Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 53 p. 128
  • Jehoyada Katara Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehoyada Katara Obi
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Enyi Ọjọọ Mere Ka Jehoash Hapụ Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-atụ Egwu Jehova?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Jehova Na-agọzi Ndị Ji Obi Ike Na-efe Ya
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Jehova Tara Nwaanyị Ọjọọ Chọrọ Inweta Ihe Na-erughịrị Ya Ahụhụ
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 53 p. 128
Ebe Nnukwu Onye Nchụàjà aha ya bụ Jehoyada na-egosi ndị Izrel Eze Jehoash

ISI NKE 53

Jehoyada Katara Obi

Jezibel mụrụ nwa nwaanyị aha ya bụ Atalaya. Atalaya bụ ajọ nwaanyị ka mama ya. Atalaya bụ nwunye eze Juda. Mgbe di ya nwụrụ, nwa ya nwoke malitere ịchị Juda. Ma, mgbe nwa ya nwoke a nwụrụ, Atalaya mere onwe ya eze nwaanyị, malite ịchị Juda. O gburu onye ọ bụla si n’ezinụlọ eze nwere ike ịnọchi ya. O gbudịrị ụmụ ụmụ ya ndị nwoke. Onye ọ bụla na-atụ ya ụjọ.

Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Jehoyada na Jehoshiba nwunye ya ma na ihe ahụ Atalaya na-eme jọgburu onwe ya. Ha zoro otu n’ime ụmụ ụmụ Atalaya n’agbanyeghị na Atalaya nwere ike igbu ha ma ọ mata. Aha nwa ahụ bụ Jehoash. Ha zụlitere ya n’ụlọ nsọ.

Mgbe Jehoash dị afọ asaa, Jehoyada kpọkọtara ndị isi niile na ndị Livaị ma gwa ha, sị: ‘Cheenụ ọnụ ụzọ ụlọ nsọ nche, unu ekwekwala onye ọ bụla bata.’ Jehoyada meziri Jehoash eze Juda ma kpuwe ya okpueze. Ndị Juda malitere iti mkpu, sị: “Eze, ị ga-adị ogologo ndụ!”

Ebe Eze Nwaanyị Atalaya na-eti mkpu

Mgbe eze nwaanyị bụ́ Atalaya nụrụ mkpu ha na-eti, ọ gbaara gaa n’ụlọ nsọ ozugbo. Mgbe ọ hụrụ eze ọhụrụ ahụ, o tiri mkpu, sị: “Ha agbaala m mgba okpuru! Ha agbaala m mgba okpuru!” Ndị isi ahụ jidere ya, kpọpụ ya n’ụlọ nsọ ma gbuo ya. Gịnịkwanụ ka a ga-eme maka ihe ọjọọ Atalaya mere ka ndị Juda na-eme?

Jehoyada mere ka ndị Juda na Jehova gbaa ndụ, ha ekwe Jehova nkwa na ọ bụ naanị ya ka ha ga na-efe. Jehoyada mere ka ha kụtuo ebe a na-achụrụ Bel àjà ma kụrisie arụsị ndị dị ebe ahụ. Ọ họpụtara ndị nchụàjà na ndị Livaị ka ha rụwa ọrụ ha n’ụlọ nsọ, ka ndị mmadụ nwee ike ịnọ ebe ahụ fewekwa Chineke. Ọ họpụtakwara ndị ga na-eche ụlọ nsọ nche ka onye na-adịghị ọcha ghara ịbanye na ya. Jehoyada na ndị isi Izrel kpọọrọ Jehoash gaa n’obí eze ma mee ka ọ nọrọ n’ocheeze. Ihe a mere ka ndị Juda ṅụrịa ọṅụ. Ugbu a Atalaya nwụrụla, e bibiekwa Bel, ndị Juda enwerela onwe ha ife Jehova. Ị̀ hụrụ na otú a Jehoyada si kata obi baara ọtụtụ ndị uru?

“Unu atụkwala egwu ndị na-egbu ahụ́ ma ha agaghị egbuli mkpụrụ obi. Kama na-atụnụ egwu onye ga-ebibili ma mkpụrụ obi ma ahụ́ n’ime Gehena.”​—Matiu 10:28

Ajụjụ: Olee ihe Jehoyada mere gosiri na ọ katara obi? Ì chere na Jehova ga-enyere gị aka ịkata obi?

2 Ndị Eze 11:1–12:12; 2 Ihe E Mere 21:1-6; 22:10-12; 23:1–24:16

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya