Isi 75
Isi Iyi nke Obi Ụtọ
N’OGE ije ozi ya na Galili, Jisọs rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube, ugbu a, ọ na-arụghachikwa ndị a na Judia. Dị ka ihe atụ, o si n’ahụ otu nwoke chụpụ mmụọ ọjọọ nke gbochiworo ya ikwu okwu. O juru ìgwè mmadụ ndị ahụ anya, ma ndị mmegide welitekwara otu okwu mmegide ahụ e welitere na Galili. Ha na-ekwu sị, “N’ike Beelzebul onye isi ndị mmụọ ọjọọ ka ọ na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.” Ndị ọzọ chọrọ ka Jisọs nyekwuo ihe àmà banyere onye ọ bụ, ha gbalịkwara ịnwa ya ọnwụnwa site n’ịgwa ya ka o nye ha ihe àmà site n’eluigwe.
Ebe ọ matara ihe ha bu n’uche, Jisọs zaghachikwara ndị mmegide ndị a na Judia dị ka ọ zara ndị nke Galili. O kwuru na alaeze ọ bụla nke e kewara megide onwe ya ga-ada. Ọ na-ajụ sị, “Ma ọ bụrụkwa na Setan kewara megide onwe ya, alaeze ya ga-esi aṅaa guzo?” O gosipụtara ọnọdụ dị ize ndụ nke ndị na-emegide ya site n’ịsị: “Ma ọ bụrụ na mụ onwe m achụpụ ndị mmụọ ọjọọ n’ike mkpịsị aka Chineke, ya mere alaeze Chineke ruru unu ahụ [“agaferewo unu,” NW].”
Ndị na-ekiri ọrụ ebube nile nke Jisọs kwesịrị imeghachi omume banyere ha n’otu ụzọ ahụ ndị ahụ mere, bụ́ ndị hụrụ Mosis ka ọ rụrụ otu ọrụ ebube n’ọtụtụ narị afọ gara aga. Ha tiri mkpu, sị: “Mkpịsị aka Chineke ka nke a bụ!” Ọ bụkwa “mkpịsị aka Chineke” dere Iwu Iri ahụ n’elu mbadamba nkume. Ọ bụkwa mkpịsị aka Chineke—bụ́ mmụọ nsọ ya, ma ọ bụ ike ọrụ ya—na-enye Jisọs ike ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ na ịgwọ ndị ọrịa. Ya mere Alaeze Chineke agaferewo ndị mmegide ndị a, ebe Jisọs, bụ́ Eze a họpụtara nke Alaeze ahụ nọ n’etiti ha n’ebe ahụ.
Jisọs nyeziri ihe atụ nke na-egosi na ike o nwere ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ bụ ihe àmà nke ike o nwere megide Setan, ọbụna dị ka mgbe onye siri ike karị bịara jikpaa onye kere ekike agha nke ọma ma na-eche obí ya nche ahụ. Ọ maghachikwara atụ nke ọ mara na Galili banyere mmụọ na-adịghị ọcha. Mmụọ ọjọọ hapụrụ otu nwoke, ma mgbe nwoke ahụ na-ejighị ihe dị mma mejuo ohere ahụ pụtara, mmụọ ahụ na-alaghachite kpọrọ asaa ndị ọzọ, ọnọdụ nwoke ahụ ewee dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.
Ka ọ na-ege ntị n’ozizi ndị a, a kpaliri otu nwanyị n’etiti ìgwè mmadụ ahụ iti mkpu n’olu dara ụda, sị: “Ngọzi [“Obi ụtọ,” NW] na-adịrị afọ nke buru gị, na ara nke ị mịrị!” Ebe ọ bụ ọchịchọ nke nwanyị onye Juu ọ bụla ịbụ nne nke onye amụma na karịsịa nke Mesaịa ahụ, ọ dị mfe ịghọta ihe mere nwanyị a ga-eji kwuo nke a. O doro anya na o chere na Meri ga-enwe obi ụtọ pụrụ iche n’ihi ịbụ nne Jisọs.
Otú ọ dị, Jisọs mere ngwa ịgbazi uche nwanyị ahụ banyere ezi isi iyi nke obi ụtọ. Ọ zaghachiri sị, “Nke bụ eziokwu karị bụ, ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị ndị nụrụ okwu Chineke, debekwa ya!” Ọ dịghị mgbe Jisọs nyere echiche nke na e kwesịrị inye nne ya bụ Meri nsọpụrụ pụrụ iche. Kama, o gosiri na a na-achọta ezi obi ụtọ site n’ịbụ onye na-ejere Chineke ozi nke kwesịrị ntụkwasị obi, ọ bụghị ná njikọ anụ ahụ ọ bụla ma ọ bụ ihe mmadụ rụpụtara.
Dị ka o mererịị na Galili, Jisọs gakwara n’ihu ịbara ndị Judia ahụ mba n’ihi ịrịọ maka ihe ịrịba ama site n’eluigwe. Ọ gwara ha na a gaghị enye ha ihe ịrịba ama ọ bụla ma ọ bụghị ihe ịrịba ama nke Jona. Jona ghọrọ ihe ịrịba ama site ma n’ụbọchị atọ ọ nọrọ n’ime azụ ma ná nkwusa o ji obi ike mee, nke kpatara na a kpaliri ndị Nineve ka ha chegharịa. Jisọs na-asị, “Ma lee, onye ka Jona nọ n’ebe a.” N’otu aka ahụ, amamihe Solomọn riri eze nwanyị nke Sheba ọnụ. Jisọs na-ekwukwa sị, “Ma lee, onye ka Solomọn nọ n’ebe a.”
Jisọs kọwara na mgbe mmadụ mụnyere ọkụ n’oriọna, ọ dịghị adọba ya ebe dị na nzuzo ma ọ bụ n’okpuru nkata, kama ọ bụ n’elu ihe ndọba oriọna ka ndị mmadụ wee jiri ìhè ya hụ ụzọ. Ma eleghị anya ọ na-eme ka amata na izi ihe na ịrụ ọrụ ebube dị iche iche n’anya ndị a ekwo kpọrọ nkụ n’etiti ndị na-ege ya ntị yiri izobe ìhè nke oriọna. Anya nke ndị nkiri dị otú ahụ adịghị n’otu ebe, ma ọ bụ bụrụ nke e legidere nke ọma, ya mere e mezughị nzube e bu n’uche rụọ ọrụ ebube ndị ahụ.
Jisọs ka chụpụsịrị mmụọ ọjọọ ma mee ka onye ogbi kwuo okwu. Nke a kwesịrị ịkpali ndị nwere anya dị n’otu ebe, ma ọ bụ nke e legidere nke ọma ito oké ọrụ a dị ebube ma kpọsaa ozi ọma ahụ! Ma, nye ndị mmegide ndị a, ọ bụghị nke a ka e mere. N’ihi nke a, Jisọs kwubiri, sị: “Ya mere, lee anya ma ìhè dị n’ime gị abụghị ọchịchịrị. Ya mere, ọ bụrụ na ahụ gị dum ejupụta n’ìhè, ghara inwe akụkụ ọ bụla gbara ọchịchịrị, ahụ ahụ dum ga-ejupụta n’ìhè, dị ka mgbe oriọna, site n’ìhè ya na-enwu, na-enye gị ìhè.” Luk 11:14-36; Ọpụpụ 8:18, 19; 31:18; Matiu 12:22, 28.
▪ Gịnị bụ mmeghachi omume nke e nwere n’ọgwụgwọ Jisọs gwọrọ nwoke ahụ?
▪ Gịnị bụ “mkpịsị aka Chineke,” oleekwa otú Alaeze Chineke siworo gafere ndị na-ege Jisọs ntị?
▪ Gịnị bụ isi iyi nke ezi obi ụtọ?
▪ Olee otú mmadụ pụrụ isi nwee anya dị n’otu ebe?