Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be ihe ọmụmụ 12 p. 121-p. 123 para. 3
  • Mmegharị Ahụ́ na Ọdịdị Ihu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmegharị Ahụ́ na Ọdịdị Ihu
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịnụ Ọkụ n’Obi
    Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
  • Ikwu Okwu Ka Ebe Mmadụ na Ibe Ya Na-akparịta Ụka
    Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
  • Jiri Mmetụta Kwuo Okwu
    Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be ihe ọmụmụ 12 p. 121-p. 123 para. 3

IHE ỌMỤMỤ NKE 12

Mmegharị Ahụ́ na Ọdịdị Ihu

Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

Jiri mmegharị aka, ubu, ma ọ bụ ahụ́ dum gosipụta echiche, mmetụta, ma ọ bụ àgwà.

Jiri anya na ọnụ nakwa otú i si debe isi mesie okwu i kwuru ike ma gosi mmetụta.

Gịnị mere o ji dị mkpa?

Mmegharị ahụ́ na ọdịdị ihu na-emesikwu okwu gị ike site n’ihe anya na-ahụ na mmetụta uche ọ na-eme ka e nwee. Ha pụrụ ịkpali mmetụta gị n’ihi ya kwa mee ka ụda olu gị dịkwuo ụtọ.

NDỊ si n’ebe ụfọdụ na-emegharị ahụ́ n’okwu nke ọma karịa ndị a zụlitere n’ebe ndị ọzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla na-agbanwe ọdịdị ihu ya ma na-emegharị ahụ́ n’ụzọ ụfọdụ mgbe ọ na-ekwu okwu. Nke a bụ eziokwu ma ná mkparịta ụka nke mmadụ na ibe ya ma mgbe a na-ekwu okwu n’ihu ọha.

Imegharị ahụ́ maara Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nke oge mbụ ahụ́. N’otu oge, otu onye kọọrọ Jizọs na nne ya na ụmụnne ya ndị ikom chọrọ ịgwa ya okwu. Jizọs zaghachiri, sị: “Ònye bụ nne m, olee ndị bụkwa ụmụnne m ndị ikom?” Mgbe ahụ Bible kwukwasịrị: “Ka ọ gbatịpụrụ aka gaa n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ, ọ sịrị: ‘Lee! Nne m na ụmụnne m ndị ikom!’” (Mat. 12:48, 49) Tụkwasị n’izo aka ndị ọzọ, Bible na-egosi n’Ọrụ 12:17 na 13:16 na ndịozi bụ́ Pita na Pọl megharịkwara ahụ́ n’ụzọ bịaara onwe ya.

Ọ bụghị nanị ụda olu ka a na-eji eme ka a mata echiche na mmetụta kama a na-ejikwa mmegharị ahụ́ na ọdịdị ihu. Ejighị ha mee ihe nke ọma nwere ike ime ka e chee na onye ahụ na-ekwu okwu nwere omume ọ̀ gbasara m. Ma mgbe e jikọtara ụzọ ndị a nke nzirịta ozi nke ọma, ihe a na-ekwu na-adị nnọọ irè karị. Ọbụna mgbe ị na-ekwu okwu na telifon, ọ bụrụ na i megharịa ahụ́ ma gosi ọdịdị ihu kwesịrị ekwesị, ụda olu gị ga-egosipụta n’ụzọ pụtara ìhè karị ịdị mkpa nke ozi gị nakwa mmetụta gị banyere ihe ị na-ekwu. Ya mere, ma ị̀ na-ekwu okwu n’agụghị ya agụ ma ị̀ na-agụpụta ihe, ma ndị na-ege gị ntị hà na-ele gị anya ma hà na-ele anya na Bible ha, mmegharị ahụ́ na ọdịdị ihu gị bara uru.

Mmegharị ahụ́ na ọdịdị ihu gị ekwesighị ịbụ nke a gụtara n’akwụkwọ. Ị mụtaghị otú e si achị ọchị ma ọ bụ otú e si ewe iwe amụta. Mmegharị ahụ́ kwesịkwara igosipụta mmetụta ndị dị gị n’ime obi. Ọ na-aka mma ma ọ bụrụ na mmegharị ahụ́ gị na-abịara onwe ya.

E nwere ụdị mmegharị ahụ́ abụọ bụ́ isi: nke e ji na-akọwa ihe na nke e ji emesi okwu ike. Mmegharị ahụ́ e ji akọwa ihe na-egosi ihe merenụ ma ọ bụ otú ihe hà na ebe a na-ekwu maka ya. N’ụlọ akwụkwọ, mgbe ị na-arụ ọrụ ná mmegharị ahụ́, akwụsịla ma i megharịa ahụ́ nanị otu ugboro ma ọ bụ abụọ. Gbalịa imegharị ahụ́ otú ị na-esi emegharị ahụ́ kwa ụbọchị n’oge dum okwu gị na-aga n’ihu. Ọ bụrụ na ime nke a na-esiri gị ike, ị pụrụ ịhụ na ọ na-enye aka ịchọ okwu ndị na-egosi akụkụ ebe ihe dị, ịdị anya, otú ihe hà, ebe ihe dị, ma ọ bụ ebe ihe dị site n’ibe ya. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe nanị ihe dị gị mkpa bụ itinye uche gị dum n’okwu gị, n’echegbughị onwe gị banyere ihe ndị mmadụ na-eche, kama ịdị na-ekwu okwu ma na-eme ihe otú i si eme ha kwa ụbọchị. Mgbe ahụ́ ruru mmadụ ala, mmegharị ahụ́ na-abịa n’onwe ya.

Mmegharị ahụ́ e ji emesi okwu ike na-egosipụta mmetụta na ikwenyesi ike n’ihe. Ọ na-eme ka echiche dị iche iche pụta ìhè, kpoo ọkụ, ma bụrụ ndị e mesiri ike. Mmegharị ahụ́ e ji emesi okwu ike dị mkpa. Ma, kpachara anya! Mmegharị ahụ́ e ji emesi okwu ike pụrụ ịghọ àgwà maara mmadụ ahụ́ n’ụzọ dị mfe. Ọ bụrụ na i jiri otu ụdị mmegharị ahụ́ ahụ mee ihe ugboro ugboro, ọ pụrụ ịmalite ịdọrọ mmasị ndị mmadụ kama ime ka okwu gị ka mma. Ọ bụrụ na onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ekwuo na i nwere nsogbu a, gbalịa ịdị na-eji nanị mmegharị ahụ́ ndị e ji akọwa ihe na-eme ihe ruo oge ụfọdụ. E mesịa, maliteghachi iji mmegharị ahụ́ e ji emesi okwu ike na-eme ihe.

Iji chọpụta ókè i kwesịrị ijiru mmegharị ahụ́ e ji emesi okwu ike mee ihe nakwa ụdị imegharị ahụ́ ndị kwesịrị ekwesị, chebara mmetụta nke ndị ị na-agwa okwu echiche. Ịtụ ndị na-ege ntị aka pụrụ ime ka ahụ́ ghara iru ha ala. N’ọdịbendị ụfọdụ, ọ bụrụ na nwoke emegharịa ahụ́ n’ụzọ ụfọdụ, dị ka ikpuchi aka n’ọnụ ya iji gosi na ihe juru ya anya, a ga-ele nke a anya dị ka nwoke ime ka nwanyị. N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, a na-ewere ya dị ka ihe na-ezighị ezi bụ́ ụmụ nwanyị imegharị aka otú o si masị ha mgbe ha na-ekwu okwu. Ya mere n’ebe ndị ahụ, ọ dị ụmụnna nwanyị mkpa karịsịa iji ọdịdị ihu ha eme ihe nke ọma. A pụkwara ile imegharị ahụ́ gabiga ókè n’ihu ìgwè dị ntakịrị anya dị ka ihe na-atọ ọchị n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’akụkụ ọ bụla nke ụwa.

Ka ị na-enwekwu ahụmahụ ma na-enwekwu ahụ́ iru ala mgbe ị na-ekwu okwu, mmegharị ahụ́ ọ bụla e ji emesi okwu ike nke i mere ga-egosipụta mmetụta nke si gị n’obi, gosi nkwenyesi ike gị nakwa obi eziokwu gị. Ha ga-eme ka a na-aghọta okwu gị karị.

Ọdịdị Ihu Gị. Karịa akụkụ ahụ́ ọ bụla ọzọ, ihu gị na-egosikarị mmetụta i nwere n’ezie. Anya gị, otú ọnụ gị dị, akụkụ ebe i wefere isi gị, ha nile na-ekerecha òkè. N’ekwughị otu mkpụrụ okwu, ihu gị pụrụ igosi enweghị mmasị, ịkpọasị, ịnọ ná mgbagwoju anya, ihe ijuanya, ma ọ bụ obi ụtọ. Mgbe e jikọrọ ọdịdị ihu dị otú ahụ na okwu ọnụ, ọ na-eme ka e nwekwuo mmetụta site n’ihe anya na-ahụ na mmetụta uche ọ na-eme ka e nwee. Onye Okike etinyewo ọtụtụ uru ahụ́ n’ihu gị—ihe karịrị 30 ná ngụkọta. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara n’ime ha na-arụ ọrụ mgbe ị na-amụmụ ọnụ ọchị.

Ma ị̀ nọ n’elu ikpo okwu ma ị̀ na-ekere òkè n’ozi ubi, ị na-eme mgbalị ịkọrọ ndị mmadụ ozi na-enye obi ụtọ, nke pụrụ ime ka obi ha ṅụrịa. Ịmụmụ ọnụ ọchị n’ụzọ obiọma na-egosipụta na nke ahụ bụ eziokwu. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na e nweghị mmetụta ihu gị na-egosi, nke a pụrụ ime ka e nwee obi abụọ ma ihe ị na-ekwu ò sikwa gị n’obi.

Ọzọkwa, ịmụmụ ọnụ ọchị na-agwa ndị ọzọ na obi dị gị mma n’ebe ha nọ. Nke ahụ dị mkpa karịsịa n’ụbọchị ndị a ndị mmadụ na-atụkarị ndị ha na-amabughị ụjọ. Ịmụmụ ọnụ ọchị pụrụ inyere ndị mmadụ aka inwe ahụ́ iru ala ma nabata ihe ị na-ekwu karị.

ISI IHE NDỊ Ị GA-EBURU N’UCHE

  • Mmegharị ahụ́ na ọdịdị ihu ndị kasị dị irè na-esite n’obi mmadụ. Leruo ihe ndị ọzọ na-eme anya, ma anwala iṅomi ha n’ụzọ nile.

  • Mụọ ihe ị ga-eji kwuo okwu gị ruo mgbe ị maara ya nke ọma. Ghọta mmetụta ọ na-egosipụta, jiri anya nke uche na-ahụ ya, mgbe ahụ jirikwa ụda olu gị, aka gị, na ọdịdị ihu gị wepụta ya.

IHE OMUME: (1) Gụọ Jenesis 6:13-22. N’okwu nke aka gị, kọwaa otú e si wuo ụgbọ ahụ na otú e si chịkọbata ụmụ anụmanụ. Enyela onwe gị nsogbu ịkọcha ihe nile; nanị kọọ ihe i chetara. Jiri mmegharị ahụ́ e ji akọwa ihe mee ihe mgbe ị na-akọ ya. Gwa mmadụ ka ọ na-ele gị anya ma kwuo ihe ọ hụrụ. (2) Kwuo okwu dị ka a ga-asị na ị na-agbara mmadụ àmà banyere Alaeze Chineke na ngọzi ndị ọ ga-eweta. Jide n’aka na ọdịdị ihu gị na-egosi ihe i chere n’ezie banyere ihe ndị ị na-akọwa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya