Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 1/15 p. 25-31
  • Nsọpụrụ Chineke Bara Uru N’ihe Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nsọpụrụ Chineke Bara Uru N’ihe Nile
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Piątek w Poznaniu (Friday na Poznan)
  • Sobota w Katowicach (Saturday na Katowice)
  • Niedziela w Warszawie (Sunday na Warsaw)
  • Tụkwasịnụ Nsọpụrụ Chineke ná Ntachi Obi Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Nyezuokwanụ Ntachi Obi Unu Nsọpụrụ Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Na-Agbasonụ Nsọpụrụ Chineke Dị Ka Ndị Kraịst Meworo Baptism
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Na-Agbasonụ Ihe Nlereanya Jisọs Nke Nsọpụrụ Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 1/15 p. 25-31

Nsọpụrụ Chineke Bara Uru N’ihe Nile

NDỊÀMÀ JEHOVA maara na “nsọpụrụ Chineke bara uru nye ihe nile,” na ọ dịkwa mkpa maka ezi ofufe. (1 Timoti 4:8) Ọ bụrụ na e nweghị ya, okpukpe bụ ihe omume elu ọnụ efu. N’ihi ya, “Nsọpụrụ Chineke” bụ aha kwesịrị ekwesị maka usoro mgbakọ distrikti ha mere, bụ́ nke malitere na June afọ gara aga.

N’August, e mere mgbakọ atọ dị otú ahụ na Poland, bụ́ ihe wetara ọṅụ nke ukwuu. E mere ha mgbe Ndịàmà Jehova natasịrị nkwado ọchịchị n’ọnwa May. (Maka nkọwa ndị ọzọ banyere mgbakọ ndị ahụ e nwere na Poland lee Teta! [Bekee] nke December 22, 1989.) Ka anyị tụleghachi n’ebe a, usoro ihe omume ahụ dị ka e si mee ya na Poland.

Piątek w Poznaniu (Friday na Poznan)

N’ikwu ka e nye ha ihe oriri na nnwere onwe, 50,000 ndị na-eme njegharị iwe kpara aghara na Poznan na June 1956. Nke a kpatara ọnwụ nke ihe karịrị 50 mmadụ, meekwa ka e guzobe ọchịchị ọhụrụ na Poland. N’ụzọ megidere nnọọ nke ahụ, mgbe 33 afọ gasịrị, n’ọnọdụ nke gosipụtara njupụta nke ihe oriri ime mmụọ na nnwere onwe ndị Karịst, ndị Kraịst dị n’udo zukọtara n’ebe ahụ ịnụrụ okwu ndị dabeere n’isiokwu bụ “Ijere Chineke nke Na-achọ Ka A Rara Ofufe Nye Nanị Ya Ozị,” bụ́ isiokwu nke Friday. Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 40, 442 mmadụ zukọtara n’ebe ahụ na Sunday.

Mgbe onyeisi oche kwusịrị okwu nnabata ya, mgbe a jụsịkwara ndị mmadụ ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị ‘Ji Nsọpụrụ Chineke Zuru Ezu Na-ebi Ndụ,’ e nyere ndụmọdụ a pụrụ itinye n’ọrụ n’isiokwu ahụ bụ “Zere Egbugbere Ọnụ nke Na-akpata Ihe Mgbu.” Lee ka o si dị mfe okwu efu ịghọ ịgba àsị̀rì nke na-emerụ ahụ! Àsị̀rị̀ nke na-emerụ ahụ pụkwara iduje n’ajọ nkwutọ. Ma tupu ha amalite ikwu okwu banyere ndị ọzọ, ndị Kraịst tozuru okè, ndị ọ dị mkpa ichebe udo na ịdị n’otu, na-eji amamihe jụọ onwe ha, sị: ‘Jisọs ọ̀ gaara ekwu ihe a? Ọ̀ dị mpa ikwu ya? Ọ̀ bụ ihe ga-ewuli elu? Gịnị mere m ji ekwu ya?’

Otu ihe ọzọ pụrụ iche ná mgbakọ ndị ahụ e nwere na Poland bụ oge ahụ e wepụtara iche kwa ụbọchị iji nụrụ akụkọ sitere n’ọnụ Ndịàmà si ná mba ndị ọzọ bịa. Ahụmahụ nke ndị nnọchianya sitere 24 mba dị iche iche kọrọ mesiri eziokwu ahụ ike nke bụ na nke a bụ ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke dị n’otu n’ezie n’ịmata eziokwu ahụ nke bụ na “Jehova Chọrọ Ofufe A Raara Nye Nanị Ya.” Ebe ọ bụ na Chineke ruru eru inweta ofufe dị otú a, ndị ohu ya aghaghị ịdị n’otu n’ịhụnanya na n’ofufe ha.. Ihe nlereanya nke Jisọs gosipụtara na ọ dịghị ihe ọ bụla a pụrụ iji obi na-ezughị okè mee n’ihe banyere ofufe a raara nye nanị Chineke.

Nsọpụrụ Chineke metụtara ihe nile anyị na-eme. Otú a, otu okwu nke nwere akụkụ atọ dọrọ ndị Kraịst aka ná ntị ka ha “Zere Ịgahie Ụzọ” n’ihe ndị metụtara ihe oriri na ihe ọṅụṅụ, uwe na ejiji, na ihe ntụrụ ndụ. Irigbiga ihe ókè na ịṅụbiga mmanya ókè bụ ụdị dị iche nke anya ukwu, ndị na-akụda ọnọdu ime mmụọ anyị, na-eweta nsogbu ahụ ike, na-eduba n’àgwà ọjọọ, na-edujekwa n’ihe ọghọm dị iche iche. Ịgabiga ókè n’ihe banyere uwe oyiyi—ndị na-ekwesịghị ekwesị, ndị na-adịghị mma n’anya, ndị na-ekwekọghị n’ezi echiche, ọbụna ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ—bụ ihe a na-aghaghị izere. Uwe ndị a na-edozighị edozi, ndị na-adịghị ùgwù n’anya, ma ọ bụ ndị na-amapara mmadụ n’ahụ ekwesịghị nnọọ ekwesị. Ihe bụ isiokwu abụghị ma otu ụdị uwe ọ̀ bụkwa ihe ọha mmadụ nwere mmasị na ya, kama ọ bụ ma ò kwesịrị ekwesị nye onyeozi nke Chineke. Ọzọkwa, ihe ntụrụ ndụ nke e ji nnupụisi, ime ihe ike, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ime mgbaasị, ma ọ bụ adịghị ọcha nke mmekọahụ gwagbuo ekwesịghịrị ndị Kraiṣt.—Ndị Filipaị 1:27.

Usoro ihe omume nke ehihie Friday ji okwu ahụ bụ “‘Ohu ahụ Kwesịrị Ntụwasị Obi’ na Òtù Na-achị Isi Ya” wee malite. N’ịbụ onye obi diri ike na ihe ndị o kere eke ga-ekwesị ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ, Jehova na-enyefe ike ụfọdụ n’aka ndị ọzọ. Otú ahụkwa ka Ọkpara ya na-eme. Site n’etiti ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ, bụ́ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi nke nwekwara uche” ọ họpụtawo mmadụ ole na ole ije ozi dị ka òtù na-achị isi a na-ahụ anya. (Matiu 24:45) N’ime narị afọ mbụ, ihe mejupụtara òtù nke a bụ ndị ozi na ọtụtụ ndị okenye ọzọ nọ na Jerusalem.

N’oge a, a ghọtawo Òtù Na-achị Isi dị ka ndị na-ahazi mbipụta akwụkwọ nke Watch Tower Society na ndị so n’òtù na-elekọta ya. Ma Òtù Na-achị Isi ahụ dị iche n’ụlọ ọrụ ahụ e guzobere n’iwu, dị ka onyeọkà okwu ahụ mere ka ọ pụta ìhè, sị: “Ebe ọ bụ na e guzobere ụlọ ọrụ ahụ kpọmkwem n’ihi okwu metụtara iwu, na-enwekwa isi ụlọ ọrụ ndị e guzobere kpọmkwem n’otu ebe, ọ pụrụ ịbụ nke e mechiri site n’aka Sisa, bụ́ ndị Ọchịchị.” Ọ dịghị otú ahụ n’ihe banyere Òtù Na-achị Isi ahụ, nke na-abụghị òtù dabeere n’iwu kama ndị òtù ya bụ ndị “a na-ahọpụta site n’ike mmụọ nsọ n’okpuru nduzi nke Jehova na Kraịst.” Otú a, Òtù Na-achị Isi ahụ anọgidewo na-arụ ọrụ, na-anatakwa nkwado na-enwghị atụ nke Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa.

Mmadụ ise n’ime Òtù Na-achị Isi ahụ nwere mmadụ iri na abụọ ugbu a bịara mgbakọ ndị anụ e mere na Poland. Otu n’ime ha kwuru okwu bụ isi, nke isiokwu ya bụ “Ihe Mere A Ga-eji Mụta Ihe Omimi nke Nsọpụrụ Chineke.” N’ebe ahụ, e mere ka ọ pụta ìhì na ihe omimi nke nsọpụrụ Chineke abụghịzikwa ihe omimi, ebe ‘e mere ka ọ pụta ìhè n’ahụ Jisọs.’ Onyeọkà okwu ahụ tụlere akụkụ isii nke ihe omimi dị nsọ nke a nke e hotara na 1 Timoti 3:16, wee sị: “Ekele anyị nwere maka ihe omimi ahụ nke nsọpụrụ Chineke kwesịrị ịnọgide na-eduzi anyị ịgbasochi nzọụkwụ Jisọs anya.”

Usoro isokwu abụọ ọtụtụ mmadụ kwuru mere ka ọ pụta ìhè na nsọpụrụ Chineke bụ ihe a chọrọ ma n’aka ndị na-eto eto na n’aka ndị okenye. Ọ bụ ibu ọrụ dịịrị ndị mụrụ ụmụ ịhapụrụ ụmụ ha ihe nketa ime mmụọ site n’ikuziri ha ịzụlite ezi echiche nke ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Ọmụmụ ihe ezinụlọ nke na-arụpụta ezi ihe, gụnyere ịtụlekọ nsogbu ụmụntakịrị na-enwe nke ọma, bụ ihe a na-aghaghị ime. Ịmụrụ anya mgbe nile banyere mgbaàmà nke ihe ize ndụ dị iche iche, ndị mụrụ ụmụ aghaghị ichebe ụmụntkịrị site ná mkpakọrịta na-adịghị mma, ọbụna n’ime ọgbakọ.

N’aka nke ọzọ, ka ndị na-eto eto wee bie ndụ nke na-enyeghachi ezi ụgwọ ọrụ, ha aghaghị ilekwasị Kraịst anya, bụ́ onye ‘hapụụrụ ha ihe nlereanya ka ha wee soo nzọụkwụ ya nile.’(1 Pita 2:21) N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, a jụrụ ha, sị: “Ọ bụrụ na a zụlitere gị n’eziokwu ahụ, ị maara ihe i kweere na ya, ma ị̀ maara ihe mere i ji kwere?” A gbara ha ume ime ka eziokwu ahụ bụrụ nke ha site n’ịnwapụtara onwe ha na Bible bụ Okwu Chineke, na Ndịàmà Jehova nwekwara eziokwu ahụ n’ezie.

N’ọtụtụ mba dị iche iche, okwu nke a mechiri site ná mwepụta nke akwụkwọ ọhụrụ ahụ nwere 320 peji, bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Work. (Biko lee igbe nke so isiokwu a, nke isiokwu ya bụ “‘Onyinye Sitere n’Aka Jehova’ maka Ndị Na-eto Eto.”) Anyị nwere olileanya na ndị na-eto eto bi na Poland nakwa ná mba ndị ọzọ nke Ọwụwa Anyanwụ Europe ga-emesịa nwee ike irite uru site na ndụmọdụ ọma dị n’akwụkwọ nke a site n’ịgụ ya n’asụsụ nke aka ha.

Sobota w Katowicach (Saturday na Katowice)

Katowice bụ ebe e nwere ọtụtụ ụlọ ọrụ n’etiti ógbè ebe a na-egwupụta coal na ndịda Poland. Olulu coal ndị ahụ dị n’ógbè Silesia ewetaworo ndị ebe ahụ uru akụ na ụba. Ma isiokwu nkwurịta okwu nke dị n’etiti 65,710 mmadụ ndị zukọtara na Slaski Stadium n’August gara aga bụ ụdị ihe uru ka ukwuu.

Onyeọkà okwu mbụ ná nnọkọ nke ehihie kọwara isiokwu nke ụbọchị Saturday, nke bụ́ “Nsọpụrụ Chineke Bụ Ụzọ Irite Uru nke Ukwuu.” (1 Timoti 6:6) A jụrụ ụfọdụ mmadụ ndị nwetaworo uru dị ukwuu ná ndụ nke onwe ha site n’ịgbaso nsọpụrụ Chineke ajụjụ ọnụ iji kwadoo ịbụ eziokwu nke ihe onyeọkà okwu ahụ kwuru.

N’oge ihe omume nke ụtụtụ, e mesiwo abamuru ndị a na-enweta n’ịgbaso nsọpụrụ Chineke ike n’otu usoro isiokwu ndị ọkàkwu atọ kwuru. “Site n’Iji Nghọta Na-agụ [Okwu Chineke] Mgbe Nile,” inyoba anya n’isi ihe anyị na-agụ, na iji ekpere na-atụle ụzọ anyị ga-esi tinye ihe anyị na-amụta n’ọrụ, dị ka ndị Kraịst, ga-enwe ike ịgbaso nsọpụrụ Chineke “Site n’Ikwe Ka Ìhè Anyị Na-enwu Mgbe Nile.” (Joshua 1:8) E hotara na ọ bụrụ na Onyeàmà Jehova ọ bụla n’ụwa dum enwee ike itinye 15 minit kwa ụbọchị n’ịgbara ndị ọzọ àmà mberede, a pụrụ itinyekwu 327 nde awa n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ.

A na-agbasokwa nsọpụrụ Chineke “Site n’Iguzogide Ọnwụnwa.” Ihe ndị dị ka ka ihe oriri, ihe ọṅụṅụ, mmekọahụ, ma ọ bụ ego, ọ bụ ezie na ha adịghị njọ n’onwe ha, pụrụ ịdị njọ n’ọnọdụ ndị na-ezighị ezi. Ụzọ nchebe bụ mmadụ izere ikpughe onwe ya n’ụzọ ezi uche na-adịghị ya nye nchụso ihe onwunwe nke ụwa, ihe osise na ihe odide banyere mmekọahụ, ọgwụ ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya ókè, tinyere oké nchụso nke ihe ụtọ, dị ka egwú otiti, egwuregwu, na ihe omume ọha dị iche iche. Ekpere dị oké mkpa. Ndị Kraịst aghaghị ịmụta ịkpọ ihe ọjọọ asị. Nke a kwesịrị ekwesị, ebe ọ bụ na onyeọkà okwu na-esochinụ mere ka ọpụta ìhè na ha kwesịrị “Ịdị Ndụ, Ọ Bụkwaghị Ime Uche Mmadụ kama Ime Uche Chineke.”

Ọnu ọgụgụ na-abawanye ụba nke ụmụ mmadụ na-ekpebi ime nke ahụ. Nke a pụtara ìhè mgbe 2,663 Ndịàmà ọhụrụ gosipụtara mkpebi ha n’ihu ọha ‘Ịgbaso Nsọpụrụ Chineke Dị Ka Ndị Kraịst Raara Onwe Ha Nye, Meekwa Baptesm.’ (Ná mgbakọ atọ ahụ e mere na Poland, ngụkọta ndị mere baptism dị 6,093.) Iji nọgide na-enwe ọṅụ n’ozi Jehova, a gbara ndị ahụ gaje ime baptism ume ka ha tụgharịa uche n’ọtụtụ ihe ndị mere ha ga-eji nwee ọṅụ: ọbụbụenyi nke Jehova, òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ ha nọ na ya, na olieanya nke ịdị ndụ n’ime Paradaịs.

A tụlere ihe banyere ndị Kraịst ido onwe ha n’okpuru n’okwu ahụ isiokwu ya bụ “Igosipụta Nsọpụrụ Chineke n’Ihe Omume—Dị Ka Ndị Ikom Nọ n’Okpuru Ịbụ Isi nke Kraịst.” Ndị ikom ndị na-egosipụta nsọpụrụ Chineke ga-elekọta ibu ọrụ ezinụlọ ha n’ụzọ ịhụnanya yiri nke Kraịst. “Dị Ka Ndị Inyom Ndị Na-edo Onwe Ha n’Okpuru n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị,” ụmụnna anyị ndị nwanyị bụ ndị Kraịst ga na-enye nkwado, ọ bụghị inwe mmetụta na-ezighị ezi n’ebe onyeisi ezinụlọ ahụ nọ ma ọ bụ i kwere ka mmetụta ha na-enwe duje ha n’ime mkpebi ndị ezi uche na-adịghị na ha. “Dị Ka Ụmụntakịrị Ndị Na-erubere Ndị Mụrụ Ha Isi,” ndị na-eto eto ga-amụta irube isi, ịza ajụjụ ná nzukọ dị iche iche, na ikere òkè n’ije ozi ndị Kraịst.

