Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 4/15 p. 3-4
  • Udo Ụwa Ọ̀ Dịwala Nso?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Udo Ụwa Ọ̀ Dịwala Nso?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Agha Ndị E Chefuru Echefu
  • È Nwere Olileanya maka Udo?
  • Ezi Udo—Site n’Ebee?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ka “Udo Nke Chineke” Chee Obi Unu Nche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Olee Mgbe Udo Na-adịgide Adịgide Ga-abịa n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ònye Ga-eduru Ihe A Kporo Mmadụ Gaa n’Inweta Udo?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 4/15 p. 3-4

Udo Ụwa Ọ̀ Dịwala Nso?

N’AKỤKỌ ihe mere eme dum, o nwebeghị mgbe ọ bụla a na-enweghị atụmatụ udo na nkwupụta okwu udo n’ụdị dị iche iche. Ọ dị mwute ịhụ na o yikwara ka à na-enwe nnọọ ọtụtụ agha otú ahụ iji mee ka ha ghara ịdị irè. N’ihe banyere nkwekọrịta na nkwupụta okwu udo dị iche iche, ọtụtụ ndị amụtawo ịghara ịtụkwasị ha obi hie nne.

Otú ọ dị, n’ime afọ ole na ole gara aga, ọtụtụ ndị na-ahụ ihe na-emenụ na ndị na-enyocha akụkọ amalitewo iche na ọ dị ihe dị iche nke na-emenụ. Ha ewelitewo echiche ahụ nke bụ na, ma eleghị anya, n’agbanyeghị nsogbu a na-enwe n’ógbè dị iche iche, n’oge nke a, ọ pụrụ ịbụ na e guzobewo ọnọdụ nke ga-eweta udo ụwa. Òtù Stockholm International Peace Institute kwuru, sị, “E nwewo ntọala ka mma maka iji udo dozie esemokwu karịa n’afọ ọ bụla kemgbe ọgwụgwụ Agha Ụwa nke Abụọ.” Oké ihe omume ndị ahụ mere ngwa ngwa n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe dujere otu onye odeakụkọ a ma ama n’ikwu, sị: “Udo n’elu Ala yiri ka ò kwere omume ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ.” Ọbụna akwụkwọ akụkọ bụ The Bulletin of the Atomic Scientists gosipụtara mmetụta nke a. Na 1988, o weghachiri klọkụ ụbọchị mbibi ya ahụ a ma ama site na minit atọ ruo etiti abalị gaa na minit isii ruo etiti abalị. Mgbe ahụkwa, n’April 1990, o weghachikwuru ya azụ gaa na minit iri ruo etiti abalị.

Ihe a nile kpaliri oké olileanya maka ezi ihe na ọṅụ tupu ntiwapụ nke agha n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Ma ọbụna eri mgbe ahụ, ụfọdụ ndị na-ekwu okwu banyere Agha Nzuzo ahụ na ịsọ mpì mkpụpụta ngwá agha ahụ nke dị n’etiti mba ndị bụ dike dị ka ihe ndị gwụsịworonụ. Ụfọdụ ndị nọ na-atụgharị uche banyere ihe a ga-eji ego nile ahụ mee, bụ́ nke gọọmenti dị iche iche nwere olileanya ichebe site ná mbelata e belatara ego a na-emefu n’ihe banyere agha. Ò kwere omume na oge a ga-enwe udo na-adịgide adịgide abịawo n’ezie? Mba dị iche iche hà na-amụta n’ezie ‘ịkpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi’? (Aịsaịa 2:4) Gịnị ka ihe ndị na-eme eme n’ezie na-egosi?

Agha Ndị E Chefuru Echefu

Akwụkwọ akụkọ bụ The Economist nke London kwuru, sị, “Ngwụsị nke agha nzuzo ahụ na ntụsara ahụ ọhụrụ ahụ dị n’etiti Ọwụwa Anyanwụ na Ọdịda Anyanwụ ụwa emewo ka ụfọdụ ndị chee na udo bụ ihe dị adị. Ọ dịghị otú ahụ. Ọ bụ ezie na ọ bụ mwepụ nke otu nnukwute ebe nsogbu si na-abịa, ụwa ka nwekwara ọtụtụ ndị obere.” Gịnị bụ nsogbu, ma ọ bụ esemokwu, “ndị obere” ndị a?

Òtù Lentz Peace Research Laboratory, bụ́ òtù kwụụrụ onwe ya nke na-eme nnyocha na United States, kọrọ na ka ọ dị na September 1990, ya dịkarịa ala, agha 15 dị iche iche na-aga n’ihu n’ụwa. Nke a agụnyeghị mwaba ahụ ndị Iraq wabara na Kuwait, ebe ọ bụ na akụkọ ahụ gụnyere nanị agha ndị e gburu otu puku mmadụ ma ọ dịkarịa ala kwa afọ ruo mgbe ahụ. Ụfọdụ n’ime agha ndị a anọwo na-aga n’ihu ruo 20 afọ ma ọ bụ karị. Ná ngụkọta, e gbuwo 2,900,000 mmadụ n’ime ha, ihe ka ọtụtụ n’ime ndị a bụkwa ndị nkịtị. Ọnụ ọgụgụ nke a agụnyeghị ndị e gburu n’ụfọdụ n’ime agha ndị ahụ a kasị wụfuo ọbara na ha, bụ́ ndị ka kwụsịworo n’afọ bu nke ahụ ụzọ, dị ka nke Uganda, Afghanistan, na nke ndị Iran na Iraq.

E gburu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ atọ mgbe a sị na ụwa nọ n’udo! Nke ahụ n’onwe ya bụ ihe jọgburu onwe ya. Otú ọ dị, ọdachi nke ka njọ bụ na ihe ka ọtụtụ n’agha ndị a anọwo na-aga n’ihu n’enweghị nnọọ onye hụtara ha—n’adịghịkwa onye tiri mkpu banyere ha—n’akụkụ ụwa ndị ọzọ. Ha bụ ihe a pụrụ ịkpọ agha ndị e chefuru echefu, ebe ọ bụ na ihe ka ọtụtụ n’ime ha—nkwatu ọchịchị, agha obodo, mgbanwe ọchịchị dị iche iche—bụ ndị a na-alụ n’otu ma ọ bụ nke ọzọ n’ime mba ndị na-emepechabeghị anya. Nye ọtụtụ ndị bi ná mba ndị bara ọgaranya, ndị mepeworo emepe, otu ọkara nde mmadụ ahụ e gburu na Sudan, ma ọ bụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu nde mmadụ ndị e gburu n’Angola, eyighị ihe kpaliri mmasị dị ukwuu. N’eziokwu, e nwere ndị na-ekwu na ụwa anọwo n’oge udo a na-ahụtụbeghị mbụ kemgbe ọgwụgwụ Agha Ụwa nke Abụọ n’ihi na e nweghị agha ọ bụla n’etiti mba ndị mepeworo emepe, nakwa n’agbanyeghị oké ahụ erughị ala na nkwakọba ngwá agha, na mba ndị ahụ bụ dike alụrịtabeghị agha.

È Nwere Olileanya maka Udo?

Ọ bụrụ na nanị ihe udo pụtara bụ enweghị agha nuklia nke zuru ụwa ọnụ, mgbe ahụ ma eleghị anya, mmadụ pụrụ ikwu na mba dị iche iche nke ụwa enwewọ ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ihe ịga nke ọma ná mgbalị ha na-eme inweta udo. Ụkpụrụ echiche nke Mkpochapụrịta E Ji n’Aka ejilatawo mba ndị ahụ bụ dike ruo ugbu a. Ma nke ahụ ọ̀ bụ udo n’ezie? Olee otú ọ pụrụ isi bụrụ, mgbe ụmụ mmadụ na-ebi n’egwu nke mkpochapụ mberede? Olee ụzọ anyị pụrụ isi kwuo okwu banyere udo mgbe, gburugburu ụwa, agha ukwu na agha nta dị iche iche nọ na-etisasị ndụ ọtụtụ ndị, na-ebibisị ihe ndị ha ji enweta ihe e ji adị ndụ, na-ebibikwa olileanya ha nwere maka ịdị ndụ n’ụzọ bara uru?

Onye nwetara onyinye Nobel, bụ́ Elie Wiesel dere n’otu mgbe, sị: “Sitekwa n’ogologo oge gara aga, ụmụ mmadụ anọwo na-ekwu okwu banyere udo n’enwetaghị ya. Ọ̀ bụ na anyị enweghị ahụmahụ zuru ezu? Ọ bụ ezie na anyị na-ekwu okwu banyere udo, anyị na-ebu agha. Mgbe ụfọdụ ọbụna na anyị na-ebu agha n’aha nke udo. . . . Ọ pụrụ ịbụ na agha aghọwo akụkụ nke akụkọ ihe mere eme nke na a pụghị iwepụ ya ewepụ—mgbe ọ bụla.”

N’oge na-adịghịkwa anya gara aga, agha ahụ nke dara n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ tisasịrị echiche ahụ e nwere nke bụ na udo abịawala. Ọ̀ pụrụ ịbụ na ihe a kpọrọ mmadụ anọwo na-atụ anya udo site n’ebe na-ekwesịghị ekwesị?

[Foto dị na peeji nke 3]

“Ọgbọ nke a nke ụmụ mmadụ bi n’ụwa pụrụ ịhụ mmalite nke oge udo a na-apụghị ịgbanwe agbanwe n’akụkọ ihe mere eme nke mmepeanya mmadụ.”—Onye isi ala mba Soviet bụ Mikhail Gorbachev, ná nzukọ ndị isi ọchịchị e mere na Washington, D.C., U.S.A., May 1990

[Ebe E Si Nweta Foto]

UPI/Bettmann Newsphotos

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

“Ụwa ọhụrụ nke nnwere onwe na-eche anyị ihu . . . , ụwa ebe udo na-adịgide adịgide, ebe akọ na uche na-adị n’azụmahịa na ebe ihe nile ndị yiri ka hà pụrụ ikwe omume ga-ekwe omume.”—Onye isi ala mba U.S. bụ́ George Bush, n’otu nzukọ ndị isi azụmahịa e nwere na Houston, Texas, U.S.A., July 1990

[Ebe E Si Nweta Foto]

UPI/Bettmann Newsphotos

“Mgbidi ndị jibidoburu ụmụ mmadụ na echiche ha nile na-adakpọsị. Ndị Europe na-ekpebi ihe ga-abụ ọdịnihu nke ha. Ha na-ahọrọ nnwere onwe. Ha na-ahọrọ nnwere onwe n’ụzọ akụ na ụba. Ha na-ahọrọ udo.”—Nkwupụta okwu ndị òtù NATO mere ná nzukọ ha mere na London, England, July 1990

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]

Foto ndị dị n’ihu akwụkwọ nke U.S. Naval Observatory sere (kpakpando); Foto NASA sere (ụwa)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya