IHE ỌMỤMỤ NKE 34
Ọ Na-ewuli Elu Ma Bụrụ nke A Pụrụ Iji Mee Ihe
OZI e nyere anyị ọrụ izisa bụ ozi ọma. Jizọs sịrị: “A ghaghị ibu ụzọ kwusaa ozi ọma ahụ ná mba nile.” (Mak 13:10) Jizọs n’onwe ya setịpụrụ ihe nlereanya a ga-agbaso site n’ikwusa “ozi ọma banyere alaeze Chineke.” (Luk 4:43) A kọwakwara ihe ndịozi kwusara dị ka “ozi ọma Chineke” nakwa “ozi ọma banyere Kraịst ahụ.” (1 Tesa. 2:2; 2 Kọr. 2:12) Ụdị ozi ahụ na-ewuli elu ma bụrụ nke a pụrụ iji mee ihe.
N’ikwekọ ná nkwusa “ozi ọma ebighị ebi” nke “mmụọ ozi . . . na-efegharị n’etiti eluigwe” na-ekwusa, anyị na-agba ndị mmadụ ume, sị: “Na-atụnụ Chineke egwu, na-enyekwa ya otuto.” (Mkpu. 14:6, 7) Anyị na-agwa ndị mmadụ n’ebe nile banyere ezi Chineke ahụ, aha ya, àgwà ya magburu onwe ha, oké ọrụ ya dị iche iche, nzube ịhụnanya ya, ihe ndị ọ chọrọ n’aka anyị, nakwa na anyị ga-aza ajụjụ n’ihu ya. Ozi ọma ahụ na-agụnye eziokwu bụ́ na Jehova Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume, ndị na-adịghị asọpụrụ ya, ndị na-emebiri ụmụ mmadụ ndị ọzọ ndụ. Ma ọ bụghị ọrụ anyị ikpe ndị anyị na-ekwusara ozi ọma ikpe. Ihe anyị chọsiri ike bụ ka ọtụtụ mmadụ, ruo n’ókè o kwere mee, ṅaa ntị n’ozi Bible ka o wee bụrụ ozi ọma n’ezie nye ha.—Ilu 2:20-22; Jọn 5:22.
Mee Ka Isiokwu Ndị Na-akụda Mmụọ Dị Ntakịrị. N’ezie, e nwere ihe ndị na-akụda mmụọ ná ndụ. Anyị adịghị eleghara ha anya. Iji malite mkparịta ụka, ị pụrụ iwelite otu nsogbu nke na-echegbu ndị nọ n’ókèala unu ma soro ha kwurịta ya ná mkpirikpi. Ma ọ dịghị abakebe uru ikwute ya aka. Ndị mmadụ na-anụ akụkọ ọjọọ mgbe nile, ya mere ikwu banyere ihe ndị na-adịghị enye obi ụtọ pụrụ ime ka ha mechie ụzọ ha ma ọ bụ ntị ha. Ná mmalite mkparịta ụka gị, gbalịa ịdọrọ uche ha gaa n’eziokwu na-enye ume ọhụrụ ndị dị n’Okwu Chineke. (Mkpu. 22:17) Mgbe ahụ, ọ bụrụgodị na onye ahụ achọghị ịga n’ihu ná mkparịta ụka ahụ, ị ga-agwaworị ya ihe na-ewuli elu ọ ga-echebara echiche. Nke a pụrụ ime ka ọ dịkwuo njikere ige ntị n’oge ọzọ.
N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na a kpọrọ gị ikwu okwu, agwala ndị na-ege ntị banyere ihe ndị na-akụda mmụọ gabiga ókè nanị n’ihi na ha bara ụba. Ọ bụrụ na onye ọkà okwu ekwuo okwu ruo ogologo oge banyere ihe ndị ọchịchị bụ́ mmadụ na-emelighị, akụkọ banyere mpụ na ime ihe ike, nakwa njupụta omume rụrụ arụ jupụtara ebe nile n’ụzọ na-awụ akpata oyi n’ahụ́, ọ pụrụ ịdị na-akụda mmụọ. Webata akụkụ ndị na-akụda mmụọ n’ihe ị na-ekwu nanị ma ọ bụrụ na ha ga-aba uru. Iwebata ntakịrị n’ime ụdị ihe ọmụma ahụ pụrụ imesi ike otú okwu gị si bịa n’oge ya. Ọ pụkwara ime ka a mata isi ihe ndị so na-akpata otu ọnọdụ, n’ihi ya, jiri ya gosi ihe mere ihe ngwọta e nyere n’ime Bible ji dị irè. N’ebe o kwere mee, kpọọ okwu aha n’ekwughị okwu ruo ogologo oge banyere nsogbu ndị ahụ.
