IHE ỌMỤMỤ NKE 16
Ahụ́ Iru Ala
AHỤ́ ịma ọkà okwu jijiji mgbe o biliri ikwu okwu abụghị ihe ọhụrụ, karịsịa ma ọ bụrụ na ọ dịghị ekwu okwu ọtụtụ ugboro. Ahụ́ pụrụ ịmatụ onye nkwusa jijiji mgbe o mere nleta ndị mbụ ya n’ozi ubi n’ụbọchị. Mgbe e nyere Jeremaịa ọrụ ịbụ onye amụma, ọ zara, sị: “Amaghị m ikwu okwu, n’ihi na nwata ka m bụ.” (Jer. 1:5, 6) Jehova nyeere Jeremaịa aka, ọ ga-enyekwara gị aka. Ka oge na-aga, ị pụrụ ịmalite inwe ahụ́ iru ala.
Ọkà okwu ahụ́ ruru ala na-enwe obi ruru ala. Obi iru ala a na-apụta ìhè n’otú o si anọ. Otú o si anọ na-adaba adaba ma kwesị ihe ọ na-eme. Ọ na-achịkwa otú o si emegharị aka. Ụda olu ya na-egosipụta mmetụta ya ma bụrụ nke a chịkwara achịkwa.
Ọ bụ ezie na ị pụrụ iche na i kwekọghị ná nkọwa a e nyere banyere onye ahụ́ ruru ala, ị pụrụ imeziwanye ihe. N’ụzọ dị aṅaa? Ka anyị tụlee ihe mere ahụ́ na-eji ama ọkà okwu jijiji nakwa ihe ọ na-ejighị enwe ahụ́ iru ala. Ọ pụrụ ịbụ otú ahụ́ si arụ ọrụ na-akpata ya.
Mgbe ị na-eche ihe ịma aka ihu ma chọọ ime nke ọma ma i jighị n’aka ma ị̀ ga-eme nke ọma, ị na-enwe nchegbu. N’ihi ya, ụbụrụ gị na-ezigara ahụ́ gị ozi ka o mepụtakwuo mmiri ahụ́ bụ́ adrenaline. Mmepụta ahụ o mepụtara adrenaline pụrụ ịkpata obi gị ịkụ ngwa ngwa karị, mgbanwe n’otú i si eku ume, ọsụsọ ịgbakwu gị, ma ọ bụ ọbụna aka gị na ikpere gị ịma jijiji nakwa ụda olu gị ịma jijiji. Ahụ́ gị na-agbalị inyere gị aka imeri ọnọdụ ị na-eche ihu site n’ịmụba ike i nwere. Ihe bụ́ nsogbu bụ iji ume ọrụ ahụ e mepụtakwuru mee ihe n’iche echiche n’ụzọ ga-arụpụta ezi ihe na iji ịnụ ọkụ n’obi kwuo okwu.
Ụzọ Isi Belata Nchegbu. Cheta na inwetụ nchegbu bụ ihe dị otú o kwesịrị. Otú ọ dị, iji nọgide na-enwe ahụ́ iru ala ọ dị gị mkpa inwe ike ibelata nchegbu ị na-enwe ma nagide ọnọdụ gị n’ụzọ dị jụụ, nke ùgwù dịkwa na ya. Olee otú ị pụrụ isi mezuo nke a?
Kwadebe nke ọma. Tinye oge n’ịkwadebe okwu gị. Jide n’aka na ị ghọtara isiokwu gị nke ọma. Ọ bụrụ na okwu gị bụ nke ọ bụ gị ga-ahọrọ isi ihe ndị ị ga-ekwu, chee echiche ihe ndị ga-ege gị ntị marawooro banyere isiokwu ahụ na ihe ị na-atụ anya ịrụzu. Nke a ga-enyere gị aka ịhọrọ ihe ọmụma kasị baa uru. Ọ bụrụ na o siiri gị ike ná mmalite, soro ọkà okwu nwere ahụmahụ kwurịta nsogbu ahụ. Ọ pụrụ inyere gị aka inyocha ihe ọmụma gị na ndị ga-ege gị ntị n’ụzọ ga-arụpụta ihe. Mgbe i ji n’aka na i nwere ihe ọmụma ga-abara ndị ga-ege gị ntị uru nakwa na ha doro gị anya, ọchịchọ gị isoro ha kerịta ya ga-amalite ịnọchi nchegbu ị pụrụ inwe banyere ikwu ya.
Chebara okwu mmeghe gị echiche karịsịa. Mara otú ị ga-esi malite. Ozugbo ị malitere okwu gị, o yikarịrị ka ahụ́ ịma jijiji gị ọ ga-ebelata.
A pụkwara iji ụkpụrụ ndị ahụ bụ́ isi mee ihe mgbe a na-akwadebe ozi ubi. Tụlee ọ bụghị nanị isiokwu ị na-eme atụmatụ iso ndị mmadu kwurịta kamakwa ụdị ndị ị ga-agbara àmà. Jiri nlezianya hazie okwu mmeghe gị. Rite uru site n’ahụmahụ nke ndị nkwusa tozuru okè.
Ị pụrụ iche na ahụ́ ga-eru gị ala karị ma i jiri okwu a ga-agụ agụ mee ihe mgbe ị na-ekwu okwu n’ihu ìgwè mmadụ. N’ezie, nke a pụrụ ịkpata inwekwu nchegbu mgbe ọ bụla ị ga-ekwu okwu. Ọ bụ eziokwu na ndị ọkà okwu ụfọdụ na-edepụta ọtụtụ ihe, ebe ndị ọzọ na-edepụta ihe ole na ole. Ma ihe ga-agbanwe ihe ị na-eche ma belata nchegbu gị abụghị ihe e dere n’akwụkwọ, kama ikwenyesi ike n’obi gị na ihe ị kwadebeere ndị ga-ege gị ntị bara uru n’ezie.
Kwupụta ya ekwupụta mgbe ị na-amụgharị otú ị ga-esi kwuo okwu gị. Mmụgharị ihe dị otú ahụ ga-eme ka i nwee obi ike na ị pụrụ ikwupụta ihe ndị i bu n’uche. Ka ị na-amụgharị ihe, ị na-azụlite usoro ncheta ihe nke a pụrụ ịkpali ngwa ngwa mgbe ị na-ekwu okwu gị. Mee ka oge mmụgharị ihe gị bụrụ nke ezi uche dị na ya. Jiri anya nke uche na-ahụ ndị ga-ege gị ntị. Nọrọ na tebụl ma ọ bụ guzoro ọtọ, otú ị ga-anọ mgbe ị na-ekwu okwu.
Kpegara Jehova ekpere maka enyemaka. Ọ̀ ga-aza ụdị ekpere ahụ? “Nke a bụkwa obi ike nke anyị nwere n’ebe ọ nọ, na, n’agbanyeghị ihe ọ bụ nke anyị na-arịọ dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.” (1 Jọn 5:14) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịsọpụrụ Chineke na inyere ndị mmadụ aka irite uru n’Okwu ya, n’ezie ọ ga-aza ekpere gị. Mmesi obi ike ahụ pụrụ iwusi gị ike nke ukwuu ime ihe omume gị. Ọzọkwa, ka ị na-azụlite mkpụrụ nke mmụọ nsọ—ịhụnanya, ọṅụ, udo, ịdị nwayọọ, na njide onwe onye—ị ga-azụlite echiche uche a chọrọ iji jiri ahụ́ iru ala merie ọnọdụ dị iche iche.—Gal. 5:22, 23.
Nweta ahụmahụ. Ka ị na-ekerekwu òkè n’ozi ubi, otú ahụ ka ahụ́ ịma jijiji gị ga na-ebelata. Ka ị na-azakwu ajụjụ ná nzukọ ọgbakọ, ọ ga na-adịrị gị mfe karị ikwu okwu n’ihu ndị ọzọ. Ka ọnụ ọgụgụ okwu ị na-ekwu n’ọgbakọ na-ebukwu ibu, nchegbu ị na-enwe tupu okwu nke ọ bụla ga-ebelata ma eleghị anya. Ị̀ ga-achọ inwekwu ohere ikwu okwu? Mgbe ahụ wepụta onwe gị ịnọchi anya onye ọzọ mgbe ndị ọzọ na-enweghị ike ime ihe omume ha.
Mgbe i mesịworo ihe ndị ahụ e depụtara n’elu, ị ga-ahụ na ọ na-aba uru inyocha mgbaàmà ndị na-egosi, n’ehieghị ụzọ, enweghị obi iru ala. Ịmata mgbaàmà ndị ahụ na ịmata ụzọ isi merie ha ga-enyere gị aka iji ahụ́ iru ala na-ekwu okwu. Mgbaàmà ndị ahụ pụrụ ịbụ ndị nke ahụ́ ma ọ bụ ụda olu.
Mgbaàmà nke Ahụ́. Gị inwe ahụ́ iru ala, ma ọ bụ enweghị ya, na-apụta ìhè n’otú i si anọ na otú i si eji aka gị eme ihe. Buru ụzọ tụlee ihe banyere aka. Aka a kụkụchiri n’azụ, ndị e debere n’akụkụ n’emegharịghị ha emegharị, ma ọ bụ ijidesi ebe ọkà okwu na-atụkwasị akwụkwọ ike; itinye na iwepụta aka n’akpa uwe ọtụtụ ugboro, ịdị na-akpọchi ma na-akpọghe jaket gị, ịhịa aka na ntì, imi, na n’enyo anya gị; ịdị na-ebitụgharị aka n’elekere mgbanaka, pensịl, mgbaaka, ma ọ bụ n’ihe ndị e deturu; mmegharị aka n’ụzọ na-ama jijiji ma ọ bụ n’ụzọ na-erughị n’isi—ihe a nile na-egosicha ahụ́ erughị ala.
Edebeghị ụkwụ otu ebe, mmadụ ibugharị onwe ya site n’otu akụkụ gaa n’ọzọ, iguzoro ka osisi, ịyọsara ayọsara, ịracha egbugbere ọnụ ọtụtụ ugboro, ilo asọ mmiri ugboro ugboro, na iku ume ọkụ ọkụ pụkwara igosicha enweghị obi ike.
Site n’itinyesi mgbalị ike, a pụrụ ịchịkwa ihe ndị a na-egosi ahụ́ ịma jijiji. Rụọ ọrụ nanị n’otu otu mgbe. Chọpụta ihe bụ́ nsogbu, ma buru ụzọ tụlee ihe ọ dị mkpa ka i mee iji gbochie ya. Ọ bụrụ na i tinye mgbalị, ị ga-enye ihe àmà na ahụ́ ruru gị ala site n’otú i si anọ.
Mgbaàmà n’Ụda Olu. Ihe àmà ndị na-egosi ahụ́ ịma jijiji n’ụda olu pụrụ ịgụnye ọdịdị ụda olu dị oké elu ma ọ bụ nke na-ama jijiji. Ikekwe ị na-akwacha akpịrị gị ugboro ugboro ma ọ bụ na-ekwu okwu oké ngwa ngwa. A pụrụ imeri nsogbu na àgwà ndị a maara mmadụ ahụ́ site n’itinyesi mgbalị ike n’ịchịkwa ụda olu.
Ọ bụrụ na ahụ́ na-ama gị jijiji, kwụsịtụ ma kute ume nke ọma ugboro ole na ole tupu ị rịgoro n’elu ikpo okwu. Gbalịsie ike ime ka ahụ́ gị nile nwee ntụsara ahụ́. Kama ịdị na-eche banyere ahụ́ ịma jijiji gị, tụkwasị uche n’ihe mere i ji chọọ isoro ndị ga-ege gị ntị kerịta ihe ndị ị kwadebere. Tupu ị malite ikwu okwu, cheretụ ma lee ndị na-ege gị ntị anya, chọpụta onye nwere omume enyi ma mụmụọ ọnụ ọchị. Jiri nwayọọ nwayọọ kwuo okwu mmeghe gị, banyezie n’ime okwu gị.
Ihe Ị Ga-Atụ Anya Ya. Atụla anya ka mmetụta nile nke ahụ́ ịma jijiji ghara ịdịkwa. Ahụ́ na-ama ọtụtụ ndị ọkà okwu kwuworo okwu ruo ọtụtụ afọ jijiji tupu ha apụta n’ihu ndị na-ege ntị. Otú ọ dị, ha amụtawo ịchịkwa ahụ́ ịma jijiji ha. Otu ọkà okwu dị otú ahụ kwuru, sị: “Ahụ́ ka na-ama m jijiji, ma ugbu a ana m achịkwa ya.”
Ọ bụrụ na i mee ezigbo mgbalị iji kwụsị ihe ndị a pụtara ìhè na-egosi ahụ́ ịma jijiji, ndị na-ege gị ntị ga-ewere gị dị ka ọkà okwu ahụ́ ruru ala. Ahụ́ ka pụrụ ịdị na-ama gị jijiji, ma ha agaghị ama ma ọlị.
Cheta na mmepụta nke adrenaline bụ́ nke na-akpata mgbaàmà nke ahụ́ ịma jijiji na-emekwa ka i nwekwuo ume ọrụ. Jiri ya kwuo okwu n’ụzọ nwere mmetụta.
Ọ dịghị mkpa ka i chere ruo mgbe ị rịgooro n’elu ikpo okwu tupu ị malite ịmụgharị ihe ndị a. Mụta inwe ahụ́ iru ala na ịchịkwa onwe gị na iji mmetụta kwesịrị ekwesị na-ekwu okwu ná ndụ gị kwa ụbọchị. Gị ime otú ahụ ga-enye aka nke ukwuu n’ime ka i nwee obi ike n’elu ikpo okwu na n’ozi ubi, bụ́ ebe ọ dị mkpa karịsịa.