Isi 99
Jisọs Akụzie Ihe na Jeriko
N’OGE na-adịghị anya, Jisọs na ìgwè mmadụ so ya na-eme njem bịarutere na Jeriko, bụ́ obodo na-ewe njem ihe dị ka otu ụbọchi site na Jerusalem. O yiri ka Jeriko ọ̀ bụ obodo dị ụzọ abụọ, obodo ochie nke ndị Juu dịkwa ihe dị ka otu maịlụ site n’obodo ndị Rom, bụ́ nke dị ọhụrụ karị. Ka ìgwè mmadụ ahụ si n’obodo nke ochie na-apụ, ma na-abịaru nso na nke ọhụrụ, ndị ìsì abụọ na-arịọ arịrịọ nụrụ mkpatụ ha. Aha otu n’ime ha bụ Batimiọs.
Ka ọ matara na ọ bụ Jisọs na-agafe, Batimiọs na onye òtù ya malitere iti mkpu, sị: “Onyenwe anyị, meere anyị ebere, Nwa Devid.” Mgbe ìgwè mmadụ ahụ basiiri ha mba ike ka ha mechie ọnụ, ha tipụtara mkpu ìhè ọbụna karị ma jiri olu ka daa ụda, sị: “Onyenwe anyị, meere anyị ebere, Nwa Devid.”
Ka ọ nụrụ mkpọtụ ahụ, Jisọs kwụsịrị. Ọ gwara ndị so ya ka ha kpọọ ndị na-eti mkpu ahụ nile. Ndị a jekwuuru ndị ìsì ahụ na-arịọ arịrịọ ma gwa otu n’ime ha, sị: “Nwee obi ike: bilie, ọ na-akpọ gị.” Site ná mkpali nke a na-akparaghị ókè, onye ìsì ahụ chịfuru uwe elu ya, malie guzoro n’ụkwụ ya, wee gakwuru Jisọs.
Jisọs jụrụ, sị “Gịnị ka unu na-achọ ka m meere unu?”
Ndị ikom abụọ ahụ rịọrọ sị, “Onyenwe anyị, ka e wee meghee anya anyị.”
Ebe o nwere ọmịiko n’ahụ ha, Jisọs metụrụ ha aka n’anya. Dị ka ihe ndekọ Mak si kwuo, Jisọs gwara otu n’ime ha, sị: “Laba; okwukwe gị azọpụtawo gị.” Ozugbo ahụ, ndị ìsì ahụ na-arịọ arịrịọ malitere ịhụ ụzọ, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ha abụọ malitere ito Chineke. Mgbe ìgwè mmadụ ahụ hụrụ ihe merenụ, ha nyekwara Chineke otuto. N’atụfughị oge ọ bụla, Batimiọs na onye òtù ya malitere iso Jisọs.
Ka Jisọs si na Jeriko na-agafe, ìgwè mmadụ ahụ buru ibu nke ukwuu. Onye ọ bụla na-achọ ịhụ onye ahụ nke gwọrọ ndị ikom ahụ kpuru ìsì. Ndị ahụ si n’akụkụ nile gbaa Jisọs gburugburu, n’ihi nke a kwa, ụfọdụ apụghị ịhụ ya anya. Otu n’ime ndị a bụ Zakịọs, bụ́ onye isi nke ndị ọna ụtụ nile na Jeriko na gburugburu ya. Ọ dị mkpụmkpụ nke ukwuu nke na ọ pụghị ịhụ ihe na-aganụ.
Ya mere Zakịọs gbaara ọsọ gaa n’ihu wee rịgoro n’elu osisi sycomore nke dị n’okporo ụzọ ahụ Jisọs si na-abịa. Site n’ọnọdụ nke a dị mma, ọ pụrụ ịhụ ihe nile nke ọma. Ka ìgwè mmadụ ahụ na-abịaru nso, Jisọs chere ihu n’osisi ahụ ma kpọọ òkù, sị: “Zakịọs, mee ngwa, rịdata; n’ihi na aghaghị m ịnọdụ n’ụlọ gị taa.” Zakịọs ji obi ụtọ rịdata ma gbara ọsọ laa n’ụlọ ya ịga dozie ihe maka onye ọbịa ya nke pụrụ iche.
Otú ọ dị, mgbe ndị mmadụ hụrụ ihe na-emenụ, ha nile malitere ịtamu. Ha lere ya anya dị ka ihe na-ekwesịghị ekwesị ka Jisọs bụrụ ọbịa n’ụlọ nwoke dị otú a. Leenụ, Zakịọs bara ọgaranya site n’ịnara ego n’ụzọ na-ezighị ezi n’ọrụ ya nke ịnakọta ụtụ.
Ọtụtụ ndị mmadụ sooro gaa, mgbe Jisọs banyekwara n’ụlọ Zakịọs, ha mere mkpesa, sị: “Ọ bara ịnọ ọnọdụ abalị n’ụlọ nwoke bụ onye mmehie.” Ma Jisọs hụrụ ohere nke nchegharị n’ime Zakịọs. E mechughịkwa Jisọs ihu, n’ihi na Zakịọs guzoro ọtọ na-ekwu n’ihu ọha, sị: “Lee, Onyenwe anyị, nkera ihe m nwere ka m ga-enye ndị ogbenye; ọ bụrụkwa na anara m onye ọ bụla ihe site n’ebubo ụgha, m ga-enyeghachi anọ anọ.”
Zakịọs gosipụtara na nchegharị ya bụ nke ziri ezi site n’iwere nkera nke ihe o nwere nye ndị ogbenye nakwa iji nkera nke ọzọ kwụghachi ndị ọ naara ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. O doro anya na ọ pụrụ ịgbakọ kpọmkwem ego nile o ji ndị a n’ụgwọ site n’ihe ndekọ ya nke ịnakọta ụtụ. Ya mere ọ ṅụrụ iyi ịkwụghachi okpukpu anọ, n’ikwekọ n’iwu Chineke, nke na-asị: ‘Mgbe onye ọ bụla ga-ezuru atụrụ, atụrụ anọ ka ọ ga-akwụghachi n’ọnọdụ atụrụ ahụ.’
Ụzọ Zakịọs si kwee nkwa ikesa ihe onwunwe ya masịrị Jisọs, n’ihi na O kwuru, sị: “Taa ka nzọpụta bịaruru ụlọ a, ebe ya onwe ya bụkwa nwa Abraham. N’ihi na Nwa nke mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ihe nke furu efu.”
N’oge na-adịbeghị anya, Jisọs enyeworị ihe atụ nke ọnọdụ ‘ndị furu efu’ site n’akụkọ ya banyere nwa mmefu ahụ. Ugbu a, anyị nwere ihe atụ mere eme n’ezie nke onye furu efu a chọtaworo. Ọ bụ eziokwu na ndị ndú okpukpe na ndị na-eso ha na-atamu ntamu ma na-eme mkpesa banyere ụzọ Jisọs si chee ihu n’ebe ndị dị ka Zakịọs nọ, Jisọs nọgidere na-achọ ma na-akpọghachite ụmụ ndị a furu efu nke Abraham. Matiu 20:29-34; Mak 10:46-52; Luk 18:35–19:10; Ọpụpụ 22:1.
▪ Ebee ka ọ na-aghaghị ịbụworị na Jisọs zutere ndị ìsì ahụ na-arịọ arịrịọ, gịnịkwa ka o meere ha?
▪ Ònye bụ Zakịọs, n’ihi gịnịkwa ka o ji rịa elu osisi?
▪ Olee otú Zakịọs si gosipụta nchegharị ya?
▪ Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ụzọ Jisọs si mesoo Zakịọs?