Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • hf nkebi 9 p. 29-31
  • Jirinụ Ife Jehova Kpọrọ Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jirinụ Ife Jehova Kpọrọ Ihe
  • Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • 1 NA-EME IHE GỊ NA JEHOVA GA-EJI ADỊKWU NÁ MMA
  • 2 MEE KA OFUFE EZINỤLỌ NA-ATỌ ỤTỌ
  • Ihe Ga-enyere Ezinụlọ Ọ Bụla Aka
    Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Gịnị Bụ Ofufe Ezinụlọ?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
  • Ofufe Ezinụlọ—Ì Nwere Ike Ime Ka Ọ Na-atọkwu Unu Ụtọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • “Bịaruonụ Chineke Nso, Ọ Ga-abịarukwa Unu Nso”
    Bịaruo Jehova Nso
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
hf nkebi 9 p. 29-31
Ebe otu di na nwunye na-amụ Baịbụl

ISIOKWU NKE 9

Jirinụ Ife Jehova Kpọrọ Ihe

“Feenụ Onye ahụ nke kere eluigwe na ụwa.”—Mkpughe 14:7

Akwụkwọ a enyerela anyị aka ịhụ na e nwere ọtụtụ ihe dị na Baịbụl ndị ga-enyere ma di ma nwunye ma ụmụ ha aka. Jehova chọrọ ka gị na ezinụlọ gị na-enwe obi ụtọ. O kwere nkwa na ọ ‘ga-atụkwasịrị gị ihe ndị ọzọ niile’ ma ị na-ebute ihe gbasara ofufe ya ụzọ. (Matiu 6:33) Ọ chọrọ ka ị bụrụ enyi ya. N’ihi ya, mee ihe ọ bụla i kwesịrị ime ka gị na Chineke dịrị ná mma. O nweghị ihe ọma a ga-eji tụnyere ya.—Matiu 22:37, 38.

1 NA-EME IHE GỊ NA JEHOVA GA-EJI ADỊKWU NÁ MMA

Ebe otu di na nwunye na-arụkọ ọnụ n’ozi ọma

IHE BAỊBỤL KWURU: “‘M ga-abụkwara unu nna, unu ga-abụkwara m ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom,’ ka Jehova . . .  kwuru.” (2 Ndị Kọrịnt 6:18) Chineke chọrọ ka gị na ya dịrị n’ezigbo mma. Otu n’ime ihe ga-enyere gị aka ka ị bụrụ ezigbo enyi ya bụ ikpe ekpere. Jehova gwara anyị ka anyị na-ekpe ekpere “n’akwụsịghị akwụsị.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:17) Ọ chọrọ ka ị na-agwa ya ihe ọ bụla dị gị n’obi. (Ndị Filipaị 4:6) Ọ bụrụ na gị na ndị ezinụlọ gị ana-ekpekọ ekpere ọnụ, ha ga-ahụ na i jighị ife Chineke egwu egwu.

Ka ị na-agwa Chineke ihe dị gị n’obi, i kwesịkwara ịna-ege ya ntị. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịna-amụ Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. (Abụ Ọma 1:1, 2) Na-echebakwara ihe ị gụtara na Baịbụl echiche. (Abụ Ọma 77:11, 12) Otú ọzọ anyị ga-esi na-ege Chineke ntị bụ ịna-agachi ọmụmụ ihe anya.—Abụ Ọma 122:1-4.

Ihe ọzọ ị ga-eme ka gị na Jehova dị ná mma bụ ịna-aga ozi ọma, na-agwa ndị ọzọ banyere Jehova. Ọ bụrụ na ị na-agachi ozi ọma anya, gị na Jehova ga-adịkwu ná mma.—Matiu 28:19, 20.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Wepụtanụ oge unu ga-eji na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Wepụtakwanụ oge unu ga-eji na-ekpe ekpere kwa ụbọchị

  • Gbaa mbọ ka ị hụ na ihe kacha ndị ezinụlọ unu mkpa bụ ihe gbasara ofufe Chineke, ọ bụghị ihe e ji atụrụ ndụ

2 MEE KA OFUFE EZINỤLỌ NA-ATỌ ỤTỌ

Ebe otu nna na-akwadebe ihe ya na ezinụlọ ya ga-amụ n’ofufe ezinụlọ. Mgbe ha meziri ofufe ezinụlọ ahụ, ọ tọrọ ha ụtọ

IHE BAỊBỤL KWURU: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Hazienụ oge unu ga-eji na-enwe ofufe ezinụlọ na ihe ndị unu ga na-amụ. Unu kwesịrị ịna-enwechi ya anya. (Jenesis 18:19) Ma, e nwere ihe ọzọ unu kwesịrị ime. Ihe ọ bụla unu na-eme kwa ụbọchị kwesịrị ịna-egosi na unu ji obi unu niile hụ Chineke n’anya. Ndị ezinụlọ gị na Chineke ga-adị ná mma ma ọ bụrụ na ị na-agwa ha banyere Chineke “mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-eje ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala nakwa mgbe i biliri ọtọ.” (Diuterọnọmi 6:6, 7) Kpebie na ị ga-eme ka onye fere Jehova n’oge ochie aha ya bụ Jọshụa. O kwuru sị: “Mụ onwe m na ezinụlọ m, anyị ga-efe Jehova.”—Jọshụa 24:15.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Na-enwechinụ ofufe ezinụlọ anya, na-amụkwanụ ihe ga-enyere onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ unu aka

Ebe otu nne na-agụrụ obere nwa ya nwoke ihe e dere n’akwụkwọ; Ebe otu ezinụlọ na-eme ihe nkiri ha gụtara na Baịbụl; Ebe otu nna na-amụrụ nwa ya nwaanyị Baịbụl

NDỊ OHU JEHOVA NA-ENWE OBI ỤTỌ

O nweghị ihe dị ka mmadụ ife Jehova Chineke. Obi dị ya ụtọ na gị na ndị ezinụlọ gị ji obi unu niile na-efe ya. Ọ bụrụ na unu ana-efe Jehova, unu ga-ahụkwu ya n’anya, na-emekwa otú o si eme. (Mak 12:30; Ndị Efesọs 5:1) Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-adịkwu ná mma ma ọ bụrụ na unu ji ofufe Chineke kpọrọ ihe n’ezinụlọ unu. (Ekliziastis 4:12; Aịzaya 48:17) Gị na ndị ezinụlọ unu ga na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi na “Jehova bụ́ Chineke gị agọziwo gị.”—Diuterọnọmi 12:7.

JỤỌ ONWE GỊ AJỤJỤ NDỊ A . . .

  • Olee mgbe ikpeazụ mụ na di m ma ọ bụ nwunye m kpekọrọ ekpere ọnụ?

  • Olee ihe anyị ga-amụ n’ezinụlọ anyị nke ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike?

IHE ONYEISI EZINỤLỌ GA-EBURU N’OBI

  • Ekwela ka ihe ọ bụla mee ka unu ghara ịna-enwe ofufe ezinụlọ

  • Gwa ndị ezinụlọ gị ihe unu ga-amụ tupu ụbọchị unu ji amụ ihe eruo ka ha nwee ike ịkwado nke ọma

  • Ndị ezinụlọ gị niile kwesịrị ịnọ ya mgbe unu na-amụ ihe

  • Unu mụwa ihe, mee ka obi ruo onye ọ bụla ala

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya