Ì Kweere na Ị Dịbuola Ndụ?
“N’eziokwu, ndị mmadụ na-alọ ụwa, o dokwara anya na ndị dị ndụ ugbu a bụ ndị nwụrụla anwụ ma lọ ụwa. Mkpụrụ obi ndị nwụrụ anwụ ka dị ndụ ebe ọzọ.”—PLETO, ONYE GRIS BỤ́ ỌKÀ IHE ỌMỤMA. Ọ DỊRỊ NDỤ N’IHE DỊ KA PUKU AFỌ ABỤỌ NA NARỊ AFỌ ANỌ GARA AGA. IHE A O KWURU BỤ IHE A SỊRỊ NA SỌKRETIZ KWURU.
“Ebe ọ bụ na mkpụrụ obi dị iche n’ahụ́, o nweghịkwa ike ịdị ndụ ma ọ bụrụ na ọ nọghị n’ahụ́, ọ naghị anọgide n’otu ahụ́, ọ na-abụ ya nọchaa n’ahụ́ otu onye, ya agafee n’ahụ́ onye ọzọ.”—GIORDANO BRUNO, ONYE ỊTALI BỤ́ ỌKÀ IHE ỌMỤMA. Ọ DỊRỊ NDỤ N’IHE DỊ KA NARỊ AFỌ ISE GARA AGA.
“Mmadụ anaghị anwụ anwụ n’eziokwu: ha na-eme ka à ga-asị na ha anwụọla . . . ma o nwere ihe na-esi n’ahụ́ ha pụọ ma banye n’ahụ́ onye ọzọ, nọrọ ebe ahụ na-ahụ ihe na-eme n’ụwa.”—RALPH WALDO EMERSON, ONYE AMERỊKA NA-EDE AKWỤKWỌ. Ọ DỊRỊ NDỤ N’IHE DỊ KA NARỊ AFỌ ABỤỌ GARA AGA.
Ò NWETỤLA mgbe ị jụrụ onwe gị ma ị̀ dịbuola ndụ? Ya bụrụ otú ahụ, mara na ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ. Kemgbe ụwa, ma ndị ọcha ma ndị ojii ajụọla onwe ha ụdị ajụjụ a. Ihe ụfọdụ ndị chọrọ ịmata azịza ajụjụ a meziri bụ ikwere na a na-alọ ụwa alọ. Ihe ihe a ha kweere pụtara bụ na mgbe mmadụ nwụrụ, mkpụrụ obi ya na-esi n’ahụ́ ya pụọ, a mụgharịa ya, ya aghọọ mmadụ ma ọ bụ anụmanụ, ma ọ bụkwanụ osisi.
Ụfọdụ ndị kweere na ihe a bụ eziokwu, ma olee otú anyị ga-esi amata ma ọ̀ bụ eziokwu? Gịnị ka Baịbụl, bụ́ Okwu Chineke, kwuru gbasara ịlọ ụwa? Ma ka anyị burugodị ụzọ mata ebe ihe ahụ ụfọdụ ndị kweere si malite.
Olee Ebe Ozizi Ịlọ Ụwa Si Malite?
Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị ọkà mmụta kwuru na ọ bụ ndị Babịlọn oge ochie bụ ndị mbụ kweere na mkpụrụ obi mmadụ anaghị anwụ anwụ. E wuru obodo Babịlọn n’ihe dị ka puku afọ anọ gara aga. Otu ọkachamara aha ya bụ Morris Jastrow nke Nta kwuru n’otu akwụkwọ ya, sị: “Ndị ọkà mmụta okpukpe ndị Babịlọn kụziiri ndị mmadụ ọtụtụ ihe ha chere mere ha ji kwere na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ.” Ọkachamara ahụ kwuru na ndị Babịlọn weere na “ọnwụ bụ ihe na-eme ka mmadụ gaa dịrị ndụ n’ebe ọzọ. O doro anya na ihe mere ha ji chee otú a bụ na o siiri ha ike ikweta na ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ nwụchaala, ọ makwaghị ihe ọ bụla.”
Ozizi ịlọ ụwa sizi na Babịlọn gazuo ebe niile n’oge ochie. Ndị ọkà ihe ọmụma e nwere n’Ịndịa bịaziri chepụta otú dị iche iche ndị mmadụ si alọ ụwa. Ha kwuru na ọ bụ ihe mmadụ mere n’ụwa mbụ ya ga-ekpebi ihe onye ahụ ga-aghọ ma ọ lọ ụwa. Ndị ọkà mmụta Gris a ma ama bịakwara kwere na a na-alọ ụwa alọ. Nke a meziri ka onye ukwu na onye nta kwere na a na-alọ ụwa alọ.
N’oge anyị a, ndị kweere na a na-alọ ụwa alọ ebuola ibu ná mba ndị dị ka Amerịka, Kanada, na Ingland. Ọtụtụ ndị a ma ama nakwa ụmụ okoro na agbọghọ enweela mmasị n’ihe ndị na-ekpe okpukpe ndị Eshia na-akụzi na ihe ndị ha na-eme. Taa, e nweela ọtụtụ akwụkwọ ebe ndị mmadụ kọrọ ihe ndị ha sịrị mere ha n’ụwa ha mbụ. Ị gaakwa n’Ịntanet, ebe ndị mmadụ kọrọ ụdị ihe ahụ hà ka ájá. Ihe na-ewuzi n’ọtụtụ ebe n’ụwa ugbu a bụ ihe a sịrị e ji achọpụta ụdị ndụ mmadụ biri n’ụwa mbụ ya. Ha kwuru na otú ha si eme ya bụ na ha na-eme ka mmadụ ghara ịmakwa onwe ya, onye ahụ ekwuwezie ihe ọ bụla batara ya n’isi. Ha sịrị na ha na-esi n’ihe onye ahụ kwuru amatazi otú ahụ́ dị ya na àgwà ndị ọ na-akpa.
Ọ̀ Bụ Eziokwu na A Na-alọ Ụwa Alọ?
N’agbanyeghị na ọ dịla anya ndị mmadụ kweere na a na-alọ ụwa alọ, ihe anyị kwesịrị ịchọpụta bụ ma ọ̀ bụ eziokwu. Ihe ọzọkwa bụ na Ndị Kraịst ga-achọ ịmata ma ihe ahụ ndị mmadụ kweere ọ̀ dabara n’ihe Baịbụl na-akụzi. (Jọn 17:17) Ebe ọ bụ Jehova Chineke kere anyị, bụrụkwa Onye na-enye anyị ndụ na “Onye na-ekpughe ihe nzuzo,” ọ na-agwa anyị ọtụtụ ihe banyere ndụ na ọnwụ mmadụ bụ́ ndị anyị na-agaraghị ama ma a sị na ọ gwaghị anyị. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Okwu ya bụ́ Baịbụl ga-agwa anyị ihe na-eme anyị ma anyị nwụọ.—Daniel 2:28; Ọrụ Ndịozi 17:28.
Ọ bụrụ na anyị amụọ Baịbụl nke ọma, ọ gaghị esiri anyị ike ịghọta ihe na-eme anyị ma anyị nwụọ. Dị ka ihe atụ, Jenesis 3:19 kwuru ihe Chineke gwara Adam mgbe Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi. Ọ gwara Adam, sị: “Ọsụsọ ga-agba gị n’ihu tupu gị erie ihe oriri ruo mgbe ị laghachiri n’ala, n’ihi na e si na ya wepụta gị. N’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.” Ọ bụ ájá ka e ji kee Adam. Mgbe ọ nwụrụ, ọ ghọkwara ájá. Ihe a Chineke kwuru doro anya. N’ihi ya, mmadụ nwụọ, ọ naghị alọ ụwa, kama ọ na-akwụsị ịdị ndụ.a Onye nwụrụ anwụ adịghị ndụ, onye dịkwanụ ndụ anwụghị anwụ n’ihi na ọnwụ na ndụ abụghị otu. Ndị nwụrụ anwụ anwụọla, ha adịkwaghị. Ihe a Baịbụl kwuru ò siri ike nghọta?
Ebe ọ bụ na ndị nwụrụ anwụ anwụọla, ọ ga-abụrịrị ihe ọzọ mere ndị mmadụ ji echeta ihe ndị ha sịrị mere ha n’ụwa ha mbụ. Ụmụ mmadụ aghọtachabeghị otú uche mmadụ si arụ ọrụ, otú ụbụrụ mmadụ si arụ ọrụ mgbe mmadụ na-amachaghị onwe ya na otú ọgwụ nwere ike isi kpaghasịa mmadụ ụbụrụ ma ọ bụkwanụ ihe na-eme ụbụrụ mmadụ ma ihe ike mee mmadụ. Ọtụtụ nrọ mmadụ rọrọla na ihe ndị o chere n’obi ya, bụ́ ndị ka dị n’ụbụrụ ya, nwere ike imecha bịa dị onye ahụ ka ihe ndị ahụ hà mere eme. Mgbe ụfọdụ, ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ na-eme ka ihe ụfọdụ na-emeghị eme yie mmadụ ka hà mere eme.—1 Samuel 28:7-19.
Ọ na-agụ mmadụ niile agụụ ịdị ndụ, anyị niile chọkwara ịmara ihe ga-eme anyị n’ọdịnihu. Ma gịnị mere o ji dị otú ahụ? Baịbụl kwuru banyere onye kere anyị, sị: “O tinyewo ọbụna mgbe ebighị ebi n’obi ha.” (Ekiziastis 3:11) N’ihi ya, ọ na-agụ ụmụ mmadụ agụụ ka ha dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
Ebe ọ bụ na Onye kere anyị bụ́ Jehova Chineke mere ka ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi na-agụ ụmụ mmadụ agụụ, ihe ọ pụtara bụ na ọ ga-agwakwa anyị ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Baịbụl kwuru na Onye kere anyị bu n’obi ime ka ndị na-erubere ya isi dịrị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs. Ọbụ abụ bụ́ Eze Devid si n’ike mmụọ nsọ kwuo, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Ihe ga-eme ka ihe a Chineke bu n’obi mezuo bụ na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Nke a so n’otu n’ime ihe ndị dị mkpa Baịbụl na-akụzi.—Ọrụ Ndịozi 24:15; 1 Ndị Kọrịnt 15:16-19.
Ihe Ndị Gosiri na A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ n’Ọnwụ
E nwere mmadụ asatọ Baịbụl kwuru na a kpọlitere n’ọnwụ.b E nwekwara ndị ji anya ha hụ mgbe a kpọlitere ha. E si n’ọnwụ kpọlite ha, ha alọghị ụwa. Mgbe a kpọlitere ha, ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha matara ndị ha bụ ozugbo. Ndị ikwu ha agaghị chọwa ha n’ebe a mụrụ ụmụ ọhụrụ ka ha mata ma hà alọla ụwa.—Jọn 11:43-45.
Obi dị anyị ụtọ na Baịbụl kwuru na Chineke ga-akpọlite ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ mgbe ọ ga-eweta ụwa ọhụrụ ya. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eji ya dochie ụwa ajọ omume a. (2 Pita 3:13, 14) Ka ọ dị ugbu a, Chineke ka na-echeta ọtụtụ ijeri ndị nwụrụ anwụ, na-echetakwa otú onye nke ọ bụla n’ime ha dị n’ihi na Chineke zuru okè. Ọ machadị aha kpakpando niile! (Abụ Ọma 147:4; Mkpughe 20:13) Mgbe ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ kemgbe ụwa, onye nke ọ bụla n’ime ha ga-amata ezinụlọ o si, matakwa ndị nne na nna ya ochie. Ndụ ga-atọ ezigbo n’oge ahụ!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu ihe e kwuru n’ebe a, gụọ isiokwu bụ́ “Ebee Ka Ndị Nwụrụ Anwụ Gara?” n’isi nke 6 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.
b Ebe a kọrọ akụkọ mmadụ asatọ ahụ bụ ná 1 Ndị Eze 17:17-24; 2 Ndị Eze 4:32-37; 13:20, 21; Luk 7:11-17; 8:40-56; Jọn 11:38-44; Ọrụ Ndịozi 9:36-42; 20:7-12. Ị gụwa akụkọ ndị ahụ, echefula na ọtụtụ ndị ji anya ha hụ mgbe ha mere. Onye nke itoolu Baịbụl kwuru na a kpọlitere n’ọnwụ bụ Jizọs Kraịst.—Jọn 20:1-18.
[Igbe dị na peeji nke 20]
Olileanya Ka Mma
Kama igbuwe oge na-agbalị ka ị mata ihe ndị i chere mere gị n’ụwa mbụ gị, ọ ga-aka mma ka i wepụta oge mụta ihe Baịbụl kụziri banyere mbilite n’ọnwụ. Ihe ị ga-amụta na Baịbụl ga-eme ka obi ruo gị ala ugbu a, kasiekwa gị obi n’oge ị nọ ná mwute.
Dị ka ihe atụ, mgbe Rosemarie bụ́ nwunye Theodore nwụrụ, o wutere Theodore nke ukwuu. Ha alụọla afọ iri anọ na anọ tupu Rosemarie anwụọ. Theodore kwuru, sị: “O doro m anya na Jehova na-echeta nwunye m. Baịbụl kọọrọ anyị banyere ọtụtụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ. Ihe a Baịbụl kọrọ bụ eziokwu n’ihi na e nwere ọtụtụ ndị ji anya ha hụ mgbe a kpọlitere ha n’ọnwụ. Ọ bụ ya mere m ji na-eche ka m nụ mgbe Jizọs ga-akpọ Rosemarie òkù otú ahụ ọ kpọrọ Lazarọs, sị ya: ‘Rosemarie, pụta!’”
Obi gbawara Costas na Maria mgbe nwa ha nwaanyị dị otu afọ na ọnwa asatọ nwụrụ n’ihi ọrịa o bu pụta ụwa. Aha nwa ha ahụ bụ Evi. Maria kwuru, sị: “Ọnwụ Evi wutere anyị nke ukwuu. Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị ghọtakwuru ihe ahụhụ ndị mmadụ na-ata na ọnwụ ha na-anwụ pụtara, ghọtakwa ihe mbilite n’ọnwụ pụtara. Anyị bịara ghọtakwuo ihe e kwuru n’Aịzaya 33:24; 35:5, 6; nakwa ná Mkpughe 21:4, 5. N’eziokwu, Jehova bụ ezigbo Nna nke hụrụ anyị n’anya, ọ bụ ya mere o ji kwe anyị nkwa na ya ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, ọ ga-emekwa ya.”
Ọ bụ Onye kere anyị gwara anyị ihe niile Baịbụl kwuru banyere ndụ ụmụ mmadụ na ihe na-eme ha ma ha nwụọ. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Okwu Chineke obi, i nwekwara ike inwe olileanya na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ otú ahụ Theodore, Costas, na Maria nwere. Obi ga-esikwa gị ike na ihe niile Chineke kwuru ga-emezu n’ọdịnihu n’ihi na Chineke anaghị agha ụgha.—Taịtọs 1:2.