Lee nnọọ ezi ndụmọdụ nke a bụ! Ma, lee nnọọ ka okpukpe ụgha siworo daa ajọ ọdịda n’inye ezi nduzi dị otú ahu! N’ihi nke a, o kwesịrị inweta nkatọ siri ike, bú nke bịara n’okwu ahụ bụ “Ikpughe ‘Onye ahụ Na-emebi Iwu.’” A kọwara onye nke a bụ ihe omimi dị ka “‘onye’ ọtụtụ ndị mejupụtara, bụ́ òtù ndị ndú okpukpe dum nke Krisendọm wezugara onwe ya n’ezi ofufu.” N’ịbụ ndị ihe ọjọọ e ji mara ha bụ ịkpagbu ndị ohu Chineke, ndị ọzọ esonyeworo ndị ndú okpukpe ahụ ugbu a, bụ́ “ndị zọrọbuuru na ha bụ Ndịàmà, [ndị nọgidewokwara] na-agaghachi n’ozizi nile rụrụ arụ nke Krisendọm, sorokwa ndị na-aṅụbiga mmanya ókè n’ụzọ ime mmụọ nke Babilọn Ukwu ahụ na-ejikọ aka n’iti òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nke nwekwara uche nke Jehova ihe, na-ebusokwa ha agha.” E ji ịkụ aka gosi nkwenye mgbe onyeọkà okwu ahụ kwupụtara, sị: “Anyị ga-anọgide na-ekpughe Bailọn Ukwu ahụ na ‘onye mmebi iwu ya.”

Nke a chọrọ obi ike, karịsịa, dị ka M.G.Henschel, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi ahụ kwuru, n’oge mgbe ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ ‘gbakụtaworo Chineke na Okwu ya bụ Bible azụ.’ Ọ bụ ezie na “nsọpụrụ a na-enye Bible n’oge a dị n’ọnọdụ dị ala otú ọ na-adịtubeghị,” Bible anọgidewo na-adị irè ruo ogologo oge. Onyeọkà okwu ahụ rụrụ ụka na “ọ dịghị akwụkwọ ọ bụla nke ọ bụ nanị ụmụ mmadụ mepụtara nke pụrụ igosi nghọta dị omimi otú a, nọgidekwa na-ekwu ihe ziri ezi ezi mgbe nile.” O kwuru na ‘Ndịàmà Jehova na-ekwe ka Okwu Chineke na-enwe ike ná ndụ ha, òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke ezi ndị Kraịst, nke na-egosi na Bible bụ Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ nsọ.’ Ụbọchị ahụ rutere ná ngwụsị na-enye obi ụtọ mgbe a mara ọkwá mwepụta nke akwụkwọ ọhụrụ ahụ bụ The Bible—God’s Word or Man’s?, bụ́ nke e wepụtara n’ọtụtụ asụsụ.

Niedziela w Warszawie (Sunday na Warsaw)

Ndị na-abịa ileta Warsaw na-ejekarị ịhụ ebe ahụ bụ ihe ncheta nke kara akara ebe e nwere Warsaw Ghetto ahụ ọha mmadụ kpọrọ asị, bụ́ ebe ndị Nazi tinyejuru ọtụtụ narị puku ndị Juu, bụ́ ndị a kara akara maka mgbuchapụ n’oge Agha Ụwa nke Abuọ. Ọtú ọ dị, n’ebe a pụrụ iji ụgbọ ala ruo na minit ole na ole, 60,366 mmadụ jupụtara na X-Lecia Stadium n’August 13, ịnụrụ okwu ndị dabeere n’isiokwu bụ “Na-ajụ Asọpụrụghị Chineke ma Na-adị Ndụ nke Nsọpụrụ Chineke,” bụ́ isiokwu nke Sunday.—Taịtọs 2:12.

O doro anya na ịdị ndụ nke nsọpụrụ Chineke megidere mmụọ ụwa nke ịchọ nnwere onwe. Ihe nkiri ahụ nke na-egosi ihe na-eme eme n’ezie, nke isiokwu ya bụ “Doonụ Onwe Unu n’Okpuru Jehova,” nke e ji ụdị ịnụ ọkụ n’obi e ji amara ndị Poland mee, mesiri ike mgbanwe ndị ọ dị mkpa ka ndị Kraịst mee iji wee nweta nkwado nke Chineke.

Otu onye so n’Òtù Na-achị Isi hotara okwu dị ná 1 Ndị Kọrint 8:6, nke na-asị: “N’ebe anyị nọ otu Chineke dị, bụ́ Nna.” O hotara na ozizi bụ isi nke ndị Kraịst abụghị Atọ n’Ime Otu, dị ka ọtụtụ ndị na-ekwu kama na ọ bụ iwepụ aha Jehova n’ụta site n’Alaeze ya nke dị n’aka Kraịst. “Ozizi Atọ n’Ime Otu bụ ngahie ụzọ site n’eziokwu, ndapụ site na ya,” ka ọ kọwara.Otú a, mmadụ ndị na-akpọ Meri nne nke Chineke na Onye Ogbugbo Nwanyị n’etiti Chineke na mmadụ anaghị ‘anọgide ná mmazu Chineke.’ (Ndị Rom 1:28) Ya mere, “ife Chineke n’ụzọ ziri ezi pụtara ịjụ ozizi Atọ n’Ime Otu.” E ji oké ịkụ aka nabata mwepụta nke akwụkwọ nta ọhụrụ nwere 32 peji bụ Czy wierzyć w Trójcę? (Ì Kwesịrị Ikwenye n’Atọ n’Ime Otu?) Lee nnọọ ezi ngwá ọrụ nke a bụ iji kpughee ozizi ahụ na-adịghị asọpụrụ chineke dị ka ihe na-abụghị eziokwu!

Ọ dịghị mgbe a napụtara ndị ahụ a chịjere na Warsaw Ghetto ahụ. Ma nkwa Chineke, dị ka a kọwara ya n’okwu ihu ọha ahụ, bụ na “Mgbapụta Dị Nso Nye Ndị Na-asọpụrụ Chineke!” (2 Pita 2:9) Ọ dị otú ahụ n’agbanyeghị eziokwu ahụ nke bụ na ndị Kraịst bụ ndị a na-emeso ihe ike n’ụzọ abụọ—ụdị a na-enweta kwa ụbọchị na nke ahụ a na-emeso ha kpọmkwem n’ụdị mkpagbu. N’ịkpọ òkù ka onye ọ bụla nyochaa onwe ya, onyeọkà okwu ahụ mesiri ya ike na “nnapụta bụ nanị nye ndị ahụ na-asọpụrụ Chineke, ndị nsọpụrụ ha bụ nke ziri ezii, ndị nrubeisi ha bụ ngosipụta nke ikwesị ntuwasị obị.”

Mgbe e nyesịrị ihe ncheta ikpeazụ nke isiokwu ya bụ “Na-adịnụ Ọkụ ná Mmụọ Unu,” mgbakọ ahụ mechiri site n’isokwu na-akpali akpali bụ “Ọzụzụ Anyị nke Na-aga n’Ihu Ná Nsọpụrụ Chineke Bara Uru.” Mgbe ahụ ndị ahụ bịara mgbakọ meghere akwụkwọ abụ ọhụrụ ha dị n’asụsụ Polish, bụ́ nke e bipụtara nanị izu ole na ole tupu mgbe ahụ, wee tinyekọta olu n’ikpe “Ekpere nke Inye Ekele” bụ́ isiokwu nke abụ 45 (n’akwụkwọ abụ ọhụrụ).

Ekpere mmechi sitere n’ala ala obi sochiri nke a, mgbe ahụ oké ịkụ aka tiwapụrụ na Warsaw, Poznan, na Katowice. Na Warsaw, ọtụtụ iri puku mmadụ nọgidere na-akụsi aka ike n’usoro n’usoro ruo ihe karịri 11 minit. Ọ dịghị onye chọrọ ịla ala, oké ịkụ aka ahụ, nke na-egosipụtakwa obi ụtọ nke oké ìgwè Ndịàmà ndị a, nke ihe karịrị 100,000 n’ime ha na-abịa mgbakọ ụbọchị atọ nke mbụ ha, gosịpụtara nnọọ ekele ha nwere nye Jehova na nzukọ ya. Ọ bụ dị ka ọ̀ bụ ná nzaghachi nye Abụ Ọma 47:1, 2: “Unu ndị nile dị iche iche, kụọnụ aka; werenụ olu nke iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke. N’ihi na Jehova, onye kachasị ihe nile elu, dị egwu; ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa nile.” Ka otu n’ime ihe ndị kasị bụrụ oké ihe omume n’akụkọ ihe mere eme nke oge a nke Ndịàmà Jehova na-abịaru ná ngwụsị ya, ụmụnna ndị ahụ na-anụ ọkụ n’obi mere nkwadebe maka njem ụla ha, obi ha na-ejubigakwa ókè n’obi ụtọ na mkpebi siri ike ịrụsikwu ọrụ ike n’ọrụ ịgba àmà Alaeze ahụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe nlereanya nsọpụrụ Chineke dị oké ọnụ ahịa nke Jisọs.

[Igbe dị na peeji nke 27]

Akwụkwọ Ndị Ọhụrụ Akpalie ‘Ihe Omume nke Nsọpụrụ Chineke’

Akwụkwọ ọhụrụ ahụ bụ The Bible—God’s Word or Man’s? na akwụkwọ nta ahụ bụ Should You Believe in the Trinity? kpalichara okwu ekele dị iche iche. Otu nwanna nwanyị dere banyere akwụkwọ nta Trinity ahụ, sị: “Ọ bụụrụ m ihe ịtụnanya, ihe mkpali, na ihe obi ụtọ. Ana m ekele unu maka oge, ike, na ọrụ dị ukwuu unu tinyere n’ibipụta akwụkwọ ọma nke a.”

Nwanna nwanyị ọzọ dekwara banyere akwụkwọ ahụ bụ The Bible—God’s Word or Man’s?, sị: “Achọrọ m ikele unu site n’ala obi m maka akwụkwọ ọma ọhụrụ nke a. Ònye ma ma unu matakwararịị otú o si bụrụ oké ọrụ nkà? Ana m akanyekarị akara n’okpuru okwu ndị dị mkpa. Ma unu emewo ihe karịrị m ike n’ihi na mkpụrụ okwu ọ bụla dịcha mkpa. Aka m gụchara nanị isi 5, ma achọrọ m nnọọ ịsị unu, unu emeela.”

[Igbe dị na peeji nke 30]

Onyinye sitere n’Aka Jehova’ maka Ndị Na-eto Eto

Otu ihe omume pụrụ iche ná mgbakọ ndị e nwere na United States na n’ọtụtụ mba ndị ọzọ bụ nnọkọ nke ehihie Friday, mgbe a gwara ndị na-eto eto nọ n’agbata 10 na 19 afọ ka ha nọdụ n’akụkụ e wepụụrụ ha iche. Mgbe otu usoro isikwu pụrụ iche gasịrị, e nyere onye ọ bụla n’ime ha otu akwụkwọ ọhụrụ ahụ bụ Questions Young People Ask—Answers That Work. Gburugburu ụwa, e wepụtara 8,840,000 akwụkwọ ahụ na 21 asụsụ dị iche iche, a natawokwa ọtụtụ puku akwụkwọ ozi na-egosi obi ekele!

“Ná mgbakọ ndị a na-enwe n’oge gara, enwewo okwu dị iche iche a gwara ndị na-eto eto,” ka otu nwa agbọghọ ka dị afọ iri na ụma dere, “Ma mmetụta nke ịkpọkọta anyị nile ka anyị nọkọọ n’otu bụ ihe a na-apụghị ịkọ akọ.” Onye ọzọ na-eto eto dere, sị: “Ejere m nọdụ n’ebe ahụ e debere ndị na-eto eto. Nke a gbara m ume nke ukwuu nke na, eri mgbe ahụ, ana m edetuzi ihe ná nzukọ dị iche iche, na-amụ ihe karị, na-azakwa ajụjụ. Ana m eche echiche banyere ime baptism n’ọkọchị nke na-abịanụ.”

Nye ọtụtụ ndị na-eto eto, ahụmahụ ahụ bụ oké ihe omume. “Mgbe onyeọkà okwu ahụ mara ọkwa ka anyị jee nọdụ n’akụkụ nke e debere iche,” ka otu nwa agbọghọ na-echetaghachi, “amaara m na oké ihe gaje ime. Mgbe a mara ọkwa mwepụta nke akwụkwọ ahụ, obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu nke na achọrọ m ibe ákwá. Amawo m eri mgbe na unu nwere mmetụta n’ebe anyị bụ ndị na-eto eto nọ, ma nke a bamiri n’ime obi m. Akwụkwọ a bụ nnọọ ihe dị anyị mkpa!”

“E dere ya nnọọ nke ọma,” ka otu onye na-eto eto aha ya bụ Leah kwuru, “ihe osise ndị dị na ya dịkwa nnọọ mma, bụrụkwa ndị na-eme ka i chee echiche.” Akwụkwọ ndị ahụ e wepụtara ná mgbakọ nwere ozi dị mkpirikpi sitere n’aka Òtù Na-achi Isi nke e dere “Nye Ndịàmà Jehova Nile bụ́ Ndị Na-eto Eto.” “Ozi ahụ pụrụ iche metụrụ m nnọọ n’obi nke ukwuu,” ka onye na-eto eto bụ Andreá kwuru. “Nke ahụ nyere m mmetụta nke yiri ka à ga-asị na otu n’ime ndị Jehova họrọworo iso ya biri n’eluigwe na-agwa m okwu kpọmkwem!”

Ọtụtụ ndị nwere ekele na e nyere akwụkwọ ahụ dị ka onyinye. Otu onye mụrụ ụmụ kwuru, sị: “Nke a wetara anya mmiri n’anya m. Ụmụnna, ise n’ime ndị ahụ na-eto eto bụ ndị nke m, ndị nọ n’afọ ndụ 11 ruo 16. Agaara m enwe ike ịzụtali nanị akwụkwọ abụọ.” Onye na-eto eto aha ya bụ Mak dere, sị: “Amalitere m ịgbakọ ego ole ọ ga-ewe iji nye onye ọ bụla na-eto eto otu akwụkwọ ahụ n’efu, ma mgbe ahụ echetara m na nduzi nke dị n’ime ya bụ ihe ọnụ ahịa ọ bụla na-apụghị ịzụta. Ọ bụrụ na akwụkwọ ahụ enyere nanị otu onye na-eto eto nke gahieworo ụzọ aka ịlọghachi n’ụzọ nke na-eduje ná ndụ ma ọ bụ, karịsịa, ọ bụrụ na o nyere ọtụtụ n’ime anyị aka ịnọgide n’ụzọ ahụ, ihe nile e mefuru na ya kwesịrị nnọọ ekwesị.”

Ọtụtụ ndị na-eto eto malitere irite uru site n’akwụkwọ ahụ ozugbo. “Ejere m mgbakọ nke anyị na July 7-9,” ka otu onye na-eto eto kwuru, “mgbe ọ na-erule Monday, july 10, agụchawo m ya!” Otu onye ọzọ kwukwara, sị: “Isiokwu abụọ ndị nke ikpeazụ dị na ya gbara m nnọọ ume ichebara ndụ m echiche karị. Ọ dịbu mgbe m chọrọ ime baptism ma gbanwee uche m. Ugbu a m nwetaworo akwụkwọ nke a dị ebube, aghọtawo m na ‘ụwa na-agabiga agabiga,’ na ọ dịkwa mkpa ka m mee ihe ugbu a.”

“N’ihi na oge anyị na-ebi n’ime ya agbanwewo,” ka otu nwa agbọghọ dere, “ana m echebu nnọọ na ndị okenye amaghị ụdị mmetụta anyị na-enwe. Unu amaghị otú o si bụụrụ m ihe obi ụtọ ịhụ na echiche m na-enwe ezighị ezi. Nlebara anya unu na-enye anyị bụ́ ndị na-eto eto na-eme ka m nwee echiche dị ka à ga-asị na abụ m onye a na-agụ n’ihe.” Otu ìgwè ndị na-eto eto si Sweden dere, sị: “Anyị nwere mmetụta nke bụ na unu na-aghọta anyị dị ka ndị na-eto eto, anyị nwekwara mmetụta nke ịbụ ndị dị unu nso karị.”

Otu onye na-eto eto chịkọtara ihe nile nke ọma mgbe ọ sịrị: “Akwụkwọ ahụ masịrị mụ na nwanne m nwoke na nwanne m nwanyị. Anyị na-eche na ọ bụ onyinye sitere kpọmkwem n’aka Jehova.” Anyị na-ekpe ekpere ka onyiye nke a nọgide na-aru ọrụ maka ngọzi nke ndị na-eto eto, bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke.

[Chaatị dị na peeji nke 29]

Nsọpụrụ Chineke Nọ Na-amụba na Europe!

Ọnụ Ọgụgụ Kasị Elu nke Ndị Bịaranụ Ndị E Mere

Baptism ná Mgbakọ

1979 1984 1989 1979 1984 1989

AUSTRIA 17,847 20,908 25,153 236 257 307

BELGIUM 23,185 28,456 30,622 234 248 429

BRITAIN 113,910 137,008 160,704 605 937 1,344

DENMARK 21,057 23,267 24,645 122 147 249

FINLAND 20,293 23,501 25,679 215 302 329

FRANCE 89,073 110,745 156,751 1,361 1,856 3,201

GERMANY 129,342 140,681 159,819 1,154 1,009 1,694

ITALY 117,163 169,328 240,041 2,515 3,769 6,295

LUXEMBOURG 1,141 1,327 3,131 8 12 61

NETHERLANDS 36,768 42,060 44,185 126 143 271

NORWAY 10,327 11,352 13,829 107 159 294

POLAND — 94,134a 166,518 — 3,140b 6,093

PORTUGAL 35,108 47,843 59,797 862 1,068 1,546

SPAIN 62,201 84,706 115,981 1,278 1,521 2,935

SWEDEN 21,286 25,204 30,943 279 323 410

SWITZERLAND 14,455 17,457 23,867 130 225 349

NGỤKỌTA 713,156 977,977 1,281,665 9,232 15,116 25,807

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọnụ ọgụgụ nke 1985

b Ọnụ ọgụgụ nke 1985

[Foto dị na peeji nke 26]

Mwepụta nke akwụkwọ nta ahụ bụ “Trinity” bụ ihe na-eweta ọṅụ na Warsaw

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndịàma ọhụrụ raara onwe ha nye na Katowice na-agbaso nsọpụrụ Chineke site n’ime baptism

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya