ISI NKE 44
Ndị Enyi Anyị Kwesịrị Ịhụ Chineke n’Anya
NDỊ enyi anyị bụ ndị anyị na-enwe mmasị iso na-enwe mkparịta ụka na isoro ha nọrọ. Ma ọ dị mkpa ka anyị nwee ụdị ndị enyi kwesịrị ekwesị. Ònye ka i chere bụ́ enyi kasị mma anyị pụrụ inwe?— Ee, ọ bụ Jehova Chineke.
Ànyị pụrụ ịbụ ndị enyi Chineke n’ezie?— Bible na-ekwu na Ebreham, bụ́ nwoke biri ndụ ogologo oge gara aga, bụ “enyi Jehova.” (Jems 2:23) Ị̀ ma ihe mere o ji bụrụ enyi Jehova?— Bible na-ekwu na Ebreham rubeere Chineke isi. O rubere isi ọbụna mgbe a gwara ya ka o mee ihe siri ike. Ya mere, iji bụrụ enyi Jehova, anyị aghaghị ime ihe dị ya mma dị nnọọ ka Ebreham mere na dịkwa nnọọ ka Onye Ozizi Ukwu ahụ na-eme mgbe nile.—Jenesis 22:1-14; Jọn 8:28, 29; Ndị Hibru 11:8, 17-19.
Gịnị mere Ebreham ji bụrụ “enyi Jehova”?
Jizọs gwara ndịozi ya, sị: “Unu bụ ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu emee ihe m na-enye unu n’iwu.” (Jọn 15:14) Ebe ọ bụ na ihe nile Jizọs gwara ndị mmadụ sitere n’aka Jehova, Jizọs na-ekwu na ndị enyi ya bụ ndị na-eme ihe Chineke kwuru na ha kwesịrị ime. Ee, ndị enyi ya nile hụrụ Chineke n’anya.
Ụfọdụ n’ime ezigbo ndị enyi Onye Ozizi Ukwu ahụ bụ ndịozi ya, bụ́ ndị ị pụrụ ịhụ foto ha na peeji nke 75 nke akwụkwọ a. Ha so ya mee njem, nyekwara ya aka rụọ ọrụ ime nkwusa ahụ. N’ihe ka ukwuu n’oge Jizọs, ọ bụ ya na ndị ikom a na-anọ. Ha rikọrọ nri. Ha kwurịtara banyere Chineke. Ha mekọkwara ihe ndị ọzọ ọnụ. Ma Jizọs nwere ọtụtụ ndị enyi ọzọ. Ya na ha na-anọ, ha na-enwekọkwa obi ụtọ ọnụ.
Otu ezinụlọ Jizọs na-enwe mmasị ịnọ na nke ha bi n’otu obodo nta bụ́ Betani, nke dị nnọọ ná mpụga obodo ahụ buru ibu bụ́ Jeruselem. Ì chetara ha?— Ha bụ Meri na Mata na nwanne ha nwoke, bụ́ Lazarọs. Jizọs kpọrọ Lazarọs enyi ya. (Jọn 11:1, 5, 11) Ihe mere Jizọs ji hụ ezinụlọ a n’anya ma nwee mmasị ka ya na ha na-anọ bụ n’ihi na ha hụrụ Jehova n’anya ma na-ejere Ya ozi.
Gịnị mere Jizọs na ezinụlọ a ji anọkarị mgbe ọ gara Jeruselem? Ị̀ ma aha ha?
Nke a apụtaghị na Jizọs enweghị obiọma n’ebe ndị na-adịghị ejere Chineke ozi nọ. O nwere obiọma n’ebe ha nọ. Ọ gara ọbụna n’ụlọ ha ma soro ha rie nri. Nke a mere ụfọdụ ndị ji sị na Jizọs bụ “enyi ndị ọnaụtụ na ndị mmehie.” (Matiu 11:19) Nke bụ́ eziokwu bụ na Jizọs adịghị aga n’ụlọ ndị a n’ihi na o nwere mmasị n’ụzọ ha si ebi ndụ. Ọ gara na nke ha ka o wee nwee ike ịgwa ha banyere Jehova. Ọ gbalịrị inyere ha aka ịgbanwe ụzọ ọjọọ ha na ijere Chineke ozi.
Gịnị mere Zakịọs ji rịgoro elu osisi a?
Nke a mere otu ụbọchị n’obodo Jeriko. Jizọs nọ na-agafe ka ọ nọ na-aga Jeruselem. E nwere ìgwè mmadụ, otu nwoke aha ya bụ Zakịọs sokwa n’ìgwè mmadụ ahụ. Ọ chọrọ ịhụ Jizọs. Ma Zakịọs dị mkpụmkpụ, ọ pụghịkwa ịhụ ya n’ihi ìgwè mmadụ ahụ. Ya mere, ọ gbaara gaa n’ihu gaa rịgoro n’elu otu osisi iji hụ Jizọs nke ọma mgbe ọ ga-agafe.
Mgbe Jizọs rutere n’ebe osisi ahụ dị, o leliri anya elu wee, sị: ‘Mee ọsọ ọsọ rịdata, n’ihi na m ga-aga n’ụlọ gị taa.’ Ma Zakịọs bụ ọgaranya nke meworo ihe ọjọọ dị iche iche. Gịnị mere Jizọs ji chọọ ịga n’ụlọ onye dị otú ahụ?—
Ọ bụghị n’ihi na Jizọs nwere mmasị n’ụzọ nwoke ahụ si ebi ndụ. Ọ gara n’ebe ahụ ịga gwa Zakịọs banyere Chineke. Ọ hụrụ otú nwoke ahụ si gbalịsie ike ịhụ ya anya. Ya mere, ọ ma na Zakịọs ga-ege ntị ma eleghị anya. Nke a bụ oge dị nnọọ mma iji gwa ya banyere ụzọ Chineke kwuru na ndị mmadụ kwesịrị isi na-ebi ndụ.
Gịnị mere Jizọs ji gaa na nke Zakịọs, gịnịkwa ka Zakịọs kwere nkwa ime?
Ya mere, gịnị ka anyị na-ahụ na-eme ugbu a?— Zakịọs nwere mmasị n’ihe ndị Jizọs na-akụzi. O wutere ya na ya ghọgburu ndị mmadụ, ọ na-ekwekwa nkwa ịkwụghachi ego ndị na-ezighị ezi ọ naara. Ọ ghọziri onye na-eso ụzọ Jizọs. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka Jizọs na Zakịọs bịara ghọọ enyi.—Luk 19:1-10.
Ọ bụrụ na anyị agbasoo ihe nlereanya nke Onye Ozizi Ukwu ahụ, ọ̀ dị mgbe anyị ga-aga na nke ndị na-abụghị ndị enyi anyị?— Ee. Ma ihe mere anyị ga-eji aga n’ụlọ ha abụghị n’ihi na anyị nwere mmasị n’ụzọ ha si ebi ndụ. Anyị agaghịkwa eso ha na-eme ihe ọjọọ. Anyị ga-aga na nke ha ka anyị wee nwee ike ịgwa ha okwu banyere Chineke.
Ma ndị bụ́ ezigbo ndị enyi anyị bụ ndị anyị na-enwe mmasị karịsịa iso nọkọọ. Iji bụrụ ndị enyi kwesịrị ekwesị, ha aghaghị ịbụ ụdị ndị enyi Chineke nwere mmasị n’ebe ha nọ. Ụfọdụ nwere ike ha agadịghị ama onye Jehova bụ. Ma, ọ bụrụ na ha chọrọ ịmụta banyere ya, anyị pụrụ inyere ha aka. Mgbe ha hụkwara Jehova n’anya dị ka anyị si hụ ya n’anya, mgbe ahụ anyị na ha pụrụ ịghọ ezigbo ndị enyi.
Ọ dị ụzọ ọzọ anyị pụrụ isi chọpụta ma mmadụ ọ̀ ga-aghọ ezi enyi anyị. Lee ihe ndị ọ na-eme. Ọ̀ na-eme ndị ọzọ ihe ọjọọ ma na-achị ọchị banyere ya? Ọ dịghị mma, ka ọ̀ dị?— Ọ̀ na-adaba ná nsogbu mgbe nile? Anyị agaghị achọ iso ya daba ná nsogbu, ka ànyị ga-achọ?— Ka ọ̀ na-ama ụma eme ihe ndị na-adịghị mma na-eche na ya wara anya n’ihi na e jideghị ya? Ọ bụrụgodị na e jideghị onye ahụ, Chineke hụrụ ihe o mere, ka ọ̀ bụ na Ọ hụghị ya?— Ì chere na ndị na-eme ihe ndị dị otú a ga-abụ ndị enyi anyị kwesịrị inwe?—
Biko, weta Bible gị. Ka anyị lee ihe o kwuru banyere otú ndị enyi anyị si enwe mmetụta ná ndụ anyị. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ bụ 1 Ndị Kọrint isi 15, amaokwu 33. Ị̀ hụla ya?— Ọ na-agụ, sị: “Ka a ghara iduhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru.” Nke a pụtara na ọ bụrụ na anyị esoro ndị ọjọọ na-akpakọrịta, anyị pụrụ ịghọ ndị ọjọọ. Ọ bụkwa eziokwu na ndị enyi ọma na-enyere anyị aka ịzụlite àgwà ọma.
Ka anyị ghara ichefu ya mgbe ọ bụla na Onye kasị mkpa ná ndụ anyị bụ Jehova. Anyị achọghị imebi ọbụbụenyi anyị na ya, ka ànyị chọrọ?— Ya mere, anyị aghaghị ịkpachara anya iji hụ na ọ bụ nanị ndị hụrụ Chineke n’anya ka anyị na-emete enyi.
E gosiri mkpa ọ dị inwe ụdị ndị enyi kwesịrị ekwesị n’Abụ Ọma 119:115; Ilu 13:20; 2 Timoti 2:22; nakwa na 1 Jọn 2:15.