Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 10/1 p. 4-5
  • Ụwa Ohụrụ Dị Anyị Mkpa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụwa Ohụrụ Dị Anyị Mkpa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Udo Ụwa Ọ̀ Dịwala Nso?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ụmụ Mmadụ Hà Pụrụ Iweta Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Na-adịgide Adịgide?
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Ọdịdị nke Agha Agbanweela
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ụwa Agha Na-adịghị Dị Nso
    Teta!—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 10/1 p. 4-5

Ụwa Ohụrụ Dị Anyị Mkpa

LAGHACHI azụ ma lee ọnọdụ ndị gbara gị gburugburu anya. Ihe ị na-ahụ ọ masịrị gị?

Ma eleghị anya gị onwe gị nwere ụlọ mara mma n’ógbè ebe mara mma nke a na-elekọtakwa nke ọma. Ọ pụkwara ịbụ na i nwere ọrụ a na-akwụ gị ezigbo ụgwọ na ya, bụ nke i nwere mmasị na ya. Ọzọkwa, gị na ndị ị hụrụ n’anya pụrụ inwe ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ezi ahụ ike. Ná ngụkọta ihe nile, ị pụrụ inwe mmetụta nke onye nọ ná nchebe na n’obi ụtọ ma ọ bụrụ na e jiri ya tụnyere ọnọdụ nke ndị ọzọ.

Ma chee echiche banyere ógbè ndị ọzọ dị gị nso, akụkụ ndị ọzọ nke mba i bi n’ime ya, mba ndị ọzọ. Lezuo ụwa dum anya. Ihe ị na-ahụ ọ bụ ọnọdụ mara mma? Ọ̀ bụ nke afọ ojuju, udo, na ihe ịga nke ọma n’ezie?

Dị ka ihe ụfọdụ ndị e kwuru ná mmalite narị afọ nke a, bụ ndị a sịrị na ha ga-eme, o kwesịrị ịbụ na ọkà mmụta sayensị ewepụchasịwo ọrịa nile ndị bụ isi ma rule ugbu a, mee ka e nwee nri ga-ezuru mmadụ nile, mee ka gburugburu ebe obibi nọgide n’ọnọdụ dị mma, meziwanyekwa ya, webatakwa oge nke udo. Ma gịnị meworo n’ezie?

Ọ dịghị ewe nnyocha dị ukwuu iji chọpụta na mbara ala anyị enwebeghị ike inweta udo. Michael Renner dere n’akwụkwọ bụ State of the World 1990, sị, “Kemgbe oge e dere Bible, a nọwo na-agwa ndị mmadụ ka ha kpụgharịa mma agha ha nile ka ha ghọọ mma oge. Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ọzọ ndụmọdụ ahụ kwesịrị ekwesị karịa ka ọ dị ugbu a. Oké nchụso a na-achụso ịbụ dike n’obubuagha ewetawo ihe a kpọrọ mmadụ nso mkpochapụ.”

A na-anụ ọtụtụ akụkọ banyere esemokwu na agha obodo dị iche iche ndị gbukpọworo ụmụ mmadụ n’ọtụtụ mba dị iche iche gburugburu ụwa. Dị ka otu ebe e si enweta akụkọ na-ekwu, a ka nọ na-alụ 22 agha dị iche iche na 1988.a Mmadụ ole nwụworo n’agha ndị ahụ? Akwụkwọ akụkọ St. Louis Post-Dispatch kwuru na, ruo ma gụnyere afọ ahụ, “ngụkọta ọnụ ọgụgụ mmadụ e gburu n’agha nile a na-alụ na 1988 bụ 4,645,000. Pasenti iri asaa na isii nke ndị ahụ e gburu bụ ndị nkịtị.”

Ihe ndị na-eme n’ụwa ugbu a hà na-egosi na a gaje inwe ụwa nke dị n’udo n’ọdịnihu? Otu ihe odide dị n’akwụkwọ akụkọ San Jose Mercury News nke California, U.S.A., na-asị, “A na-anụ na Agha Nzuzo ahụ na-ebelata, na e nyewokwa udo ohere ka ọ dịrị. Ma lezie anya nke ọma. N’akụkụ Ụwa Ndị Ka Na-emepe Emepe, agha nọ na-aga n’ihu n’enweghị oké olileanya nke idozi esemokwu ndị ahụ. Ndị a bụ agha ndị e zoro ezo n’ụwa. Ha na-abụkarị esemokwu ndị na-eme ka ndị ọchịchị na-emegide ndị nke ha: ndọrọ ndọrọ ndị nkịtị a na-awụfu ọbara na ya maka ala, okpukpe, esemokwu nke agbụrụ na mba nta dị iche iche, ike ọchịchị, ọbuna ọgwụ ọjọọ. . . . Site n’ebe Horn of Africa ruo na Southeast Asia, agha amanyewo ọtụtụ nde mmadụ ịgbapụ site n’ebe obibi ha. A naghị akụ ihe n’ubi, a na-awakwasị ebe a na-elekọta ndị ọrịa, a na-egbusisị ụmụ anụ ụlọ, a na-eji obi ịta mmiri gbuo ndị nne na nna n’ihu ụmụ ha, a na-eme ka ụmụntakịrị ndị nwoke gbara 10 afọ bụrụ ndị na-eje ozi, na e mesịa, ndị agha, a na-edina ụmụ agbọghọ nta n’ike. N’ime mba ndị a ndị a na-adịghị echeta ihe ka ọtụtụ n’ime ha n’echiche, agha akpatawo oké mbibi ihe na ọgba aghara nke ọha mmadụ ndị ọ pụrụ ịbụ na ọ dịghị mgbe ọ bụla mba ndị ahụ ga-esi na ya pụtaghachi ọzọ.... Nchọpụta e mere egosiwo na afọ ndị 1980 bụ mgbe a lụworo ọtụtụ agha karịa ka a lụworo n’afọ iri ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme.”

Ọtụtụ ndị ahụ gbalịsiri ike wee gbafee ná mba ndị mepetụrụ emepe karị na-ahụ ka e tisasịrị udo ahụ nke ha chọọrọ wee bịa site n’iyi egwu nke imempụ n’ụzọ ime ihe ike. Akwụkwọ U.S.News & World Report na-akọ, sị, “Nchebido imempụ chebidoro [United States] nọgidere n’afọ ndị 1980 nile n’agbanyeghị amụma nile e buru na ọ ga-ebelata. N’otu afọ nkịtị: A na-enwe 8.1 nde imempụ ndị siri ike dị ka igbu ọchụ, mwakwasị na ịwaba n’ụlọ n’ike ije zuo ohi. . . Ihe kasị atụ egwu bụ otú mwụfu ọbara ahụ siworo bụrụ nke ezi uche na-adịghị ya na nke a na-apụghị ịkọ ebe ọzọ ọ ga-eme. Inọ n’egwu mwakwasị bụzi ọnọdụ na-adịgide adịgide. Ụlọ ọrụ U.S. Bureau of Justice Statistics na-eme atụmatụ na 83 pasenti nke ụmụntakịrị ndị dị 12 afọ ugbu a ga-abụ ndị e mesoro ihe ike kpọmkwem ma ọ bụkwanụ nwaa imeso ha ihe ike ma ọ bụrụ na ọ̀tụ̀tụ̀ imempụ dị ugbu a anọgide na-aga n’ihu. . . . Ịta ndị na-eme ihe ọjọọ n’obodo ahụhụ abụghị ihe e ji n’aka, ọ naghị abịakwa ọsọ ọsọ. Gburugburu mba ahụ dum, ndị uwe ojii na-enwe ike ịchọpụta ndị mere nanị 1 n’ime mpụ 5 ọ bụla ndị bụ isi.” Ọnọdụ yiri nke ahụ dịkwa gburugburu ụwa. Nzukọ Ezumezu nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu (UN) na-akọ na e nwere “mmụba ma n’ọnụ ọgụgụ ma ’n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị njọ nke imempụ n’akụkụ ụwa dị iche iche.”

Ma, ọbụna ma a sị na agha nile, ngwá agha nile, na imempụ apụọ n’ụwa dum n’otu ntabi anya, ndụ ka ga-anọkwa n’ihe ize ndụ. N’akwụkwọ ha bụ State of the World 1990, òtù Worldwatch Institute kọrọ, sị, “Ịda ogbenye ọnụ ntụ́, ọrịa ndị na-adapụta aghara aghara, na ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke amaghị akwụkwọ bụ ihe e ji mara ndụ nke ọtụtụ narị nde ndị bi ná mba ndị ka na-emepe emepe. Ihe nile a kpọrọ mmadụ—ma hà bụ ọgaranya ma hà bụ ogbenye, ma hà siri ike n’obubuagha ma ọ bụ na ha esighị ike—na-eche ihu ihe egwu nke mbibi gburugburu ebe obibi nke a na-enwetụbeghị ụdị ya mbụ.”

Ee, a nọ na-emebisị usoro ihe ndị ahụ na-akwado ndụ n’onwe ha, bụ ndị ihe nile a kpọrọ mmadụ dabeere na ha. Onye editọ bụ Paul Hoffman dere na magazin bụ Discover, sị, “Ụwa dum nọ n’ọnọdụ dị njọ karịa [otú ọ dị na 1970]. Ihe ruru unyi ejupụtawo n’ebe ndị a na-ekpoju ha, na-asọpụtazi n’ala nkịtị. Ikuku ndị na-ekwuchigide ekwuchigide nọ na-eme ka ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ nke mbara igwe rịa elu. Ihe nchebe ozone nke mbara ala anyị na-atalata. Ọzara dị iche iche na-agbasawanye, oké ọhịa ndị mmiri na-ezo na ha na-ebelatakwa. Ụdị ihe ọkụkụ na anụmanụ dị iche iche na-agwụchapụ ’n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke 17 ụdị n’otu hour ọ bụla.”

Tụkwasị na nke ahụ mmetụta nke mmetọ a nọgidere na-emetọ ala na mmiri. Gbakọnye mmụba nọgidere na-aga n’ihu nke ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa, nke na-akpata iwegharakwu ala ubi maka iwu ụlọ ma ọ bụ ịrụ ụzọ, wee si otú ahụ na-amụba mgbuchapụ nke ụdị anụmanụ na ihe ọkụkụ dị iche iche. Tụlee mmụba nke ụkọ ebe e si enweta mmiri dị mma na ihe isi ike nke mmiri ozuzo acid. Tụkwasịkwa ihe na-eyi ahụ ike egwu nke ikuku e metọrọ emetọ na-akpata na nsogbu nke ihe unyi ndị dị ize ndụ. Ná nchịkọta, ha pụtara ọdachi nye agbụrụ mmadụ. N’agbanyeghị onye anyị bụ ma ọ bụ ebe anyị nọ, ọ dị anyị mkpa inweta ikuku, ihe oriri, mmiri, na ngwá ọrụ e ji emepụta ihe dị iche iche ka anyị wee nọgide na-adị ndụ. Ọ dị mkpa ka anyị nweta ha n’emetọghị ha emetọ, ’n’ọ̀tụ̀tụ̀ zukwara ezu. Akwụkwọ bụ State of the World 1990 na-asị na ka ọ dị ugbu a, “nye ndị ogbenye, afọ ndị 1980 bụ oge oké ọdachi na-enweghị atụ, oge e riri nri dị nta, nweekwa ọ̀tụ̀tụ̀ ịnwụ anwụ na-arị elu.”

Ebe a na-eyi agbụrụ mmadụ egwu n’ọtụtụ ụzọ otú a, ọ̀ dị onye pụrụ ịgọpụ ya na e nwere oké mkpa maka ụwa ọhụrụ? Ma nke ahụ ọ̀ ga-ekwe omume n’ezie? Olee ebe ụwa dị otú ahụ ga-esi bịa? Ihe mgbochi dịgasị aṅaa ka a ga-emeri tupu e nwee ike ile mbara ala anyị anya dị ka nke na-anọghị n’ihe ize ndụ, nke na-enwekwa ọganihu? Ka anyị leenụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A kọwara “agha” dị ka esemokwu nke metụtara, ya dịkarịa ala otu ọchịchị, nke e gbukwara, ma ọ dịkarịa ala, 1,000 mmadụ n’ime ya n’otu afọ.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 4]

WHO photo by P. Almasy

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya