Isi 106
E Kpughere Ha Site n’Ihe Atụ Ndị Metụtara Ubi Vine
JISỌS nọ n’ụlọ nsọ ahụ. Ọ ka kwusịrị nnọọ ihe tụrụ ndị ndú okpukpe ahụ n’anya, bụ́ ndị chọrọ ịmata onye nyere ya ikike o ji na-eme ihe. Tupu ha nwetaghachi onwe ha site n’ọnọdụ mgbagwoju anya ahụ, Jisọs jụrụ, sị: “Ma gịnị bụ uche unu?” Mgbe ahụ, site n’ịkọrọ ha otu ihe atụ, o gosiri ha ụdị ndị ha bụ n’ezie.
Jisọs kọrọ sị, “Otu nwoke nwere ụmụ abụọ; o wee bịakwute nke mbụ, sị, Nwa, jee rụọ ọrụ taa n’ubi vine nke m. Ma ọ zara, sị, Achọghị m ije: ma e mesịa ọ kwaa ụta, wee jee. O wee bịakwute nke abụọ, kwuo otú ahụ. O wee zaa, sị, Mụ onwe m ga-eje, onyenwe anyị: ma o jeghị.” Jisọs jụrụ sị, “Ònye n’ime ha abụọ mere ihe nna ya chọrọ?”
Ndị ahụ na-emegide ya zaghachiri sị, “Onye mbụ.”
Ya mere Jisọs kọwara, sị: “N’ezie asị m unu, na ndị ọna ụtụ na ndị inyom nke na-akwa iko na-ebu unu ụzọ aba n’alaeze Chineke.” Nke a pụtara na n’ihi omume ha, ndị ọna ụtụ na ndị inyom na-akwa iko bu ụzọ jụ ijere Chineke ozi. Ma mgbe e mesịrị, dị ka nwa nke mbụ ahụ, ha kwara ụta wee jeere ya ozi. N’aka nke ọzọ, ndị ndú okpukpe, dị ka nwa nke abụọ ahụ, kwuru na ha na-ejere Chineke ozi, ma dị ka Jisọs mere ka ọ pụta ìhè: “Jọn [Onye Na-eme Baptism] bịakwutere unu n’ụzọ ezi omume, ma unu ekweghị ya: ma ndị ọna ụtụ na ndị inyom nke na-akwa iko kweere ya: ma mgbe unu hụrụ ya, unu onwe unu akwaghị ụta ọbụna e mesịa, ka unu wee kwere ya.”
Jisọs gara n’ihu igosi na ọdịda nke ndị ndú okpukpe ndị a abụghị nanị n’ilefuru ijere Chineke ozi anya. Ee e, ha bụ ndị ọjọọ n’ezie, bụ́ ndị ajọ omume. Jisọs na-akọ sị, “Otu nwoke dị, bụ́ nna nwe ụlọ, onye kụrụ ubi vine, gbaa ya ogige gburugburu, gwuokwa ebe nzọcha mkpụrụ vine n’ime ya, wuokwa ụlọ elu, werekwa ya tinye n’aka ndị ọrụ ubi, wee jee ala ọzọ. Ma mgbe oge mkpụrụ ruru nso, o zigara ndị ohu ya jekwuru ndị ọrụ ubi ahụ, ịnata mkpụrụ ya. Ndị ọrụ ubi ahụ wee jide ndị ohu ya, pịa otu onye ihe, gbuokwa nke ọzọ, tụọkwa nke ọzọ nkume. Ọzọ, o zigara ndị ohu ọzọ dị ọtụtụ karịa ndị mbụ: ha wee meekwa ha otú ahụ.”
“Ndị ohu” ahụ bụ ndị amụma ndị “nna nwe ụlọ,” bụ́ Jehova Chineke, zigaara “ndị ọrụ ubi” nke “ubi vine” ya. Ndị ọrụ ubi ndị a bụ ndị nnọchianya bụ isi nke mba Israel, bụ́ mba Bible mere ka a mata dị ka “ubi vine” nke Chineke.
Ebe ọ bụ na “ndị ọrụ ubi” ahụ mesoro “ndị ohu” ahụ omume ọjọọ ma gbuokwa ha, Jisọs kọwara, sị: “Ma e mesịa [onye ahụ nwe ubi vine] zigaara ha ọkpara ya, sị, Ha ga-asọpụrụ ọkpara m. Ma ndị ọrụ ubi ahụ, mgbe ha hụrụ ọkpara ahụ, ha sịrịta onwe ha, Nke a bụ onye nketa; bịanụ, ka anyị gbuo ya, nwerekwa ihe nketa ya. Ha wee jide ya, tụpụ ya n’azụ ubi vine ahụ, gbuo ya.”
Ugbu a n’ịgwa ndị ndú okpukpe ahụ okwu, Jisọs jụrụ, sị: “Mgbe ọ bụla onye nwe ubi vine ahụ ga-abịa, gịnị ka ọ ga-eme ndị ọrụ ubi ahụ?”
Ndị ndú okpukpe ahụ zaghachiri sị, “Ọ ga-ala ndị ọjọọ ahụ n’iyi n’ụzọ jọrọ njọ, ọ ga-ewerekwa ubi vine ya tinye n’aka ndị ọrụ ubi ọzọ, ndị ga-enyeghachi ya mkpụrụ ya n’oge ha.”
Ha si otú a kwupụta ikpe ọmụma n’isi onwe ha n’amaghị ama ebe ha so ná ndị Israel bụ “ndị ọrụ ubi” nke mba “ubi vine” Jehova nke Israel. Mkpụrụ Jehova na-atụ anya ya site n’aka ndị ọrụ ubi dị otú ahụ bụ okwukwe n’Ọkpara ya, bụ́ ezi Mesaịa ahụ. N’ihi ọdịda ha dara n’ịmịpụta mkpụrụ dị otú ahụ, Jisọs na-adọ aka ná ntị, sị: “Ọ́ dịghị mgbe ọ bụla unu gụrụ n’ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ [n’Abụ Ọma 118:22, 23], Nkume nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ, nke ahụ ka e mere isi nkuku ụlọ: ọ bụ n’aka Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] ka nke a sitere, ọ bụkwa oké ọrụ n’anya anyị? N’ihi nke a ka m ji sị unu, A ga-anara unu alaeze Chineke, wee nye mba ọzọ nke na-amị mkpụrụ ya. A ga-etiwasịkwa onye dakwasịrị nkume a: ma onye ọ bụla ọ ga-adakwasị, ọ ga-efesa ya dị ka ájá.”
Ndị odeakwụkwọ na ndị isi nchụàjà matara ugbu a na Jisọs na-ekwu banyere ha, ha wee chọọ igbu ya, bụ́ ezi “onye nketa” ahụ. Ya mere, dị ka otu mba, a gaje ịnapụ ha ihe ùgwù nke ịbụ ndị na-achị achị n’Alaeze Chineke, a gajekwa iguzobe mba ọhụrụ nke ‘ndị ọrụ ubi vine,’ bụ́ nke ga-amịpụta mkpụrụ kwesịrị ekwesị.
N’ihi na ndị ndú okpukpe ndị ahụ na-atụ egwu ìgwè mmadụ, bụ́ ndị weere Jisọs dị ka onye amụma, ha anwaghị igbu ya n’oge nke a. Matiu 21: 28-46; Mak 12:1-12; Luk 20:9-19; Aịsaịa 5:1-7.
▪ Ole ndị ka ụmụ abụọ ahụ dị n’ihe atụ mbụ Jisọs nyere nọchiri anya ha?
▪ N’ihe atụ nke abụọ ahụ, olee ndị e sere onyinyo ha site ná “nna nwe ụlọ,” “ubi vine,” “ndị ọrụ ubi,” “ndị ohu,” na “onye nketa” ahụ?
▪ Gịnị ga-eme ‘ndị ọrụ ubi vine’ ahụ, oleekwa ndị ga-ewere ọnọdụ ha?