Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ie p. 17-18
  • Ebe A Ga-aga Maka Azịza

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ebe A Ga-aga Maka Azịza
  • Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Sayensị na Nkà Ihe Ọmụma
  • Isi Iyi Pụrụ Iche nke Azịza
  • Ndụ Mgbe A Nwụsịrị—Gịnị Ka Ndị Mmadụ Kweere?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • À Na-adị Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?
    Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
  • Isi Iyi Pụrụ Iche nke Amamihe Ka Elu
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Echiche ahụ Abanye n’Okpukpe Ndị Juu, Krisendọm, na Alakụba
    Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
ie p. 17-18

Ebe A Ga-aga Maka Azịza

“Ozizi nke ahụhụ ebighị ebi ekwekọghị n’ịhụnanya Chineke maka ihe ndị e kere eke. . . . Ikwere na ntaramahụhụ ebighị ebi nke mkpụrụ obi n’ihi ihie ụzọ ndị e mere n’afọ ole na ole, n’enyeghị ya ohere maka mgbazi, bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya.”—NIKHILANANDA ONYE ỌKÀ IHE ỌMỤMA HINDU.

1, 2. N’ihi ndịrịta iche nke nkwenkwe banyere Ndụ Mgbe A Nwụsịrị, ajụjụ ndị dị aṅaa na-ebilite?

DỊ KA onye ọkà mmụta Hindu a, ahụ adịghị eru ọtụtụ ndị ala taa n’ebe nkụzi mmekpa ahụ ebighị ebi dị. N’otu aka ahụ, ọ na-esiri ndị ọzọ ike ịghọta ụdị echiche ndị dị ka irute Nirvana na isoro Tao dị n’otu.

2 Ma, n’ihi echiche nke na mkpụrụ obi adịghị anwụghị anwụ, okpukpe nke ma Ebe Ọwụwa Anyanwụ ma Ebe Ọdịda Anyanwụ akpalitewo mgbanwe ndị dị mgbagwoju anya na-esochi ibe ha nke nkwenkwe banyere Ndụ Mgbe A Nwụsịrị. Ọ̀ pụrụ ikwe omume ịmata eziokwu banyere ihe na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ? Mkpụrụ obi ọ̀ bụ n’ezie ihe na-adịghị anwụ anwụ? Olee ebe anyị ga-aga maka azịza?

Sayensị na Nkà Ihe Ọmụma

3. Sayensị ma ọ bụ ụzọ e si eji sayensị achọpụta ihe ò nwere azịza maka ajụjụ ndị metụtara ịdị ndụ mgbe a nwụsịrị?

3 Sayensị ma ọ bụ ụzọ e si eji sayensị achọpụta ihe ò nwere azịza maka ajụjụ ndị metụtara Ndụ Mgbe A Nwụsịrị? N’ịdabere n’akụkọ ndị a na-akọ n’oge na-adịbeghị anya maka ahụmahụ nke ịfọ nke nta ka a nwụọ ma ọ bụ ‘ndị na-abụghị n’ime ahụ,’ ndị nchọpụta ụfọdụ anwawo ime nnyocha banyere ndụ mgbe a nwụsịrị. Ka ọ na-atụle nzọrọ ha ụfọdụ n’okwu ya bụ́ “Ọnwụ Ọ̀ Bụ Ụzọ E Si Aba n’Ìhè?,” ọkà mmụta okpukpe Katọlik bụ́ Hans Küng kwubiri, sị: “Ahụmahụ ndị dị otú a anwapụtaghị ihe ọ bụla banyere ikwe omume nke ndụ mgbe a nwụsịrị: ihe ndị a na-ezo aka nanị na minit ise ikpeazụ tupu ọnwụ, ọ bụghịkwa ná ndụ mgbe ebighị ebi mgbe ọnwụ gasịrị.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Okwu banyere ndụ mgbe a nwụsịrị dị oké mkpa maka ndụ tupu ọnwụ. Ọ chọrọ azịza nke a na-aghaghị ịchọ n’ebe ọzọ ma ọ bụrụ na nkà ọgwụ apụghị inye ya.”

4. Nkà ihe ọmụma ọ̀ pụrụ inyere anyị aka ịchọta azịza n’etiti ọtụtụ ikwe omume nke ndụ mgbe a nwụsịrị nke okpukpe dị iche iche na-ekwe nkwa ya?

4 Gịnị banyere nkà ihe ọmụma? Ọ̀ pụrụ inyere anyị aka ịchọta azịza n’etiti ikwe omume nke ndụ mgbe a nwụsịrị bụ́ ndị okpukpe dị iche iche na-ekwe nkwa ya? Nchọpụta nkà ihe ọmụma na-agụnye “ọrụ ịkọ nkọ,” ka onye Britain bụ́ ọkà ihe ọmụma nke narị afọ 20 bụ́ Bertrand Russell na-ekwu. Nkà ihe ọmụma, dị ka The World Book Encyclopedia si kwuo, bụ “otu ụdị nke nchọpụta—usoro nnyocha, nkatọ, nkọwa, na ịkọ nkọ.” N’isiokwu nke Ndụ Mgbe A Nwụsịrị, ịkọ nkọ nke nkà ihe ọmụma anọwo na-adịrịta iche site n’ịkpọ anwụghị anwụ ọchịchọ efu a na-eche n’echiche gaa n’ịsị na ọ bụ ihe ruuru mmadụ ọ bụla site n’ọmụmụ.

Isi Iyi Pụrụ Iche nke Azịza

5. Olee akwụkwọ kasị ochie e detụworo?

5 Otú ọ dị, ọ dị akwụkwọ nke nwere azịza ndị bụ eziokwu nye ajụjụ ndị dị mkpa banyere ndụ na ọnwụ. Ọ bụ akwụkwọ kasị ochie e detụworo, nke e dere akụkụ ya ụfọdụ n’ihe dị ka afọ 3,500 gara aga. E dere akụkụ mbụ nke akwụkwọ a narị afọ ole na ole tupu e chepụta abụ ndị kasị ochie nke akwụkwọ nsọ Hindu, bụ́ Vedas, na ihe dị ka otu puku afọ tupu Buddha, Mahāvīra, na Confucius ebie ndụ n’ụwa. E dezuru akwụkwọ a na 98 O.A., ihe karịrị afọ 500 tupu Muḥammad eguzobe Alakụba. Isi iyi a pụrụ iche nke amamihe ka elu bụ Bible.a

6. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji tụọ anya na Bible ga-agwa anyị ihe mkpụrụ obi bụ?

6 Bible nwere akụkọ ihe mere eme mgbe ochie kasị zie ezie n’etiti akwụkwọ nile dị adị. Akụkọ ihe mere eme e dekọrọ na Bible dịrị laa azụ ruo ná mmalite nke ezinụlọ mmadụ, na-akọwakwa otú anyị si bịa n’ụwa ebe a. Ọbụna ọ na-akpọrọ anyị laa azụ ruo n’oge dị tupu e kee mmadụ. N’ezie akwụkwọ dị otú ahụ pụrụ ime ka anyị ghọta ụzọ e si kee mmadụ na ihe mkpụrụ obi bụ.

7, 8. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji were obi ike chigharịkwuru Bible maka azịza ndị bụ eziokwu, na-ejukwa afọ banyere ihe na-eme mgbe anyị nwụrụ?

7 Ọzọkwa, Bible bụ akwụkwọ nke nwere amụma ndị mmezu ha na-adịghị ehie ụzọ. Dị ka ihe atụ, o buru amụma banyere mbilite na ọdịda nke alaeze ukwu Midia na Peasia na Gris n’ụzọ zuru ezu. Okwu ndị a ziri nnọọ ezi nke na ụfọdụ ndị nkatọ nwara, n’efu, iji nwapụta na e dere ha mgbe ihe ndị ahụ mesịrị. (Daniel 8:1-7, 20-22) Amụma ụfọdụ e dekọrọ na Bible na-emezu n’ụzọ zuru ezu n’oge anyị kpọmkwem.b—Matiu, isi 24; Mak, isi 13; Luk, isi 21; 2 Timoti 3:1-5, 13.

8 Ọ dịghị mmadụ ọ bụla, n’agbanyeghị otú o si nweruo ọgụgụ isi, nke pụrụ ịkọ ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu n’ụzọ ziri ezi otú ahụ. Nanị Onye Okike eluigwe na ala nke kasị ike ma kasị mara ihe pụrụ. (2 Timoti 3:16, 17; 2 Pita 1:20, 21) Bible bụ n’ezie akwụkwọ sitere n’aka Chineke. N’ezie, akwụkwọ dị otú ahụ pụrụ inye anyị azịza ndị bụ eziokwu, na-ejukwa afọ banyere ihe na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ. Ka anyị buru ụzọ hụ ihe o nwere ikwu banyere mkpụrụ obi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, nke Watchtower Bible and Tract Society of Pennsylvania, bipụtara.

b Lee The Bible—God’s Word or Man’s?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 18]

Akwụkwọ kasị ochie e detụworo

[Foto dị na peeji nke 18]

Akwụkwọ nke na-enye azịza ndị a pụrụ ịdabere na ha, ndị na-ejukwa afọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya