ISI NKE 59
Ụmụaka Anọ Ndị Rubeere Jehova Isi
Mgbe Nebukadneza kpọọrọ ụmụ nwoke ndị a mụrụ n’ezinụlọ ndị eze Juda laa Babịlọn, ọ gwara onye na-eje ozi n’obí ya aha ya bụ Ashpenaz ka ọ na-elekọta ha. Nebukadneza gwara ya ka ọ họta ụmụaka ndị kacha maa mma na ndị kacha mara ihe n’ime ha. Ọ chọrọ ka a zụọ ha afọ atọ. A zụchaa ha, a ga-enye ha nnukwu ọrụ na Babịlọn. A ga-akụziri ha otú e si agụ asụsụ Akadịan ndị Babịlọn na-asụ, otú e si ede ya, nakwa otú e si asụ ya. A ga na-enyekwa ha ụdị nri eze na ndị nọ n’obí ya na-eri. Mmadụ anọ n’ime ụmụaka ahụ bụ Daniel, Hananaya, Mishel, na Azaraya. Ashpenaz gụrụ ha aha ndị Babịlọn. Ọ gụrụ Daniel Belteshaza, gụọ Hananaya Shedrak, gụọ Mishel Mishak, gụọkwa Azaraya Abednego. Ihe a a chọrọ ịkụziri ha ọ̀ ga-eme ka ha kwụsị ife Jehova?
Ụmụ okorobịa anọ a kpebiri na ha ga-erubere Jehova isi. Ha ma na ha ekwesịghị iri nri eze n’ihi na Iwu Jehova kwuru na ụfọdụ nri ndị ahụ adịghị ọcha. Ha gwaziri Ashpenaz, sị: ‘Biko, enyela anyị nri ndị ahụ eze sị gị na-enye anyị.’ Ashpenaz gwara ha, sị: ‘Ọ bụrụ na unu erighị nri ndị ahụ, eze hụ na unu tara ahụ́, ọ ga-egbu m.’
Daniel chetara ihe ha ga-eme. Ọ gwara onye ahụ na-elekọta ha, sị: ‘Biko, na-enye anyị naanị akwụkwọ nri na mmiri ruo ụbọchị iri. Ụbọchị iri gachaa, jiri otú anyị dị tụnyere otú ụmụaka ndị na-eri nri eze dị.’ Onye ahụ na-elekọta ha kwetara.
Mgbe ụbọchị iri ahụ gachara, ahụ́ dị Daniel na ndị enyi ya atọ mma karịa ụmụaka ndị ọzọ niile. Obi dị Jehova ụtọ na ha rubeere ya isi. O medịrị ka Daniel nwee ike ịna-aghọta ọhụụ na nrọ dị iche iche.
Mgbe a zụchara ụmụaka ahụ, Ashpenaz kpọọrọ ha bịakwute Eze Nebukadneza. Ha na eze kwurịtara okwu, ya achọpụta na Daniel, Hananaya, Mishel, na Azaraya ma ihe, dịrịkwa gara gara karịa ụmụaka ndị ọzọ niile. Ọ họọrọ ha anọ ka ha na-arụ ọrụ n’obí ya. E nwee ihe dị mkpa eze chọrọ ime, ọ na-akpọkarị ha ka ha nye ya ndụmọdụ. Jehova mere ka ha mara ihe karịa ndị amamihe niile eze nwere nakwa ndị na-emere ya anwansi.
Ọ bụ eziokwu na Daniel, Hananaya, Mishel, na Azaraya nọ n’obodo ọzọ, ha echefughị na ha na-efe Jehova. Gịnwa kwanụ? Ị̀ ga na-echeta Jehova, ma mgbe ị nọ n’ebe mama gị na papa gị na-anọghị?
“Emela ihe ga-eme ka onye ọ bụla lelịa gị anya maka na ị bụ nwata. Kama nke ahụ, ka otú i si ekwu okwu, otú i si akpa àgwà, otú i si hụ ndị ọzọ n’anya, otú i si nwee okwukwe, na otú i si ebi ndụ dị ọcha bụrụ ihe ndị ji obi ha niile na-efe Chineke ji ama atụ.”—1 Timoti 4:12