Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w09 4/1 p. 24-25
  • Ndị Enyi Ọjọọ Mere Ka Jehoash Hapụ Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Enyi Ọjọọ Mere Ka Jehoash Hapụ Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-atụ Egwu Jehova?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Jehoyada Katara Obi
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ndị Na-eto Eto, Olee Ụdị Ndụ Unu Chọrọ Ibi?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Jehova Na-agọzi Ndị Ji Obi Ike Na-efe Ya
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
w09 4/1 p. 24-25

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Ndị Enyi Ọjọọ Mere Ka Jehoash Hapụ Jehova

EBE niile nọ na-azụ wuruwuru na Jeruselem, bụ́ ebe ụlọ nsọ Chineke dị. E gbuola Eze Ehazaya. Ma, ị gaghị ekweta ihe mama Ehazaya, bụ́ Atalaya, meziri. O gburu ụmụ Ehazaya, bụ́ ụmụ ụmụ ya! Ị̀ maara ihe mere o ji gbuo ha?—a Ọ bụ ka o nwee ike ịghọ eze kama otu onye n’ime ha ga-aghọ ya.

Ma, e gbughị otu nwa nwa Atalaya aha ya bụ Jehoash, nne nne ya amaghịkwa. Ị̀ chọrọ ịma otú e si zọọ ya ndụ?— Nwanne nna Jehoash, bụ́ Jehoshiba, zoro ya n’ụlọ nsọ Chineke. Ihe mere o ji nwee ike ime ya bụ na ọ bụ di ya, bụ́ Jehoyada, bụ Nnukwu Onye Nchụàjà. N’ihi ya, ha abụọ gbakọtara aka hụ na ọ dịghị ihe mere Jehoash.

E zoro Jehoash n’ụlọ nsọ ahụ ruo afọ isii. N’ebe ahụ ka a nọ kụziere ya ihe niile banyere Jehova Chineke na Iwu ya. Mgbe Jehoash gbara afọ asaa, Jehoyada meziri ya eze. Ị̀ chọrọ ịnụ otú Jehoyada si mee ya na ihe mechara mee nne nne Jehoash, bụ́ Eze Nwaanyị Atalaya?—

Ọ dị mma. Jehoyada zooro ezoro gaa kpọkọta ndị nche na-eche ndị eze chịrị na Jeruselem nche n’oge ahụ. Ọ gwara ha otú ya na nwunye ya si zọọ nwa Eze Ehazaya ndụ. Jehoyada kpọpụtaziri Jehoash ka ndị nche ahụ hụ ya, ha ekweta na ọ bụ ya kwesịrị ịchị obodo ahụ. Ha kpebiziri ihe ha ga-eme.

Jehoyada kpọpụtara Jehoash n’èzí ma mee ya eze. Mgbe ahụ, ndị obodo ahụ malitere “ịkụ aka, na-asị: ‘Eze, ị ga-adị ndụ!’” Ndị nche ahụ gbara Jehoash gburugburu ka ihe ọ bụla ghara ime ya. Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ obi ụtọ ahụ, ọ gbapụtara, sị na ha gbara ya izu ọjọọ. Ma, Jehoyada nyere ndị nche ahụ iwu ka ha gbuo Atalaya, ha egbuokwa ya.—2 Ndị Eze 11:1-16.

Ì chere na Jehoash nọgidere na-ege Jehoyada ntị ma na-eme ihe dị mma?— O mere otú ahụ n’oge niile Jehoyada nọ ndụ. Jehoash medịrị ka ndị mmadụ tụọ ego e ji rụzie ụlọ nsọ Chineke, bụ́ nke Ehazaya nna ya na Jehoram nna nna ya leghaara anya. Ma, ka anyị hụ ihe meziri mgbe Jehoyada, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà, nwụrụ.—2 Ndị Eze 12:1-16.

Mgbe ahụ, Jehoash dị ihe dị ka afọ iri anọ. Kama Jehoash ịnọgide na-eme ndị na-efe Jehova enyi, ọ gara meta ndị na-efe arụsị enyi. Zekaraya, nwa Jehoyada, bụ onye nchụàjà Jehova n’oge ahụ. Olee ihe i chere Zekaraya mere mgbe ọ nụrụ banyere ihe ọjọọ Jehoash na-emezi?—

Zekaraya gwara Jehoash, sị: ‘Ebe ọ bụ na ị hapụla Jehova, ya onwe ya ga-ahapụ gị.’ Okwu ahụ were Jehoash ezigbo iwe, ya enye iwu ka e jiri nkume tụgbuo Zekaraya. Legodị nnọọ anya, a napụtara Jehoash n’aka onye chọrọ igbu ya, ma ugbu a, ya enye iwu, e gbuo Zekaraya!—2 Ihe E Mere 24:1-3, 15-22.

Ò nwere ihe i chere anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ a?— N’eziokwu, anyị ekwesịtụdịghị ịdị ka Atalaya, bụ́ onye obi ọjọọ na onye arụrụala. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịhụ ma ndị anyị na ha na-efekọ Jehova ma ndị iro anyị n’anya, otú ahụ Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-eme. (Matiu 5:44; Jọn 13:34, 35) Chetakwa na ọ bụrụ na anyị amalite ime ihe dị mma otú ahụ Jehoash mere, anyị kwesịrị ịnọgide na-emeta ndị hụrụ Jehova n’anya na ndị ga-agba anyị ume ife ya, enyi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.

Ajụjụ:

○ Olee otú e si zọọ Jehoash ndụ, ònyekwa zọrọ ya?

○ Olee otú Jehoash si ghọọ eze, oleekwa ihe ọma o mere?

○ Gịnị mere Jehoash ji ghọọ onye ọjọọ, ònyekwa ka o gburu?

○ Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Baịbụl a?

[Foto dị na peeji nke 25]

A zọrọ Jehoash ndụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya