Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-1 isi 7 p. 73-86
  • Ahụhụ Ga-adịrị Ubi Vine ahụ Na-ekwesịghị Ntụkwasị Obi!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ahụhụ Ga-adịrị Ubi Vine ahụ Na-ekwesịghị Ntụkwasị Obi!
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ilekọta Ubi Vine Ahụ
  • Ubi Vine ahụ na Onye Nwe Ya
  • Ịmata Ubi Vine Chineke Taa
  • “Mkpụrụ Vine Ọhịa”
  • Ihe Anyaukwu Na-akpata
  • Ọnyà nke Ntụrụndụ A Na-enyo Enyo
  • Ịkpọ Mmehie Asị na Ịhụ Eziokwu n’Anya
  • Ihe Atụ Ndị Na-arụ Ọrụ n’Ubi Vaịn
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jizọs Emee Ihe Atụ Abụọ Gbasara Ubi Vaịn
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • E Kpughere Ha Site n’Ihe Atụ Ndị Metụtara Ubi Vine
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • E Kpughere Ha site n’lhe Atụ Ndị Metụtara Ubi Vine
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
ip-1 isi 7 p. 73-86

Isi nke Asaa

Ahụhụ Ga-adịrị Ubi Vine ahụ Na-ekwesịghị Ntụkwasị Obi!

Aịsaịa 5:1-30

1, 2. Gịnị ka “onye ihe ya na-atọ [Aịsaịa] ụtọ” kụrụ, ma olee otú o si ghọọ nke na-emeghị ihe dị ka a tụrụ anya ya?

“N’IHI oké ịma mma nke asụsụ e ji dee ya na nkà na-enweghị atụ nke izi ozi n’ụzọ dị irè, ilu a fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke na-enweghị oyiri.” Nke a bụ ihe otu onye na-akọwa Bible kwuru, n’izo aka n’amaokwu ndị mbụ nke Aịsaịa isi nke 5. N’ịbụ nke gafere ọrụ nkà efu, ihe Aịsaịa kwuru na-enye nkọwa na-emetụ n’ahụ nke nlekọta ịhụnanya Jehova na-elekọta ndị ya. N’otu mgbe ahụkwa, okwu ndị a na-adọ anyị aka ná ntị megide ihe ndị na-adịghị amasị ya.

2 Ilu Aịsaịa si otú a malite: “Biko, ka m bụọrọ onye ihe ya na-atọ m ụtọ nke ukwuu abụ nke onye ihe ya na-atọ m ụtọ banyere ubi vine ya. Onye ihe ya na-atọ m ụtọ nke ukwuu nwere ubi vine n’ugwu nta nke bụ ezi ókèala: o wee gwuo ya, tụtụpụ nkume ya nile, kụọ osisi vine kachasị mma n’ime ya, wuo ụlọ elu n’etiti ya, wapụtakwa ebe ịnara mmanya vine n’ime ya: o wee lee anya na ọ ga-amị mkpụrụ vine, ma ọ mịrị mkpụrụ vine ọhịa.”—Aịsaịa 5:1, 2; tụlee Mak 12:1.

Ilekọta Ubi Vine Ahụ

3, 4. Olee nlekọta ịhụnanya e lekọtara ubi vine ahụ?

3 Ma Aịsaịa ọ̀ gụpụtara ilu a n’ihu ndị na-ege ya ntị ma ọ bụ na ọ gụpụtaghị ya, ọ dọọrọ mmasị ha n’ezie. Ma eleghị anya ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha maara ihe banyere ọrụ ịkụ ubi vine, nkọwa Aịsaịa dokwara anya ma bụrụ ihe na-eme eme n’ezie. Dị nnọọ ka ndị na-akụ vine taa, onye nwe ubi vine ahụ kụrụ, ọ bụghị mkpụrụ vine, kama “osisi vine kachasị mma,” ma ọ bụ nke dị oké ọnụ ahịa—ogwe ma ọ bụ ome si na vine ọzọ. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ kụrụ ubi vine a “n’ugwu nta nke bụ́ ezi ókèala,” ebe ubi vine ga-eme nke ọma.

4 Ọ na-achọ ịrụsi ọrụ ike iji mee ka ubi vine mepụta ihe. Aịsaịa na-akọwa ogwugwu nke onye nwe ya ‘gwuru ala ahụ, tụtụpụ nkume ya nile’—ọrụ siri ike, nke na-agwụ ike! Ma eleghị anya o ji nkume ndị buru ibu karị “wuo ụlọ elu.” N’oge ochie, ụlọ elu ndị dị otú ahụ na-abụ ebe ndị nche na-anọ bụ́ ndị na-eche ihe a kụrụ n’ubi nche maka ndị ohi na ụmụ anụmanụ.a Ọzọkwa, o jiri nkume wuo mgbidi gburugburu ókèala ubi vine ahụ. (Aịsaịa 5:5) A na-emekarị nke a iji mee ka mmiri ghara ịsachapụ elu ala ahụ dị oké mkpa.

5. Gịnị ka onye nwe ya tụrụ anya inweta n’ụzọ kwesịrị ekwesị site n’ubi vine ya, ma gịnị ka o nwetara?

5 Ebe ọ rụsiworo ọrụ ike otú a ichebe ubi vine ya, o kwesịrị nnọọ ekwesị na onye ahụ nwe ya ga-atụ anya na ọ ga-amị mkpụrụ. N’ịtụ anya nke a, ọ wapụtara ebe ịnara mmanya vine. Ma ò nwetara ihe ubi ahụ ọ tụrụ anya ya? Ee e, ubi vine ahụ mịrị mkpụrụ vine ọhịa.

Ubi Vine ahụ na Onye Nwe Ya

6, 7. (a) Ònye nwe ubi vine ahụ, gịnịkwa bụ ubi vine ahụ? (b) Ikpe dị aṅaa ka onye ahụ nwe ya na-akpọ òkù ya?

6 Ònye nwe ya, gịnịkwa bụ ubi vine ahụ? Onye nwe ubi vine ahụ na-ezo aka n’azịza nye ajụjụ ndị a mgbe ya onwe ya kwuru, sị: “Ugbu a, unu ndị bi na Jerusalem na ndị Juda, biko, kpeenụ ikpe n’etiti mụ na ubi vine nke m. Gịnị ka a ga-eme ubi vine nke m ọzọ, nke m na-emeghị n’ime ya? gịnị mere, mgbe m lere anya na ọ ga-amị mkpụrụ vine, o ji mịa mkpụrụ vine ọhịa? Ma ugbu a, biko, ka m mee ka unu mara ihe mụ onwe m gaje ime ubi vine nke m: m ga-ewezụga ogige ya, o wee ghọọ ebe anụ ụlọ na-ata nri; m ga-etipịa mgbidi ya, o wee ghọọ ebe a na-azọtọ.”—Aịsaịa 5:3-5.

7 Ee, ọ bụ Jehova nwe ubi vine ahụ, o jiriwokwa aka ya pụta n’ụlọikpe, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na-arịọ ka e kpee ikpe n’etiti ya na ubi vine ya nke na-emepụtaghị ihe ọ tụrụ anya ya. Mgbe ahụ, gịnị bụ ubi vine ahụ? Onye nwe ya na-akọwa, sị: “Ubi vine nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha bụ ụlọ Israel, ndị Juda bụkwa ihe ọkụkụ na-atọ Ya ụtọ nke ukwuu.”—Aịsaịa 5:7a.

8. Gịnị ka e kwesịrị ịrịba ama banyere ọkpụkpọ Aịsaịa kpọrọ Jehova “onye ihe ya na-atọ m ụtọ”?

8 Aịsaịa kpọrọ Jehova, bụ́ onye nwe ubi vine ahụ, “onye ihe ya na-atọ m ụtọ.” (Aịsaịa 5:1) Aịsaịa pụrụ ikwu okwu banyere Chineke n’ụzọ ịhụnanya dị otú ahụ nanị n’ihi na ya na Ya nwere mmekọrịta chiri anya. (Tụlee Job 29:4; Abụ Ọma 25:14.) Otú ọ dị, ịhụnanya onye amụma ahụ nwere n’ebe Chineke nọ abụghị ihe ọ bụla ma e jiri ya tụnyere ịhụnanya Chineke gosiworo maka “ubi vine” ya—mba ọ ‘kụrụ.’—Tụlee Ọpụpụ 15:17; Abụ Ọma 80:8, 9.

9. Olee otú Jehova siworo mesoo mba ya dị ka ubi vine e ji kpọrọ ihe?

9 Jehova “kụrụ” mba ya n’ala Kenean, nyekwa ha iwu ya, bụ́ nke rụrụ ọrụ dị ka mgbidi iji chebe ha pụọ n’ịbụ ndị mba ndị ọzọ merụrụ. (Ọpụpụ 19:5, 6; Abụ Ọma 147:19, 20; Ndị Efesọs 2:14) Ọzọkwa, Jehova nyere ha ndị ikpe, ndị nchụàjà, na ndị amụma izi ha ihe. (2 Ndị Eze 17:13; Malakaị 2:7; Ọrụ 13:20) Mgbe ndị agha yiri egwu ịwakpo Israel, Jehova mere ka e nwee ndị mgbapụta. (Ndị Hibru 11:32, 33) O nwere ihe kpatara Jehova ji na-ajụ, sị: “Gịnị ka a ga-eme ubi vine nke m ọzọ, nke m na-emeghị n’ime ya?”

Ịmata Ubi Vine Chineke Taa

10. Ilu dị aṅaa metụtara ubi vine ka Jisọs tụrụ?

10 Ọ pụrụ ịbụ na Jisọs bu okwu Aịsaịa n’uche mgbe ọ tụrụ ilu banyere ndị ọrụ ubi bụ́ ndị ogbu mmadụ: “Otu nwoke dị, bụ́ nna nwe ụlọ, onye kụrụ ubi vine, gbaa ya ogige gburugburu, gwuokwa ebe nzọcha mkpụrụ vine n’ime ya, wuokwa ụlọ elu, werekwa ya [tinye] n’aka ndị ọrụ ubi, wee jee ala ọzọ.” N’ụzọ dị mwute, ndị ọrụ ubi ahụ emeghị ihe onye nwe ubi vine ahụ tụrụ anya ya, ọbụna ha gburu nwa ya nwoke. Jisọs gara n’ihu igosi na ilu a abụghị nanị Israel nkịtị ka o metụtara mgbe ọ sịrị: “A ga-anara unu [Israel anụ ahụ] alaeze Chineke, wee nye mba ọzọ nke na-amị mkpụrụ ya.”—Matiu 21:33-41, 43.

11. Ubi vine ime mmụọ dị aṅaa dị na narị afọ mbụ, ma gịnị mere mgbe ndị ozi nwụsịrị?

11 “Mba” ọhụrụ ahụ mesịrị bụrụ “Israel nke Chineke”—mba ime mmụọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị ọnụ ọgụgụ ha ga-adị 144,000. (Ndị Galetia 6:16; 1 Pita 2:9, 10; Mkpughe 7:3, 4) Jisọs jiri ndị a na-eso ụzọ tụnyere “alaka” nke “ezi osisi vine” ahụ, nke bụ́ ya onwe ya. Dị ka o kwesịrị ịdị, a na-atụ anya ka alaka ndị a mịa mkpụrụ. (Jọn 15:1-5) Ha aghaghị igosipụta àgwà ndị yiri nke Kraịst ma kere òkè n’ọrụ ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze.” (Matiu 24:14; Ndị Galetia 5:22, 23) Ma kemgbe ndị ozi iri na abụọ ahụ nwụsịrị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị na-azọrọ na ha bụ alaka nke “ezi osisi vine” ahụ egosiwo na ha bụ adịgboroja—na-amịpụta vine ọhịa kama ịmịpụta ezi mkpụrụ.—Matiu 13:24-30, 38, 39.

12. Olee otú ihe ndị Aịsaịa kwuru si akatọ Krisendọm, ihe mmụta dịkwa aṅaa ka ha bụ nye ezi ndị Kraịst?

12 Ya mere, nkatọ Aịsaịa katọrọ ndị Juda na-emetụtakwa Krisendọm taa. Inyocha akụkọ ihe mere eme ya—agha dị iche iche ọ lụrụ, agha ntụte ya, Njụta Okwukwe ya—na-ekpughe nnọọ otú mkpụrụ ya jọruworo ná njọ! Ka o sina dị, ezi ubi vine ahụ bụ́ ndị Kraịst e tere mmanụ, na ndị ibe ha bụ́ “oké ìgwè mmadụ” ahụ, aghaghịkwa ịṅa ntị n’okwu Aịsaịa. (Mkpughe 7:9) Ọ bụrụ na ha ga-eme ihe ga-atọ onye nwe ubi vine ahụ ụtọ, ha aghaghị, n’otu n’otu na dị ka otu ìgwè, ịmịpụta mkpụrụ ndị dị ya mma.

