A Gbara Ndị Gụsịrị Akwụkwọ na Gilead Ume Iwulite Ezi Àgwà Mkparịta Ụka
NA SUNDAY, March 4, 1990, ihe karịrị 4,100 mmadụ jupụtara Ụlọ Mgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Jersey City maka ihe omume ngụsị akwụkwọ nke klasị nke 88 nke Watchtower Bible School of Gilead. Mmadụ 24 ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ esiwo 6 mba dị iche iche wee bịa, a na-ezipụkwa ha ugbu a jee ná ngụkọta nke 13 mba dị iche iche.
Usoro ihe omume ahụ malitere n’elekere 10:00 nke ụtụtụ. Mgbe a bụsịrị abụ, George Gangas, onye gbaworo ihe karịrị 90 afọ ugbu a, onye sokwa n’Òtù Na-achị Isi, ji ekpere si n’ala ala obi nye Jehova wee meghee. Mgbe nke a gasịrị, onyeisi oche, bụ́ C W. Barber, onye sokwa n’Òtù Na-achị Isi, onye gụkwara akwụkwọ na klasị nke 26, ji mkpirikpi oge kọọ oké mgbanwe ụfọdụ ndị a na-enwe n’ụwa. O mechiri okwu ya site n’ịsị: “Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ọzọ e nwere ohere dị ebube karịa ugbu a maka ịbụ ndịàmà nke ịbụ ọkaaka na ịbụ onye ezi omume nke Jehova.” Mgbe ahụ, ọ gara n’ihu ịkpọpụtasị ndị ga-ekwu okwu n’usoro ihe omume nke ụtụtụ ahụ.
Vernon Wisegarver, onye so na Kọmitii Ebe Obibi Akwụkwọ nke dị na Brooklyn, họọrọ isiokwu bụ “Bụrụnụ Ndị Ọkà n’Ọrụ Unu.” N’iji ihe atụ nke onye na-akpụ ụzụ n’ime obodo mee ihe, bụ́ onye kpụpụtara ụdọ ígwè siri ike, nke e kegidere n’arịlịka e ji ejide ụgbọ, o wee zọpụta ndụ nke ndị nile nọ n’ụgbọ mmiri n’oge oké ifufe, o ji ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ na Gilead tụnyere onye ahụ na-akpụ ụzụ. Site n’ikuziri ndị mmadụ Bible, ha ga-enye aka iwulite ụdọ ígwè nke na-echebe ndụ, nke bụ àgwà ịsọpụrụ Chineke, na-eji nkà ndị ha mụtara n’ọzụzụ Gilead ha na-eme ihe. Ọ gbara ndị ahụ na-agụcha akwụkwọ ume ka ha nọgide na-eme ka nkà izi ihe ha na-adịwanye nkọ, ka ha nweekwa ike iguzo n’ihu Eze ahụ kachasị ndị eze nile dị ka “ndị nwere nkà n’ọrụ ha.”
Ọzọ, John Barr, onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu n’isiokwu ahụ bụ “Detụnụ Ire, Hụ Na Jehova Dị Mma.” Okwu ya dabeere n’Abụ Ọma 34:8, nke na-asị: “Detụnụ ire, hụ na Jehova dị mma, onye [obi ụtọ, NW] ka ọ bụ, bụ́ nwoke nke na-agbaba n’ime ya.” O nyere ha ndụmọdụ, sị: “Detụnụ ihe ọ bụla dị n’ebe e dujere unu ozi ala ọzọ ire. Nwaleenụ ihe nile. Unu atụla ya egwu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike ịhụ ịdị mma Jehova n’ụzọ unu na-ahụtụbeghị ya mgbe ọ bụla. Unu abụla ndị na-ahọkarị ihe ahọ. Ya adịla mgbe unu ga-asị, ‘Nke a amasịghị m.’ Detụ ya ire.”
Charles Woody, bụ́ onye so na Kọmitii Ngalaba Ije Ozi nke dị na Brooklyn kwuru okwu n’isiokwu ọ họọrọ, nke bụ “Ịnọgide Na-ele Onwe Anyị Anya n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị.” Ọ sịrị: “Ọ na-amasị anyị ịnọnyere ndị na-ele onwe ha anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ndị na-adịghị achọ ka e mee ihe nile otú ha si chọọ ya, ndị na-adị ngwa n’ịja ndị ọzọ mma na iwuli ha elu, ndị, ọ bụkwa ezie na ha nwere ihe ọmụma, na-adịghị eme ka ndị ọzọ nwee mmetụta na ọ dịghị ihe ha maara.” Ọ gara n’ihu ikwu, si, “Dị ka ndị ozi ala ọzọ, unu ga-achọ ịdọrọ ndị ọzọ bịa n’ebe eziokwu ahụ dị, ọ bụghị ịdọpụ ha adọpụ. Àgwà obi umeala unu ga-abụ ihe enyemaka na-enweghị atụ n’imezu nke a.”
Lyman Swingle, onye so n’Òtù Na-achị Isi, bụ onye ọzọ kwuru okwu n’isiokwu bụ “Isiakwụkwọ Ndị Na-esonụ, Gịnị Ka Ha Ga-agwa Anyị?” O malitere site n’ikwu, sị: “Taa, ị na-amalite ide ihe n’isiakwụkwọ ọhụrụ nke ndụ gị. Gịnị ka ị ga-ede n’isiakwụkwọ ndị ọhụrụ ndị a site ugbu a gaa n’ọdịnihu?” O chetaara ha sị: “Ihe ọ bụla unu na-eme kwesịrị iwetara Jehova nsọpụrụ na otuto,” wee kwuokwa, sị: “Jide n’aka na mkpebi nile unu na-eme dabeere n’Okwu Chineke. Chetanụ Ilu 3:7, nke na-asị: ‘Abụla onye maara ihe n’anya gị onwe gị.’ Bụrụnụ ndị a hụrụ dị ka ndị na-ekwesị ntụkwasị obi n’ọrụ e kenyere unu.” O mechiri okwu ya site n’ikwu, sị: “Obi siri anyị ike na ọ dịghị mgbe ọ bụla unu ga-edecha akụkọ ndụ unu edecha, na unu ga-adị ndụ ebighị ebi.”
Ọzọ, Jack Redford, bụ́ otu n’ime ndị nkuzi ụlọ akwụkwọ ahụ gbara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ume, sị: “Bụrụ Àjà Dị Ndụ.” Ọ malitere site n’ikwu, sị: “Ije ozi ala ọzọ bụ ndụ nke ịchụ àjà. . . . Anyị hụrụ unu n’anya maka mmụọ unu nke iji onwe onye chụọ àjà.” N’ihota okwu site ná Ndị Filipaị 2:17, bụ́ ebe Pọl onyeozi kwuru na a wụpụwo ya dị ka àjà ihe ọṅụṅụ, nke pụtara na ya dị njikere itinye onwe ya n’ọrụ dị ka àjà dị ndụ, ọ jụrụ, sị: “Ma olee otú ndị ozi ala ọzọ na-esi eyikarị àjà ihe ọṅụṅụ?” Mgbe ahụ, ọ kọrọ ahụmahụ abụọ nke ndị ozi ala ọzọ ndị tinyere onwe ha n’ọrụ karịa ihe a chọrọ ha n’aka. Otu n’ime ha ji aka ya kpụọ brick dị 16,000, wee wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ dị ná mba ebe e kenyere ya ọrụ. Ahụmahụ nke ọzọ metụtara otu nwanna nwanyị onye sooro di ya banye n’ime oké ọhịa, ebe ọnọdụ ibi ndụ dị nnọọ ala nke ukwuu. Ụmụnna nwanyị ndị ebe ahụ nwere mmasị n’ebe ọ nọ n’ihi na ha hụtara na ọ na-awụpụ onwe ya dị ka ‘àjà dị ndụ.’ Ma mgbe ahụ, onyeọkà okwu ahụ chetaara ụmụ akwụkwọ ahụ na ịchụàjà bụ ihe na-abaghị uru ọ bụla ma ọ bụrụ na nrubeisi esoghị ya. N’iji ihe ndekọ banyere Eze Sọl na ndị Amalek mee ihe, ọ gbara ha ume, sị: “Na-echetanụ mgbe nile na nrubeisi dị mma karịa ịchụàjà. Unu anwala anwa mgbe ọ bụla ime dị ka à ga-asị na unu na Jehova na-ekwerịta ọnụ ahịa. Meenụ ihe ọ gwara unu mee mgbe nile.”
Mgbe ahụ, onyeisi oche kpọpụtara onye nkuzi nke ọzọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, bụ́ Ulysses Glass. Nwanna Glass malitere site n’ikwu, sị: “klasị nke 88 bụ, ha nọgidekwara na-abụ, klasị nke obi ụtọ. Klasị ndị ọzọ nwekwara obi ụtọ. Ya mere, ọ̀ bụ gịnị mere obi ụtọ nke unu ji bụrụ ihe pụrụ iche?” O gosiri na obi ụtọ “abụghị ihe mgbaru ọsọ, kama na ọ bụ ihe na-esi n’ezi ọrụ apụta. Ọ bụ ihe o were irute n’ebe mgbaru ọsọ bụ ihe na-eweta ụgwọ ọrụ.” O hotara okwu nke otu onye na-ede akwụkwọ kwuru, bụ́ onye a gbanwere ndụ ya mgbe ọ hụrụ okwu ahụ bụ: “Ihe ịga nke ọma bụ njem, ọ bụghị ebe njedebe.” Onye ahụ na-ede akwụkwọ ṅụrụ iyi na ya ga-akwụsị ịtụle obi ụtọ n’ihe ndabere nke irute n’ebe a na-eje kama ịdị na-ele ndụ ya dum anya dị ka otu njem nke nọgidere na-aga n’ihu. Ọ sịrị, “Ọ dịghị ụzọ ọ bụla e si eru n’inwe obi ụtọ. Inwe obi ụtọ bụ ụzọ ahụ.” Mgbe ahụ Nwanna Glass kwuru na klasị nke a aghọtawo isi ihe dị n’okwu ahụ. O mechiri okwu ya site n’ịgba ụmụ akwụkwọ nile ahụ ume, sị: “Nọgidenụ na-eje ije n’ebe dere mmiri nke ọma. N’agbanyeghị nsogbu ọ bụla unu pụrụ izute, ka obi ụtọ nke dịịrị ndị hụrụ Jehova n’anya, na-atụkwa egwu ya, nọgide na-abụ nke unu.”
Mgbe ahụ, oge ruru maka okwu bụ isi nke ụtụtụ ahụ, nke onye kwuru ya bụkwa onye ọzọ so n’Òtù Na-achị Isi, bụ́ Karl Klein, onye họọrọ isiokwu ahụ bụ “Iwulite Mkparịta Ụka nke Ndị Kraịst.” Ọ malitere site n’ichetara mmadụ nile na Jehova bụ onye kachasị ukwuu ná ndị maara otú e si enwe mkparịta ụka. E jiri Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Logos ahụ, mee ihe dị ka Ọnụ Bụ Isi nke Na-ekwuru Jehova, o mekwara ka ihe e kere eke dị n’elu ala mara uche na ntụziaka nile nke Chineke. Mgbe Jisọs nọ n’elu ala, ụzọ izi ihe ya tụrụ ìgwè mmadụ dị iche iche n’anya. Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ha nụrụ onye na-ekwu okwu dị ka ya. Na Matiu 28:19, 20, Jisọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha bụrụ ndị na-akparịta ụka nke ọma site n’ịbanye n’ime ụwa, na-akuziri ndị ọzọ ihe nile o nyere n’iwu, na-emekwa ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.
Mgbe ahụ, n’iche okwu ya ihu kpọmkwem n’ebe ndị ahụ gaje ịbụ ndị ozi ala ọzọ nọ, Nwanna Klein sịrị na e nwere akụkụ anọ ndị ozi ala ọzọ ga-echebara echiche n’ihe banyere iwulite ezi nkà nke ịkparịta ụka: n’etiti di na nwunye, n’etiti ha na ndị ọzọ bi n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ ahụ, n’etiti ha na ndị nọ n’alaka ụlọ ọrụ ebe e zijere ha, na n’etiti ha na ndị ha zutere n’ozi ubi. Nwanna Klein kwuru, sị, “Ị na-amalite ịkparịta ụka ọbụna tupu ị saghee ọnụ gị. Otú isi anọdụ ma ọ bụ na-eguzo ọtọ na ejiji gị na-eme ka onyenwe ụlọ mara ihe ụfọdụ banyere gị.” O wee mee ọtụtụ ihe atụ iji kwadoo okwu ya wee mechie site n’inye agbamume nke a: “Nweenụ uche dị umeala. Meenụ ka ohere mkparịta ụka unu ghere oghe. Gbalịanụ imeziwanye mkparịta ụka unu.”
Mgbe a gụpụtasịrị ozi ekele dị iche iche, onyeisi oche ahụ nyere nke ọ bụla n’ime ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ akara mmụta diploma. Mgbe ahụ, klasị ahụ gụpụtara otu nkwupụta okwu nke e zijeere Òtù Na-achị Isi na ezinụlọ Betel, nke onye gụpụtara ya bụ Paul Angerville onye Guadeloupe.
Nnọkọ nke ehihie ji Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche malite. Mgbe nke ahụ gasịrị, ụmụ akwụkwọ ahụ mere ihe ngosi nke mere ka ndị bịaranụ hụ otú ọnọdụ klasị ha na-adị, nnọkọ ndị a na-emereghị oké nkwado ndị ha na-enwe n’ebe obibi ha dị iche iche, ịnụrụkwa ọtụtụ n’ime ahụmahụ ndị ha nweworo n’ubi eri oge ha bịara Gilead n’ọnwa ise tupu mgbe ahụ. N’ikpeazụ, e nwere ihe nkiri mara mma nke isiokwu ya bụ Ime Ihe Ziri Ezi n’Anya Jehova. Ọ bụ ndị nkwusa nọ n’Ọgbakọ Lyndhurst, New Jersey, mere ihe nkiri ahụ. E mechiri ihe omume nke ụbọchị ahụ site n’abụ mmechi, nke ihe sochiri ya bụ ekpere nke Fred Franz kpere, bụ́ onyeisi oche Society nke gbaworo 96 afọ.
[Igbe dị na peeji nke 27]
IHE BANYERE NDỊ KLASỊ AHỤ:
Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 6
Ọnụ ọgụgụ mba e zijere ha: 13
Ọnụ ọgụgụ ụmụnna na-alụghi nwunye: 2
Ọnụ ọgụgụ ndị di na nwunye: 11
Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 24
Nkezi afọ ndụ: 32.7
Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 14
Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 9
[Foto dị na peeji nke 26]
Klasị nke 88 nke Na-agụcha Akwụkwọ na Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru ebe a, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla. (1) Magney, D.; Rogers, L; Foster, S.; Foley, R.; Untch, L.; Jonasson, G. (2) Buri, H.; Buri, B.; Krammer, M.; Hudson, D.; Underkoffler, J. (3) Angerville, P.; Olsson, M.; Jones, A.; Untch, R.; Krammer! A.; Hudson, C. (4) Foley, L; Magney, J.; Jones, A.; Jonasson, H.; Foster, M.; Rogers, M.; Underkoffler, R.