“Ndokwa Ụwa Ọhụrụ” ahụ Amalite n’Ụzọ Na-ama Jijiji
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA GERMANY
KA CHI 1991 bọrọ, ndị mmadụ nwere nchekwube. Agha Nzuzo ahụ ebiwo. N’eziokwu, e nwere nsogbu nke Kuwait, bụ́ nke Iraq wakpoworo n’August bu ụzọ. Ma Mba Ndị Dị n’Otu egosipụtawo ike ya, wee nye Iraq iwu ka ọ laghachi azụ ka ọ na-erule January 15. Ìgwè ndị agha nke 28 mba UN jikọrọ aka na-akwado iwu ahụ, bụ́ ndị a haziworo ozugbo, ndị dịkwa njikere ịmanye Iraq ka o kwenye. E nwere olileanya dị elu na nguzo ahụ siri ike mba ụwa weere bụ ihe àmà mmalite nke oge ọhụrụ.
George Bush, president United States n’oge ahụ, kwuru banyere “ikwe omume, nye anyị na nye ọgbọ ndị dị n’ihu, nke imepụta ndokwa ụwa ọhụrụ, ụwa nke ụkpụrụ iwu, ọ bụghịkwa iwu nke ebe ịma aka obi ọjọọ, na-achịkwa otú mba nile si akpa àgwà.”
Iraq mesịrị lefuru January 15 ahụ e nyere ya anya, nnukwu mbuso agha elu na àkụ́ ụta na-ere ọkụ megide ìgwè ndị agha Iraq sikwa na ya pụta. N’ụzọ doro anya, mba ụwa ejighị egwu. Ihe na-erughị ọnwa atọ n’ikpeazụ, n’April 11, òtù UN kpọsara na Agha Gulf ebiwo. O yiri ka nkwa nke ndokwa ụwa ọhụrụ kwụsiri ike n’ụzọ akụ̀ na ụba na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ghọrọ ihe mere eme.
Agha Kwụsiri Ike n’Ụzọ Dị Mwute
N’etiti afọ 1991 ọchịchị ripọblik abụọ, Slovenia na Croatia, kwupụtara nnwere onwe pụọ na Yugoslavia nke oge ahụ, na-amalite agha obodo nke mesịrị duga ná nguzobe e guzobere ọtụtụ mba kwụụrụ onwe ha. Ihe na-erughị otu afọ mgbe nke ahụ gasịrị, onye France bụ́ ọkà ná nnyocha ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ́ Pierre Hassner sịrị: “Dị ka Europe e nwere tupu 1914, ndokwa ụwa ọhụrụ nke George Bush nwụrụ na Sarajevo.” Ka o sina dị, e nwere atụmanya maka udo mgbe a malitere mkparịta ụka na Dayton, Ohio, U.S.A., na November 1995, a bịanyekwara aka n’akwụkwọ nkwekọrịta udo na Paris na December 14. Ka 1995 na-abịaru ná ngwụsị, a tụteghachiri olileanya na ikekwe, ndokwa ụwa ọhụrụ ahụ mesịrị ghara ịnwụ.
Ọchịchị repọblik ndị dị na Union of Soviet Socialist Republics ji nwayọọ nwayọọ na-ekewapụ site n’ebe ibe ha nọ. Na 1991, Lithuania, Estonia, na Latvia bụ ndị mbụ pụrụ, ndị ọzọ sochikwara ngwa ngwa. Na December e guzobere otu ìgwè na-esighị ike a matara dị ka Mba Commonwealth Ndị Nweere Onwe Ha, ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị nọbu na Soviet Union jụrụ isonye. Mgbe ahụ, na December 25, Gorbachev gbara arụkwaghịm dị ka president Soviet.
Otú ọ dị, ọbụna ọchịchị repọblik ndị ahụ n’otu n’otu malitere ikewasị. Dị ka ihe atụ, Chechnya, obere ókèala Alakụba dị n’ebe ugwu ógbè Russia bụ́ Caucasus, na-agbalị maka nnwere onwe. Mgbalị ya ịkwụrụ onwe ya ná ngwụsị 1994 kpalitere mwakpo kpatara esemokwu site n’aka ndị agha Russia. N’agbanyeghị na ihe dị ka 30,000 ndụ alawo n’iyi kemgbe agha ahụ malitere ná mmalite afọ ndị 1990, ịlụ agha agawo n’ihu ruo n’ime afọ a.
N’ihe dị ka n’October 1995, ihe dị n’agbata 27 na 46 agha—na-adabere n’otú e siri debe ha n’ọkwá—na-aga n’ihu n’ụwa nile.
Na Nso Nso nke Ndakpọ
Ná mmalite nke afọ ndị 1990, ọ bụghị nanị na ndokwa ụwa ọhụrụ ahụ akwụsighị ike n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, kamakwa ọ mara jijiji n’ụzọ akụ̀ na ụba.
Na 1991, Nicaragua belatara ikike nzụta ego ha, ma ọbụna mgbe ahụ, 25 nde cordobas bụ nanị otu dollar United States. Ka ọ dị mgbe ahụ, Zaire nwere ịrị elu nke ọnụ ahịa bụ́ 850 pasent, na-amanye ụmụ amaala ya idi otu n’ime ụzọ ibi ndụ kasị ala n’ụwa. Akụ̀ na ụba ndị Russia na-ahụsikwa anya. Ịrị elu nke ọnụ ahịa nọ na 2,200 pasent n’otu afọ na 1992, na-eme ka ọ fọdụ nke nta ka ego ghara ịba uru. Ọ bụ ezie na ihe mesịrị kawanye mma, na 1995 nsogbu akụ̀ na ụba ebibeghị ma ọlị.
Akụkọ ọjọọ ego nke kasị njọ e nwere na narị afọ a weere ọnọdụ na 1991, mgbe Bank of Credit & Commerce International dara, nke igwu wayo na ime mpụ kwaturu. Ndị si 62 ala bụ́ ndị tinyere ego n’ebe ahụ nwere mfu nke ngụkọta ya bụ ọtụtụ ijeri dollar nke United States.
Ọ bụghị nanị mba ndị na-esighị ike n’ụzọ akụ̀ na ụba mara jijiji; ihe njikọta kpatara bogburu Germany bụ́ dike. Enweghị ọrụ rịrị elu ka ndị ọrụ kwuru ka e nye ha oge ezumike ka ogologo na nlekọta ahụ ike ka mma. Ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke abịaghị ọrụ na iji usoro enyemaka eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi tụkwasịrị nrụgide ka ukwuu n’elu akụ̀ na ụba.
Na United States, ọtụtụ oké ọdachi tiri ụlọ ọrụ inshọransị dị iche iche aka ọjọọ, bụ́ ndị nwere oké nrụgide ịkwụ ụgwọ nzọrọ inshọransị dị iche iche. Na 1993 kwa, akwụkwọ bụ́ Bankruptcy 1995: The Coming Collapse of America and How to Stop It dọrọ aka ná ntị banyere ụgwọ na-arị elu nke mba ahụ ji na mmefu karịrị atụmatụ mmefu ego. Ọbụna na e nwere obi abụọ n’ịkwụsi ike yiri Nkume Gibraltar nke ụlọ ọrụ inshọransị Britain bụ́ Lloyd’s of London. N’ịbụ ndị ọtụtụ mfu tisasịrị, a manyere ya iche banyere ihe a na-apụghị ichetụ n’echiche—ikwe omume nke ndakpọ.
Okpukpe, Ọ̀ Bụ Ikike Nkwụsi Ike?
Na 1991 akwụkwọ akụkọ kwa ụbọchị ndị Germany bụ́ Frankfurter Allgemeine Zeitung kwuru, sị: “Ọhụụ a nke ndokwa ụwa ọhụrụ gbanyere mkpọrọgwụ n’ọdịbendị dịteworo anya nke otú America si ele ụwa dum anya, bụ́ nke nweworo akụkụ gbara ọkpụrụkpụ n’okpukpe, bụrụkwa nke e jiworo ụzọ ndị Kraịst kwuo.”
Mmadụ pụrụ iche na ọnọdụ okpukpe a kwesịrị imeworị ka ndokwa ụwa ọhụrụ ahụ sie ike karị. Ma n’ezie, ekweghị ibe nọrọ nke okpukpe na esemokwu dugara n’akwụsighị ike nke zuru ebe nile. Algeria na Ijipt bụ nanị abụọ n’ime ọtụtụ gọọmenti ha na ndị okwukwe ndaru ala nke Alakụba nọ n’esemokwu. Ntiwapụ iyi ọha egwu nke okpukpe kpaliri dakwasịrị mba abụọ ahụ. Ọgba aghara okpukpe n’India gụnyere oge nke ụbọchị itoolu nke ime ihe ike òtù na Bombay n’ime 1993 nke lara ihe karịrị 550 ndụ n’iyi.
Adịghị n’otu okpukpe belatara ọganihu nke njikọ okpukpe na 1994 mgbe Chọọchị Anglịkan chiri 32 ndị inyom echichi dị ka ndị ụkọchukwu. Popu John Paul nke Abụọ kpọrọ nke a “oké ihe mgbochi nye olileanya ọ bụla nke njikọghachi n’etiti Chọọchị Katọlik na ndị òtù Anglịkan.”
N’April 19, 1993, esemokwu dị n’etiti gọọmenti United States na ndị òtù nke òtù nzuzo okpukpe, bụ́ Ndị Alaka David—nke kpatawororị ịlụ ọgụ n’ogige òtù nzuzo ahụ na Waco, Texas, na ogbugbu e gburu ndị ọrụ gọọmenti anọ—napụrụ ma ọ dịkarịa ala, 75 ndụ nke ndị so n’òtù nzuzo ahụ. Afọ abụọ mgbe nke ahụ gasịrị, e mere nnyocha ma ọ pụrụ ịbụ na bọmbụ ahụ ndị na-eyi ọha mmadụ egwu tụrụ nke gburu 168 mmadụ n’otu ụlọ gọọmenti dị n’Oklahoma City bụ mmegwara maka mwakpo ahụ a wakporo Waco.
Akpata oyi wụrụ ụwa ná mmalite 1995 ịnụ banyere mwakpo ndị na-eyi ọha mmadụ egwu ji gas na-egbu egbu mee n’ụzọ okpuru ala dị na Tokyo. Mmadụ iri nwụrụ, ọtụtụ puku ndị ọzọ dakwara ọrịa. Akpata oyi wụrụ ụwa ọbụna karị mgbe e boro òtù nzuzo apọkalips a na-akpọ Aum Shinrikyo, ma ọ bụ Eziokwu Kasị Elu nke Aum, ebubo na ọ bụ ha mere ya.
Ememe Mgbaafọ Ndị Dị Oké Mkpa ma Nwee Oriri Dị Nta
Na 1492, Columbus gara Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa n’amaghị ụma. Esemokwu rikpuru ememe mgbaafọ nke 500 nke e mere na 1992. A kpasuru ihe dị ka 40 nde ụmụ ụmụ nke ndị American Indian iwe ozugbo e kwuru na onye Europe “chọpụtara” ala ndị nna ochie ha biworo ma gbasaa ọbụna ogologo oge tupu a mụọ ya. Ụfọdụ kpọrọ onye nchọpụta ahụ “onye obuụzọ nke nchọpụta na mmeri.” N’eziokwu kwa, ọbịbịa Columbus bịara Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa bụ ọdachi karịa ka ọ bụ ngọzi nye ndị amaala bi n’ebe ahụ. Ndị ahụ a na-akpọkarị ndị mmeri bụ́ ndị Kraịst napụrụ ha ala, ikike ọchịchị, ùgwù na ndụ ha.
Na September 1995, Israel malitere ememe were ọnwa 16 iji cheta ememe mgbaafọ nke 3,000 nke mmeri Eze Devid meriri Jerusalem. Ma ememe mgbaafọ ahụ malitere n’ụzọ jọgburu onwe ya mgbe mgbọ onye ogbu ọchụ tụgburu Praịm Minista Yitzhak Rabin minit ole na ole mgbe ọ gwasịrị otu mgbakọta udo okwu na November 4. Nke a wetara enweghị obi ụtọ n’okwu udo nke Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ, na-egosipụta na oké ọdịiche okpukpe dị, ọ bụghị nanị n’etiti ndị Juu na ndị Palestine kama ọbụna n’etiti ndị Juu n’onwe ha.
E mere ọtụtụ ememe mgbaafọ nke 50 afọ n’agbata 1991 na 1995 n’ihe metụtara Agha Ụwa nke Abụọ—mwakpo Pearl Harbor ahụ, nke mere ka United States tinye aka n’agha ahụ; mwakpo Mba Ndị Jikọrọ Aka wakporo Europe; ntọhapụ nke ogige ịta ahụhụ Nazi; mmeri Mba Ndị Jikọrọ Aka nwere na Europe; na ọtụtụ a tụrụ bọmbụ atọm mbụ na Japan. N’ihi ọbara na anya mmiri nke ya na ihe omume ndị a so na-agakọ, ụfọdụ ndị na-ajụ ma ha kwesịrị ncheta n’ezie.
Nke a dugara na mgbaafọ nke ihe omume ọzọ dị mkpa, nhiwe nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu n’October 1945. Mgbe ahụ olileanya rịrị elu na e mesịwo chọta mkpịsị ugodi nke inweta udo ụwa.
Òtù Mba Ndị Dị n’Otu, dị ka odeakwụkwọ ukwu ya bụ́ Boutros Boutros-Ghali kwuchiteere ya n’oge na-adịbeghị anya, enwewo ọtụtụ mmeri. Ma o nwebeghị ike imezu nzube e ji guzobe ya, ya bụ, “ime ka e nwee udo na ịnọ ná ntụkwasị obi zuru mba nile.” Ugboro ugboro ìgwè ndị agha ya agbalịwo ime udo n’ebe a na-enweghị udo a ga-eme. N’ihe dị ka na 1995, ọ dawo ikunye ume ndụ n’ime ndokwa ụwa ọhụrụ nke na-ama jijiji.
Ka Ndokwa Ụwa Ọhụrụ Mara Jijiji, Ezi Ọchịchị Chineke Tolitere!
N’ihi akwụsighị ike nke ọchịchị, akụ̀ na ụba, na okpukpe nke mere ka ọhụụ ha banyere ndokwa ụwa ọhụrụ gbasasịa n’ihu anya ha abụọ, ụfọdụ ndị malitere ikwu okwu banyere ụwa ọhụrụ nke nsogbu. N’ihe omume a, Ndịàmà Jehova hụrụ ihe àmà ka ukwuu na ọ bụ nanị ụwa ọhụrụ Chineke na-eke ga-akwụsi ike n’ọha mmadụ.
Ná mba ụfọdụ ngwụsị nke Agha Nzuzo pụtara nnwere onwe ka ukwuu maka Ndịàmà Jehova, na-enye ha ohere inwe mgbakọ mba nile ndị pụrụ iche na Budapest, Kiev, Moscow, Prague, St. Petersburg, Warsaw, na ebe ndị ọzọ. Ndị a mere ka ndokwa ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova sikwuo ike ma nye aka n’ime ka ọrụ nkwusa ha gaa ọsọ ọsọ. N’ihi ya, o jughị anya na ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova na-eje ozi n’otu ebe nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe toro site na 49,171 na 1991 ruo 153,361 na 1995. N’ime afọ anọ ahụ, ọnụ ọgụgụ Ndịàmà n’ụwa nile toro site na 4,278,820 ruo 5,199,895. Ezi ọchịchị Chineke na-eto eto karịa ka o toworo mgbe ọ bụla ọzọ!
Ee, ọtụtụ nde mmadụ na-atụkwasị olileanya ha ugbu a maka ọdịnihu ná nkwa Jehova Chineke nke “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:10, 13) Lee ka o si bụrụ ihe amamihe karịa ilegara ndokwa ụwa ọhụrụ nke mmadụ, nke, n’ịmalite n’ụzọ na-ama jijiji, a ga-eme ka ọ maa jijiji ma pụọ n’anya!—Daniel 2:44.