Echiche ahụ Abanye n’Okpukpe Ebe Ọwụwa Anyanwụ
“Ana m echebu mgbe nile na anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi bụ eziokwu zuru ụwa dum nke onye ọ bụla nakweere. N’ihi ya o juru m nnọọ anya ịmata na ụfọdụ ndị ụbụrụ ha na-aghọ nkọ si ma n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ma n’Ebe Ọdịda Anyanwụ arụsiwo ụka ike megide nkwenkwe ahụ. Ugbu a ọ na-eju m anya otú ndị Hindu si bịa nwee echiche anwụghị anwụ.”—NWA AKWỤKWỌ MAHADUM BỤ́ ONYE A ZỤLITERE DỊ KA ONYE HINDU.
1. N’ihi gịnị ka ịma banyere mmalite na mgbasa nke ozizi anwụghị anwụ nke mmadụ n’okpukpe dị iche iche ga-eji amasị anyị?
OLEE otú echiche nke na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ si banye n’okpukpe Hindu na n’okpukpe Ebe Ọwụwa Anyanwụ ndị ọzọ? Ajụjụ ahụ na-adọrọ mmasị ọbụna nye ndị nọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha amaghị banyere okpukpe ndị a, ebe ọ bụ na nkwenkwe ahụ na-emetụta echiche onye ọ bụla banyere ọdịnihu. N’ihi na nkụzi anwụghị anwụ nke mmadụ bụ nke ihe ka n’ọtụtụ okpukpe na-akụzi taa, ịmata otú echiche ahụ si malite pụrụ ịkwalite nghọta na nkwurịta okwu ka mma n’ezie.
2. N’ihi gịnị ka India jiworo bụrụ isi iyi a ma ama nke ihe metụtara okpukpe n’Esia?
2 Ninian Smart, bụ́ prọfesọ nke ihe ọmụmụ okpukpe na Mahadum Lancaster na Britain, na-ekwu, sị: “India abụrụwo ebe kasị mkpa e nwere mmetụta okpukpe n’Esia. Nke a abụghị nanị n’ihi na ọtụtụ okpukpe malitere kpọmkwem n’India—okpukpe Hindu, okpukpe Buddha, okpukpe Jain, okpukpe Sikh, na ndị ọzọ—kama n’ihi na otu n’ime ndị a, okpukpe Buddha, nwere nnukwu mmetụta n’ọdịbendị nke ihe fọrọ nta ka ọ bụrụ Ebe Ọwụwa Anyanwụ Esia dum.” Ọtụtụ ọdịbendị e metụtara n’ụzọ dị otú a “ka na-ele India anya dị ka obodo ha n’ụzọ ime mmụọ,” ka ọkà mmụta onye Hindu, bụ́ Nikhilananda, na-ekwu. Mgbe ahụ, olee otú nkụzi a nke anwụghị anwụ si banye n’India na n’akụkụ Esia ndị ọzọ?
Nkụzi Okpukpe Hindu Banyere Ịlọ Ụwa
3. Dị ka otu ọkọ akụkọ ihe mere eme si kwuo, site n’aka ole ndị ka o yiri ka echiche nke mkpụrụ obi isi n’otu ebe aga ebe ọzọ si gaa India?
3 Na narị afọ nke isii T.O.A., ka Pythagoras na ụmụazụ ya nọ na Gris na-akwado ozizi nke mkpụrụ obi isi n’otu ebe gaa ebe ọzọ, ndị nkụzi Hindu bi n’akụkụ osimiri Indus na Ganges n’India nọ na-ewulite otu echiche ahụ. Mpụtakọ nkwenkwe a “n’ọha mmadụ ndị Gris na India apụghị ịbụ ná ndabakọ ma ọlị,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Arnold Toynbee, na-ekwu. “Otu ihe pụrụ ịbụ isi iyi [nke mmetụta],” ka Toynbee na-akọwapụta, bụ “ndị na-eme nkwagharị nke Europe na Esia, bụ́ ndị na narị afọ nke 8 na nke 7 T.O.A., gbadatara India, Ndịda Ebe Ọdịda Anyanwụ Esia, ala osisi na-adịghị n’ebe ugwu ikpere mmiri nke Osimiri Ojii, na ebe ala dịịrị banye na mmiri nke Balkan na Anatolia.” O doro anya na ndị nkwagharị ahụ nke agbụrụ Europe na Esia wetara echiche nke mkpụrụ obi isi n’otu ebe aga ebe ọzọ n’India.
4. N’ihi gịnị ka echiche nke mkpụrụ obi isi n’otu ebe aga ebe ọzọ jiri masị ndị nkụzi Hindu?
4 Okpukpe Hindu amaliteworị n’India n’oge bu nnọọ ụzọ site n’ọbịbịa ndị Aryan n’ihe dị ka 1500 T.O.A. Site nnọọ ná mmalite, okpukpe Hindu kweere na mkpụrụ obi dị iche n’ahụ, nakwa na mkpụrụ obi na-adị ndụ ma a nwụsịa. N’ihi nke a, ndị Hindu fere ndị nna ochie ofufe, na-edosakwara mkpụrụ obi ndị ha nwụrụ anwụ ihe oriri ka ha rie. Ka ọtụtụ narị afọ gasịrị mgbe echiche mkpụrụ obi isi n’otu ebe aga ebe ọzọ rutere India, ọ ghaghị ịmasịworị ndị nkụzi Hindu bụ́ ndị ha na nsogbu nke ihe ọjọọ na ahụhụ zuru ụwa ọnụ n’etiti ụmụ mmadụ nọ na-agba mgba. N’ijikọta nke a na ihe a kpọrọ iwu nke Karma, iwu nke ihe kpatara ihe na ihe ọ rụpụtara, ndị nkụzi Hindu wulitere ozizi nke ịlọ ụwa nke pụtara na a na-akwụghachi ihe ọma e mere ma ọ bụ ihe ọjọọ e mere n’otu oge ndụ ka a na-enye ụgwọ ọrụ ma ọ bụ ntaramahụhụ ná ndụ ọzọ.
5. Dị ka okpukpe Hindu si akụzi, gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ kasịnụ nke mkpụrụ obi?
5 Ma ọ dị otu echiche ọzọ nke metụtara nkụzi okpukpe Hindu banyere mkpụrụ obi. “O yiri ka ọ bụ eziokwu na kpọmkwem mgbe a malitere ozizi nke mkpụrụ obi isi n’otu ebe aga ebe ọzọ na nke karma, ma ọ bụ ọbụna tupu mgbe ahụ,” ka akwụkwọ bụ́ Encyclopædia of Religion and Ethics na-ekwu, “echiche ọzọ . . . ji nwayọọ nwayọọ na-ebilite n’etiti ndị nwere ọgụgụ isi n’Ebe Ugwu India—echiche nkà ihe ọmụma nke Brahman-Ātman [Brahman kasị elu ma na-adịru ebighị ebi, bụ́ onye dị adị n’ụzọ kasịnụ].” E jikọtara echiche a na ozizi nke ịlọ ụwa iji kọwaa ihe mgbaru ọsọ kasịnụ nke ndị Hindu—ntọhapụ pụọ n’usoro nke isi n’otu ebe aga ebe ọzọ iji bụrụ onye nwere ịdị adị kasịnụ. Nke a, ka ndị Hindu kwere na a na-enweta site n’ịgbalị inwe àgwà ọha mmadụ na-anakwere na inwe ihe ọmụma pụrụ iche nke Hindu.
6, 7. Gịnị bụ nkwenkwe nke okpukpe Hindu nke oge a banyere Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?
6 Ndị amamihe Hindu si otú a kpụzie echiche nke mkpụrụ obi isi n’otu ebe aga ebe ọzọ ịbụ nkwenkwe nke ịlọ ụwa site n’ijikọta ya na iwu nke Karma na nchepụta nke Brahman. Octavio Paz, onye na-ede uri nwetara Onyinye Nobel, onye bụbukwa onye nnọchiteanya Mexico n’India, na-ede, sị: “Ka okpukpe Hindu gbasara, otú a ka otu echiche gbasara . . . bụ́ nke dị oké mkpa nye okpukpe Brahman, okpukpe Buddha, na okpukpe Esia ndị ọzọ: nke bụ́ mkpụrụ obi isi n’otu ịdị adị gafee n’ịdị adị ndị na-esochi ibe ha.”
7 Ozizi ịlọ ụwa bụ isi sekpụ ntị nke okpukpe Hindu oge a. Onye ọkà ihe ọmụma Hindu bụ́ Nikhilananda na-ekwu, sị: “Na inweta anwụghị anwụ abụghị ihe ùgwù dịịrị nanị mmadụ ole na ole a họpụtara ahọpụta, kama ihe ruuru mmadụ nile site n’ọmụmụ, bụ ihe ezi onye Hindu ọ bụla kwenyesiri ike na ya.”
