Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gt isi 50
  • Ikwadebe Maka Izute Mkpagbu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikwadebe Maka Izute Mkpagbu
  • Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Zụrụ Ha Otú Ha Ga-enwe Ike Ịna-ekwusa Ozi Ọma Ọ Bụrụgodị na A Kpagbuwe Ha
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ịkwadebe Ndị Ozi ahụ Maka Ọpụpụ Ya
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • “Gaanụ Mee . . . Ndị Na-eso Ụzọ”
    ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
gt isi 50

Isi 50

Ikwadebe Maka Izute Mkpagbu

MGBE o nyesịrị ndị ozi ya ntụziaka n’ụzọ ha ga-esi rụọ ọrụ nkwusa ahụ, Jisọs dọrọ ha aka ná ntị banyere ndị mmegide. Ọ na-asị: “Lee, mụ onwe m na-ezipụ unu dị ka atụrụ n’etiti agụ . . . Ma na-ezenụ mmadụ: n’ihi na ha ga-arara unu nye n’aka nnọkọ ikpe dị iche iche, n’ụlọ nzukọ nile ha ka ha ga-apịakwa unu ihe; ee, n’ihu ndị isi na ndị eze ka a ga-ekurukwa unu jee n’ihi m.”

N’agbanyeghị oké mkpagbu nke ndị na-eso ụzọ ya ga-ezute, Jisọs kwere ha nkwa nke a na-emesi obi ike, sị: “Mgbe ọ bụla ha ga-arara unu nye, unu echegbula onwe unu otú unu ga-ekwu ma ọ bụ okwu unu ga-ekwu: n’ihi na a ga-enye unu n’oge hour ahụ okwu unu ga-ekwu. N’ihi na ọ bụghị unu onwe unu na-ekwu, kama ọ bụ mmụọ nke Nna unu nke na-ekwu n’ime unu.”

Jisọs gara n’ihu ịsị, “Nwanne ga-ararakwa nwanne ya nye n’ọnwụ, nna ga-ararakwa nwa ya nye: ụmụ ga-ebilikwa megide ndị mụrụ ha, mee ka ha nwụọ anwụ.” Ọ sịkwara: “Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m: ma onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.”

Ikwusa ozi ọma bụ ọrụ kachasị mkpa. N’ihi nke a, Jisọs kwusiri okwu ike banyere mkpa ọ dị iji ezi uche mee ihe ka a ghara inweta nsogbu ọ bụla n’ọrụ ahụ. Ọ na-asị, “Mgbe ọ bụla ha sogburu unu n’obodo a, gbalaga n’obodo dị iche: n’ihi na n’ezie asị m unu, Unu agaghị agazu obodo nile nke Israel ma ọlị, ruo mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa.”

Ọ bụ ezie na ndị Jisọs nyere ntụziaka, ịdọ aka ná ntị, na agbamume bụ ndị ozi 12 ya, ma ọ bụkwa ihe dịịrị ndị ahụ ga-ekere òkè n’ikwusa ozi ọma n’ụwa nile mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya gasịrị. E gosipụtara nke a n’eziokwu ahụ bụ na ọ sịrị na ndị na-eso ụzọ ya ga-abụ ndị ‘mmadụ nile kpọrọ asị,’ ọ bụghị nanị ndị Israel ahụ e zipụrụ ndị ozi ahụ ikwusara ozi ọma. Ọzọkwa, ihe àmà gosiri na a kpọpụghị ndị ozi ahụ n’ihu ndị isi na ndị eze mgbe Jisọs zipụrụ ha ikwusa ozi ọma ahụ nke na-eweghị ogologo oge. Nke kasịnụ, ndị òtù ezinụlọ araraghị ndị kwere ekwe nye n’aka ọnwụ n’oge ahụ.

Ya mere, mgbe ọ na-ekwu na ndị na-eso ụzọ ya agaghị arụzu ọrụ nkwusa nke a gburugburu ókèala ha “ruo mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa,” Jisọs na-agwa anyị n’ụzọ amụma na ndị na-eso ụzọ ya agaghị arụzu ọrụ nke ikwusa ozi ọma ahụ n’elu ụwa dum mmadụ bi banyere Alaeze Chineke nke e guzobeworo tupu Eze Jisọs Kraịst ahụ e mere ka ọ dị ebube abịa dị ka onye isi nke Jehova ga-eji rụọ ọrụ mbibi n’Amagedọn.

N’ịga n’ihu inye ha ntụziaka, Jisọs sịrị: “Onye na-eso ụzọ onye ozizi adịghị aka onye ozizi ya, ohu adịghị akakwa onye nwe ya.” Ya mere, ndị na-eso ụzọ Jisọs aghaghị ịtụ anya inweta mmeso dị ilu na mkpagbu dị ka o nwetara mgbe ọ na-ekwusa banyere Alaeze Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dụrụ ọdụ, sị: “Unu atụkwala egwu ndị ahụ na-egbu anụ ahụ ma ha apụghị igbu mkpụrụ obi; kama nke ahụ, na-atụnụ egwu onye ahụ nke pụrụ ibibi ma mkpụrụ obi ma anụ ahụ na Gehena.”​—⁠NW.

Jisọs ga-esetịpụ ihe nlereanya n’okwu a. Ọ ga-anwụ n’atụghị egwu kama ịhapụ nguzosi ike ya n’ebe Onye ahụ nke ji ike nile, bụ́ Jehova Chineke nọ. Ee, ọ bụ nanị Jehova bụ onye pụrụ ibibi “mkpụrụ obi” mmadụ (nke pụtara n’akụkụ nke a, olileanya nile onye ahụ nwere maka ọdịnihu dị ka mkpụrụ obi dị ndụ) na onye pụrụ ọbụna ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ ịdị ndụ ebighị ebi. Lee nnọọ Nna eluigwe na-ahụ n’anya, nke nwekwara ọmịiko Jehova bụ!

Jisọs mesịrị gbaa ndị na-eso ụzọ ya ume site n’ilu nke na-eme ka nlekọta ịhụnanya nke Jehova na-elekọta ha pụta ìhè. Ọ na-ajụ sị, “Á dịghị ere egwele abụọ otu penny? Ma otu n’ime ha agaghị ada n’ala ma Nna unu ekweghị: ma ọbụna agịrị isi nile nke isi unu ka a gụworo. Ya mere, unu atụla egwu; ọnụ ahịa unu onwe unu karịrị nke ọtụtụ egwele.”

Ozi Alaeze ahụ nke Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ikwusa ga-ekewasị ezinụlọ, ebe ọ bụ na ndị ụfọdụ n’ezinụlọ ga-anabata ya ebe ndị ọzọ ga-ajụ ya. Ọ na-akọwa sị, “Unu echela na abịara m ịtụba udo n’elu ụwa: abịaghị m ịtụba udo, kama ọ bụ mma agha.” N’ihi ya, ọ chọrọ obi ike ka onye òtù ezinụlọ wee nabata eziokwu nke Bible. Jisọs na-ekwu sị, “Onye na-ahụ nna ya ma ọ bụ nne ya n’anya karị mụ adịghị ekwesị m; onye na-ahụkwa nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwanyị n’anya karị mụ adịghị ekwesị m.”

Mgbe ọ na-emechi ntụziaka ya, Jisọs kọwara na ndị nabatara ndị na-eso ụzọ ya anabatawokwa ya. “Onye ọ bụla nke ga-ekuru nanị iko mmiri oyi nye otu onye n’ime ndị nta ndị a ṅụọ n’aha onye na-eso ụzọ m, n’ezie asị m unu, ọ gaghị atụfu ụgwọ ọrụ ya ma ọlị.” Matiu 10:16-⁠42.

▪ Gịnị bụ ịdọ aka ná ntị Jisọs na-enye ndị na-eso ụzọ ya?

▪ Agbamume na nkasi obi dị aṅaa ka ọ na-enye ha?

▪ N’ihi gịnị ka ntụziaka Jisọs ji dịkwara ndị Kraịst nke oge a?

▪ N’ụzọ dị aṅaa ka o si bụrụ na onye na-eso ụzọ Jisọs akaghị onye ozizi ya ukwuu?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya