Usoro Iji Zụlite Ikike Dị Ka Ọkà Okwu na Onye Ozizi
MA Ị̀ bụ nwata ma ị̀ bụ onye kataworo ahụ́, nwoke ma ọ bụ nwanyị, ihe ọmụmụ a pụrụ inyere gị aka ịdịkwu irè n’ikwupụta ihe i bu n’obi n’ụzọ dị irè karị na iru eru karị dị ka onye na-ezi Okwu Chineke.
Ọ bụ onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga na-enye ndị debanyere aha ha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ihe omume. Na peeji atọ ndị na-esonụ, ị ga-ahụ fọm ndụmọdụ okwu nke gị. Nọmba ndị bu isi ihe ndị ahụ ụzọ kwekọrọ n’ihe ọmụmụ ndị dị na peeji ndị na-esonụ. N’ihe ọmụmụ ndị ahụ, ị ga-ahụ nkọwa nke ihe ịmụta akụkụ ndị a metụtara ikwu okwu na izi ihe gụnyere nakwa ihe mere nke ọ bụla ji dị mkpa. Ị ga-ahụkwa ntụziaka na-enye aka banyere ụzọ isi mezuo ihe a na-atụ aro ya.
Àgwà e ji arịba ihe ama nke dị na fọm ndụmọdụ okwu ahụ na-egosi isi ihe ndị a ga-eji mee ihe n’ihe omume ndị gụnyere (1) ịgụrụ ndị na-ege ntị ihe, (2) ihe ngosi nke mmadụ abụọ ma ọ bụ karị ga-eme, ma ọ bụ (3) okwu a ga-agwa ọgbakọ. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekenye gị isi ihe ị ga-arụ ọrụ na ya. Ọ ka mma ịrụ ọrụ nanị n’otu isi ihe n’otu oge. Ị ga-erite uru site n’ime ihe omume ndị a tụrụ aro ha ná ngwụsị nke ihe ọmụmụ e kenyere gị. Ọ bụrụ na i gosi na i tinyewo ndụmọdụ dị n’ihe ọmụmụ ahụ e kenyere gị n’ọrụ nke ọma, onye ndụmọdụ gị ga-ekenye gị isi ihe ọzọ.
Ọ bụrụ na ị gaje ime ihe omume gị n’ụdị ihe ngosi, ọ ga-adị mkpa ka i nwee ọnọdụ okwu. E nwere ndepụta nke ọnọdụ okwu dị iche iche na peeji nke 82, ma ọ bụghị nanị ndị dị ná ndepụta a ka ị pụrụ iji mee ihe. Onye ndụmọdụ gị pụrụ ịtụ aro ka ị nwalee otu ọnọdụ okwu ka i wee nweta ahụmahụ, ma ọ bụ ọ pụrụ ịhapụ gị ka ị họrọ n’onwe gị.
Ịgụ akwụkwọ a na ime ihe omume ndị dị na ya, ọbụna mgbe ị na-adịghị akwadebe ihe omume ị ga-eme n’ụlọ akwụkwọ a, pụrụ ịtụnye ụtụ dị ukwuu n’ọganihu gị. Ikekwe, ị pụrụ ịgụcha otu ihe ọmụmụ n’ihe dị ka otu izu.
N’agbanyeghị afọ ole ị nọworo na-ekere òkè n’ụlọ akwụkwọ a ma ọ bụ na-ekere òkè n’ozi ubi, ị ka pụrụ imeziwanye ihe. Rite uru n’ụzọ zuru ezu ná mmụta a na-enye n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.