Usoro nke Mmụghachi n’Okpukpe Buddha
8-10. (a) Olee otú okpukpe Buddha si akọwa ịdị adị? (b) Olee otú otu ọkà mmụta Buddha si akọwa mmụghachi?
8 E guzobere okpukpe Buddha n’India n’ihe dị ka 500 T.O.A. Dị ka ọdịnala ndị Buddha si kọọ, ọ bụ onye India bụ́ nwa eze aha ya bụ Siddhārtha Gautama, bụ́ onye e mesịrị mara dị ka Buddha mgbe o nwesịịrị onwe ya, guzobere okpukpe Buddha. Ebe o si n’okpukpe Hindu malite, nkụzi ya yiri nke okpukpe Hindu n’ụzọ ụfọdụ. Dị ka okpukpe Buddha si akụzi, ịdị adị bụ usoro na-aga n’ihu nke mmụghachi na ọnwụ, dị ka ọ dịkwa n’okpukpe Hindu, ihe mmadụ mere ná ndụ ya gara aga na-ekpebi ọnọdụ ya ná ndụ ọ dị ugbu a.
9 Ma okpukpe Buddha adịghị akọwa ịdị adị n’ụdị nke mkpụrụ obi mmadụ nke na-adị ndụ mgbe a nwụsịrị. “[Buddha] hụrụ n’ime mmadụ nanị usoro ọnọdụ uche na-apụ n’anya ndị na-adịghị adịgide adịgide, ndị ọ bụ nanị ọchịchọ jikọtara ha,” ka Arnold Toynbee na-ekwu. Otú ọ dị, Buddha kweere na ọ dị ihe—ọnọdụ ma ọ bụ ikike ụfọdụ—a na-ebufe site n’otu ndụ gaa n’ọzọ. Dr. Walpola Rahula, onye Buddha bụ́ ọkà mmụta, na-akọwa:
10 “Mmadụ abụghị ihe ọ bụla karịa njikọta nke ikike anụ ahụ na nke uche ma ọ bụ ume ọrụ. Ihe anyị na-akpọ ọnwụ bụ anụ ahụ ịkwụsị ịrụ ọrụ kpam kpam. Ikike na ume ọrụ a nile hà na-esokwu ahụ kwụsị ịrụ ọrụ? Okpukpe Buddha na-asị ‘Ee e.’ Ọchịchọ, agụụ ịdị adị, ịdịgide ndụ, ịnọgide na-adịghachi, bụ nnukwu ikike nke na-akwali ndụ dum, ịdị adị dum, nke na-akwali ọbụna ụwa dum. Nke a bụ ikike kasịnụ, ume ọrụ kasịnụ n’ụwa. Dị ka okpukpe Buddha si akụzi, ikike a adịghị akwụsị mgbe ahụ kwụsịrị ịrụ ọrụ, nke bụ n’ọnwụ; kama ọ na-anọgide na-egosi onwe ya n’ụdị ọzọ, na-akpata ndịghachi ndụ nke a na-akpọ mmụghachi.”
11. Gịnị bụ echiche ndị Buddha banyere Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?
11 Echiche onye Buddha banyere Ndụ Mgbe A Nwụsịrị bụ nke a: Ịdị adị na-adịru ebighị ebi ọ gwụla ma onye ahụ o ruru ihe mgbaru ọsọ ikpeazụ bụ́ Nirvana, bụ́ ntọhapụ pụọ n’usoro mmụghachi. Nirvana abụghị ọnọdụ nke ọṅụ ebighị ebi nke o ji abụ nke onye nwere ịdị adị kasịnụ. Ọ bụ nanị ọnọdụ nke adịghị adị—“ebe ọnwụ na-adịghị” nke karịrị ịdị adị mmadụ. Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary na-akọwa “Nirvana” dị ka “ebe ma ọ bụ ọnọdụ na-enweghị nlekọta, ihe mgbu, ma ọ bụ ịdị adị elu ahụ.” Kama ịchọ anwụghị anwụ, a na-agba ndị Buddha ume ịgabiga ya site n’iru Nirvana.
12-14. Olee otú ụdị dị iche iche nke okpukpe Buddha si enye echiche nke anwụghị anwụ?
12 Ka ọ na-agbasaru ọtụtụ ebe n’Esia, okpukpe Buddha gbanwere nkụzi ya iji nabata nkwenkwe ndị obodo. Dị ka ihe atụ, okpukpe Buddha nke Mahayana, ụdị nke a kasị ekpe na China na Japan, kweere na bodhisattva ndị nọ n’eluigwe, ma ọ bụ na Buddha ndị a ga-enwe n’ọdịnihu. Bodhisattva ndị a na-eyigharị ịga Nirvana ha ruo ọtụtụ mmụghachi iji jeere ndị ọzọ ozi ma nyere ha aka irute ya. Ya mere mmadụ pụrụ ịhọrọ ịnọgide n’usoro mmụghachi ọbụna mgbe o rusịrị Nirvana.
13 Mgbanwe ọzọ nke nwere mmetụta karịsịa na China na Japan bụ ozizi nke Ala Dị Ọcha nke Ebe Ọdịda Anyanwụ, nke Buddha Amitabha ma ọ bụ Amida chepụtara. A na-amụghachi ndị ji okwukwe akpọku aha Buddha gaa n’Ala Dị Ọcha ahụ, ma ọ bụ paradaịs, bụ́ ebe ọnọdụ na-aka mma maka inweta nnwere onwe ikpeazụ. Gịnị siworo ná nkụzi a pụta? Prọfesọ Smart, a kpọtụrụ aha na mbụ, na-akọwa, sị: “Dị ka a purụ ịtụ anya ya, ịdị ebube nke paradaịs, nke a kọwara nke ọma n’ụfọdụ akwụkwọ nsọ nke Mahayana, nọchịrị anya nirvana n’echiche a ma ama dị ka ihe mgbaru ọsọ kasịnụ.”
14 Okpukpe Buddha nke Tibet na-ejikọta nkwenkwe obodo ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ nke Tibet banyere ndị nwụrụ anwụ na-akọwa akara aka nke onye nọ n’agbata ọnọdụ abụọ tupu a mụgharịa ya. A na-ekwu na a na-eche ndị nwụrụ anwụ n’ihu ìhè na-enwu gbaa nke ịdị adị kasịnụ, ndị na-enweghịkwa ike ịnagide ìhè ahụ adịghị enweta ntọhapụ kama a na-amụgharị ha. N’ụzọ doro anya, okpukpe Buddha n’ụdị ya dị iche iche na-enye echiche nke anwụghị anwụ.
Ofufe Ndị Nna Ochie na Shinto nke Japan
15-17. (a) Olee otú ife mmụọ ndị nna ochie ofufe si malite na Shinto? (b) Olee otú nkwenkwe anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi si dị Shinto oké mkpa?
15 Okpukpe dị adị na Japan tupu ọbịbịa okpukpe Buddha na narị afọ nke isii O.A. Ọ bụ okpukpe na-enweghị aha, ihe mejupụtakwara ya bụ nkwenkwe ndị metụtara omume na omenala ndị obodo ahụ. Otú ọ dị, n’ihi mwebata nke okpukpe Buddha, e nwere mkpa igosi ọdịiche dị n’etiti okpukpe Japan na nke si esi bịa. N’ihi ya kwa aha ahụ bụ́ “Shinto,” nke pụtara “ụzọ nke ndị bụ chi,” malitere.
16 Gịnị bụ nkwenkwe ndị Shinto mbụ nwere banyere Ndụ Mgbe A Nwụsịrị? Mgbe a malitere ịkọ osikapa n’ala mmiri, “ọrụ ubi n’ala mmiri mere ka ógbè ndị a haziri ahazi, kwụkwa chịm dị mkpa,” ka Kodansha Encyclopedia of Japan, na-akọwa “a malitekwara ememe ọrụ ubi—nke mesịrị kere òkè dị mkpa na Shintō.” Ịtụ mkpụrụ obi ndị nwụrụ anwụ egwu dugara ndị mgbe ochie a n’ichepụta ememe ndị e ji eme ka obi dajụọ ha. Nke a mesịrị ghọọ ife mmụọ ndị nna ochie ofufe.
17 Dị ka nkwenkwe Shinto si dị, mkpụrụ obi “pụrụ apụ” ka nwere ọdịdị ya kama e merụwo ya n’ihi ọnwụ. Mgbe ndị mmadụ nwụnahụrụ na-eme ememe akwamozu, a na-eme ka mkpụrụ obi dị ọcha ruo n’ọnọdụ nke iwepụ obi ọjọọ dum, ọ na-enwekwa àgwà udo na ebere. Ka oge na-aga, mmụọ nna ochie ahụ na-arịgoru n’ọkwá nke ịbụ nna ochie bụ́ chi, ma ọ bụ onye nlekọta. Ka ya na okpukpe Buddha dịrị n’otu oge, Shinto weere nkụzi ụfọdụ nke Buddha, gụnyere ozizi nke paradaịs. N’ihi ya, anyị chọpụtara na nkwenkwe anwụghị anwụ dị Shinto oké mkpa.
Anwụghị Anwụ n’Okpukpe Tao, Ofufe Ndị Nna Ochie n’Okpukpe Confucius
18. Gịnị bụ echiche onye Tao banyere anwụghị anwụ?
18 Ọ bụ Lao-tzu, bụ́ onye e kwuru na o biri na China na narị afọ nke isii T.O.A., guzobere okpukpe Tao. Ihe mgbaru ọsọ ná ndụ, dị ka okpukpe Tao si akụzi, bụ ime ka ihe mmadụ na-eme kwekọọ na Tao—ụzọ sitere n’okike. A pụrụ ịchịkọta echiche onye Tao banyere anwụghị anwụ n’ụzọ a: Tao bụ ụkpụrụ na-achị eluigwe na ala. Tao enweghị mmalite na ọgwụgwụ. Site n’ibi ndụ dị ka Tao, mmadụ na-ekere òkè na ya wee dịruo ebighị ebi.
19-21. Ịkọ nkọ onye Tao dugara ná mgbalị ndị dị aṅaa?
19 Ná mgbalị ha ime ka ha na ihe si n’okike dị n’otu, ka oge na-aga ndị Tao malitere inwe mmasị karịsịa n’agwụghị agwụ na ikike mgbake ya. Ha kọrọ nkọ na ikekwe site n’ibi ndụ dị ka Tao, ma ọ bụ ụzọ nke okike, mmadụ pụrụ ịchọpụta n’ụzọ ụfọdụ ihe nzuzo nke okike ma bụrụ onye mmerụ ahụ, ọrịa, na ọbụna ọnwụ na-apụghị imetụta.
20 Ndị Tao malitere ịnwale ntụgharị uche, mmega ahụ iku ume, na ịkpara ihe ha na-eri ókè, bụ́ nke e chere na ha pụrụ igbochi ọrịa na ọnwu ruo oge ụfọdụ. N’oge na-adịghị anya akụkọ mgbe ochie malitere ịgbasa banyere ndị na-apụghị ịnwụ anwụ bụ́ ndị pụrụ ife n’igwe ojii, na-apụta ma na-apụkwa n’anya mgbe sọrọ ha, bụ́ ndị bikwara n’ugwu ndị dị nsọ ma ọ bụ n’àgwàetiti ndị dịpụrụ adịpụ ruo ọtụtụ afọ, ndị ọ bụ igirigi ma ọ bụ mkpụrụ osisi majik jigidere ha ndụ. Akụkọ ihe mere eme China na-akọ na na 219 T.O.A., eze ukwu bụ́ Ch’in Shih Huang Ti zipụrụ ọtụtụ ụgbọ mmiri bu ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ dị 3,000 ịchọpụta àgwàetiti nke P’eng-lai ahụ a na-akọ n’akụkọ, bụ́ ebe obibi nke ndị na-adịghị anwụ anwụ, iji welata mkpá akwụkwọ ọgwụ nke anwụghị anwụ. Ọ baghị uru ikwu na ha ejighị ọgwụ ọgwọ nnụ ọrịa ahụ lọta.
21 Ọchịchọ a na-achọ ndụ agwụghị agwụ dugara ndị Tao ịnwale iji nkà mmepụta ọgwụ na-agwakọta mkpụrụ ọgwụ anwụghị anwụ. N’echiche onye Tao, ndụ na-apụta mgbe ikike na-emegide onwe ha bụ́ yin na yang (nwoke na nwanyị) bịakọrọ ọnụ. N’ihi ya, site n’ijikọta òzé (na-eji oji, ma ọ bụ yin) na mercury (na-acha ọcha, ma ọ bụ yang), ndị ọkà mmepụta ọgwụ nọ na-eṅomi usoro nke okike, ha chekwara na ihe a ga-emepụta ga-abụ mkpụrụ ọgwụ anwụghị anwụ.
22. Gịnị si ná mmetụta Buddha nwere ná ndụ okpukpe ndị China pụta?
22 Ka ọ na-erule narị afọ nke asaa O.A., okpukpe Buddha banyere ná ndụ okpukpe ndị China. Ihe si na ya pụta bụ ngwakọta nke na-agụnye ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke okpukpe Buddha, mgbaasị, na ofufe ndị nna ochie. “Ma okpukpe Buddha ma okpukpe Tao,” ka Prọfesọ Smart na-ekwu, “wulitere ma mee ka nkwenkwe banyere ndụ mgbe a nwụsịrị gbanye mkpọrọgwụ bụ́ nke na-apụtachaghị ìhè n’ofufe ndị nna ochie nke ndị China oge ochie.”
23. Olee ebe Confucius kwụ n’ihe banyere ofufe ndị nna ochie?
23 Confucius, bụ́ onye nkụzi ọzọ nke China a ma ama na narị afọ nke isii T.O.A., bụ́ onye nkà ihe ọmụma ya ghọrọ ntọala maka okpukpe Confucius, ekwughị ọtụtụ ihe banyere Ndụ Mgbe A Nwụsịrị. Kama nke ahụ, o kwusiri okwu ike banyere ịdị mkpa nke omume ọma na akparamàgwà ọha mmadụ na-anakwere. Ma, o nwere mmasị n’ofufe ndị nna ochie ma mesie ememe na ihe omume metụtara mmụọ ndị nna ochie nwụworo anwụ ike nke ukwuu.
Okpukpe Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ndị Ọzọ
24. Gịnị ka okpukpe Jain na-akụzi banyere mkpụrụ obi?
24 E guzobere okpukpe Jain n’India na narị afọ nke isii T.O.A. Onye guzobere ya, bụ́ Mahāvīra, kụziri na ihe nile dị ndụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nakwa na nzọpụta nke mkpụrụ obi pụọ n’agbụ nke Karma ga-ekwe omume nanị site na mmadụ ịnapụ onwe ya ihe n’ụzọ gabigara ókè na inye onwe onye ahụhụ tinyere emesoghị ihe nile e kere eke ihe ike ọ bụla. Ndị Jain jigidere nkwenkwe ndị a ruo taa.
25, 26. Gịnị bụ nkwenkwe ndị Hindu nke a na-achọtakwa n’okpukpe Sikh?
25 India bụkwa ebe okpukpe Sikh malitere, bụ́ okpukpe nke nde mmadụ 19 na-ekpe. Okpukpe a malitere na narị afọ nke 16 mgbe Guru Nānak kpebiri ijikọta ihe kasị mma n’okpukpe Hindu na Alakụba ma malite otu okpukpe e jikọrọ ọnụ. Okpukpe Sikh nakweere nkwenkwe Hindu nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, ịlọ ụwa, na Karma.
26 N’ụzọ doro anya, nkwenkwe bụ́ na ndụ na-adịgide mgbe ahụ nwụsịrị bụ akụkụ gbara ọkpụrụkpụ nke ihe ka n’ọtụtụ okpukpe Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Ma, gịnị banyere Krisendọm, okpukpe ndị Juu, na Alakụba?
[[Map dị na peeji 10]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
EBE ETITI ESIA
KASHMIR
TIBET
CHINA
KOREA
JAPAN
Banaras
INDIA
Buddh Gaya
MYANMAR
THAILAND
SRI LANKA
CAMBODIA
JAVA
NARỊ AFỌ NKE 3 T.O.A.
NARỊ AFỌ MBỤ T.O.A.
NARỊ AFỌ MBỤ .O.A.
NARỊ AFỌ NKE 4 O.A.
NARỊ AFỌ NKE 6 O.A.
NARỊ AFỌ NKE 7 O.A.
Okpukpe Buddha metụtara Ebe Ọwụwa Anyanwụ Esia dum
[Foto dị na peeji nke 9]
Ịlọ ụwa bụ isi sekpụ ntị nke okpukpe Hindu
[Foto dị na peeji nke 11]
Site n’ibi ndụ dị ka okike si dị, onye Tao na-anwa ịdịru ebighị ebi
[Foto dị na peeji nke 12]
Confucius nwere mmasị n’ofufe ndị nna ochie