Ọ naghị ekwekebe omume, ọ dịghịkwa mma bụ́ iwepụcha ihe nile na-akụda mmụọ n’okwu. Ihe bụ́ ihe ịma aka bụ ijikọta ndị dị mma na ndị na-akụda mmụọ n’ụzọ ga-eme ka o nwee mmetụta dị mma n’ozuzu ya. Iji mezuo nke a, ị ghaghị ikpebi ihe ị ga-ewebata, ihe ị ga-ahapụ, na ebe a ga-emesi ike. N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, Jizọs dụrụ ndị na-ege ya ntị ọdụ ka ha zere omume ịchọ ọdịmma onwe onye nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, o nyekwara ihe atụ ole na ole iji mee ka o doo anya. (Mat. 6:1, 2, 5, 16) Otú ọ dị, kama ikwuwe okwu banyere ihe nlereanya na-adịghị mma nke ndị ndú okpukpe ahụ, Jizọs mesiri ịghọta ezi ụzọ nile nke Chineke na ibi ndụ kwekọrọ na ha ike. (Mat. 6:3, 4, 6-15, 17-34) O nwere mmetụta bara nnọọ uru.
Mee Ka Ọ Bụrụ nke A Pụrụ Iji Mee Ihe. Ọ bụrụ na e kenyere gị ikwu okwu n’ọgbakọ unu banyere otu akụkụ nke ọrụ Ndị Kraịst, gbalịsie ike ịdị na-ewuli elu kama ịdị na-eme nkatọ. Jide n’aka na ị na-eme ihe ị na-agba ndị ọzọ ume ime. (Rom 2:21, 22; Hib. 13:7) Ka ọ bụrụ ịhụnanya na-akpali ihe ndị ị na-ekwu, ọ bụghị iwe. (2 Kọr. 2:4) Ọ bụrụ na i nwere obi ike na ndị kwere ekwe ibe gị chọrọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ, ihe ị na-ekwu ga-egosipụta obi ike ahụ, nke a ga-enwekwa mmetụta dị mma. Rịba ama otú Pọl onyeozi si gosipụta ụdị obi ike ahụ, dị ka e dekọrọ ya ná 1 Ndị Tesalonaịka 4:1-12; 2 Ndị Tesalonaịka 3:4, 5; nakwa na Faịlimọn 4, 8-14, 21.
Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mkpa ka ndị okenye nye ịdọ aka ná ntị banyere omume amamihe na-adịghị na ya. Ma ịdị umeala n’obi ga-enyere ha aka iji mmụọ dị nwayọọ mesoo ụmụnna ha. (Gal. 6:1) Otú e si ekwu okwu kwesịrị igosi na a na-ele ndị nọ n’ọgbakọ anya n’ụzọ nkwanye ùgwù. (1 Pita 5:2, 3) Bible na-adụ ụmụ okorobịa ọdụ ka ha mara nke a karịsịa. (1 Tim. 4:12; 5:1, 2; 1 Pita 5:5) Mgbe ọ dị mkpa ịdọ aka ná ntị, inye ọzụzụ, ime ka ihe guzozie, e kwesịrị ime nke a na-adabere n’ihe Bible n’onwe ya na-ekwu. (2 Tim. 3:16) E kwesịghị iji Akwụkwọ Nsọ mee ihe n’ebe ọ na-adabaghị ma ọ bụ hịgharịa ya iji kwadoo otu echiche nke ọkà okwu kwenyesiri ike na ya. Ọbụna mgbe ọ dị mkpa inye ndụmọdụ iji nye mgbazi, a pụrụ ime ka okwu ahụ bụrụ nke na-ewuli elu ma ọ bụrụ na e mesie ike karịsịa ụzọ isi zere itinye aka n’omume ọjọọ, ụzọ isi dozie nsogbu, ụzọ isi merie ihe isi ike, ụzọ isi gbazie ụzọ ọjọọ, na otú ihe Jehova chọrọ si echebe anyị.—Ọma 119:1, 9-16.
Mgbe ị na-akwadebe okwu gị, chesie echiche ike otú ị ga-esi mechie isi ihe nke ọ bụla nakwa okwu ahụ dum. A na-echetakarị ihe ikpeazụ e kwuru ruo ogologo oge karịsịa. Ọ̀ ga-abụ ihe na-ewuli elu?
Mgbe Gị na Ndị Kwere Ekwe Ibe Gị Na-enwe Mkparịta Ụka. Ndị ohu Jehova na-eji ohere inwe mkpakọrita ná nzukọ Ndị Kraịst akpọrọ ihe nke ukwuu. Ha bụ oge na-enye ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ. Bible na-agba anyị ume iburu ‘ịgbarịta ibe anyị ume’ n’uche mgbe anyị zukọtara n’ebe anyị na-anọ efe ofufe. (Hib. 10:25) A na-eme ya ọ bụghị nanị site n’okwu na ịza ajụjụ ná nzukọ kamakwa site ná mkparịta ụka tupu nzukọ amalite na mgbe ọ gbasasịrị.
Ọ bụ ezie na mkparịta ụka na-abụkarị banyere ihe ndị na-eme kwa ụbọchị, agbamume kasịnụ na-abịa site n’ikwurịta ihe ime mmụọ. Ndị a na-agụnye ahụmahụ ndị anyị na-enwe n’ije ozi dị nsọ. Inwe mmasị ziri ezi n’ahụ́ ibe anyị bụkwa ihe na-ewuli elu.
N’ihi mmetụta nke ụwa gbara anyị gburugburu na-enwe, ọ dị mkpa ilezi anya. Mgbe ọ na-edegara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs akwụkwọ, Pọl sịrị: “Ebe unu wepụworo okwu ụgha, ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu.” (Efe. 4:25) Ikwu eziokwu kama ịgha ụgha na-agụnye enyeghị ihe dị iche iche nakwa ndị mmadụ otuto, bụ́ ndị ụwa na-efe ka chi. N’otu aka ahụ, Jizọs dọrọ aka ná ntị banyere “ike dị aghụghọ nke akụ̀.” (Mat. 13:22) Ya mere, mgbe anyị na ndị ibe anyị na-ekwurịta okwu, ọ dị mkpa ka anyị kpachara anya ka anyị ghara ịkwalite aghụghọ ahụ site n’ime ka inwe ihe onwunwe bụrụ ihe na-adọrọ adọrọ.—1 Tim. 6:9, 10.
Mgbe ọ na-adụ ọdụ banyere mkpa ọ dị ịdị na-ewuli elu, Pọl onyeozi gbara anyị ume ka anyị ghara ikpe nwanna ikpe ma ọ bụ ledaa ya anya bụ́ onye pụrụ izere ihe ụfọdụ n’ihi “adịghị ike dị iche iche n’okwukwe ya,” ya bụ, n’ihi na ọ ghọtaghị otú nnwere onwe Ndị Kraịst haruru. N’ezie, ka mkparịta ụka anyị wee na-ewuli ndị ọzọ elu, anyị aghaghị iburu otú e si zụlite ha nakwa ókè ha toruru n’ụzọ ime mmụọ n’uche. Lee ihe mwute ọ ga-abụ ‘idebe ihe ịsụ ngọngọ ma ọ bụ ihe na-akpata mkpọbi ụkwụ n’ihu nwanna’!—Rom 4:1-4, 13, 19.
Ndị na-agbaso nsogbu onwe onye ndị siri ike mgba—dị ka ihe atụ, ọrịa na-adịghị ala ala—na-enwe mmasị ná mkparịta ụka na-ewuli elu. Onye dị otú ahụ pụrụ itinye mgbalị dị ukwuu iji gaa nzukọ. Ndị maara ọnọdụ ya pụrụ ịjụ ya, sị: “Olee otú ị dị?” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ga-enwe mmasị ná nchegbu ha. Otú ọ dị, ikwu banyere ahụ́ ike ya nwere ike ọ gaghị abụ isiokwu ọ na-enwekarịsị mmasị ikwurịta. Agbamume na ịja mma pụrụ ime ka obi dị ya mma karị. Ị̀ na-ahụ ihe àmà na-egosi na ọ ka hụrụ Jehova n’anya nakwa ntachi obi ya n’ọnọdụ siri ike? Ọ̀ na-abụrụ gị ihe agbamume mgbe ọ zara ajụjụ? Ọ́ gaghị abụ ihe na-ewuli elu karị ịdọrọ uche gaa n’ebe ndị ọ dị ike nakwa ụtụ ọ na-atụnye n’ọgbakọ kama ịbụ n’adịghị ike ya?—1 Tesa. 5:11.
Ka mkparịta ụka anyị wee bụrụ nke na-ewuli elu, ọ dị oké mkpa ka anyị buru n’uche ihe bụ́ echiche Jehova banyere ihe anyị na-atụle. N’Izrel oge ochie, Chineke were iwe dị ukwuu megide ndị kwuru okwu megide ndị nnọchiteanya Jehova ma mee mkpesa banyere mana. (Ọnụ Ọgụ. 12:1-16; 21:5, 6) Anyị na-enye ihe àmà na anyị eritewo uru n’ihe nlereanya ndị ahụ mgbe anyị na-akwanyere ndị okenye ùgwù ma jiri nri ime mmụọ a na-enye anyị site n’aka òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche kpọrọ ihe.—1 Tim. 5:17.
Ọ naghị esikebe ike ịchọta ihe ndị bara uru anyị ga-ekwu maka ha mgbe anyị na ụmụnna anyị bụ́ Ndị Kraịst nọ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ihe mmadụ na-ekwu bụ ime oké nkatọ, bute ụzọ n’ịtụgharị mkparịta ụka ahụ gaa n’ihe ndị na-ewuli elu.
Ma ànyị na-agbara ndị ọzọ àmà, na-ekwu okwu n’elu ikpo okwu, ma ọ bụ soro ndị kwere ekwe ibe anyị na-ekwurịta okwu, ka anyị jiri nghọta mee ihe iji wepụta site n’akụ̀ nke obi anyị “okwu ọ bụla dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee nye ndị na-anụ ya ihe dị ụtọ.”—Efe. 4:29.