Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
◼ Ọ̀ bụ ihe kwesịrị ekwesị bụ́ onye Kraịst ịchụ nta ma ọ bụ ịkụ ọkụ azụ?
Mmeghachi omume ndị dịgasị iche iche banyere ịchụ nta na-agụnye mmetụta dị omimi mgbe mgbe. Ya mere ọ bụ ihe kasị mma bụ́ ndị Kraịst ịgba mbọ ịghọta ma tinye echiche nke Jehova Chineke n’okwu ahụ n’ọrụ dị ka a na-ahụ ya na Bible.
Chineke nyere ihe a kpọrọ mmadụ ikike n’ebe ma anụ “ọhịa” ma anụ “ụlọ” dị. Na mbụ, Onye Okike ahụ enyeghị ụmụ mmadụ ikike, ha enweghịkwa mkpa ọ bụla nke elu ahụ iji gbuo ụmụ anụmanụ maka ihe oriri. (Jenesis 1:24, 29, 30) Ọ bụ nanị mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị ka Chineke nyere ihe a kpọrọ mmadụ ikike iri anụ ahụ nke anụmanụ, bụ́ nke a wụpụrụ “mkpụrụ obi ya—ọbara ya”—nke ọma. (Jenesis 9:3, 4, NW) Nke ahụ pụrụ ịbụ anụ sitere n’anụ ụlọ ma ọ bụ anụ ọhịa.
Ndị Israel zụlitere ụmụ anụ, dị ka atụrụ na ehi, nke a pụrụ igbu iji nweta ihe oriri mgbe ha nwere agụụ maka anụ. Ha chụkwara nta ma gbuo azụ iji nweta nri. (Deuterọnọmi 12:20-24; 14:4-20) Nke a na-ekwekọ n’okwu ihe atụ nke Chineke kwuru na ya ‘gaje iziga ọtụtụ ndị ọkụ ịkụrụ ndị ya dị ka azụ nakwa ọtụtụ ndị na-achụ nta iji chụta ha.’ (Jeremaịa 16:16) Ka oge na-aga, Jisọs webatakwara ndị ọkụ azụ n’ime ndị ozi ya ma duzie ihe bụ ọrụ ịkụ azụ n’ezie—Matiu 4:18-22; 17:27; Luk 5:2-6: Jọn 21:4-7.
Mgbe nna ahụ kaworo nká bụ Aịsak rịọrọ ka e jiri anụ siere ya nri nke tọrọ ụtọ, nwa ya nwoke bu Jekọb di njikere igbu ewu abụọ iji siere ya nri. Otú ọ dị, Ịsọ chụrụ nta anụ ọhịa iji gbutere nna ya anụ mgbada. Rịba ama na ọ bụrịị eziokwu na e nwere anụ nke sitere n’anụ ụlọ, Aịsak rịọrọ ka e nye ya anụ nke a chụtara ná nta. Rịbakwa ama na ụmụ ndị ikom abụọ ahụ gburu anụ nke ga-abụ nri, ọ bụghị maka ha onwe ha, kama maka onye ọzọ.—Jenesis 27:1-19.
A pụrụ igbu anụmanụ, ọ bụghị nani maka anụ ya. A pụrụ iji akpụkpọ ahụ ha mee uwe. (2 Ndị Eze 1:8; Mak 1:6: Ndị Hibru 11:37) A na-esikwa n’ajị anụ na-emepụta ihe ndị e ji ekpuchi ihe na arịa dị iche iche, ọbụna site n’anụmanụ ndị na-adịghị ọcha maka oriri nakwa ndị ụmụ Israel na-adịghị eri.—Ọpụpụ 39:33, 34: Ọnụ Ọgụgụ24:7; Ndị Ikpe 4:19; Abụ Ọma 56:8.
Ọchịchọ Chineke chọrọ ka a wụfuo ọbara nke anụ ndị e gburu egbu kwesịrị ichetara ndị na-achụ nta na ndụ anụ sitere n’aka ya, n’ihi nke a kwa na o kwesịrị ka anyị jiri nsọpụrụ mee ihe banyere ya, ọ bụghị n’ụzọ ezi echiche na-adịghị. (Levitikọs 17:13) Ihe àmà na-egosi na Nimrod gburu ụmụ anụmanụ ma eleghịkwa anya tuo ọnụ banyere nkà ya n’ịchụ nta, ịdị ukwuu ma ọ bụ ọnụ ọgụgụ nke anụ ndị o gburu, ma ọ bụ ihe ncheta ndị a pụrụ isiworị na ha mepụta. Ọ bu “dike n’ịchụ nta [megide, NW] Jehova.”—Jenesis 10:9.
Mkpali dị otú a n’ihe banyere ịchụ nta ma ọ bụ igbu ụmụ anụ, ma ọ bụ banyere ịkụ azụ, pụrụ ibilite n’ime onye Kraịst. Ọtụtụ ndị na-achụ nta ma ọ bụ ndị ọkụ azụ bụ́ ndị nyochaworo obi ha achọpụtawo na ọ bu ‘ọṅụ nke ihe e gbutere’ kpaliri ha. Ụdị mkpali dị otú ahụ na ejighị ndụ ụmụ anụ kpọrọ ihe na-aga ụkwụ na ụkwụ. Ya mere ebe ọ na-adịghị njọ ịchụ nta ma ọ bu ikụ azụ (mgbe ọ dị onye ga-eji ihe e gbutere ma ọ bụ ihe e jidere mee ihe dị ka nri ma ọ bụ mee ihe ná nzube ọzọ kwesịrị ekwesi), ọ ga-abụ ihe na-adịghị mma ime otú ahụ ma ọ bụrụ na onye Kraịst enwee mmụọ yiri nke Nimrod. Ma e nwere ihe ize ndụ ndị dịnụ ma e wezụga inweta mkpali site n’ịchụ nta, ihe ahụ e gburu, ma ọ bu ihe ncheta.
Ụlọ Nche nke January 15, 1984, tụlere ihe mere ezi ndị Kraịst na-ejighị ebugharị ma ọ bụ na-enwe égbè iji mee ihe megide ụmụ mmadụ ma ọ bụ chebe onwe ha. (Peji 23-26) Ịtụgharị uche na ndụmọdụ ahụ edujewo Ndịàmà ụfọdụ n’ilebaghachi anya n’uru nke inwe ọbụna égbè ndị e ji achụ nta. Ọtụtụ ahọrọwo iwepụsị égbè ndị ha nwere kpam kpam ma ọ bụ izere idebe ha ebe aka ga-eru ha ngwa ngwa. Otú a, ndị Kraịst ndị a agaghị eme ihe na-enye echiche nke bu na ha ji ngwá agha eme nganga ma ọ bu na-atụkwasị obi n’ebe ha di. Ọzọ, ọ bughị inwe égbè e ji achụ nta ma ọ bu idebe ha ebe aka ga-eru na ha ngwa ngwa pụrụ ime ka a ghara inwe ọdachi. Mgbe ahụ ngwá agha ndị a na-akpata ọnwụ apụghị ịbata n’aka ụmụntakịrị bụ́ ndị pụrụ imerụ mmadụ ahụ ma ọ bụ gbuo mmadụ n’amaghị ama, égbè agaghịkwa adị ebe aka ga-eru ya ma ọ bụrụ na egwu ejide mmadụ ma ọ bu o daa mbà n’obi. —Tụlee llu 22:3.
Ndị Kraịst ụfọdụ pụrụ inwe mmasị n’ịdị ụtọ nke anụ ụfọdụ a chụtara ná nta ma ọ bụ azụ, ụzọ kasịkwa zie ezi a pụrụ isi nweta anụ dị otú ahụ bụ site n’ịchụ nta ma o bu ịkụ azụ. Ndị ọzọ na-enweta ọṅụ n’ikuku na inwe mmegharị ahụ nke e jikọrọ ya na ichu nta n’ime ọhịa, ma ọ bụ chọpụta na awa ndị ahụ di jụụ nke ịkụ azụ na-eweta ntụsara ahụ. Bible adịghị ekwu okwu megide nke a, ya mere, ọ dịghị ihe mere a ga-eji kpee ndị ọzọ ikpe ma hà na-enweta ọṅụ n’ihe ndị a ma ọ bu na hà adịghị enweta. Ihe atụ nke Aịsak na ụmụ ya na-egosikwa na ọ dịghị ihe ọ bụla mere a ga-eji jụọ ajụjụ banyere onye ga-eri ihe a chụtara ná nta ma ọ bụ ihe a kụtara n’ọkụ.—Matiu 7: 1-5; Ndị Rom 14:4.
Dị ka ihe àmà na-egosi, Pita onye-ozi bụ onye a maara maka ịkụ azụ. N’inwe azụ ụfọdụ ndị a chịsara na nso nso ha, Jisọs ahụ si n’ọnwụ bilie nyeere ya aka inyocha mmetụta nke onwe ya banyere azụ ma ọ bụ ọrụ nke igbu azụ. Jisọs jụrụ, sị: “Saịmọn, nwa Jọn, ị huru m n’anya karịa ndị a?”—Jọn 2l:1-3, 9-15; lee Ụlọ Nche nke November 1, 1988, peji 31.
N’ụzọ yiri nke ahụ, onye Kraịst nke ji ezi akọ na uche họrọ ịchụ nta ma ọ bụ igbu azụ kwesịrị ịhazi ihe ndị bụ isi n’usoro. Dị ka ihe atụ, ọ buru na oge ịchụ nta ma ọ bụ ịkụ azụ ga-amalite n’oge a haziri maka nzukọ ọgbakọ, olee ihe ọ ga-eme? Ma ọ bụ, mkparịta ụka ya ọ̀ na-egosi na o ji nkà ya n’ịchụ nta ma ọ bụ ịkụ azụ anya isi? Lee ihe mara mma ọ bụ ma ọ bụrụ na onye Kraịst tozuru okè, bụ́ onye na-ahọrọ ịchụ nta ma ọ bụ ịkụ azụ mgbe ụfọdụ ga-enwe ike iji obi siri ike kwuo, sị: “Ee, Onyenwe anyị, ị matara na ahụrụ m gị n’anya [karịa ihe nchuso ndị a].”—Jọn 21:16, NW.