Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 4/1 p. 4-6
  • Udo Ohere Dị Aṅaa Dị Maka Inweta Ya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Udo Ohere Dị Aṅaa Dị Maka Inweta Ya?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Udo Site n’Okpukpe na Iwu
  • Ihe Ndị Ọzọ E Mere Iji Nweta Udo
  • Ike Zoro Ezo Nke Na-egbochi Udo
  • Ezi Udo—Site n’Ebee?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ka “Udo Nke Chineke” Chee Obi Unu Nche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ònye Ga-eduru Ihe A Kporo Mmadụ Gaa n’Inweta Udo?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Olee Mgbe Udo Na-adịgide Adịgide Ga-abịa n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 4/1 p. 4-6

Udo Ohere Dị Aṅaa Dị Maka Inweta Ya?

N’AGBANYEGHỊ isiokwu ndị na-apụta n’akwụkwọ akụkọ, ihe bụ eziokwu bụ na, dị ka ihe ka ọtụtụ n’ime anyị maara, na ihe a kpọrọ mmadụ abịabeghị nso inweta ezi udo ma ọlị. Ịkpọpụ usuu ndị agha mba ọzọ n’Afghanistan ewetaghị udo n’ala ahụ. A ka nwekwara otu ụdị ọgba aghara ma ọ bụ ọzọ na Philippines, Sudan, Israel, Northern Ireland, Lebanon, na Sri Lanka, iji kpọtụ nanị ole na ole aha.

Ebe ọ bụ na ọ ga-akara ihe ka ọtụtụ ná ndị isi zuru okè mma inwe udo kama agha, gịnị mere o ji sie ike otú a inweta udo? Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị agbalịwo n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche n’ime ọtụtụ narị afọ gara aga iji weta udo, ma mgbalị ha nile adawo mgbe nile. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ka anyị lee ihe atụ ụfọdụ iji wee mara.

Udo Site n’Okpukpe na Iwu

Ụfọdụ ndị na-ele Alaeze Rom anya dị ka mgbalị gara nke ọma e mere iji nweta udo. N’okpuru ya, ngwakọta nke iwu e guzobere eguzobe, usoro ọchịchị ndị a pụrụ ịgbanwegharị agbanwegharị, usuu ndị agha siri oké ike, na okporo ụzọ ndị a rụrụ nke ọma mere ka e nwee nguzosi ike nke mba dị iche iche ruo narị afọ ole na ole, bụ́ nke a kpọrọ Pax Romana (Udo nke Rom) n’ebe akụkụ dị ukwuu nke Ọdịda Anyanwụ Asia, Africa, na Europe, dị. Ma mgbe e mesịrị, Alaeze Rom ahụ dara n’ihi omume rụrụ arụ nke ndị bi n’ime ya na mwakwasị nke ndị mba ọzọ, Udo nke Rom ahụ wee dakpọọ.

Nke a na-eme ihe atụ nke otu eziokwu dị mwute banyere mgbalị ụmụ mmadụ na-eme. Mgbe a malitesịrị n’ụzọ na-enye olileanya, ha na-adakpọkarị. Chineke n’onwe ya kwuru, sị: “Nchepụta nke obi mmadụ dị njọ site na nwata,” nchepụta ọjọọ nke a na-emesịakwa nwee mmeri n’ikpeazụ. (Jenesis 8:21) Ọzọkwa, Jeremaịa onye amụma kwuru, sị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị ngwọta ka ọ bụkwa: ònye ga-amara ya?” (Jeremaịa 17:9) Ụmụ mmadụ bụ ndị pụrụ ime mgbanwe na mberede. Ekworo na ọchịchọ onwe onye nke ndị ọzọ pụrụ imebi ezi nzube nke otu onye. Ma ọ̀ bụkwanụ na onye ọchịchi nke nwere ụkpụrụ omume ndị dị elu pụrụ ịtinye aka n’omume rụrụ arụ n’onwe ya. N’iburu nke a n’uche, olee ụzọ ụmụ mmadụ pụrụ isi weta udo mgbe ọ bụla?

