Isi nke 6
Lee mkpịsị aka gị anya. Megharịa mkpịsị ụkwụ gị.
Metụ ntị gị aka, metụkwa imi gị aka.
Lee ụkwụ gị anya. Ọ bụ ya ka i ji agba ọsọ, awụli elu, na-agba okirikiri ma na-egwu ụdị egwuregwu ndị ọzọ.
Lee anya n’enyo. Gịnị ka ị na-ahụ?
Jehova mere ihe niile ka ha maa ezigbo mma.
IHE NNE MA Ọ BỤ NNA GA-EME
Gụọrọ nwa gị:
Gwa nwa gị ka o metụ ihe ndị a aka:
Mkpịsị aka ya Ntị ya Imi ya
Mkpịsị ụkwụ ya Ọnụ ya
Lee ma nwa gị ọ̀ ga-ahụ ihe ndị a zoro ezo.
Nshịkọ Nwamba
Jụọ nwa gị:
Ònye kere mụ na gị?
[Foto dị na peeji nke 14]
[Foto dị na peeji nke 15]
[Foto dị na peeji nke 15]
[Foto dị na peeji nke 16]