Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bm nkebi 2 p. 5
  • A Chụpụrụ Ha na Paradaịs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Chụpụrụ Ha na Paradaịs
  • Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Ụdị Ndụ Adam na Iv Biri na Paradaịs?
    Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi
  • Ndị Ọzọ Dị Elu Karịa Anyị
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Adam na Iv Nupụụrụ Chineke Isi
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Anyị Pụrụ Iji Di na Nwunye Mbụ Mụta Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
bm nkebi 2 p. 5

Nkebi nke 2

A Chụpụrụ Ha na Paradaịs

Otu mmụọ ozi nke nupụrụ isi mere ka nwoke mbụ na nwaanyị mbụ bụ́ Adam na Iv jụ ọchịchị Chineke. N’ihi ya, mmehie na ọnwụ batara n’ụwa

OGOLOGO oge tupu Chineke ekee mmadụ, o kere ọtụtụ ndị bụ́ mmụọ, ya bụ, ndị mmụọ ozi. N’Iden, otu mmụọ ozi nke nupụrụ isi, onye e mechara kpọwa Setan bụ́ Ekwensu, ji aghụghọ rata Iv iri mkpụrụ si n’otu osisi Chineke sịrị ha erila.

Setan mere ka à ga-asị na ọ bụ agwọ na-agwa Iv okwu. Okwu Setan pụtara na Chineke na-ezochiri nwaanyị ahụ na di ya ihe ga-abara ha uru. Mmụọ ozi ahụ gwara Iv na ya na di ya agaghị anwụ ma ha rie mkpụrụ osisi ahụ Chineke sịrị ha erila. Setan si otú ahụ bo Chineke ebubo na ọ ghaara ụmụ Ya bụ́ mmadụ ụgha. Onye Nduhie ahụ mere ka inupụrụ Chineke isi yie ihe dị mma, nke ga-emepe ha anya, meekwa ka ha nwere onwe ha. Ma ihe ahụ niile Setan kwuru bụ ụgha. N’eziokwu, ọ bụ ụgha mbụ a ghara n’ụwa. Isi ihe na-ese okwu gbasara ọchịchị Chineke, ya bụ, ma ọ̀ bụ Chineke kwesịrị ịchị nakwa ma ọ̀ na-achị n’ụzọ ziri ezi, nke ga-akacha baara ndị ọ na-achị uru.

Iv kwetara ụgha ahụ Setan ghaara ya. Mkpụrụ osisi ahụ malitere ịdọ ya akpịrị, ya erie ụfọdụ n’ime ha. O mechara nyetụ di ya, ya erie. Ha si otú ahụ ghọọ ndị mmehie. Ihe ahụ ha mere nke yiri ka o nweghị ihe ọ bụ bụ nnupụisi. Adam na Iv kpachaara anya nupụrụ Chineke isi, si otú ahụ jụ ọchịchị Onye kere ha, bụ́ onye nyere ha ihe niile nakwa ndụ zuru okè.

Chineke mara ndị nnupụisi ahụ ikpe. O kwere nkwa na e nwere Mkpụrụ ma ọ bụ Onye Nnapụta ga-abịa gbuo Setan, bụ́ onye agwọ ahụ nọchiri anya ya. Chineke ekweghị ka Adam na Iv nwụọ ozugbo. O si otú ahụ meere ụmụ ha ga-amụta ebere. Ụmụ ahụ ha ga-amụta ga-enwe olileanya n’ihi na Onye ahụ Chineke ga-ezite ga-emezi ihe niile isi ahụ e nupụrụ n’Iden mebiri. Ma ka a na-ede Baịbụl, e ji nke nta nke nta mee ka a mara otú Chineke ga-esi emezu nzube ya banyere Onye Nzọpụta ahụ ga-abịanụ nakwa onye Onye ahụ a ga-ezite ga-abụ.

Chineke chụpụrụ Adam na Iv na Paradaịs. Tupu ha arụta ihe ha ga-eri, ha ga-ata ahụhụ, kọọ ala n’ebe ahụ a chụgara ha. Iv tụụrụ ime, mụọ Ken, bụ́ nwa mbụ ya na Adam mụrụ. Adam na Iv mụtara ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ndị ọzọ, tinyere Ebel nakwa Set bụ́ nna nna Noa.

—O si na Jenesis isi nke 3 ruo na nke 5; Mkpughe 12:9.

◼ Olee ụgha mbụ a ghara, onye ghara ya?

◼ Gịnị mere e ji chụpụ Adam na Iv na Paradaịs?

◼ Mgbe Chineke mara ndị nnupụisi ahụ ikpe n’ihi ihe ha mere, olee nkwa o kwere?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 5]

Mkpụrụ ahụ “ga-egwepịa gị isi, ị ga-emerụkwa ya ahụ́ n’ikiri ụkwụ.”—Jenesis 3:15

[Igbe dị na peeji nke 5]

EZUGHỊ OKÈ NA ỌNWỤ

Adam na Iv zuru okè mgbe Chineke kere ha. O kere ha ka ha biri na Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi. Ha mere mmehie mgbe ha nupụụrụ Chineke isi. Nke ahụ mere ka ha ghọọ ndị na-ezughị okè, meekwa ka ha na Jehova bụ́ Isi Iyi nke ndụ ghara ịdị ná mma. Si mgbe ahụ gawa, ha na ụmụ niile na-ezughị okè ha ga-amụta ga na-eme mmehie, na-anwụkwa anwụ.—Ndị Rom 5:12.

[Chaatị dị na peeji nke 5]

Jenesis ●

Ọpụpụ

Levitikọs

Ọnụ Ọgụgụ

Diuterọnọmi

Jọshụa

Ndị Ikpe

Rut

1 Samuel

2 Samuel

1 Ndị Eze

2 Ndị Eze

1 Ihe E Mere

2 Ihe E Mere

Ezra

Nehemaya

Esta

Job

Abụ Ọma

Ilu

Ekliziastis

Abụ Sọlọmọn

Aịzaya

Jeremaya

Abụ Ákwá

Ezikiel

Daniel

Hosia

Malakaị

Matiu

Mak

Luk

Jọn

Ọrụ Ndịozi

Ndị Rom

1 Ndị Kọrịnt

2 Ndị Kọrịnt

Ndị Galeshia

Ndị Efesọs

Ndị Filipaị

Ndị Kọlọsi

1 Ndị Tesalonaịka

2 Ndị Tesalonaịka

1 Timoti

2 Timoti

Taịtọs

Faịlimọn

Ndị Hibru

Jems

1 Pita

2 Pita

1 Jọn

2 Jọn

3 Jọn

Jud

Mkpughe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya