Mmalite na Uto Ha nke Oge A
AKỤKỌ ihe mere eme nke oge a nke Ndịàmà Jehova malitere n’ihe karịrị otu narị afọ gara aga. Ná mmalite afọ ndị 1870, a malitere ihe a pụrụ ịkpọ ntakịrị ìgwè ọmụmụ Bible na Allegheny, Pennsylvania, U.S.A., nke bụ́ otu akụkụ Pittsburgh ugbu a. Ọ bụ Charles Taze Russell haziri ìgwè ahụ. Na July 1879, e wepụtara mbipụta mbụ nke magazin bụ́ Zion’s Watch Tower and Herald of Christ’s Presence. Ka ọ na-erule 1880, ọtụtụ ọgbakọ agbasawo na steeti ndị dị nso site n’otu ntakịrị ìgwè ọmụmụ Bible ahụ. Na 1881, e guzobere Zion’s Watch Tower Tract Society, na 1884 kwa, e debanyere aha ya n’akwụkwọ dị ka òtù nke iwu kwadoro, na-enwe Russell dị ka onyeisi oche ya. E mesịrị gbanwee aha òtù ahụ ịbụ Watch Tower Bible and Tract Society. Ọtụtụ ndị na-agba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma na-enyefe akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Iri mmadụ ise ji oge ha nile na-eme nke a na 1888—ugbu a nkezi ọnụ ọgụgụ ndị na-eme ya n’ụwa nile bụ ihe dị ka 700,000.
Ka ọ na-erule 1909, ọrụ ahụ aghọwo nke a na-arụ ná mba dị iche iche, e bugakwara isi ụlọ ọrụ nke Society ahụ n’ebe ọ dị ugbu a na Brooklyn, New York. A kpọsara okwu ihu ọha ndị e biri ebi n’akwụkwọ akụkọ dị iche iche, ka ọ na-erukwala 1913, a na-akpọsa ha n’asụsụ anọ n’ọtụtụ puku akwụkwọ akụkọ na United States, Canada, na Europe. E kesawo ọtụtụ narị nde akwụkwọ, akwụkwọ nta na traktị.
Na 1912, a malitere ịrụ ọrụ n’ihe nkiri bụ́ “Foto Ihe Nkiri nke Okike.” O ji ihe nkiri slide na sịnịma nwere ụda olu nye nkọwa site n’okike ruo ná ngwụsị nke Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst. A malitere igosi ya na 1914, mmadụ 35,000 na-ekirikwa ya kwa ụbọchị. Ọ bụ ya bụ sịnịma mbụ nwere ụda olu.
AFỌ 1914
Oge dị oké mkpa na-eru nso. Na 1876, onye mmụta Bible bụ́ Charles Taze Russell dere isiokwu bụ́ “Oge Ndị Jentaịl: Olee Mgbe Ha Ga-agwụ?” nye ndị na-ebipụta Bible Examiner, bụ́ nke a na-ebipụta na Brooklyn, New York, bụ́ nke kwuru na peeji nke 27 ná mbipụta ya nke October, sị, “Oge asaa nke ndị mba ọzọ ga-agwụ na A.D. 1914.” Oge Ndị Jentaịl bụ oge e zoro aka na ya ná nsụgharị Bible ọzọ dị ka “oge nke mba ọzọ.” (Luk 21:24) Ọ bụghị ihe nile a tụrụ anya ga-eme na 1914 mere, ma ọ kara ngwụsị nke Oge Ndị Jentaịl akara, ọ bụkwa afọ pụrụ iche. Ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị na-enye nkọwa kwetara na 1914 bụ oge oké mgbanwe n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ihe ndị na-esonụ e kwuru na-egosi nke a:
“Afọ ikpeazụ dị ‘otú o kwesịrị’ n’ụzọ zuru ezu n’akụkọ ihe mere eme bụ 1913, afọ bu ụzọ tupu Agha Ụwa Mbụ amalite.”—Uche akwụkwọ akụkọ Times-Herald, Washington, D.C., March 13, 1949.
“N’ụzọ na-arịwanye elu, ogologo oge ahụ dị afọ 75 malite na 1914 ruo na 1989, bụ́ mgbe e nwere agha ụwa abụọ na agha nzuzo, bụ nke ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ahụ dị ka oge pụrụ iche, nke na-enweghị oyiri, oge pụrụ iche mgbe akụkụ dị ukwuu nke ụwa nọ na-alụ agha, nọ na-edozi ihe ndị e bibiri n’agha, ma ọ bụ na-ejikere ịlụ agha.”—The New York Times, May 7, 1995.
“Ụwa nile ghasara n’ezie n’ihi Agha Ụwa Mbụ, anyị amatabeghịkwa ihe kpatara ya. Tupu mgbe ahụ, ndị mmadụ chere na o ruwela mgbe ihe nile ga-ezu okè. E nwere udo na ọganihu. Mgbe ahụ ihe nile ghasara. Kemgbe ahụ, anyị nọ n’ọnọdụ nke enweghị ihe na-aga aga . . . E gbuwo ọtụtụ mmadụ na narị afọ a karịa ka e gburu n’akụkọ ihe mere eme nile.”—Dr. Walker Percy, American Medical News, November 21, 1977.
Ihe karịrị afọ 50 mgbe 1914 gasịrị, onye Germany ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị bụ́ Konrad Adenauer dere, sị: “Ịnọ ná ntụkwasị obi na ịnọ jụụ adịghịzi ná ndụ ụmụ mmadụ kemgbe 1914.”—The West Parker, Cleveland, Ohio, January 20, 1966.
Onyeisi oche mbụ nke Society ahụ, bụ́ C. T. Russell, nwụrụ na 1916, Joseph F. Rutherford nọchikwara ya n’afọ na-eso ya. Ọtụtụ mgbanwe weere ọnọdụ. E wepụtara magazin ya na Ụlọ Nche na-agakọ, nke a kpọrọ The Golden Age. (Nke a na-akpọ Teta! ugbu a, nke a na-ekesa ihe karịrị 20,000,000 n’ime ya n’ihe karịrị asụsụ 80.) E mesikwuru ịgba àmà site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ ike. Iji doo onwe ha iche n’òtù okpukpe dị iche iche nke Krisendọm, na 1931 ndị Kraịst ndị a nakweere aha bụ́ Ndịàmà Jehova. Aha a dabeere n’Aịsaịa 43:10 -12.
E ji redio mee ihe n’ụzọ dị ukwuu n’afọ ndị 1920 na 1930. Ka ọ na-erule 1933, Society ji ụlọ ọrụ redio 403 na-akpọsa okwu ihu ọha ndị dabeere na Bible. Ka oge na-aga, e ji ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ nke Ndịàmà ji ntakịrị ígwè phonograph na okwu Bible ndị e tinyere na tepụ na-aga n’ụzọ buru ibu karị dochie iji redio eme ihe. A maliteere onye ọ bụla gosiri mmasị n’eziokwu Bible ọmụmụ Bible ebe obibi.
MMERI NDỊ E NWERE N’ỤLỌIKPE
N’afọ ndị 1930 na 1940, e jidere ọtụtụ Ndịàmà n’ihi ịrụ ọrụ a, a gbakwara mgba n’ụlọikpe dị iche iche iji chebe nnwere onwe ikwu okwu, ibipụta akwụkwọ, inwe mgbakọ, na ife ofufe. Na United States, akwụkwọ ndị e tinyere maka mkpegharị ikpe site n’ụlọikpe ndị dị ala mere ka Ndịàmà nwee mmeri n’okwu ikpe 43 n’Ụlọikpe Kasị Elu nke United States. N’otu aka ahụ, e nwewo mkpebi ikpe ndị dị mma n’ụlọikpe ndị dị elu n’ala ndị ọzọ. Banyere mmeri ndị a e nwere n’ụlọikpe, Prọfesọ C. S. Braden, n’akwụkwọ ya bụ́ These Also Believe, kwuru banyere Ndịàmà, sị: “Ha arụwo ọrụ pụrụ iche n’usoro ọchịchị onye kwuo uche ya site na mgba ha gbara ichebe ihe ndị ruuru ha, n’ihi na site na mgba ha, ha arụpụtawo ihe dị ukwuu n’inweta ihe ndị ahụ ruuru mmadụ maka òtù ọ bụla dị nta n’America.”
USORO ỌZỤZỤ PỤRỤ ICHE
J. F. Rutherford nwụrụ na 1942, N. H. Knorr nọchikwara ya dị ka onyeisi oche. A malitere usoro ọzụzụ e kwekọrịtara na ya. Na 1943, a malitere ụlọ akwụkwọ na-enye ọzụzụ pụrụ iche maka ndị ozi ala ọzọ nke a kpọrọ Watchtower Bible School of Gilead. Site mgbe ahụ gaa n’ihu, e zigawo ndị gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ a n’ala dị iche iche gburugburu ụwa. E nwewo ọgbakọ ndị ọhụrụ ná mba ebe ndị a na-enwebughị nke dịnụ, alaka ndị e guzobewokwara ná mba dị iche iche agafewo 100 ugbu a. Site n’oge ruo n’oge, a malitewo ihe ọmụmụ ndị pụrụ iche maka ịzụ ndị okenye ọgbakọ, ndị ọrụ afọ ofufo nọ n’alaka dị iche iche, na ndị na-arụ ọrụ ịgba àmà ahụ oge nile (dị ka ndị ọsụ ụzọ). E mewo ndokwa maka ọtụtụ ụdị agụmakwụkwọ pụrụ iche n’ebe agụmakwụkwọ dị na Patterson, New York.
N. H. Knorr nwụrụ na 1977. Otu n’ime mgbanwe ikpeazụ o so mee ná nzukọ a tupu ọ nwụọ bụ ịmụba ọnụ ọgụgụ nke Òtù Na-achị Isi, ndị nọ n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile dị na Brooklyn. Na 1976, e kere ọrụ nlekọta ma kenye ya kọmitii dị iche iche nke ndị mejupụtara ha bụ́ ndị so n’Òtù Na-achị Isi, bụ́ ndị onye ọ bụla n’ime ha nweworo ahụmahụ ruo ọtụtụ iri afọ dị ka onye ozi.
E WUSAWANYE ỤLỌ ỌRỤ OBIBI AKWỤKWỌ DỊ ICHE ICHE
Akụkọ nke Ndịàmà Jehova n’oge a ejupụtawo n’ihe omume ndị dị ịrịba ama. Site n’otu ntakịrị ọmụmụ Bible nọ na Pennsylvania laa azụ na 1870, Ndịàmà ahụ amụbawo ruo ihe dị ka ọgbakọ 90,000 n’ụwa nile ka ọ na-erule afọ 2000. Na mbụ, ọ bụ ụlọ ọrụ achụmnta ego na-ebipụta akwụkwọ ha nile; e mesịa, na 1920, Ndịàmà ahụ nọ n’ụlọ ọrụ a gbazitere agbazite bipụta akwụkwọ ụfọdụ. Ma malite na 1927 gaa n’ihu, e bipụtara ọtụtụ akwụkwọ karị n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe nke nwere okpukpu asatọ nke dị na Brooklyn, New York, nke ọ bụ Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., nwe. Nke a ebuwanyewo ibu ugbu a gaa n’ụlọ mmepụta ihe ndị ọzọ na ihe owuwu ọfịs. E nwekwara ụlọ ndị ọzọ dị nso na Brooklyn, bụ́ ebe ndị ozi wepụtara onwe ha n’afọ ofufo ilekọta ọrụ ibi akwụkwọ ahụ, ga-ebi. Tụkwasị na nke a, e nwere ugbo na ebe obibi akwụkwọ n’ebe dịdewere Wallkill, n’ebe ugwu New York. Ọ na-ahụ maka ibipụta magazin Ụlọ Nche na Teta!, na-emepụtakwa ụfọdụ n’ime ihe oriri nke ndị ozi na-eje ozi n’ebe dị iche iche na-eri. Onye ọrụ afọ ofufo ọ bụla na-anata ntakịrị ego ụgwọ mmefu kwa ọnwa iji kwụọ ụgwọ mmefu ndị na-adapụtanụ.
MGBAKỌ MBA NILE
Na 1893, e nwere mgbakọ mbụ buru ibu na Chicago, Illinois, U.S.A. Mmadụ 360 bịara, e mekwara ndị ọhụrụ 70 baptism. E nwere otu mgbakọ mba nile ikpeazụ buru ibu na New York City na 1958. E ji ma Ámá Egwuregwu Yankee ma Polo Grounds bụ́ nke dị mgbe ahụ mee ihe. Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịaranụ bụ 253,922; ndị ọhụrụ e mere baptism dị 7,136. Kemgbe ahụ, e nwewo mgbakọ mba nile n’usoro dị iche iche n’ọtụtụ mba. N’ozuzu, usoro ndị ahụ pụrụ ịgụnye otu puku mgbakọ n’ala dị iche iche gburugburu ụwa.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]
Ọrụ pụrụ iche n’inweta nnwere onwe ndị ruuru mmadụ
[Foto dị na peeji nke 6]
“Ụlọ Nche,” malite ná mkpụrụ 6,000 n’otu asụsụ gaa n’ihe karịrị 22,000,000 n’ihe karịrị asụsụ 132
[Foto dị na peeji nke 7]
Oge oké mgbanwe n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ
[Foto zuru ihu peeji na peeji nke 10]