Ndụ na Ije Ozi Jisọs
E Kpughere Ha site n’lhe Atụ Ndị Metụtara Ubi Vine
JISỌS nọ n’ụlọ nsọ ahụ. Ọ ka kwusịrị nnọọ ihe tụrụ ndị ndú okpukpe ahụ n’anya, bụ́ ndị chọrọ ịmata onye o ji ikike ya na-eme ihe. Tupu ha esi ná mgbagwoju anya ha pụta, Jisọs jụrụ, sị: “Ma gịnị bụ uche unu?” Mgbe ahụ, site n’ịkọrọ ha otu ihe atụ, o gosiri ha ụdị ndị ha bụ n’ezie.
“Otu nwoke nwere ụmụ abụọ;” ka Jisọs kọrọ. “O wee bịakwute nke mbụ, sị, Nwa, jee rụọ ọrụ taa n’ubi vine nke m. Ma ọ zara, sị, Achọghị m ije: ma e mesịa ọ kwaa ụta, wee jee. O wee bịakwute nke abụọ, kwuo otú ahụ. O wee zaa, sị, Mụ onwe m ga-eje, Onyenwe anyị: ma o jeghị. Ònye n’ime ha abụọ mere ihe nna ya chọrọ?” ka Jisọs jụrụ.
“Onye mbụ,” ka ndị ahụ na-emegide ya zaghachiri.
Ya mere Jisọs kọwara, sị: “N’ezie asị m unu, na ndị ọna ụtụ na ndị inyom nke na-akwa iko na-ebu unu ụzọ aba n’alaeze Chineke.” Nke a pụtara na ndị ọna ụtụ na ndị inyom na-akwa iko bu ụzọ jụ ijere Chineke ozi. Ma mgbe e mesịrị, dị ka nwa nke mbụ ahụ, ha kwara ụta wee jeere ya ozi. N’aka nke ọzọ, ndị ndú okpukpe, dị ka nwa nke abụọ ahụ, kwuru na ha na-ejere Chineke ozi, ma dị ka Jisọs mere ka ọ pụta ìhè: “Jọn [Onye na-eme baptism] bịakwutere unu n’ụzọ ezi omume, ma unu ekweghị ya: ma ndị ọna ụtụ na ndị inyom nke na-akwa iko kweere ya: Ma mgbe unu hụrụ ya, unu onwe unu akwaghị ụta ọbụna emesịa, ka unu wee kwere ya.”
Jisọs gara n’ihu igosi na ọdịda nke ndị ndú okpukpe ndị a abụghị nanị n’ilefuru ijere Chineke ozi anya. Ee e, ha bụ n’ezie ndị ọjọọ, bụ́ ndị ajọ omume. “Otu nwoke dị, bụ́ nna nwe ụlọ,” ka Jisọs kọrọ, “onye kụrụ ubi vine, gbaa ya ogige gburugburu, gwuokwa ebe nzọcha mkpụrụ vine n’ime ya, wuokwa ụlọ elu, werekwa ya tinye n’aka ndị ọrụ ubi, wee jee ala ọzọ. Ma mgbe oge mkpụrụ ruru nso, o zigara ndị ohu ya jekwuru ndị ọrụ ubi ahụ, ịnata mkpụrụ ya. Ndị ọrụ ubi ahụ wee jide ndị ohu ya, pịa otu onye ihe, gbuokwa nke ọzọ, tụọkwa nke ọzọ nkume. Ọzọ, o zigara ndị ohu ọzọ dị ọtụtụ karị ndị mbụ: ha wee meekwa ha otú ahụ.”
“Ndị ohu” ndị ahụ bụ ndị amụma nke “nna nwe ụlọ,” bụ́ Jehova Chineke, zigaara “ndị ọrụ ubi” nke “ubi vine” ya. Ndị ọrụ ubi ndị a bụ ndị nnọchianya bụ isi nke mba Israel, bụ́ mba Bible mere ka a mata dị ka “ubi vine” nke Chineke.
