Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bm nkebi 14 p. 17
  • Chineke Si n’Ọnụ Ndị Amụma Ya Kwuo Okwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Si n’Ọnụ Ndị Amụma Ya Kwuo Okwu
  • Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Amụma Ozi Ha Pụrụ Imetụta Anyị
    Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
  • E Gosiri Onye Amụma A Dọọrọ n’Agha Ihe Ndị Ga-eme n’Ọdịnihu
    Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Ọbịbịa Mesaya
    Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Amụma Ndị E Buru Gbasara Mesaya Hà Na-egosi n’Eziokwu na Ọ Bụ Jizọs Bụ Mesaya?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
bm nkebi 14 p. 17

Nkebi nke 14

Chineke Si n’Ọnụ Ndị Amụma Ya Kwuo Okwu

Jehova họpụtara ndị amụma izi ozi banyere ikpe, ezi ofufe, na olileanya maka Mesaya

N’OGE ndị eze Izrel na Juda chịrị, e nwere ndị pụrụ iche Chineke nyere ọrụ, ya bụ, ndị amụma. Ha bụ ndị ikom nwere okwukwe na obi ike na-enweghị atụ, bụ́ ndị ziri ozi Chineke. Tụlee ozi anọ dị mkpa ndị amụma Chineke ziri ndị mmadụ.

1. Mbibi Jeruselem. Ọtụtụ afọ tupu e bibie Jeruselem, ndị amụma Chineke, nke ka nke, Aịzaya na Jeremaya, malitere ịdọ ndị bi na Jeruselem aka ná ntị na a ga-ebibi ya, mee ka ọ tọgbọrọ n’efu. Ha kọwara ihe mere Chineke ji na-ewesa obodo ahụ iwe. Ndị bi na ya sịrị na ha na-anọchite anya Jehova. Ma okpukpe ụgha ha, nrụrụ aka ha, na ime ihe ike ha gosiri na ọ bụghị eziokwu.—2 Ndị Eze 21:10-15; Aịzaya 3:1-8, 16-26; Jeremaya 2:1-3:13.

2. Ịmaliteghachi ezi ofufe. Mgbe ndị Chineke bichara na Babịlọn afọ iri asaa, Chineke ga-eme ka ha nwere onwe ha. Ha ga-alaghachi n’ala ha nke tọgbọrọ n’efu ma wughachi ụlọ nsọ Jehova na Jeruselem. (Jeremaya 46:27; Emọs 9:13-15) N’ihe dị ka narị afọ abụọ tupu e merie Babịlọn, Aịzaya kpọrọ aha onye ga-emeri obodo ahụ, ya bụ, Saịrọs. Ọ bụ ya ga-agwa ndị Chineke ka ha gaa maliteghachi ezi ofufe. Aịzaya kọwadịrị ụzọ pụrụ iche Saịrọs ga-esi merie obodo ahụ.—Aịzaya 44:24–45:3.

3. Ọbịbịa Mesaya na ihe a ga-eme ya. A ga-amụ Mesaya n’obodo Betlehem. (Maịka 5:2) Ọ ga-adị umeala n’obi, nọrọ n’elu ịnyịnya ibu banye Jeruselem. (Zekaraya 9:9) N’agbanyeghị na ọ dị umeala n’obi na obiọma, ihe ya agaghị adị mmadụ niile mma, ọtụtụ ndị ga-ajụ ya. (Aịzaya 42:1-3; 53:1, 3) A ga-ata ya ahụhụ ma gbuo ya. Ọ̀ bụ otú ahụ ka nke Mesaya ahụ ga-esi gwụ? Mbanụ, n’ihi na ihe mere o ji were ndụ ya chụọ àjà bụ ka e nwee ike ịgbaghara ọtụtụ ndị mmehie ha. (Aịzaya 53:4, 5, 9-12) Ọ gwụla mbilite n’ọnwụ ya ga-emezu nke ahụ.

4. Ọchịchị Mesaya ga-achị ụwa. Ụmụ mmadụ na-ezughị okè enweghị ike ịchị onwe ha n’udo, ma a ga-akpọ Eze bụ́ Mesaya Onyeisi Udo. (Aịzaya 9:6, 7; Jeremaya 10:23) N’ọchịchị ya, mmadụ niile na ibe ha ga-ebi n’udo. Ha na ụmụ anụmanụ niile ga-anọkwa n’udo. (Aịzaya 11:3-7) Ọrịa agaghị adịkwa. (Aịzaya 33:24) A ga-elodakwa ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi. (Aịzaya 25:8) Mgbe Mesaya ga na-achị, a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ ka ha biri n’ụwa.—Daniel 12:13.

—O si n’akwụkwọ Aịzaya, Jeremaya, Daniel, Emọs, Maịka, na Zekaraya.

◼ Olee ụdị ozi ndị amụma Chineke ziri?

◼ Olee otú ndị amụma si buo amụma na a ga-ebibi Jeruselem ma wughachi ya?

◼ Gịnị ka ndị amụma Jehova kwuru banyere Mesaya na ihe a ga-eme ya?

◼ Olee otú ndị amụma si kọwaa ọchịchị Mesaya ga-achị ụwa?

Chaatị dị na peeji nke 17]

Jenesis

Ọpụpụ

Levitikọs

Ọnụ Ọgụgụ

Diuterọnọmi

Jọshụa

Ndị Ikpe

Rut

1 Samuel

2 Samuel

1 Ndị Eze

2 Ndị Eze

1 Ihe E Mere

2 Ihe E Mere

Ezra

Nehemaya

Esta

Job

Abụ Ọma

Ilu

Ekliziastis

Abụ Sọlọmọn

Aịzaya ●

Jeremaya ●

Abụ Ákwá ●

Ezikiel ●

Daniel ●

Hosia ●

Joel ●

Emọs ●

Obedaya ●

Jona ●

Maịka ●

Nehọm ●

Habakọk ●

Zefanaya ●

Hagaị ●

Zekaraya ●

Malakaị ●

Matiu

Mak

Luk

Jọn

Ọrụ Ndịozi

Ndị Rom

1 Ndị Kọrịnt

2 Ndị Kọrịnt

Ndị Galeshia

Ndị Efesọs

Ndị Filipaị

Ndị Kọlọsi

1 Ndị Tesalonaịka

2 Ndị Tesalonaịka

1 Timoti

2 Timoti

Taịtọs

Faịlimọn

Ndị Hibru

Jems

1 Pita

2 Pita

1 Jọn

2 Jọn

3 Jọn

Jud

Mkpughe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya