Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ịgba Àmà Mberede Amịpụta Mkpụrụ
JISỌS malitere otu mkparịta ụka nke dujere n’ịgba àmà mberede nke dịrị nnọọ irè mgbe ọ gwara otu nwanyị onye Sameria nọ n’olulu mmiri, sị: “Nye m mmiri ka m ṅụọ.” (Jọn 4:7) Anyị onwe anyị taa pụkwara ime nnọọ ihe dị irè ma ọ bụrụ na anyị adị njikere iji ohere nile nke ịgba àmà mberede mee ihe. Otu nwanna nwoke nọ n’Australia kpaliri mkparịta ụka mberede site n’ịnọ n’oche dị n’ogige ntụrụ ndụ ọha na-agụ ihe mmụta dịrị ụbọchị. Otu nwoke chọrọ ịmata ihe hụtara akwụkwọ ahụ wee kwuo na ya onwe ya nwekwara mmasị n’Akwụkwọ nsọ. Ọ bụ onye Katọlik nke na-ejighị okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu, onye a kuziwooro ihe banyere evolushọn n’ụlọ akwụkwọ ndị Katọlik. Ugbu a, ọ maghịkwa nke ọ ga-ekwere ekwere. Nwanna ahụ mere ndokwa iwetara ya akwụkwọ ahụ bụ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation?a Mgbe ụbọchị abụọ gasịrị, o weere akwụkwọ ahụ jee n’ụlọ ọrụ nwoke ahụ, wee nụ na ọ pụrụ apụ. Odeakwụkwọ nwoke ahụ naara akwụkwọ ahụ ngwa ngwa, na-asị: “Anyị anọwo na-eche akwụkwọ nke a.”
Mgbe awa abụọ gasịrị, nwoke ahụ kpọrọ nwanna nwoke ahụ na telifonu wee rịọ ka e wetakwuoro ya akwụkwọ Creation abụọ wee gwa Onyeàmà ahụ ka ọ bịa n’ọfịs ya. Mgbe nwanna nwoke ahụ gara n’ọfịs ahụ, ọ hụrụ ka nwoke ahụ na mmadụ abụọ ndị ọzọ nọ. Ọ maliteere ha ọmụmụ Bible, gụnyere onye odeakwụkwọ ahụ, e mekwara ndokwa ka nwanna ahụ na-abịa ugbo abụọ kwa izu. N’izu ndị na-esonụ, enyi nwanyị nke nwoke ahụ, bụ́ ‘onye Kristian a mụworo ọzọ,’ nọgidere na-edeta akwụkwọ na-ajụ ajụjụ Bible dị iche iche. N’ikpeazụ, o sonyere n’ọmụmụ ihe ahụ, dịkwa ka onye ya na nwoke ahụ na-arụkọ ọrụ na enyi ya, nke bụ onye kweere n’ozizi evolushọn.
Ha nọgidere n’ọmụmụ Bible ha ruo ọnwa ise n esepụghị aka, ha na-enwekwa ọmụmụ ihe nke abụọ ha kwa izu n’ogige ntụrụ ndụ ọha ahụ. Mgbe ahụ, enyi nwoke nke onye odeakwụkwọ ahụ sonyeere ìgwè ndị ahụ na-amụ ihe. N’oge na-adịghị anya mgbe nke a gasịrị, onye ahụ ya na nwoke nke mbụ ahụ na-arụkọ ọrụ na enyi ya kwagara Idaho nke dị na United States, bụ́ ebe ha nọgidere na-amụ ihe. Mgbe izu ole na ole gasịrị, otu onye nwoke nke mbụ ahụ na-amaghị ma ọlị bịakwutere ya, wee jụọ ya ihe mere e ji kwụsị okwu Bible ndị ahụ a na-anọ n’ogige ntụrụ ndụ ahụ na-enwe. Ọ ghaghị ịbụ na ọ nọwo na-ege ntị mgbe nile ha na-amụ ihe n’ebe ahụ. E mere ndokwa ka ya onwe ya malitekwa ịmụ ihe.
Gịnị si n’ihe a nile pụta? Mgbe ọnwa iri na asatọ gasịrị malite na mgbe mbụ ahụ a malitere nkwurịta okwu n’ogige ntụrụ ndụ ahụ, nwoke nke mbụ ahụ na enyi ya nwanyị, onye ahụ bụbu ‘onye Kristian a mụworo ọzọ,’ alụwo di na nwunye wee mee baptism. Onye odeakwụkwọ ahụ na enyi ya nwoke lụkwara di na nwunye, meekwa baptism. Onye ahụ ya na nwoke nke mbụ ahụ na-arụkọ ọrụ na enyi ya ahụ, bụ́ ndị jere United States mekwara baptism, otu n’ime ha na-ejekwa ozi ugbu a dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka n’esepụghị aka. Onye ahụ nke na-ege ntị n’ọmụmụ Bible ndị ahụ a nọ n’ogige ntụrụ ndụ ahụ na-eme nọgidere n’ọmụmụ ihe ya. O wee kwafee Ireland, ọ na-atụ kwa anya ime baptism!
Ihe a nile mere n’ihi na otu nwanna weere ohere oge nri ehihie o nwere iji gbaa àmà mberede, Jehova gọzikwara mgbalị ya nile. Ka anyị meekwa ihe dị otú ahụ site n’iji ohere ọ bụla dapụtaranụ mee ihe ịgbasa ozi ọma ahụ nye ndị ozi Alaeze Jehova na-agụ agụụ!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.