“Mkpụrụ Vine Ọhịa”

13. Gịnị ka Jehova ga-eme ubi vine ya n’ihi ịmịpụta mkpụrụ ọjọọ?

13 Ebe o meworo ihe dị ukwuu iji lekọta ma zụọ ubi vine ya, Jehova na-atụ anya n’ụzọ ziri ezi ka ọ ghọọ “ubi vine nke mmanya vine na-asụ ụfụfụ”! (Aịsaịa 27:2) Otú ọ dị, kama ịmịpụta mkpụrụ bara uru, ọ mịpụtara “mkpụrụ vine ọhịa,” n’ụzọ nkịtị “ihe ndị na-esi ísì” ma ọ bụ “mkpụrụ osisi berry rere ere.” (Aịsaịa 5:2; nkọwa ala ala peji nke NW; Jeremaịa 2:21) Ya mere, Jehova na-ekwu na ya ga-ewezụga “ogige” nchebe ya nke gbara mba ahụ gburugburu. A ga-eme ka mba ahụ “gwụsịa,” a ga-agbahapụkwa ya, ọ ga-anọkwa n’ụkọ mmiri ozuzo. (Gụọ Aịsaịa 5:6.) Mosis adọọlarị aka ná ntị na ihe ndị dị otú ahụ ga-eme ha ma ha nupụ isi n’Iwu Chineke.—Deuterọnọmi 11:17; 28:63, 64; 29:22, 23.

14. Mkpụrụ dị aṅaa ka Jehova na-atụ anya ya n’aka mba ya, ma kama nke ahụ, gịnị ka ọ mịpụtara?

14 Chineke na-atụ anya ka mba ahụ mịpụta mkpụrụ ọma. Onye ya na Aịsaịa dịkọrọ ndụ bụ́ Maịka na-ekwu, sị: “Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ ebere n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?” (Maịka 6:8; Zekaraịa 7:9) Otú ọ dị, mba ahụ egeghị ntị n’agbamume Jehova. “[Chineke] wee lee anya ikpe ziri ezi, ma, lee, mwụsị ọbara; O lere anya ezi omume, ma, lee, iti mkpu.” (Aịsaịa 5:7b) Mosis buru amụma na mba ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi ga-amịpụta mkpụrụ vine na-egbu egbu site “n’osisi vine nke Sọdọm.” (Deuterọnọmi 32:32) Ya bụrụ otú ahụ, o yiri ka mmekọahụ rụrụ arụ, gụnyere idina ụdị onwe, hà so n’ụzọ ndị ha si kpafuo site n’Iwu Chineke. (Levitikọs 18:22) A pụkwara ịsụgharị okwu bụ́ “mwụsị ọbara” ịbụ “ịda iwu.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na mmeso obi ọjọọ dị otú ahụ akpatawo ndị e megburu emegbu “iti mkpu”—iti mkpu nke ruworo Onye Kụrụ ubi vine ahụ ntị.—Tụlee Job 34:28.

15, 16. Olee otú ezi ndị Kraịst pụrụ isi zere ịmịpụta mkpụrụ ọjọọ nke ndị Israel mịpụtara?

15 Jehova Chineke bụ onye “na-ahụ ezi omume na ezi ikpe n’anya.” (Abụ Ọma 33:5) O nyere ndị Juu iwu, sị: “Unu emela ajọ omume n’ikpe: ahụla onye na-enweghị ike ihu ọma, asọpụrụkwala ihu nke onye ukwu: n’ezi omume ka ị ga-ekpe mmadụ ibe gị ikpe.” (Levitikọs 19:15) Ya mere anyị aghaghị izere ile mmadụ anya n’ihu n’otú anyị si emesorịta ibe anyị, ghara ikwe mgbe ọ bụla ka ihe ndị dị ka agbụrụ, afọ ndụ, akụ̀ na ụba, ma ọ bụ ịda ogbenye metụta otú anyị si ele ndị mmadụ anya. (Jemes 2:1-4) Ọ dị mkpa karịsịa ka ndị na-eje ozi n’ọnọdụ nlekọta ‘ghara ime ihe ọ bụla n’ụzọ ịsọ anya,’ na-achọ mgbe nile ịnụta okwu site n’ọnụ ndị okwu gbasara tupu ha emee mkpebi.—1 Timoti 5:21; Ilu 18:13.

16 Ọzọkwa, ọ ga-adị mfe ndị Kraịst bi n’ime ụwa nke na-emebi iwu ịzụlite àgwà dị njọ ma ọ bụ nke nnupụisi n’ebe ụkpụrụ Chineke dị. Ma ezi ndị Kraịst aghaghị ịdị “njikere irube isi” n’iwu Chineke. (Jemes 3:17, NW) N’agbanyeghị mmekọahụ rụrụ arụ na ime ihe ike nke “ajọ usoro ihe a,” ọ dị ha mkpa ịdị ‘na-elezi anya nke ọma otú ha na-ejegharị, ọ bụghị dị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe.’ (Ndị Galetia 1:4; Ndị Efesọs 5:15) Ha kwesịrị izere echiche nke mere otú masịrị gị n’ihe banyere mmekọahụ, mgbe e nwekwara nghọtahie, ha kwesịrị idozi ha n’ejighị “ọnụma na iwe na iti mkpu na nkwulu.” (Ndị Efesọs 4:31) Site n’ịzụlite ezi omume, ezi ndị Kraịst na-ewetara Chineke nsọpụrụ ma na-enweta ihu ọma ya.