N’ime narị afọ nke atọ T.O.A., a natara akụkọ banyere mgbalị pụtara nnọọ ìhè e mere maka udo site ná mba ahụ buru ibu bụ India. N’ebe ahụ, otu onye ọchịchị siri ike aha ya bụ Asoka guzobere otu alaeze buru ibu site n’ibu agha na ịwụfu ọbara. Mgbe ahụ, dị ka ihe ndekọ na-egosi, a tọghatara ya gaa n’ụkpụrụ nile nke okpukpe Buddha. N’ịjụ ibu agha, o guzobere ihe ọkpụkpụ dị iche iche gburugburu ebe ọ na-achị, bụ́ ndị e dekwasịrị ihe n’elu ha, ndị ga-enyere ndị ọ na-achị aka ibi ndụ dị mma karị. O yikwara nnọọ ka alaeze ya nọrọ n’udo, nweekwa ihe ịga nke ọma.

Ụzọ nke Aśoka ọ̀ bụ nke na-eduje n’udo? Ọ bụ ihe dị mwute na ọ bụghị otú ahụ. Mgbe onyeeze ahụ nwụrụ, udo ya sokwa ya nwụọ, alaeze ya wee dakpọọ. Nke a na-egosi na ọbụna mgbalị nile nke onye ọchịchị nwere ezi nzube, onye maakwara ọrụ nke ọma, na-emesịa dakpọọ n’ihi na ọ ghaghị ịnwụ anwụ. Onye dere Eklisiastis kpọtụrụ uche n’ihe isi ike nke a mgbe o dere, sị: “Mụ onwe m kpọkwara ndọgbu m nile asị, . . . n’ihi na m ga-ahapụrụ ya mmadụ nke ga-anọ mgbe m gasịrị. Ma ònye maara ma ọ̀ ga-abụ onye maara ihe ma ọ bụ onye nzuzu? Ma ọ ga-achị ndọgbu m nile nke m dọgbuworo onwe m n’ọrụ, na nke m meworo n’amamihe n’okpuru anyanwụ. Nke a bụkwa ihe efu.”—Eklisiastis2:18, 19.

Ee, eziokwu ahụ nke bụ na mmadụ na-anwụ anwụ bụ ihe mgbochi a na-apụghị imeri emeri nye mgbalị ya iji nweta udo nke na-adịgide adịgide. N’ihe banyere nke a, ndụmọdụ nke onye ọbụ abụ ahụ bụ nke amamihe dị n’ime ya n’ezie: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere. Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachị n’ala o sị pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.”—Abụ Ọma 146:3, 4.

Ihe Ndị Ọzọ E Mere Iji Nweta Udo

Ihe ndị ọzọ mmadụ na-eme na-egosikwa ihe mere mmadụ ji na-ada ná mgbalị ya inweta udo. Dị ka ihe atụ, n’ime narị afọ nke iri, e guzobere otu òtù a kpọrọ Udo nke Chineke na Europe. N’ịbụ nke e guzobere iji chebe ala chọọchị nwere, ọ gbasara gaa n’ịbụ otu ụdị nke òtù na-adịghị eme ihe ike nke na mgbe ọ na-erule etiti narị afọ nke iri na abụọ, ọ gbasazuwo ruo akụkụ dị ukwuu nke Europe.

Echiche ọzọ biliterenụ bụ nke a kpọrọ “nhazi nke ike.” N’ịgbaso ụkpụrụ echiche nke a, otu njikọ nke mba dị iche iche—dị ka Europe—na-enye aka ịhụ na agha adaghị site n’ijigide ihe a pụrụ ịkpọ nhazi nke ike n’etiti mba dị iche iche. Ọ bụrụ na mba nke siri ike eyie mba ọzọ nke na-esichaghị ike egwu, mba ọzọ siri ike na-ejikọta onwe ya n’ebe nke ahụ na-esichaghị ike nọ ruo nwa mgbe nta iji kụda nke ahụ na-achọ okwu aka. Ụkpụrụ echiche nke a duziri mmekọrịta ndị Europe malite n’ọgwụgwụ nke Agha Napoleon ndị ahụ ruokwa ná ntiwapụ nke agha ụwa mbụ na 1914.

Mgbe agha ahụ gasịrị, e guzobere Njikọ Mba Dị Iche Iche (òtù League of Nations) dị ka ọgbọ ebe mba dị iche iche ga-anọ kwurịta okwu banyere enweghị nkwekọrịta ha kama ibu agha n’ihi ha. Njikọ ahụ kwụsịrị ịrụ ọrụ mgbe agha ụwa nke abụọ tiwapụrụ, ma mgbe agha ahụ gasịrị, a tụteghachiri mmụọ ya n’ime Òtù Mba Ndị Dị n’Otu (United Nations), bụ́ nke dịgidere ruo ugbu a.

Otú ọ dị, ihe ndị a nile e mere ewetaghị udo nke bụ ezie ma ọ bụ nke na-adịgide adịgịde. Ka òtù Udo nke Chineke nọ na-adị na Europe, ndị Europe nọ na-ebuso ndị Alakụba agha n’Agha Ntụte dị iche iche ebe a wụfuru ọbara dị ukwuu. Ka ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị nọkwa na-agbalị ime ka udo dịgide na Europe site ná nhazi nke ike, ha nọ na-ebu agha, na-ewulitekwa alaeze dị iche iche ná mba ndị na-adịghị na Europe. Njikọ Mba Dị Iche Iche enweghị ike ịkwụsị agha ụwa nke abụọ, Òtù Mba Ndị Dị n’Otu enweghịkwa ike ịkwụsị ajọ mgbukpọ mmadụ e nwere na Kampuchea ma o bụ mburịta agha ndị e nwere n’ebe ndị dị ka Korea, Nigeria, Vietnam, na Zaire.

Ee, mgbalị kasị mma ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị meworo iji nweta udo akụwo afọ n’ala. Ndị ọchịchị amaghị nnọọ otú a ga-esi nweta udo na-adịgide adịgide, ebe ọ bụ na ịnwụ anwụ na adịghị ike nile nke onwe ha na nke ndị ọzọ na-egbochi ha. Otú ọ dị, ọbụna ma a sị na ọ dịghị otú ahụ, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị agaghị enwekwarị ike iweta udo. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi ihe mgbochi ọzọ nke siri nnọọ ike n’ezie.

Ike Zoro Ezo Nke Na-egbochi Udo

Bible kwuru banyere ihe mgbochi nke a mgbe ọ sịrị: “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ajọ onye ahụ bụ Setan, bụ Ekwensu, bụ mmụọ nke dị ike nke ukwuu karịa anyị onwe anyị. Site ná mmalite, aka Setan adịwo ná nnupụisi, ikwu okwu ụgha, na igbu mmadụ. (Jenesis 3:1-6; Jọn 8:44) Ndị ọzọ kwuru okwu site n’ike mmụọ Chineke gbakwara akaebe banyere ike dị ukwuu nke zoro ezo o nwere n’ihe ndị na-eme n’ụwa. Pọl kpọrọ ya “chi nke oge a,” “onyeisi nke ike nke mbara eluigwe.” (2 Ndị Kọrint 4:4; Ndị Efesọs 2:2) Ihe karịrị otu ugbo, Jisọs kpọrọ ya “onyeisi ụwa nke a.”—Jọn 12:31; 14:30; 16:11.

Ebe ọ bụ na ụwa na-atọgbọ n’ike Ekwensu, ọ gaghị ekwe nnọọ omume na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ mmadụ ga-eweta udo na-adịgide adịgide. Nke ahụ ọ̀ pụtara na ọ dịghị mgbe ọ bụla udo ga-adị? Ọ̀ dị onye pụrụ iduru ihe a kpọrọ mmadụ gaa n’inweta udo?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

N’agbanyeghị otú onye ọchịchị si bụrụ onye nwere amamihe, nke nwekwara ụkpụrụ ndị dị elu, ọ ga-emesịa nwụọ, ọtụtụ mgbe ndị na-amachaghị ọrụ, ndị na-adịghị agbasochakwa ụkpụrụ dị elu na-eweghara ọchịchị

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Ihe mghochi kasị ukwuu e nwere n’ebe udo dị bụ Setan bụ́ Ekwensu

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 5]

U.S. National Archives photo

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya