Ndị Ntorobịa—Ùnu Ga-agafe Ule Nguzosi Ike n’Ihe nke Ndị Kraịst?
“Ị NAGHỊ ele omume rụrụ arụ anya dị ka eguzosighị ike n’ihe. Ọ bụ nanị ndụ ka ị na-ekpori. Ọ bụ eziokwu na ị maara na ọ bụru na ndị mụrụ gị ma ọ bụ ndị okenye achọpụta, ọ ga-akpata obi mgbawa na ọtụtụ nsogbu. Ma mgbe ị na-ekpori ndụ, ị na-ewepụ nnọọ echiche nile dị otú ahụ n’uche gị.”
Nwa okoro nke e hotara okwu ya n’ebe a anọwo na-akwa iko na nzuzo. Ọ na-ebi ụdị ndụ abụọ, na-eduhie ndị mụrụ ya na ọgbakọ ndị Kraịst. Ọ mataghị n’oge ahụ na ọ na-ada ule nguzosi ike n’ihe nke ndị Kraịst.
Ọtụtụ puku ndị ntorobịa bụ ndị Kraịst adawo ule ndị dị otú ahụ nke iguzosi ike n’ihe. Oké ihe ijuanya adịghịkwa ya! Ee, Setan bụ Ekwensu ‘na-ebu agha’ megide ndị Chineke, na-eme ihe nile ọ pụrụ ime iji bibie nguzosi ike ha n’ezi ihe. (Mkpughe 12:17) Karịsịa, o mewo ka ndị ntorobịa bụrụ ebe o lekwasịrị anya ‘n’ọrụ aghụghọ ya nile.’ (Ndị Efesọs 6:11, Kingdom Interlinear) O si otú a bụrụ ihe chọrọ ezi mgbalị na mkpebi siri ike ịnọgide n’iguzosi ike n’ihe.
Gịnị kpọmkwem bụ iguzosi ike n’ihe? N’Akwụkwọ nsọ Hibru, okwu dị n’asụsụ mbụ ahụ nke dịịrị “iguzosi ike n’ihe” na-egosi iji ịhụnanya rapagidesie ike n’ebe otu onye nọ, na-eburu otu nzube n’uche. (Abụ Ọma 18:25) Ọ dịghị akọwa ihe nkekọ na-esighị ike nke a pụrụ ịdọbi ngwa ngwa kama ọ bụ nrapagidesi ike nke na-anọgide ruo mgbe e mezuru nzube ya n’ihe banyere onye ahụ. N’Akwụkwọ nsọ Grik, okwu asụsụ mbụ dịịrị “iguzosi ike n’ihe” nwere echiche nke ịdị nsọ, ezi omume, ma ọ bụ nsọpụrụ dị omimi.
Otú a, iguzosi ike n’ihe metụtara mmekọrịta ziri ezi nke anyị na Chineke. Ndị Efesọs 4:24 na-agwa anyị ka anyị ‘yikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere n’ime ezi omume na iguzosi ike n’ihe.’ Ị̀ chọrọ ịbụ onye na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova? Mgbe ahụ, ị ghaghị iwulite ezi nrapara siri ike n’ebe ọ nọ, ihe nkekọ a na-apụghị ibibi ebibi, mkpebisi ike ime ihe na-atọ ya ụtọ n’ụzọ gị nile. Ị ghaghị ịrapagidesi ike n’ụkpụrụ ezi omume nile nke Jehova—n’agbanyeghị ụzọ ọ pụrụ isi bụrụ ihe ọnwụnwa ime ihe megidere nke ahụ!
Ihe Nrụgide Ndị E Nwere Ịghara Iguzosi Ike n’Ihe
Ọ bụ ihe kwesịrị ịja mma na ihe ka ọtụtụ ná ndị na-eto eto n’etiti Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ịnọgide ná nguzosi ike n’ihe, ha na-eritekwa uru nke akọ na uche dị ọcha n’ihi nke a. N’agbanyeghị nke a, Pọl onyeozi buru amụma na n’ime “mgbe ikpeazụ,” eguzosighị ike n’ihe ga-abụ ihe e ji mara ndị mmadụ n’ozuzu ha. (2 Timoti 3:1, 2) N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ndị ntorobịa bụ ndị Kraịst ekwewo ka ụwa nke a nke na-adịghị eguzosi ike n’ihe ‘mee ka ha yie ya.’ (Ndị Rom 12:2, Phillips) Olee ụzọ Setan siworo mezuo nke a?