Ihe Anyaukwu Na-akpata

17. Olee àgwà ọjọọ ahụhụ nke mbụ nke Aịsaịa katọrọ?

17 N’amaokwu nke 8, Aịsaịa adịkwaghị ehota ihe Jehova kwuru. N’ịkatọ ụfọdụ n’ime “mkpụrụ vine ọhịa” ahụ a mịpụtara na Juda, o kwupụtara n’onwe ya nke mbụ n’ime ahụhụ isii: “Ahụhụ ga-adịrị ndị na-atụkwasị ụlọ n’ụlọ, ndị na-eme ka ubi ruo ubi nso, ruo mgbe ọnọdụ adịghịkwa ọzọ, e wee mee ka nanị unu biri n’etiti ala! Ná ntị m abụọ ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha kwuru, sị, N’ezie ọtụtụ ụlọ ga-aghọ ebe tọgbọrọ n’efu, ọbụna ụlọ ukwu nke bụkwa ezi ụlọ, nke ọ na-adịghị onye ọ bụla na-ebi n’ime ha. N’ihi na ala ubi vine nke mmadụ ga-eji ehi abụọ arụ n’ụbọchị iri ga-ewepụta nanị otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bath nke mmanya vine, ọzọ, otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ homer nke mkpụrụ ọghịgha ga-amị nanị otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ephah.”—Aịsaịa 5:8-10.

18, 19. Olee otú ndị ha na Aịsaịa dịkọrọ ndụ si leghara iwu Jehova banyere ala anya, gịnịkwa ka ọ ga-arụpụtara ha?

18 N’Israel oge ochie ala nile bụ Jehova nwe ha kpam kpam. Ezinụlọ nke ọ bụla nwere ihe nketa nke Chineke nyere ya, nke ha pụrụ inye ná ngo ma ha apụghị ‘ire ya kpam kpam.’ (Levitikọs 25:23) Iwu a gbochiri iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, dị ka otu onye inwekọrọ ala na ụlọ nile. O chebekwara ezinụlọ dị iche iche pụọ n’ịda ogbenye ọnụ ntụ. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị nọ na Juda ji anyaukwu na-emebi iwu Chineke n’ihe banyere ala. Maịka dere, sị: “Ha wee tụkwasị anyaukwu n’ubi, nara ha n’ike; ha tụkwasị anyaukwu n’ụlọ, buru ha: ha emegbuwokwa ma nwoke ma ụlọ ya, bụ́ onye ọ bụla na ala nketa ya.” (Maịka 2:2) Ma Ilu 20:21 na-adọ aka ná ntị, sị: “Ihe nketa nke a na-anara [n’anyaukwu, NW] na mbụ; a gaghị agọzikwa ikpeazụ ya.”

19 Jehova na-ekwe nkwa ịnapụ ndị a dị anyaukwu uru ndị ha nwetara n’ụzọ na-ezighị ezi. Ụlọ ndị ha pụnaara n’ike agaghị enwe “onye ọ bụla na-ebi n’ime ha.” Ala ndị ha na-enwere anyaukwu agaghị emepụta nri otú ha na-emepụtabu. E kwughị kpọmkwem otú na mgbe ọbụbụ ọnụ a ga-emezu. Ma eleghị anya ọ na-ezo aka, ma ọ dịghị ihe ọzọ n’otu akụkụ, n’ọnọdụ ndị ije biri n’ala ọzọ na Babilọn kpatara.—Aịsaịa 27:10.

20. Olee otú ndị Kraịst taa pụrụ isi zere iṅomi àgwà anyaukwu nke ụfọdụ ndị n’Israel gosiri?

20 Ndị Kraịst taa aghaghị ịkpọ oké anyaukwu nke yiri nke ndị Israel ụfọdụ nwere n’oge ahụ asị. (Ilu 27:20) Mgbe e weere ihe onwunwe dị ka ihe dịbigara mkpa ókè, ọ na-adị mfe itinye aka n’ụzọ ọjọọ dịgasị iche iche nke isi nweta ego. A pụrụ ịmata mmadụ n’ọnyà n’ụzọ dị mfe itinye aka n’achụmnta ego ndị a na-enyo enyo ma ọ bụ n’atụmatụ ịba ọgaranya taa na echi ndị ezi uche na-adịghị na ha. “Onye na-anụkpọ onwe ya ịbụ ọgaranya, a gaghị agụ ya n’onye na-emeghị ihe ọjọọ.” (Ilu 28:20) Mgbe ahụ, lee ka o si dị mkpa na anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe anyị nwere!—1 Timoti 6:8.

Ọnyà nke Ntụrụndụ A Na-enyo Enyo

21. Olee mmehie ndị a katọrọ n’ahụhụ nke abụọ nke Aịsaịa?

21 Ahụhụ nke abụọ nke Aịsaịa sochiri: “Ahụhụ ga-adịrị ndị na-ebili n’isi ụtụtụ ịgbaso ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya; ndị na-anọ ogologo mgbe n’anyasị, mmanya vine ewee mee ka ahụ nwuru ha ọkụ. Ụbọ akwara na une na egwú otiti na ọjà na mmanya vine dịkwa n’ọṅụṅụ mmanya vine ha nile: ma ha adịghị elegide ọrụ Jehova anya, ha ahụghịkwa ihe aka Ya abụọ na-eme.”—Aịsaịa 5:11, 12.

22. Enweghị njide onwe onye dị aṅaa pụtara ìhè n’Israel, gịnịkwa ka ọ ga-arụpụtara mba ahụ?

22 Jehova bụ “Chineke obi ụtọ,” ọ dịghịkwa ewute ya ikwe ka ndị ohu ya nwee ntụrụndụ ezi uche dị na ya. (1 Timoti 1:11, NW) Otú ọ dị, ndị a na-achọ nnọọ ihe ụtọ gabiga ókè! “Ndị na-aṅụbigakwa mmanya ókè na-aṅụbiga n’abalị,” ka Bible na-ekwu. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:7) Ma ndị na-eme oriri oké mkpọtụ bụ́ ndị e kwuru maka ha n’amụma ahụ na-amalite ịṅụ mmanya ha n’isi ụtụtụ ma ṅụgide ya ruo mgbede! Ha na-eme omume dị ka a ga-asị na Chineke adịghị, dị ka a ga-asị na ọ gaghị ajụ ha ajụjụ banyere omume ha. Aịsaịa buru amụma na ọdịnihu nke ndị dị otú ahụ ga-adị njọ. “Ndị m ejewo biri n’ala ọzọ, site n’amaghị ama: ndị nsọpụrụ ha bụkwa ndị agụụ na-agụgbu, ìgwè ha bụkwa ndị akpịrị mmiri na-akpọsi nkụ ike.” (Aịsaịa 5:13) N’ihi ịjụ ime ihe dị ka ezi ihe ọmụma si dị, ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ—ndị ukwu na ndị nta—ga-arịda na Sheol.—Gụọ Aịsaịa 5:14-17.

23, 24. Njide onwe onye na imeru ihe n’ókè na gịnị ka a na-akpọ ndị Kraịst òkù ka ha gosi?

23 “Oriri oké mkpọtụ” bụkwa nsogbu nke ndị Kraịst ụfọdụ na narị afọ mbụ nwere. (Ndị Galetia 5:21; Byington; 2 Pita 2:13) Ya mere ọ bụghị ihe ijuanya na ụfọdụ ndị Kraịst taa bụ́ ndị raara onwe ha nye egosiwo enweghị ezi uche mgbe a bịara n’okwu banyere nnọkọ oriri. Iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ a na-akparaghị ókè emewo ka ụfọdụ ndị ghọọ ndị na-eme mkpọtụ na ndị na-ekwu oké okwu. (Ilu 20:1) E nwewokwa ọbụna ụfọdụ ndị mere omume rụrụ arụ mgbe ha ṅụbigara mmanya ókè, e kwewokwa ka nnọkọ oriri ụfọdụ nọgide ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ chi ọbụbọ, na-egbochi ọrụ ndị Kraịst n’echi ya.

24 Otú ọ dị, ndị Kraịst nwere ezi nguzozi na-amịpụta mkpụrụ nke Chineke ma na-enwe njide onwe onye na imeru ihe n’ókè n’ụdị ntụrụndụ ha na-ahọrọ. Ha na-aṅa ntị na ndụmọdụ Pọl nke dị ná Ndị Rom 13:13: “Ka anyị na-ejegharị dị ka o kwesịrị anyị, dị ka n’ehihie; ọ bụghị n’ite egwú na ịṅụbiga mmanya ókè.”

Ịkpọ Mmehie Asị na Ịhụ Eziokwu n’Anya

25, 26. Olee ajọ echiche ndị Israel nwere nke Aịsaịa kpughere n’ahụhụ nke atọ na nke anọ ya?

25 Gee ntị ugbu a n’ahụhụ nke atọ na nke anọ nke Aịsaịa: “Ahụhụ ga-adịrị ndị chịịrị ụdọ ihe efu adọkpụ ajọ omume, ndị jikwa dị ka a ga-asị na ọ bụ ụdọ ụgbọala adọkpụ mmehie: ndị na-asị; Ya mee ngwa, Ya rụọ ọrụ Ya ọsọ ọsọ, ka anyị wee hụ: ka ndụmọdụ nke Onye Nsọ nke Israel ruo anyị nso bịa, ka anyị wee mara. Ahụhụ ga-adịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe, ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ; ndị na-etinye ọchịchịrị n’ọnọdụ ìhè, na ìhè n’ọnọdụ ọchịchịrị; ndị na-etinye ihe ilu n’ọnọdụ ihe ụtọ, na ihe ụtọ n’ọnọdụ ihe ilu!”—Aịsaịa 5:18-20.

26 Lee nkọwa doro anya nke a na-enye banyere ndị na-eme ihe ọjọọ! Ha na-arapara n’ihe ọjọọ otú e si ekedo anụmanụ ndị e ji arụ ọrụ n’ụgbọala. Ndị mmehie a adịghị atụ ụjọ ọ bụla banyere ụbọchị ikpe na-abịanụ. Ha ji ịkwa emo na-asị: “[Chineke] rụọ ọrụ Ya ọsọ ọsọ!” Kama irube isi n’Iwu Chineke, ha na-ahịgharị ihe, na-akpọ ‘ihe ọjọọ ezi ihe, na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ.’—Tụlee Jeremaịa 6:15; 2 Pita 3:3-7.

27. Olee otú ndị Kraịst taa pụrụ isi zere àgwà yiri nke ndị Israel?

27 Ndị Kraịst taa aghaghị izere àgwà dị otú ahụ n’ụzọ nile. Dị ka ihe atụ, ha na-ajụ ịnakwere echiche ụwa bụ́ na ịkwa iko na idina ụdị onwe adịghị njọ. (Ndị Efesọs 4:18, 19) N’eziokwu, onye Kraịst pụrụ ‘iwere nzọụkwụ na-ezighị ezi’ nke pụrụ iduga n’ime mmehie dị oké njọ. (Ndị Galetia 6:1, NW) Ndị okenye nọ n’ọgbakọ dị njikere inyere ndị mehieworonụ ma chọọ enyemaka aka. (Jemes 5:14, 15) Site n’ekpere na ndụmọdụ dabeere na Bible, ọ ga-ekwe omume ịgbake n’ụzọ ime mmụọ. Ma ọ́ bụghị ya, e nwere ihe ize ndụ nke ịghọ “ohu mmehie.” (Jọn 8:34) Kama ịdị na-akwa Chineke emo na ịghọ ndị na-amụkwaghị anya banyere ụbọchị ikpe na-abịanụ, ndị Kraịst na-agbalịsi ike ịnọgide na-abụ “ndị na-enweghị ntụpọ, ndị a na-apụghịkwa ịta ụta” n’ihu Jehova.—2 Pita 3:14; Ndị Galetia 6:7, 8.

28. Mmehie dịgasị aṅaa ka a katọrọ n’ahụhụ ndị ikpeazụ nke Aịsaịa, oleekwa otú ndị Kraịst taa pụrụ isi zere ụdị mmehie ndị ahụ?

28 N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Aịsaịa na-agbakwụnye ahụhụ ikpeazụ ndị a: “Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe n’anya ha onwe ha, ndị na-elekwa onwe ha anya na ha bụ ndị nghọta! Ahụhụ ga-adịrị ndị dike n’ịṅụ mmanya vine, ndị bụkwa dimkpa n’itigwa ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya: ndị na-agụ onye na-emebi iwu n’onye ezi omume n’ihi iri ngo, ha na-ewezụgakwa ezi omume nke onye ezi omume n’ahụ ya!” (Aịsaịa 5:21-23) Ma eleghị anya ọ bụ ndị na-eje ozi dị ka ndị ikpe n’ala ahụ ka a gwara okwu ndị a. Ndị okenye ọgbakọ taa na-ezere iyi “ndị maara ihe n’anya ha onwe ha.” Ha na-eji ịdị umeala n’obi anakwere ịdọ aka ná ntị site n’aka ndị okenye ibe ha ma na-araparasi ike ná ntụziaka ndị nzukọ na-enye. (Ilu 1:5; 1 Ndị Kọrint 14:33) Ha na-emeru ihe n’ókè n’ojiji ha na-eji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe, n’adịghị mgbe ha na-aṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya tupu ha arụwạ ọrụ ọgbakọ. (Hosea 4:11) Ndị okenye na-ezerekwa ọbụna inye echiche nke ile mmadụ anya n’ihu. (Jemes 2:9) Lee ka ha si dị iche ná ndị ụkọchukwu nke Krisendọm! Ọtụtụ n’ime ndị ụkọchukwu a na-ekpuchi ndị a ma ama na ndị bara ọgaranya na-eme mmehie nọ n’etiti ha, n’ụzọ megidere nnọọ ịdọ aka ná ntị ndị Pọl nyere, ndị dị ná Ndị Rom 1:18, 26, 27; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10; nakwa ná Ndị Efesọs 5:3-5.