Ebe ọ bụ na “ndị ọrụ ubi” ndị ahụ mesoro “ndị ohu” ndị ahụ omume ọjọọ ma gbuokwa ha, Jisọs kọwara, sị: “Ma e mesịa [onye ahụ nwe ubi vine] zigaara ha ọkpara ya, sị, Ha ga-asọpụrụ ọkpara m. Ma ndị ọrụ ubi ahụ, mgbe ha hụrụ ọkpara ahụ, ha sịrịta onwe ha, Nke a bụ onye nketa; bịanụ, ka anyị gbuo ya, nwerekwa ihe nketa ya. Ha wee jide ya, tupu ya n’azụ ubi vine ahụ, gbuo ya.”
Ugbu a, n’ịgwa ndị ndú okpukpe ahụ okwu, Jisọs jụrụ, sị: “Mgbe ọ bụla onyenwe ubi vine ahụ ga-abịa, gịnị ka ọ ga-eme ndị ọrụ ubi ahụ?”
“Ọ ga-ala ndị ọjọọ ahụ n’iyi n’ụzọ jọrọ njọ,” ka ha zaghachiri, “ọ ga-ewerekwa ubi vine ya tinye n’aka ndị ọrụ ubi ọzọ, ndị ga-enyeghachi ya mkpụrụ ya n’oge ha.”
Ndị ndú okpukpe ndị ahụ si otú a kwupụta ikpe ọmụma n’isi onwe ha n’amaghị ama, ebe ha so ná ndị Israel bụ “ndị ọrụ ubi” nke mba “ubi vine” Jehova ahụ bụ Israel. Mkpụrụ Jehova na-atụ anya ya site n’aka ndị ọrụ ubi dị otú ahụ bụ okwukwe n’Ọkpara ya bụ ezi Mesaịa ahụ. N’ihi ọdịda ha dara n’ịmịpụta mkpụrụ dị otú ahụ, Jisọs dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Ọ́ dịghị mgbe ọ bụla unu gụrụ n’ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ [n’Abụ Ọma 118:22, 23], Nkume nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ, nke ahụ ka e mere isi nkuku ụlọ: ọ bụ n’aka [Jehova, NW] ka nke a sitere, ọ bụkwa oké ọrụ n’anya anyị? N’ihi nke a ka m ji sị unu, A ga-anara unu alaeze Chineke, wee nye mba ọzọ nke na-amị mkpụrụ ya. A ga-etiwasịkwa onye dakwasịrị nkume a: ma onye ọ bụla ọ ga-adakwasị, ọ ga-efesa ya dị ka ájá.”
Ndị odeakwụkwọ na ndị isi nchụaja matara ugbu a na Jisọs na-ekwu okwu banyere ha, ha wee chọọ igbu ya, bụ́ ezi “onye nketa” ahụ. Ya mere, dị ka otu mba, a gaje ịnapụ ha ihe ùgwù nke ịbụ ndị na-achị achị n’Alaeze Chineke, a gajekwa iguzobe mba ọhụrụ nke ‘ndị na-arụ ọrụ n’ubi vine,’ bụ́ nke ga-amịpụta mkpụrụ kwesịrị ekwesị.
N’ihi na ndị ndú okpukpe ndị ahụ na-atụ egwu ìgwè mmadụ, bụ́ ndị weere Jisọs dị ka onye amụma, ha anwaghị igbu ya n’oge nke a. Matiu 21:28-46; Mak 12:1-12; Luk 20:9-19; Aịsaịa 5:1-7.
◆ Òle ndị ka ụmụ abụọ ahụ dị n’ihe atụ mbụ ahụ Jisọs nyere nọchiri anya ha?
◆ Olee ndị e sere onyinyo ha site ná “nna nwe ụlọ,” “ubi vine” ahụ, “ndị ọrụ ubi,” “ndị ohu,” na “onye nketa” ahụ dị n’ihe atụ nke abụọ?
◆ Gịnị ga-eme ‘ndị ọrụ ubi vine’ ahụ, oleekwa ndị ga-ewere ọnọdụ ha?