Nrụgide ndị ọgbọ bụ otu ngwá ọrụ dị irè nke Setan. Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ chọrọ ka ndị ọzọ na-eche echiche dị mma banyere ha, Setan maakwara ụzọ ọ pụrụ isi jiri ọchịchọ nke a e bu pụta ụwa mee ihe. N’ịchọ ịbụ ndị e lere anya dị ka ndị yiri ibe ha, ụfọdụ ndị ntorobịa bụ ndị Kraịst ekerewo òkè ná mkparịta ụka ndị na-adịghị ọcha, omume rụrụ arụ, ise sịga, ịṅụbiga mmanya ókè—ọbụna iji ọgwụ ọjọọ eme ihe—ihe ndị a nile bụ ka ndị ọgbọ ha wee nakwere ha nke ọma.
Setan chọrọ ka anyị ‘na-ebi obi n’ime agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ anyị, na-eme ihe nile anụ ahụ anyị chọrọ.’ (Ndi Efesọs 2:3) Ọ maara nke ọma otú agụụ inwe mmekọahụ na-esi esi ike n’oge mmadụ nọ ‘ná ntoju ntorobịa.’ (1 Ndị Kọrint 7:36) Ọ chọkwara ka i mee ihe ndị kwekọrọ n’ọchịchọ ndị ahụ. N’amaghị ama, ụfọdụ ndị ntorobịa bụ ndị Kraịst na-adaba n’aka ya site n’ikiri akwụkwọ, sinima, na ihe nkiri vidio ndị na-egosi mmekọahụ ma ọ bụ site n’itinye aka ná mmetọ onwe onye. Ihe ndị a na-edujekarịkwa n’omume ndị dị oké njọ nke eguzosighị ike n’ihe. Ụwa Setan ‘ò mewo ka i yie ya’ n’ụfọdụ n’ime akụkụ ndị a?
Ibi Ụdị Ndụ Abụọ
Ọ bụ ezie na ime mmehie jọgburu onwe ya dị ka ịkwa iko bụ okwu siri ike n’onwe ya, ụfọdụ ndị ntorobịa na-eme ka ihe sikwuoro ha ike. Ha yiri ‘mmadụ ndị na-ekwu okwu ụgha,’ ndị e kwuru banyere ha n’Abụ Ọma 26:4, bụ́ ndị ‘na-ezochi ihe ha bụ n’ezie.’ Ndị ntorobịa dị otú ahụ na-ebi ụdị ndụ abụọ, na-eme otu ụdị omume mgbe ha na ndị mụrụ ha ma ọ bụ ndị Kraịst ndị ọzọ tozuru okè nọ ma na-eme ụdị omume ọzọ mgbe ha na ndị ọgbọ ha nọ.
Otú ọ dị, ibi ụdị ndụ abụọ bụ mmeri onwe onye, dịrịkwa ize ndụ. Omume ọjọọ ndị a na-achịkwaghị achịkwa yiri ka ọ̀ na-edujekarị mgbe nile n’omume ọjọọ ndị ọzọ. Ọ pụkwara ịbụ na ọ na-enye akọ na uche ha nsogbu ná mmalite, ka onye ahụ nọgidere n’ime ihe ọjọọ, otú a ka mmeghachi omume akọ na uche ya n’ebe ihe ọjọọ dị na-ebelata. N’ụzọ nkịtị, mmadụ pụrụ ‘ịkwụsị ịnụ ụfụ’ nke omume ọjọọ.—Ndị Efesọs 4:19, Kingdom Interlinear.
Mgbe o ruru n’ókè nke a, ọ na-aghọ ihe siri ike nke ukwuu mmadụ ikwupụta mmehie ya ma nweta enyemaka. Ọ na-adịkarị otú a ma ọ bụrụ na ndị ntorobịa ndị ọzọ bụ ndị Kraịst so n’omume ọjọọ ahụ. Echiche hiere ụzọ nke iguzosi ike n’ihe na-enwekarị mmeri. Nwa okorobịa ahụ nke e hotara okwu ya ná mmalite kọwara, sị: “Ị na-amata ihe ị na-eme, ị matakwara na ọ dị njọ. Ka ndị nke ọzọ o metụtara wee ghara ịbanye ná nsogbu, ị na-ekwere ịghara ịgwa onye ọ bụla.”
