Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gt isi 123
  • “Lee, Nwoke Ahụ!”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Lee, Nwoke Ahụ!”
  • Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Lee, Nwoke Ahụ!”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Paịlet Agwa Ndị Juu, Sị: “Lee Nwoke Ahụ!”
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ònye Bụ Pọntiọs Paịlet?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Site n’Ihu Paịlat Jee na nke Herọd, Lọghachikwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
gt isi 123

Isi 123

“Lee, Nwoke Ahụ!”

N’ỊBỤ onye otú Jisọs si mee omume masịrị, n’ịmatakwa na ọ bụ onye ikpe na-amaghị, Paịlet chọrọ ụzọ ọzọ ọ ga-esi tọhapụ ya. Ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ, sị, “Unu nwere omenala, ka m hapụrụ unu otu onye n’ememe ngabiga.”

E jikwa Barabas eji, bụ́ onye ogbu mmadụ a ma ama dị ka onye mkpọrọ, ya mere Paịlet jụrụ, sị: “Ònye ka unu na-achọ ka m hapụrụ unu? Barabas, ma ọ bụ Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?”

N’ịbụ ndị ndị isi nchụàjà ahụ rụgidere, bụ́ ndị kpaliworo ha, ndị ahụ rịọrọ ka a tọhapụ Barabas ma gbuo Jisọs. N’ekwenyeghịrị ha ngwa ngwa, Paịlet zaghachiri, na-ajụ ọzọ, sị: “Ònye n’ime mmadụ abụọ ahụ ka unu na-achọ ka m hapụrụ unu?”

Ha tiri mkpu, sị, “Barabas.”

Paịlet ji iwe jụọ ha, sị, “Ọ̀ bụ gịnị ka m ga-emekwa Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?”

Ha ji oké iti mkpu zaghachi n’otu olu, sị: “Ka a kpọgbuo ya!” “Kpọgbuo! Kpọgbuo ya!”​—⁠NW.

N’ịmata na ha na-achọ ka e gbuo onye na-emeghị ihe ọjọọ ọ bụla, Paịlet jụrụ ha, sị: “Ee e, n’ihi na onye a mere ihe ọjọọ gịnị? Ahụghị m ihe kwesịrị ịnwụ anwụ n’ahụ ya: ya mere m ga-adọ ya aka ná ntị, wee hapụ ya.”

N’agbanyeghị mgbalị ya nile, ìgwè mmadụ ahụ a kpasuworo iwe, n’ịbụ ndị ndị ndú okpukpe ha kpaliri, nọgidere na-eti mkpu, sị: “Ka a kpọgbuo ya!” N’ịbụ ndị ndị nchụàjà ahụ kpalibigara ókè, ìgwè mmadụ ahụ chọrọ ọbara. Cheedị nnọọ echiche, nanị ụbọchị ise tupu mgbe ahụ, ma eleghị anya ụfọdụ n’ime ha so ná ndị ahụ nabatara Jisọs na Jerusalem dị ka Eze! N’ime oge ahụ nile, ndị na-eso ụzọ Jisọs, ọ bụrụ na ha nọ n’ebe ahụ, nọ n’ekwughị okwu ọ bụla, na otú a na-agaghị esi hụ ha.

Paịlet, mgbe ọ hụrụ na arịrịọ nile ọ na-arịọ adịghị arụpụta ezi ihe ọ bụla, kama nke ahụ, na oké iti mkpu na-ebilite, o weere mmiri wee kwọọ aka ya abụọ n’ihu ìgwè mmadụ ahụ wee sị: “Ikpe ọbara onye ezi omume a amaghị m: unu onwe unu lee nke ahụ.” Mgbe o kwuru nke ahụ, ìgwè mmadụ ahụ wee zaa, sị: “Ọbara ya dị anyị n’isi, dịkwa n’isi ụmụ anyị.”

Ya mere, n’imere ha ihe ha chọrọ​—⁠n’ịchọkwa ime ihe ga-atọ ìgwè mmadụ ahụ ụtọ karịa ime ihe ọ maara na o ziri ezi​—⁠Paịlet tọhapụụrụ ha Barabas. Ọ kpọọrọ Jisọs, mee ka e yipụsịa ya uwe ma pịa ya ụtarị. Nke a abụghị ịpịa ụtarị nkịtị. Akwụkwọ bụ The Journal of the American Medical Association na-akọwa ihe omume ndị Rom nke ịpịa ụtarị, sị:

“Ihe a na-ejikarị eme ihe bụ ụtarị dị mkpirikpi (flagrum ma ọ bụ flagellum) nke nwere ọtụtụ eriri akpụkpọ anụ nọ otu otu ma ọ bụ a kpara akpa nke ịdị ogologo ha dị iche iche, bụ́ ndị e kenyesịrị mkpụrụ ihe ígwè ma ọ bụ iberibe ọkpụkpụ atụrụ ndị dị nkọ n’ebe dị iche iche. . . . Ka ndị agha Rom na-eji ike ha nile na-apịa mmadụ ihe ahụ n’azụ ugboro ugboro, mkpụrụ ihe ígwè ndị ahụ na-akpata mmerụahụ dịgasị omimi, eriri akpụkpọ anụ na ọkpụkpụ atụrụ ndị ahụ ga-akawasịkwa akpụkpọ ahụ onye ahụ ma kabanye n’ime ahụ. Mgbe ahụ, ka ịpịa ụtarị ahụ na-aga n’ihu, mmerụahụ ndị ahụ ga-abanye n’ime uru ahụ ndị dị n’okpuru akpụkpọ ahụ wee na-adọkapụtasị iberibe anụ ahụ ndị na-agba ọbara.”

Mgbe e tisịrị ya ihe n’ụzọ jọgburu onwe ya otú a, ha kpọọrọ Jisọs banye n’obíeze onye ọchịchị ahụ, a kpọkọtakwara ìgwè ndị agha nile. N’ebe ahụ, ndị agha kwara ya emo gaa n’ihu site n’ịkpa otu okpueze e ji ogwu mee wee kpukwasị ya n’isi. Ha tinyere otu amị́ n’aka nri ya, wee yikwasị ya uwe odo odo, bụ́ ụdị ahụ ndị eze na-eyi. Ha wee malite ịgwa ya n’ụzọ ịkwa emo, sị: “Ekele, Eze ndị Juu!” Ha bụsakwara ya ọnụ mmiri wee tie ya ihe n’ihu. N’ịnapụ ya amị́ ahụ siri ike n’aka, ha ji ya tie ya ihe n’isi, na-akụmikwu ogwu ndị ahụ na-adụ adụ nke “okpueze” ahụ e ji na-eweda ya n’ala.

Ịdị ùgwù na ike dị ịrịba ama nke Jisọs nwere n’agbanyeghị mmeso ọjọọ nke a kpaliri Paịlet nke ukwuu nke na o mere mgbalị ọzọ ịnapụta ya. Ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ, sị, “Lee, ana m ekupụta ya n’èzí nye unu, ka unu wee mara na ahụghị m ihe kwesịrị ahụhụ mmehie n’ime ya.” Ma eleghị anya o chere na ịhụ Jisọs mgbe ọ nọ n’ọnọdụ ịta ahụhụ ga-emeda obi ha. Ka Jisọs na-eguzo n’ihu ìgwè mmadụ ahụ obi tara mmiri, na-eyi okpueze ahụ e ji ogwu mee na uwe odo odo ahụ, na ihu ọbara na-agba nke na-egosikwa ịta ahụhụ nke ihe mgbu, Paịlet kwupụtara, sị: “Lee, Nwoke ahụ!”

Ọ bụ ezie na e merụsịwo ya ahụ nke ukwuu, n’ebe a ka onye kasị pụta ìhè n’akụkọ ihe mere eme nile na-eguzo, n’ezie nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ mgbe ọ bụla! Ee, Jisọs gosiri ịdị ùgwù na ịdị nwayọọ nke na-egosipụta ịdị ukwuu nke ọbụna Paịlet na-aghaghị ịnakwere, n’ihi na o yiri ka okwu ya ọ̀ bụ ngwakọta nke ma nsọpụrụ ma obi ebere. Jọn 18:⁠39–19:⁠5; Matiu 27:​15-17, 20-30; Mak 15:​6-19; Luk 23:​18-⁠25.

▪ N’ụzọ dị aṅaa ka Paịlet si nwaa ime ka a tọhapụ Jisọs?

▪ Olee ụzọ Paịlet si gbalịa ịgbụrụ isi ya?

▪ Gịnị ka ịbụ onye a pịara ụtarị gụnyere?

▪ Olee ụzọ e si kwaa Jisọs emo mgbe a pịasịrị ya ụtarị?

▪ Mgbalị ọzọ dị aṅaa ka Paịlet mere ịtọhapụ Jisọs?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya