Ọchịchọ A Na-achọ Ọnọdụ Ụwa Ọhụrụ
“ỌDỊGHỊ map ọ bụla ndị ga-eduje anyị n’ebe anyị na-aga, ịgaru n’ụwa ọhụrụ nke a nke anyị na-emepụta n’onwe anyị. Ka ụwa na-eleghachi anya azụ n’iri afọ itoolu nke agha, nke esemokwu, nke onye ọ bụla inyo ibe ya enyo, ka anyị lepụkwa anya n’ihu—gaa na narị afọ ọhụrụ, gaakwa na puku afọ ọhụrụ, nke udo, nnwere onwe na ihe ịga nke ọma.”
Onye isi ala mba U.S. bụ George Bush kwuru okwu ahụ na January 1, 1990. N’otu ozi yiri nke ahụ, onye isi ala mba Soviet bụ Mikhail Gorbachev meziri atụmatụ mmekọrịta ihe n’afọ ndị 1990, nke ga-ewepụchasị “site n’ụwa, egwu na enweghị ntụkwasị obi, ngwá agha ndị na-adịghị mkpa, echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ozizi ịlụ agha ndị nọfeworo oge ha, na ihe mgbochi aka mere ndị na-ekewa ndị mmadụ ná mba dị iche iche.” Otú ahụ ka a kọrọ ya n’akwụkwọ akụkọ Japan bụ Mainichi Daily News nke January 3, 1990.
O doro anya na olileanya e nwere n’oge ahụ dị elu. Ha ka dịkwa elu mgbe otu afọ gasịrị. N’okwu onye isi ala mba U.S. na-ekwu ná mmepe nke nnọkọ a na-enwe mgbe nile nke ụlọ nzukọ Congress, bụ́ nke e mere na January 29, 1991, President Bush zoro aka n’ebe agha ahụ a na-ebu n’ógbè Persian Gulf dị, wee sị: “Ihe a na-azọ n’ebe a karịrị otu mba dị nta [Kuwait], ọ bụ echiche dị ukwuu—ọnọdụ ụwa ọhụrụ ebe mba dị iche iche bụ ndị a na-eme ka ha dị n’otu n’ịchụso otu ihe mgbaru ọsọ iji wee mezuo ihe ihe nile a kpọrọ mmadụ na-achọsi ike: udo na ịnọ ná ntụkwasị obi, nnwere onwe na ịgbaso ụkpụrụ iwu.”
Ọ Bụghị Nchuso nke Na-enweghị Nsogbu
Ọtụtụ nsogbu na-egbochi mmadụ n’ọchịchọ ọ na-achọ ọnọdụ ụwa ọhụrụ. O doro anya na mburịta agha bụ ihe mgbochi. N’izo aka ná mburịta agha nke maliteworo n’Iraq na Kuwait n’oge ahụ, magazin Time nke January 28, 1991, sịrị: “Ka bọmbụ ndị ahụ na-ada, akụ ụta ogbunigwe ndị ahụ ana-efegharịkwa, olileanya ndị e nwere maka ọnọdụ ụwa ọhụrụ dakpọrọ wee nye ohere maka ọgba aghara ahụ dịbu adị.” Magazin ahụ kwukwara, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla kwesịrị ịmalite inwe olileanya ọ bụla na ọnọdụ ụwa ọhụrụ ahụ e kwuworo oké okwu banyere ya ewerewo ọnọdụ, ma ọ bụ ọbụna na ọ dị nso.”
E nwetabeghị ọnọdụ nke mba nile ijikọ aka na-eme ihe, nke a na-egbochikwa mgbalị nile mmadụ na-eme iji guzobe ọnọdụ ụwa ọhụrụ. N’otu akụkọ e bipụtara n’akwụkwọ bụ The World & I (January 1991), ndị ọkà mmụta tụlere “ụkpụrụ ọhụrụ nke mmekọrịta mba na mba nke mba ndị bụ dike na mmetụta ha pụrụ inwe n’ọnọdụ ụwa ọhụrụ ahụ.” Onye editọ nke akwụkwọ ahụ kwubiri, sị: “Akụkọ ihe mere eme na-atụ aro na ọdịiche dị n’etiti agha na udo dị nnọọ nta n’oge ndị kasị mma. Mba na mba imekọ ihe n’otu, karịsịa n’etiti mba ndị bụ isi, dị oké mkpa maka inwe ihe ịga nke ọma n’isite n’oge Agha Nzuzo ahụ gafee n’ọnọdụ ụwa ọhụrụ.”
Nsogbu ndị metụtara gburugburu ebe obibi na-egbochikwa ọnọdụ ụwa ọhụrụ ahụ nke ọtụtụ ndị nwere olileanya na a ga-enwe. N’akwụkwọ State of the World 1991 (bụ́ akụkọ ndị òtù Worldwatch Institute depụtara), Lester R. Brown sịrị: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ikwu kpọmkwem ihe ọnọdụ ụwa ọhụrụ ahụ ga-adị ka ya. Ma, ọ bụrụ na anyị ga-eguzobe ọdịnihu nke ga-adị mma maka ọgbọ na-abịanụ, mgbe ahụ, mgbalị dị ukwuu nke a chọrọ iji mezie ihe mmetọ gburugburu ebe obibi nke mbara ala nke a mere ga-eduzi ihe omume ụwa ruo ọtụtụ iri afọ na-abịanụ.” Akụkọ ahụ kwuru na mmetọ ikuku “eruwo ọ̀tụ̀tụ̀ ndị na-eyi ahụ ike egwu n’ọtụtụ narị obodo ukwu dị iche iche nakwa ọ̀tụ̀tụ̀ na-eyi ihe ọkụkụ egwu n’ọtụtụ mba dị iche iche.” O kwukwara, sị: “Ka ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ bi na mbara ala nke a na-arịwanye elu, ọnụ ọgụgụ nke ụdị ihe ọkụkụ na anụmanụ ndị e nwere na-adalata. Mbibi nke ebe obibi na mmetọ ikuku na mmiri na-ebelata ụdị ihe dị iche iche dị ndụ e nwere n’ụwa. Ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ ndị na-arị elu na ntalata nke ihe mkpuchi ozone ahụ pụrụ ịtụkwasị ihe ná mfù ndị a na-enwe.”
Ya mere, o doro anya na nsogbu jupụtara n’ọchịchọ mmadụ na-achọ ọnọdụ ụwa ọhụrụ. Ọchịchọ ahụ ọ̀ ga-enwe ihe ịga nke ọma? À pụrụ ikwu na ọnọdụ ụwa ọhụrụ dị ezi nso? Ya bụrụ otú ahụ, olee ụzọ a ga-esi weta ya?