Ọ bụ ezie na mmadụ pụrụ ‘izochi ihe ọ bụ n’ezie’ site n’anya ndị mụrụ ya ma ọ bụ n’anya ọgbakọ, ọ pụghị izo ezo site n’anya Jehova. “Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’ihu ya: kama ihe nile gba ọtọ bụrụkwa ihe e megheworo n’anya ya, bụ́ onye anyị ga-akọrọ akụkọ banyere omume anyị.” (Ndị Hibru 4:13) Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Onye na-ekpuchi njehie ya nile, ọ gaghị agara ya.” (Ilu 28:13) Mgbe oge na-aga, njehie ahụ ga-apụta ìhè. Mmadụ apụghị nnọọ ịghọgbu Jehova. Ilu 3:7 na-asị: “Abụla onye maara ihe n’anya gị onwe gị; tụọ egwu Jehova, wee si n’ihe ọjọọ wezụga onwe gị.” Chetakwa na “n’ebe nile ọ bụla ka anya abụọ nke Jehova dị, na-eche ndị ọjọọ na ndị bụ ezi mmadụ nche.”—Ilu 15:3.
E si otú a chọpụta ihe banyere nwa okoro ahụ e hotara ná mmalite, ya na ọtụtụ ndị ọzọ ndị keere òkè ná mmehie nzuzo, a chụpụkwara ya na ndị enyi ya n’ọgbakọ ndị Kraịst. Ha mesịrị nwetaghachi ahụ ike ime mmụọ e wee kpọbataghachi ha. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, lee nnọọ ụzọ siri ike ọ bụ isi mụta ihe bụ iguzosi ike n’ihe!
Iso Chineke ‘Dozie Okwu’
Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ọ dịworị ụzọ mmadụ si gosi onwe ya ịbụ onye na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ma eleghị anya site n’ime ihe ọjọọ? Ọ bụ ihe dị mfe mmadụ ịghọgbu onwe ya ma gọpụ mkpa ọ dị idozi okwu ahụ. Otu onye ntorobịa nke tinyere aka n’ịkwa iko na nzuzo kwuru, sị: “Amụbawanyere m òkè m na-ekere n’ije ozi ubi, na-eche na ọ dị ụzọ nke a pụrụ isi kpuchie mmehie ahụ.” Mba njehie ahụ bụ Israel sikwa otu ụzọ ahụ mee ihe na-anwa iji àjà dị iche iche mejụọ ihu Jehova. Ma Jehova jụrụ nsọpụrụ ihu abụọ dị otú ahụ. Ọ gbara ha ume, sị: “Saanụ ahụ, meenụ onwe unu ka unu dị ọcha; wezụganụ ihe ọjọọ nke omume unu nile n’ihu anya m abụọ; hapụnụ ime ihe ọjọọ.” Jehova ga-anara àjà ha nile nanị mgbe ha ‘sosịworo ya dozie okwu.’ Otú ahụ kwa ka ọ dị taa maka onye ọ bụla nke ọ pụrụ ịbụ na o kerewo òkè n’ajọ omume.—Aịsaịa 1:11, 15-18.
Mmadụ apụghị idozi okwu n’etiti ya na Jehova nanị site n’ịkọsara onye ọgbọ ya. Otu ihe bụ na ndị ọgbọ adịghị enyekebe enyemaka kasị mma, ebe ọ bụ na ọtụtụ mgbe ha onwe ha enwebeghịkwa ahụmahụ hiri nne ná ndụ. Nke ka mkpa bụ na ha apụghị ịgbaghara mmehie gị. Ọ bụ nanị Chineke pụrụ ime nke ahụ. Ya mere ‘wụsara ya obi gị dị ka mmiri’ ná nkwupụta mmehie. (Abụ Ọma 62:8) Ọ bụ ezie na omume gị pụrụ ịbụrụ gị ihe ihere nke ukwuu, ma jide n’aka na Jehova ‘na-agbaghara mmehie n’ụba.’—Aịsaịa 55:7.
Enyemaka ọzọ ka dị gị mkpa. Otu onye Kraịst na-eto eto nke ritere uru site n’enyemaka dị otú ahụ gbara ume, sị, “Mee ka ndị mụrụ gị mara, mee ka ndị okenye mara ozugbo ahụ—site nnọọ ná mmalite.” Ee, ọ pụrụ ịbụ na ndị mụrụ gị nọ n’ọnọdụ dị mma inyere gị aka. ‘Nye ha obi gị,’ na-eme ka ha mara otú nsogbu gị hà n’ezie. (Ilu 23:26) Ha pụrụ ime ndokwa ka i nwetakwuo enyemaka site n’aka ndị okenye ọgbakọ ma ọ bụrụ na nke ahụ dị mkpa.—Jemes 5:14, 15.
Igosipụta Ezi Nguzosi Ike n’Ihe —n’Ụzọ Dị Aṅaa?
N’eziokwu, ọ ga-akasị mma ka mmadụ ghara ịdaba n’agwa nke eguzosighị ike n’ihe ma ọlị. Abụ Ọma 18:25 na-agwa anyị, sị: “N’ebe onye ebere [“onye na-eguzosi ike n’ihe,” NW] nọ ị [Jehova] ga-egosi onwe gị onye ebere [“onye na-eguzosi ike n’ihe,” NW]; n’ebe nwoke zuru okè nọ ị ga-egosi onwe gị onye zuru okè.” Jehova na-agọzi n’ụba ndị ahụ ji iguzosi ike n’ihe nọgide n’ụkpụrụ dị elu nke omume.
Ma e nwere ụzọ ndị ọzọ a pụrụ isi tinye nguzosi ike n’ihe anyị n’ule. Dị ka ihe atụ, chee echiche ma ọ bụrụ na enyi gị etinyewo aka n’ụzọ njehie. Ị̀ ga-ekwere ka echiche hiere ụzọ nke iguzosi ike n’ihe nye enyi gị ahụ merie nguzosi ike n’ihe gị nye Jehova? Ihe na-egosi ịhụnanya ị ga-eme ga-abụ ijekwuru enyi gị ahụ ma gbaa ya ume ịkọrọ ndị mụrụ ya ma ọ bụ ndị okenye banyere okwu ahụ. Gwa enyi gị na ọ bụrụ na o meghị otú ahụ ruo ogologo oge ụfọdụ, ị ga-eme otú ahụ n’onwe gị. Ilu 27:5 na-asị: “Ọ dị mma, bụ́ ịba mba n’ìhè, karịa ịhụnanya nke e zobeworo ezobe.” Site n’inyere enyi gị aka n’ụzọ dị otú a, ọ bụghị nanị na ị na-egosipụta izi ezi nke ọbụbụenyi gị, kamakwa ị na-egosipụta ịdị omimi nke nguzosi ike n’ihe gị nye Jehova.
N’agbanyeghị ihe bụ ule ahụ, ike a na-eji egosipụta nguzosi ike n’ihe na-esite n’ezi mmekọrịta onwe onye mmadụ na Jehova nwere. Ekpere sitere n’ezi obi na ịdị uchu n’ọmụmụ ihe onwe onye bụ ihe ndị dị mkpa ka anyị wee nweta mmekọrịta dị otú ahụ. Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịmata na ndị ntorobịa nile ahụ mehiere emehie e hotara ná mmalite nakweere na ekpere ha na ọmụmụ ihe onwe onye ha aghọwo ihe e ji emezu iwu—mgbe oge ụfọdụ na-agakwa ha kwụsịrị ịdị adị ma ọlị. Jehova kwụsịrị ịbụ onye dị adị n’ezie nye ha, àgwà na-adịghị ọcha sochikwara n’isi nso. Ì ji ekpere na ọmụmụ ihe onwe onye na-ewusi mmekọrịta gị na Jehova ike ka i wee nọgide n’iguzosi ike n’ihe?
N’eziokwu, mgbe ụfọdụ ị pụrụ iche na ihe ọma na-efunarị gị. “Mgbe ụfọdụ ọ na-eyi ka ndị ụwa hà na-ekpori ndụ,” ka otu nwa agbọghọ kwuru. “Ma mgbe ị dabara n’ọnọdụ ụfọdụ, ị pụrụ ịhụ na ọ bụghị ikpori ndụ ma ọlị.” O kwuru ihe sitere n’ahụmahụ o nwere, ebe o tinyeworo aka ná mmekọahụ na-adịghị ọcha, nke dujere ya n’ịtụrụ ime na isikwopụ afọ ime. Ọ na-ekwu ugbu a, sị, “Ịnọ n’eziokwu bụ ihe nchebe”—bụ́ ihe ọ mụtara site n’ịta ahụhụ. Abụ Ọma 119:165 na-echetara anyị na “udo nke hiri nne ka ndị na-ahụ iwu [Chineke] n’anya nwere.”
Ya mere, mee ihe nile ị pụrụ ime iji nọgide n’iguzosi ike n’ihe. Rụọ ọrụ iji wulite mmekọrịta na-adịgide adịgide nke gị na Jehova. Kpọọ ihe ọjọọ asị, rapagidesiekwa ike n’ezi ihe. (Ndị Rom 12:9) Abụ Ọma 97:10 na-agwa anyị, sị: “Unu ndị na-ahụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị: ọ na-edebe mkpụrụ obi ndị ebere [“ndị na-eguzosi ike n’ihe,” NW] ya; ọ na-napụta ha n’aka ndị na-emebi iwu.” Ee, dị ka nwa okoro ma ọ bụ agbọghọ onye Kraịst, ị ga-erite uru site ná nchebe Jehova, nwetakwa ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na ị gafee ule nguzosi ike n’ihe nke ndị Kraịst.