Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jl ihe ọmụmụ 10
  • Gịnị Bụ Ofufe Ezinụlọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Ofufe Ezinụlọ?
  • Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ga-enyere Ezinụlọ Ọ Bụla Aka
    Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Gịnị Ga-eme Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu?​—Nke 2
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Jirinụ Ife Jehova Kpọrọ Ihe
    Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
  • Ofufe Ezinụlọ—Ì Nwere Ike Ime Ka Ọ Na-atọkwu Unu Ụtọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
jl ihe ọmụmụ 10

ISI NKE 10

Gịnị Bụ Ofufe Ezinụlọ?

Ndị na-enwe ofufe ezinụlọ

Saụt Koria

Di na nwunye na-amụ Baịbụl

Brazil

Onyeàmà Jehova na-amụ Baịbụl

Ọstrelia

Ezinụlọ na-amụ ihe

Gini

Kemgbe ụwa, Jehova chọrọ ka ezinụlọ ọ bụla na-anọkọ na-ekwurịta gbasara ya. Ha na-eme otú ahụ, ya na ha ga-adịkwu ná mma, udo adịrịkwa n’ezinụlọ ahụ. (Diuterọnọmi 6:​6, 7) Ọ bụ ya mere ezinụlọ Ndịàmà Jehova ọ bụla ji ewepụta otu mgbede n’izu ọ bụla iji nọkọọ fee Chineke. N’oge ahụ, ha na-ekwurịta gbasara otú ezinụlọ ha ga-esi na-emekwu uche Chineke. Ọ naghịkwa abụ oge ha ji akpasu ibe ha iwe. Ọ bụrụgodị na ọ bụ naanị gị bi, ị ga-eji oge ahụ na-amụ ihe ọ bụla ị chọrọ ịmụ gbasara Chineke.

Ọ bụ oge anyị ji abịarukwu Jehova nso. Baịbụl kwuru, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:⁠8) Anyị na-amatakwu ụdị onye Jehova bụ ma anyị gụọ Baịbụl gụta otú o si mesoo ndị mmadụ n’oge ochie. Ụzọ dị mfe i nwere ike isi malite ofufe ezinụlọ bụ gị na ndị ezinụlọ unu ịnọkọ gụọ Baịbụl, onye gụọ ibe ya agụọ. Unu nwedịrị ike gụọ ebe e kwuru ka a gụọ n’Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ n’izu ahụ. E nwere ike gwa onye nke ọ bụla ebe ọ ga-agụ tupu ụbọchị ahụ unu ga-enwe ofufe ezinụlọ. Ụbọchị ahụ ruzie, unu gụchaa ebe ahụ unu chọrọ ịgụ, onye ọ bụla ekwuo ihe ọ mụtara.

Ọ bụ oge na-eme ka ndị ezinụlọ na ibe ha na-adịkwu ná mma. Ofufe ezinụlọ na-eme ka di na nwunye ma ọ bụkwanụ nne na nna na ụmụ ha na-adịkwu ná mma. Oge ahụ kwesịrị ịbụ oge na-eme onye ọ bụla obi ụtọ n’ezinụlọ, nke na ha ga na-atụ anya ka o ruwe eru. Mgbe ndị nne na nna na-ekpebi ihe a ga-amụ, ha kwesịrị iburu afọ ole ụmụ ha dị n’obi. Ha nwere ike si n’Ụlọ Nche ma ọ bụ na Teta! ma ọ bụkwanụ na jw.org/ig họrọ isiokwu ga-abara ụmụ ha uru. Unu na ụmụ unu nwere ike kwurịta nsogbu ha nwere n’ụlọ akwụkwọ na otú ha ga-esi merie ya. Unu nwekwara ike ile otu n’ime ihe ndị e gosiri n’Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehovah dị na tv.jw.org. Unu lechaa ya, unu ekwurịta ihe ndị unu mụtara na ya. Unu nwere ike mụọ abụ a ga-abụ n’ọmụmụ ihe. Ọ ga-adịkwa mma ma unu chọrọ ihe ụfọdụ unu ga-eji megharịa ọnụ ma unu nwechaa ofufe ezinụlọ.

Ọ bụrụ na ezinụlọ unu ejiri oge a pụrụ iche na-efe Jehova kwa izu, ịmụ Okwu Chineke ga na-atọ unu ụtọ. Chineke ga-agọzikwa mbọ unu na-agba.​—⁠Abụ Ọma 1:​1-3.

  • Gịnị mere anyị ji ewepụta oge anyị ji enwe ofufe ezinụlọ?

  • Gịnị ka ndị nne na nna nwere ike ime ka ofufe ezinụlọ na-atọ ndị ezinụlọ ha ụtọ?

IHE ỌZỌ Ị GA-EME

Gakwuru ụfọdụ ụmụnna anyị ka ha gwa gị otú ha si enwe ofufe ezinụlọ. Leruokwa akwụkwọ ndị dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anya, mara nke ga-akacha mma iji na-akụziri ụmụ gị gbasara Jehova.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya