Ì Kwesịrị Ikwere n’Ịlọ Ụwa?
ONYE ọkà ihe ọmụma Grik bụ́ Plato jikọtara ịdaba n’ịhụnanya na echiche nke ịlọ ụwa. O kwenyere na mgbe ọnwụ nke ahụ gasịrị, mkpụrụ obi, ebe ọ na-adịghị anwụ anwụ, na-aga ‘n’ógbè nke ọdịdị ndị dị ọcha.’ N’enweghị ahụ, ọ na-anọrọ n’ebe ahụ ruo oge ụfọdụ, na-atụle ọdịdị ndị ahụ. Mgbe o mesịrị lọọ ụwa n’ahụ ọzọ, mkpụrụ obi ahụ na-echeta n’ụzọ dị inyoghị inyoghị ma na-enwe agụụ maka ógbè nke ọdịdị dị iche iche. Dị ka Plato si kwuo, ndị mmadụ na-adaba n’ịhụnanya n’ihi na ha na-ahụ n’ime onye ha hụrụ n’anya ọdịdị ịma mma na-amasị ha, bụ́ nke ha na-echeta ma na-achọ n’ụzọ na-edochaghị anya.
Ịmata Isi Iyi na Ebe Ndabere Ya
Nkụzi nke ịlọ ụwa mere ka ọ dị mkpa na mkpụrụ obi agaghị anwụ anwụ. Mgbe ahụ, a ghaghị ịchọ mmalite nke ịlọ ụwa gaa ná ndị ma ọ bụ mba ndị nwere nkwenkwe dị otú ahụ. Ná ndabere nke a, ụfọdụ na-eche na ọ malitere n’Ijipt oge ochie. Ndị ọzọ kweere na ọ malitere na Babilọn oge ochie. Iji mee ka a na-ele okpukpe Babilọn anya ọma, òtù ndị nchụàjà ya chepụtara nkwenkwe nke mkpụrụ obi isi n’otu ebe gaa ebe ọzọ. Ha pụrụ isi otú ahụ na-azọrọ na ndị a na-asọpụrụ n’okpukpe ha bụ ndị nna nna a ma ama lọrọ ụwa, n’agbanyeghị na ọ dịwo anya ha nwụrụ.
Otú ọ dị, ọ bụ n’India ka ikwere n’ịlọ ụwa tolitere nke ọma. Ndị amamihe nke Hindu nọ na-agbaso nsogbu zuru ebe nile nke ihe ọjọọ na nhụjuanya n’etiti ụmụ mmadụ mgba. ‘Olee otú a pụrụ isi mee ka nke a na echiche nke Onye Okike bụ onye ezi omume kwekọọ?’ ka ha jụrụ. Ha gbalịrị idozi ekwekọghị ekwekọ dị n’agbata ezi omume nke Chineke na ọdachi mberede na ahaghị nhata ndị dị n’ụwa. Ka oge na-aga, ha chepụtara “iwu nke karma,” iwu nke bụ na ihe ọ bụla mere nwere ihe kpatara ya—‘mkpụrụ ọ bụla mmadụ kụrụ, nke ahụ ka ọ ga-aghọrọ.’ Ha chepụtara ‘akwụkwọ mpịazi ego’ bụ́ nke a na-enye uru ma ọ bụ ọghọm nke otu ndụ ụgwọ ọrụ ma ọ bụ ahụhụ ná ndụ na-esochi ya.
“Karma” pụtara nnọọ “omume.” A na-ekwu na onye Hindu nwere karma dị mma ma ọ bụrụ na ọ na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ọha mmadụ na okpukpe, nweekwa karma ọjọọ ma ọ bụrụ na o meghị otú ahụ. Omume, ma ọ bụ karma ya, na-ekpebi ọdịnihu ya ná mmụghachi nke ọ bụla na-esochi ibe ya. “A na-amụ mmadụ nile inwe ụkpụrụ àgwà, bụ́ nke omume ha n’ụwa mbụ ha na-akwadebe, ọ bụ ezie na ihe nketa na-ekpebi ọdịdị ha ndị a na-ahụ anya,” ka onye ọkà ihe ọmụma bụ́ Nikhilananda na-ekwu. “Mmadụ [n’ụzọ dị otú a] bụ onye na-atụ ụkpụrụ nke akara aka ya, onye na-ewu ọdịnihu ya nke a kara aka.” Otú ọ dị, ihe mgbaru ọsọ kasịnụ bụ ịbụ onye a tọhapụrụ n’usoro a nke isi n’otu ebe gaa ebe ọzọ ma bụrụ onye e mere ka ya na Brahman dị n’otu—bụ ihe bụ ezie kasịnụ. E kwenyere na a na-enweta nke a site n’ịchụso akparamàgwà ọha mmadụ nakweere na amamihe pụrụ iche nke ndị Hindu.
Nkụzi nke ịlọ ụwa si otú a jiri nkwenkwe nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mere ntọala ma na-eji iwu nke karma na-ewukwasị ihe n’elu ya. Ka anyị hụ ihe Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible, nwere ikwu banyere echiche ndị a.
Mkpụrụ Obi Ọ́ Dịghị Anwụ Anwụ?
Iji zaa ajụjụ a, ka anyị chigharịkwuru ikike kasịnụ n’isiokwu ahụ—Okwu sitere n’ike mmụọ nsọ nke Onye Okike. Kpọmkwem n’akwụkwọ mbụ nke Bible, bụ́ Jenesis, anyị na-amụta ihe “mkpụrụ obi” pụtara n’ezie. Banyere okike nke nwoke mbụ, bụ́ Adam, Bible na-ekwu, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, O wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” (Jenesis 2:7) N’ụzọ doro anya, mkpụrụ obi abụghị ihe mmadụ nwere kama ihe ọ bụ. Okwu Hibru e ji mee ihe n’ebe a maka mkpụrụ obi bụ neʹphesh. Ọ pụtara ihe dị ka ugboro 700 n’ime Bible, ọ dịghịkwa mgbe ọ na-ezo aka n’akụkụ dị iche na nke na-enweghị ahụ nke mmadụ kama ọ na-ezo aka mgbe nile n’ihe a pụrụ imetụ aka, nke nwekwara ahụ.—Job 6:7; Abụ Ọma 35:13; 107:9; 119:28.
Gịnị na-eme mkpụrụ obi n’ọnwụ? Tụlee ihe mere Adam n’ọnwụ ya. Mgbe o mehiere, Chineke gwara ya, sị: “Ị ga-alata n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.” (Jenesis 3:19) Cheedị echiche banyere ihe nke ahụ pụtara. Tupu Chineke ekee ya site n’ájá, Adam adịghị. Mgbe ọnwụ ya gasịrị, Adam laghachiri n’otu ọnọdụ ahụ nke adịghị adị.
N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, Bible na-akụzi na ọnwụ bụ ihe na-emegide ndụ. N’Eklisiastis 9:5, 10, anyị na-agụ, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ ha nwere ọzọ; n’ihi na e chezọwo ncheta ha. Ihe ọ bụla aka gị na-ahụ ime, were ike gị mee ya; n’ihi na ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Sheol, NW], ebe gị onwe gị na-ala.”
Nke a pụtara na ndị nwụrụ anwụ adịghị enwe ike ime ma ọ bụ inwe mmetụta ihe ọ bụla. Ha enwekwaghị echiche ọ bụla, ha adịghịkwa echeta ihe ọ bụla. Ọbụ abụ ahụ na-ekwu, sị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere. Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.”—Abụ Ọma 146:3, 4.
Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na n’ọnwụ mkpụrụ obi adịghị apụ gaa n’ahụ ọzọ, kama ọ na-anwụ. “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ,” ka Bible na-ekwu n’ezoghị ọnụ. (Ezikiel 18:4, 20; Ọrụ 3:23; Mkpughe 16:3) Ya mere, nkwenkwe nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi—kpọmkwem ntọala nke nchepụta nke ịlọ ụwa—enweghị nkwado ọ bụla n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụrụ na ọ dịghị, nchepụta ahụ na-akụ afọ n’ala. Mgbe ahụ, gịnị mere e ji nwee nhụjuanya anyị na-ahụ n’ụwa?
N’ihi Gịnị Ka Ndị Mmadụ Ji Ahụju Anya?
Ihe bụ isi mere ụmụ mmadụ ji ahụju anya bụ ezughị okè nke anyị nile ketara site n’aka Adam bụ onye mmehie. “Mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere,” ka Bible na-ekwu. (Ndị Rom 5:12) N’ịbụ ndị a mụrụ site n’Adam, anyị nile na-arịa ọrịa, na-aka nká, na-anwụkwa anwụ.—Abụ Ọma 41:1, 3; Ndị Filipaị 2:25-27.
Ọzọkwa, iwu na-adịghị agbanwe agbanwe nke Onye Okike na-ekwu, sị: “Unu ekwela ka e duhie unu; Chineke abụghị onye a na-elelị; n’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi. N’ihi na onye na-agha mkpụrụ nye anụ ahụ onwe ya ga-esite n’anụ ahụ ahụ weta mmebi dị ka ihe ubi.” (Ndị Galetia 6:7, 8) N’ihi ya, ụzọ ndụ nke inwe mmekọahụ aghara aghara pụrụ iduje ná nsogbu mmetụta uche, afọ ime a na-achọghị, na ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ. “A pụrụ ịta ise siga ụta maka 30 pasent na-eju anya nke ọrịa cancer na-egbu egbu [na United States], nakwa ọnụ ọgụgụ hà ka nke ahụ n’ihi ụzọ e si ebi ndụ, karịsịa usoro iri ihe na enweghị mmega ahụ,” ka magazin bụ́ Scientific American na-ekwu. Ụfọdụ ọdachi ndị na-akpata nhụjuanya bụ n’ihi iji akụ̀ ndị dị n’ụwa eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.—Tụlee Mkpughe 11:18.
Ee, a ga-ata mmadụ ụta maka ihe dị ukwuu ná nhụsianya ya. Ma, ebe ọ bụ na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ, a pụghị iji iwu nke ‘ịghọrọ mkpụrụ ị kụrụ’ jikọta nhụjuanya ụmụ mmadụ na karma—ihe ndị e mere n’ihe e chere na ọ bụ ụwa mbụ. “Onye nwụrụ anwụ, a gụwo ya n’onye ezi omume pụọ ná mmehie ya,” ka Bible na-ekwu. (Ndị Rom 6:7, 23) N’ihi ya a dịghị ebufe mkpụrụ nke mmehie ná ndụ mgbe a nwụsịrị.
Setan Ekwensu na-akpatakwa nhụjuanya dị ukwuu. N’ezie, Setan na-achị ụwa nke a. (1 Jọn 5:19) Dị ka Jisọs Kraịst bukwara n’amụma, ndị na-eso ụzọ Ya ga-abụ ‘ndị mmadụ nile ga-akpọ asị n’ihi aha ya.’ (Matiu 10:22) N’ihi ya, ndị ezi omume na-echekarị nsogbu ka ukwuu ihu karịa ndị ajọ omume.
N’ụwa a, ihe ụfọdụ na-eme, bụ́ ndị a na-adịghị amata ozugbo ihe ndị na-akpata ha. Onye kasị agba ọsọ pụrụ ịzọhie ụkwụ ma ghara imeri n’ọsọ ahụ. Usuu ndị agha dị ike pụrụ ịda ná mmeri n’ihu ndị agha dị ala. Nwoke nwere amamihe nwere ike ghara inweta ọrụ dị mma, n’ihi ya kwa nọrọ n’agụụ. Mmadụ ndị nwere nghọta magburu onwe ya nke nhazi achụmnta ego nwere ike, n’ihi ọnọdụ, ghara inwe ike itinye ihe ọmụma ha n’ọrụ, wee si otú ahụ daa ogbenye. Ndị mmadụ nwere ihe ọmụma nwere ike kotere onwe ha ọnụma nke ndị ọchịchị wee bụrụ ndị a kpọrọ asị. N’ihi gịnị ka nke a ji dị otú a? “Mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile,” ka Eze Solomọn nwere amamihe na-aza.—Eklisiastis 9:11.
Ihe a kpọrọ mmadụ ahụjuwo anya eri ogologo oge tupu ndị amamihe nke ndị Hindu agbalịa ịkọwa ihe mere o ji dịrị. Ma è nwere olileanya maka ọdịnihu ka mma? Nkwa dịkwa aṅaa ka Bible nwere maka ndị nwụrụ anwụ?
Ọdịnihu Udo
Onye Okike ekwewo nkwa na ya ga-eweta ụwa ọha mmadụ dị ugbu a, bụ́ nke nọ n’okpuru nchịkwa Setan, ná njedebe n’isi nso. (Ilu 2:21, 22; Daniel 2:44) Ọha mmadụ ọhụrụ nke ezi omume—“ụwa ọhụrụ”—ga-abụ ihe dị adị n’ezie. (2 Pita 3:13) N’oge ahụ “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) A ga-ewepụ ọbụna oké ihe mgbu nke ọnwụ, n’ihi na Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:4.
Banyere ndị ga-ebi n’ụwa ọhụrụ nke Chineke na-ekwe ná nkwa, ọbụ abụ ahụ buru amụma, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Ọzọkwa, ‘ịba ụba nke udo ga-atọkwa ndị dị umeala n’obi ụtọ.’—Abụ Ọma 37:11.
Mukundbhai, a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ, adawo n’ụra ọnwụ n’amaghị nkwa ndị magburu onwe ha nke Chineke. Ma ọtụtụ nde ndị nwụworo n’amaghị Chineke nwere olileanya nke ịbụ ndị a kpọlitere n’ụwa ọhụrụ nke udo dị otú ahụ, n’ihi na Bible na-ekwe nkwa, sị: “Mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.”—Ọrụ 24:15; Luk 23:43.
A na-asụgharị n’ebe a okwu ahụ bụ́ “mbilite n’ọnwụ” site n’okwu Grik bụ́ a·naʹsta·sis, nke pụtara n’ụzọ nkịtị “iguzo ọtọ ọzọ.” N’ihi ya mbilite n’ọnwụ na-agụnye ntụteghachi nke ụkpụrụ ndụ nke onye ahụ.
Onye Okike eluigwe na ala nwere amamihe na-enweghị nsọtụ. (Job 12:13) Icheta ụkpụrụ ndụ nke ndị nwụrụ anwụ abụghịrị ya nsogbu. (Tụlee Aịsaịa 40:26.) Jehova Chineke jupụtakwara n’ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) N’ihi ya, ọ pụrụ iji ikike ncheta ya zuru okè, ọ bụghị iji nye ndị nwụrụ anwụ ahụhụ n’ihi ihe ọjọọ ha meworo, kama iji weghachi ha ná ndụ n’elu ala paradaịs n’ụdị mmadụ ha bụ tupu ha anwụọ.
Nye ọtụtụ nde mmadụ dị ka Mukundbhai, mbilite n’ọnwụ ga-apụta isoroghachi ndị ha hụrụ n’anya nọrọ ọzọ. Ma cheedị echiche ihe ọ pụrụ ịpụtara ndị dị ndụ ugbu a. Were, dị ka ihe atụ, nwa nwoke Mukundbhai, onye bịaworo mara eziokwu dị ebube banyere Chineke na nzube ya. Lee ka o si bụrụ ihe na-akasi obi nye ya ịmara na nna ya anọghị n’ọnyà nke usoro mmụghachi na-adịghị agwụ agwụ, bụ́ nke ihe ọjọọ na nhụjuanya gbara gburugburu! Ọ nọ nanị n’ụra ọnwụ, na-echere mbilite n’ọnwụ. Lee ihe na-akpali akpali ọ bụụrụ ya iche banyere ikwe omume nke isoro nna ya otu ụbọchị kerịta ihe ya onwe ya mụtaworo site na Bible!
Ọ bụ uche Chineke ka “a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Timoti 2:3, 4) Ugbu a bụ oge ịmụta otú gị, gụnyere ọtụtụ nde ndị ọzọ na-emeworị uche Chineke, ga-esi nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala paradaịs.—Jọn 17:3.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]
“Mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile.”—Eklisiastis 9:11
[Igbe dị na peeji nke 6]
Ụdị Onye Chineke Bụ na Iwu nke Karma
“Iwu nke Karma,” ka Mohandas K. Gandhi na-akọwa, “bụ ihe a na-apụghị ịgbanwe agbanwe, a na-apụghịkwa izere ezere. N’ihi ya ọ dịghị mkpa ma ọlị ka Chineke tinye aka. O guzobere iwu ahụ, dị ka a pụkwara isi kwuo ya, sere aka.” Nke a nyere Gandhi nsogbu.
N’aka nke ọzọ, nkwa mbilite n’ọnwụ na-ekpughe na Chineke nwere mmasị dị omimi n’ihe o kere eke. Iji weghachi onye nwụrụ anwụ ná ndụ n’elu ala paradaịs, Chineke aghaghị ịmara ma cheta ihe nile banyere onye ahụ. Chineke na-echegbu onwe ya n’ezie banyere anyị.—1 Pita 5:6, 7.
[Foto dị na peeji nke 5]
Wheel ndụ nke ndị Hindu
[Foto ndị dị na peeji nke 8]
Okwu Chineke na-akụzi mbilite n’ọnwụ