29. Olee mbibi ọdachi na-echere ubi vine Jehova bụ́ Israel?

29 Aịsaịa mechiri ozi amụma a site n’ịkọwa mbibi ọdachi ga-abịakwasị ndị ‘jụworo iwu Jehova’ ma ghara ịmị mkpụrụ ezi omume. (Aịsaịa 5:24, 25; Hosea 9:16; Malakaị 4:1) Ọ na-ekwu, sị: “[Jehova] wee weliere mba ndị sitere n’ebe dị anya ọkọlọtọ, kpọkọta ya òkù site ná nsọtụ ụwa: ma, lee, ọ na-eme ngwa bịa ọsọ ọsọ.”—Aịsaịa 5:26; Deuterọnọmi 28:49; Jeremaịa 5:15.

30. Ònye ga-akpọkọta otu oké “mba” imegide ndị Jehova, gịnịkwa ga-esi na ya pụta?

30 N’oge ochie osisi e gwunyere n’ebe dị elu pụrụ ịbụ “ọkọlọtọ,” ma ọ bụ ebe izukọta ọnụ, nye ndị mmadụ ma ọ bụ ndị agha. (Tụlee Aịsaịa 18:3; Jeremaịa 51:27.) Ugbu a Jehova n’onwe ya ga-akpọkọta oké “mba” a a na-akpọghị aha imezu ikpe ya.b Ọ ‘ga-akpọkọta ya,’ ya bụ, dọrọ uche ya gaa n’ebe ndị ya na-emebi iwu nọ dị ka ihe kwesịrị mmeri. Onye amụma ahụ kọwaziri mwakpo dị ngwa, nke na-emenyekwa ụjọ, nke ndị mmeri a yiri ọdụm bụ́ ndị ‘ga-ejide anụ ndọgbu,’ ya bụ, mba Chineke, “buru ya laa” ná ndọrọ n’agha ga-eme. (Gụọ Aịsaịa 5:27-30a.) Leekwa ihe ọjọọ ọ ga-arụpụtara ala nke ndị Jehova! “Mmadụ [ga-elegide] ala anya, lee, ọchịchịrị dị; mkpa na ìhè; ọ gbawo ọchịchịrị n’igwe ojii ya nile.”—Aịsaịa 5:30b.

31. Olee otú ezi ndị Kraịst pụrụ isi zere inweta ntaramahụhụ ahụ e nyere ubi vine Jehova bụ́ Israel?

31 Ee, ubi vine ahụ Chineke ji nnọọ ịhụnanya kụọ aghọwo nke na-amịghị mkpụrụ—nke kwesịrị nanị mbibi. Lee ihe mmụta dị ike okwu Aịsaịa bụ nye ndị nile ga-efe Jehova ofufe taa! Ka ha gbalịsie ike ịmị nanị mkpụrụ ezi omume, iji wetara Jehova otuto na maka nzọpụta ha!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ndị ọkà mmụta ụfọdụ kwenyere na ihe owuwu ndị dị ọnụ ala karị, ndị na-adịru nwa oge, dị ka ụlọ ntu, ma ọ bụ ụlọ ahịhịa, bụ nnọọ ihe a na-ewukebe karịa ụlọ elu ndị e ji nkume wuo. (Aịsaịa 1:8) Ọdịdị ụlọ elu dị n’ebe a ga-egosi na onye nwe ya etinyewo mgbalị a na-adịghị ahụkebe maka “ubi vine” ya.

b N’amụma ndị ọzọ, Aịsaịa mere ka a mata Babilọn dị ka mba ahụ nke mezuru ikpe mbibi nke Jehova n’ahụ Juda.

[Foto dị na peeji nke 83]

Onye mmehie na-arapara n’ihe ọjọọ otú e si ekedo anụmanụ ndị e ji arụ ọrụ n’ụgbọala

[Foto dị na peeji nke 85]

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya