Na-achụso Obi Ebere Ịhụnanya Mgbe Nile
“Onye na-agbaso ezi omume na ebere [“obi ebere ịhụnanya,” NW] na-achọta ndụ, na ezi omume, na nsọpụrụ.”—ILU 21:21.
1. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụọ anya na ndị ahụ mmụọ Chineke na-eduzi ga-egosi obi ọma?
JEHOVA nwere obi ọma na ọmịiko. Ọ bụ “Chineke nke nwere obi ebere, onye na-eme amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.” (Ọpụpụ 34:6, 7) Ya mere, o kwere nghọta na mkpụrụ nke mmụọ nsọ ya gụnyere ịhụnanya na obi ọma.—Ndị Galetia 5:22, 23.
2. Ihe atụ dịgasị aṅaa ka anyị ga-atụle ugbu a?
2 Ndị ahụ mmụọ nsọ Jehova ma ọ bụ ike ọrụ ya na-eduzi, na-egosipụta mkpụrụ ya nke obi ọma. Ha na-egosi obi ebere ịhụnanya ná mmekọrịta ha na ndị ọzọ. N’eziokwu, ha na-agbaso ihe nlereanya Pọl, na-eme ka a mara ha dị ka ndị na-ejere Chineke ozi “n’ime obi ọma” na n’ụzọ ndị ọzọ. (2 Ndị Kọrint 6:3-10) Mmụọ ha nke inwe obi ebere, ọmịiko, na mgbaghara kwekọrọ n’ọdịdị nke Jehova, bụ́ onye ‘na-aba ụba n’obi ebere ịhụnanya,’ onye e nwekwara ọtụtụ ihe nlereanya nke obi ọma n’Okwu ya. (Abụ Ọma 86:15; Ndị Efesọs 4:32) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ụfọdụ n’ime ndị a?
Obi Ọma Na-eme Ka Anyị Na-ele Ndị Ọbịa Anya Nke Ọma, Gharakwa Ịdị Na-achọ Ọdịmma Nanị Onwe Anyị
3. N’ụzọ dị aṅaa ka Abraham si bụrụ ezi ihe nlereanya n’igosi obi ọma, agbamume dị aṅaa ka Pọl nyere n’ihe banyere nke a?
3 Nna ochie ahụ bụ Abraham (Abram)—‘enyi Jehova,’ onye bụkwa ‘nna nke ndị nile nwere okwukwe’—setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’igosi obi ọma. (Jemes 2:23; Ndị Rom 4:11) Ya na ezinụlọ ya, gụnyere nwa nwanne ya bụ Lọt, hapụrụ obodo ndị Kaldea ahụ bụ Ua wee banye na Kenean mgbe Chineke nyere ha iwu ka ha mee otú ahụ. Ọ bụ ezie na Abraham bụ onye mere okenye karị, bụrụkwa onye isi ezinụlọ ahụ, o nwere obi ọma, gharakwa ịchọ ọdịmma nanị onwe ya n’ikwere ka Lọt họrọ akụkụ kachasị mma nke ala ịta nri, ebe ya onwe ya weere nke fọdụrụnụ. (Jenesis 13:5-18) Obi ọma dị otú ahụ pụrụ ịkpali anyị ikwe ka ndị ọzọ rite uru nke gaara abịaworo anyị. Iji obi ọma mee ihe n’achọghị ọdịmma nanị onwe onye n’ụzọ dị otú a kwekọrọ na ndụmọdụ Pọl onyeozi: “Ka onye ọ bụla ghara ịchọ ọdịmma nke aka ya, kama ọdịmma nke mmadụ ibe ya.” Pọl n’onwe ya ‘mere ihe tọrọ mmadụ nile ụtọ n’ihe nile, n’achọghị uru nke aka ya kama uru nke mmadụ nile ka e wee zọpụta ha.’—1 Ndị Kọrint 10:24, 33.
4. È si aṅaa kwụọ Abraham na Sera ụgwọ ọrụ maka igosi obi ọma n’ụdị nke ile ndị ọbịa anya nke ọma?
4 Mgbe ụfọdụ, a na-egosi obi ọma n’ụdị nke ile ọbịa anya nke ọma n’ụzọ sitere n’ala ala obi. Abraham na nwunye ya bụ Sera, nwere obi ọma, leekwa ndị ọbịa atọ na-agafe agafe otu ụbọchị ọbịa nke ọma. Abraham gbara ha ume ịnọtụ nwa oge, mgbe ya na Sera mere ngwa ngwa kwadebe ihe oriri dị mma maka ndị ọbịa ahụ. O mesịrị bụrụ na ndị ọbịa ahụ bụ ndị mmụọ ozi Jehova, ndị otu n’ime ha ziruru ozi nkwa ahụ nke bụ na Sera onye meworo agadi n’amụtaghị nwa gaje inwe otu nwa nwoke. (Jenesis 18:1-15) Lee nnọọ nkwughachi ụgwọ nke a bụ maka iji obi ọma lee ndị ọbịa anya nke ọma!
5. N’ụzọ dị aṅaa ka Gaịọs si gosi obi ọma, ànyị pụkwara isi aṅaa mee ihe yiri nke ahụ?
5 Otu ụzọ nke ndị Kraịst nile pụrụ isi gosi obi ọma bụ site n’ịbụ ndị na-ele ndị ọbịa anya nke ọma. (Ndị Rom 12:13; 1 Timoti 3:1, 2) N’ụzọ kwekọrọ na nke a, ndị ohu Jehova na-eji obi ọma na-ele ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ọbịa nke ọma. Nke a na-echetara anyị ụdị obi ọma onye Kraịst narị afọ mbụ ahụ bụ Gaịọs gosiri. O mere “ihe kwesịrị ntụkwasị obi” n’ịnabata ụmụnna bụ ndị ọbịa nke ọma—ha bụkwa “ndị ọbịa” ndị ọ na-amabughị tupu mgbe ahụ. (3 Jọn 5-8) Dị ka ọ na-adịkarị, anyị maara ndị anyị pụrụ iji obi ọma lee ọbịa nke ọma. Ma eleghị anya, anyị na-ahụta na otu nwanna nwanyị ime mmụọ anyị nọ ná mwute. Ọ pụrụ ịbụ na di ya bụ onye na-ekweghị ekwe ma ọ bụ ọbụna onye a chụpụrụ n’ọgbakọ. Lee nnọọ ohere nke a bụ igosi obi ọma site n’ịkpọ ya òkù ka o sonyere ezinụlọ anyị ná nnọkọ ime mmụọ nakwa n’ihe oriri site n’oge ruo n’oge! Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na anyị agaghị eme oké oriri, o doro anya na ezinụlọ anyị ga-enweta ọṅụ n’igosi nwanna nwanyị dị otú ahụ obi ọma. (Tụlee Ilu 15:17.) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ga-egosipụtakwa ekele ya maka nke a n’okwu ọnụ ma ọ bụ n’akwụkwọ ozi ekele.
6. Olee ụzọ Lidia si gosi obi ọma, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka o ji dị mkpa igosi obi ekele maka ihe obi ọma ndị e meere anyị?
6 Mgbe e mesịrị nwanyị ahụ ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, bụ́ Lidia, baptism, “ọ rịọ anyị, sị, Ọ bụrụ na unu [Pọl na ndị ya na ha so] atụlewo na abụ m onye kwere n’Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], batanụ n’ụlọ m, nọgide n’ebe ahụ.” Luk kwukwara, sị, “O wee rụgide anyị.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha gosiri obi ekele ha maka obi ọma Lidia gosiri ha. (Ọrụ 16:14, 15, 40) Ma, ịghara igosipụta ekele pụrụ imebi ihe dị ukwuu. N’otu mgbe, otu nwanna nwanyị gbaworo 80 afọ, onye ahụ na-esichaghị ike, onye ego o nwere na-ehighịkwa nne, ji obi ọma rụsie ọrụ ike ịkwadebe ihe oriri maka ndị ọbịa ole na ole. O wutere ya nke ukwuu mgbe otu nwa okorobịa na-enweghị ike ọbụna ime ka ọ mara na ya agaghị enwe ike ịbịa. N’otu oge ọzọ, ụmụnna nwanyị abụọ abịaghị iri nri otu nwa agbọghọ bu ha n’uche wee kwadebe. “Nke a kụdara m mmụọ nke ukwuu,” ka nwa agbọghọ ahụ sịrị, “ebe ọ bụ na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha o mere nchefu. . . . Ọ gaara akara m mma ịnụ na ha chefuru banyere ịbịa iri nri, ma kama nke ahụ, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ụmụnna nwanyị ahụ nwere obi ọma ma ọ bụ ịhụnanya ruo n’ókè nke ime ka m mara na ha agaghị abịa.” Mkpụrụ nke mmụọ nsọ nke bụ obi ọma ọ̀ ga-akpali gị igosi obi ekele na ezi echiche n’ọnọdụ ndị yiri ndị a?
Obi Ọma Na-eme Ka Anyị Na-echebara Ndị Ọzọ Echiche
7. Isi ihe dị aṅaa banyere obi ọma ka e mere ihe atụ ya site ná mgbalị ahụ e mere ịgbaso ọchịchọ Jekọb n’ihe banyere olili ya?
7 Obi ọma kwesịrị ime ka anyị na-eche echiche banyere ndị ọzọ nakwa banyere ọchịchọ ha ndị ziri ezi. Iji mee ihe atụ: Jekọb (Israel), gwara nwa ya bụ Josef ka o gosi ya ebere ịhụnanya site n’ịghara ili ya n’Ijipt. Ọ bụ ezie na nke a ga-eme ka ọ dị mkpa iburu ozu Jekọb gaa ogologo njem, Josef na ụmụ ndị ọzọ nke Jekọb “[bubatara] ya n’ala Kenean, lie ya n’ọ́gbà nke ọhịa Makpila, nke Abraham zụtara, ya na ọhịa, ka ọ bụrụ ihe onwunwe nke ga-abụ ala ili, n’aka Efrọn onye Het, n’ihu Mamre.” (Jenesis 47:29; 49:29-31; 50:12, 13) N’ikwekọ n’ihe atụ ahụ, ọ̀ bụ na obi ebere ịhụnanya ekwesịghị ịkpali anyị ime ihe kwekọrọ ná ndokwa olili ozu nke Akwụkwọ nsọ kwadoro nke onye ezinụlọ anyị bụ onye Kraịst chọrọ ka a gbasoo?
8. Gịnị ka okwu banyere Rehab na-akụziri anyị banyere ịkwụghachi obi ọma?
8 Mgbe ndị ọzọ gosiri anyị obi ebere ịhụnanya, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị igosi obi ekele ma ọ bụ meghachikwara ha ihe ọma n’ụzọ ụfọdụ? O doro anya na anyị kwesịrị ime otú ahụ. Rehab bụ nwanyị na-akwa iko gosiri obi ọma site n’izobe ndị Israel ahụ bịara ime nledo. N’ihi ya, ndị Israel ahụ gosiri obi ebere ịhụnanya site n’ichebe ya na ezinụlọ ya mgbe ha raara obodo Jeriko nye mbibi. (Joshua 2:1-21; 6:20-23) Lee nnọọ ezi ihe nlereanya nke a bụ iji gosi na anyị kwesịrị iji obi ọma kwụghachi ndị ozọ site n’igosirịta ibe anyị nchebara echiche na obi ọma!
9. N’ihi gịnị ka ị ga-eji kwuo na o kwesịrị ekwesị ịrịọ mmadụ ka o gosi anyị obi ebere ịhụnanya?
9 E kwuwerị banyere nke ahụ, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ịrịọ mmadụ ka o gosi anyị obi ebere ịhụnanya. Jonatan, bụ́ nwa eze mbụ nke Israel, bụ́ Sọl, mere nke a. Jonatan gwara enyi ya ahụ ọ hụrụ n’anya nke bụ onye ọ karịrị n’afọ ndụ, bụ́ Devid, igosi ya na ezinụlọ ya obi ebere ịhụnanya. (1 Samuel 20:14, 15; 2 Samuel 9:3-7) Devid chetara nke a mgbe ọ bọọrọ ndị Gibeọn ọ́bọ̀, bụ́ ndị Sọl mejọworo. N’icheta “ọṅụṅụ iyi Jehova” nke dị n’etiti ya na Jonatan, Devid gosiri obi ebere ịhụnanya site n’ichebe ndụ nwa Jonatan bụ Mefiboshet. (2 Samuel 21:7, 8) Ànyị na-esi n’otu ụzọ ahụ ‘na-ekwe ka Ee anyị bụrụ Ee’? (Jemes 5:12) Ọ bụrụkwa na anyị bụ ndị okenye ọgbakọ, ànyị na-esi n’otu ụzọ ahụ egosipụta ọmịiko mgbe ọ dị mkpa ka anyị gosi ndị kwere ekwe ibe anyị obi ebere ịhụnanya?
Obi Ọma Na-ewusiwanye Njikọ Dị n’Etiti Ndị Mmadụ Ike
10. È si aṅaa gọzie obi ebere ịhụnanya nke Rut?
10 Obi ebere ịhụnanya na-ewusiwanye nkekọ ezinụlọ ike, na-akwalitekwa obi ụtọ. E gosiri nke a n’okwu banyere nwa agbọghọ onye Moab ahụ bụ Rut. Ọ dọgburu onwe ya n’ọrụ dị ka onye na-atụtụkọta ihe e wefọrọ n’ubi Boaz ahụ meworo agadi n’ebe dị nso Betlehem, na-achọtara onwe ya na nne di ya nke bụ nwanyị di ya nwụworo, nke nọkwa ná mkpa, bụ́ Naomi, ihe oriri. (Rut 2:14-18) Boaz mesịrị gwa Rut, sị: “I mewo ebere nke ọma n’ikpeazụ karịa na mbụ, ebe ị na-ejesoghị ụmụ okorobịa, ma ọ bụ onye na-enweghị ike ma ọ bụ ọgaranya.” (Rut 3:10) Nke mbụ, Rut gosiri Naomi obi ebere ịhụnanya. “N’ikpeazụ,” nwanyị onye Moab ahụ gosipụtara obi ebere ịhụnanya site n’ịdị njikere ịlụ Boaz ahụ meworo agadi ka o wee welitere di ya nwụworo anwụ nakwa Naomi nke meworo agadi aha. Site na Boaz, Rut ghọrọ nne nke nna nna Devid, bụ́ Obed. Chineke nyekwara ya ‘ụgwọ ọrụ zuru ezu’ nke ịbụ otu n’ime ndị inyom Jisọs Kraịst sitere n’usoro ọmụmụ ha. (Rut 2:12; 4:13-17; Matiu 1:3-6, 16; Luk 3:23, 31-33) Lee nnọọ ọtụtụ ngọzi obi ebere ịhụnanya nke Rut wetaara ya na ezinụlọ ya! Taa, ọtụtụ ngọzi, obi ụtọ, na imesiwanye ihe nkekọ ezinụlọ ike na-abịakwa mgbe obi ebere ịhụnanya na-adị n’ezinụlọ ndị na-atụ egwu Chineke.
11. Mmetụta dị aṅaa ka obi ọma nke Faịlimọn nwere?
11 Obi ọma na-ewusiwanyekwa ihe nkekọ dị n’ime ọgbakọ ndị Jehova ike. Nwoke onye Kraịst ahụ bụ Faịlimọn bụ onye a maara n’ihi igosi obi ebere ịhụnanya n’ebe ndị kwere ekwe ibe ya nọ. Pọl gwara ya, sị: “Ana m ekele Chineke m mgbe nile mgbe m na-ehota gị n’ekpere m nile, ebe m na-anụ okwu banyere ịhụnanya gị na okwukwe gị, bụ́ okwukwe i kweere n’Onyenwe anyị Jisọs, na ịhụnanya ị hụrụ ndị nsọ nile . . . enwere m ọtụtụ ọṅụ na nkasi obi n’ihi ịhụnanya gị, n’ihi na obi ndị nsọ ezuwo ike site n’aka gị, nwanna m.” (Faịlimọn 4-7) Akwụkwọ nsọ ekwughị ụzọ e si mee ka obi ndị nsọ zuo ike site n’aka Faịlimọn. Otú ọ dị, ọ ghaghị igosiworị ndị e tere mmanụ ibe ya obi ebere ịhụnanya n’ụzọ dị iche iche nke bụ ihe wetaara ha izu ike, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na nke a mesiwanyere ihe nkekọ dị n’etiti ha ike. Ihe ndị yiri nke ahụ na-emekwa mgbe ndị Kraịst na-egosipụta obi ebere ịhụnanya taa.
12. Gịnị si n’obi ọma Onisifọrọs gosiri pụta?
12 Obi ọma nke Onisifọrọs nwekwara mmetụta dị mma. “Ka Onyenwe anyị meere ezinụlọ Onisifọrọs ebere,” ka Pọl sịrị, “n’ihi na o mere ka m nwee ume ndụ ọtụtụ mgbe, ihere mkpọrọ m emeghịkwa ya; kama, mgbe ọ bịaruru Rom, o weere ịnụ ọkụ n’obi chọba m, wee chọta m (ka Onyenwe anyị nye ya ka ọ chọta ebere n’aka Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] n’ụbọchị ahụ); ka ha hàkwa, bụ́ ihe o ji jeere m rịị ozi n’Efesọs, gị onwe gị maara karị.” (2 Timoti 1:16-18) Ọ bụrụ na anyị arụsie ọrụ ike iji gosi obi ebere ịhụnanya n’ebe ndị anyị na ha na-efekọ ofufe nọ, anyị ga-enwe obi ụtọ, na-ewusiwanyekwa ihe nkekọ nke ịhụnanya ụmụnna nke dị n’ime ọgbakọ ndị Kraịst ike.
13, 14. Olee ụzọ ọgbakọ dị na Filipaị si bụrụ ezi ihe nlereanya, oleekwa ụzọ Pọl si meghachi omume n’obi ọma ọgbakọ ahụ gosiri ya?
13 Mgbe mmadụ dum nọ n’ọgbakọ na-egosi obi ebere ịhụnanya n’ebe ndị ha na ha na-efekọ ofufe nọ, nke a na-ewusi ihe nkekọ dị n’etiti ha ike. Nkekọ siri ike dị otú ahụ dịrị n’etiti Pọl na ọgbakọ ahụ dị n’obodo Filipaị. N’eziokwu, otu n’ime ihe ndị kpatara o ji dee akwụkwọ ozi ahụ o degaara ndị Filipaị bụ iji gosipụta ekele ya maka obi ọma na ihe enyemaka ha nyere ya. O dere, sị: “N’ime mmalite nke ozi ọma, mgbe m siri na Masedonia pụta, ọ dịghị nzukọ Kraịst ọ bụla nke mụ na ya nwekọrọ ihe n’okwu banyere onyinye na ọnịna, ma ọ bụghị nanị unu onwe unu; n’ihi na ọbụna na Tesalọnaịka unu zigara otu mgbe zigakwa mgbe ọzọ igbo m mkpa. . . . Enwezuwo m ihe nile, ana m ababigakwa ókè: e mewo ka m zuo ezu, ebe m natara n’aka Epafrọdaịtọs ihe nile si n’aka unu bịa, ísìsì nke ihe ísì ụtọ, àjà nke a na-anara nke ọma, nke na-atọ Chineke ezi ụtọ.”—Ndị Filipaị 4:15-18.
14 Ka a sịkwa ihe mere ndị Filipaị ahụ nwere obi ọma ji na-adị n’ekpere nile nke Pọl! Ọ sịrị: “Ana m ekele Chineke m ná ncheta nile m na-echeta unu, mgbe nile n’arịrịọ nile m na-arịọrọ unu nile na-arịọ arịrịọ ahụ n’ime ọṅụ, n’ihi nnwekọ unu nwekọrọ n’izisa ozi ọma site n’ụbọchị mbụ ruo ugbu a.” (Ndị Filipaị 1:3-5) Nkwado obi ọma na nke afọ ofufo dị otú a nke ọrụ nkwusa Alaeze ahụ adịghị mgbe ọ bụla ọ na-eme ka ọgbakọ daa ogbenye. Mgbe ndị Filipaị jisịrị obi ọma mee ihe ha pụrụ ime n’ihe banyere nke a, Pọl mesiri ha obi ike, sị: “Ma Chineke m ga-enyezu unu ihe nile ọ bụla na-akpa unu dị ka akụ ya n’ebube si dị, n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:19) Ee, Chineke na-akwụghachi obi ọma na inwe afọ ofufo ụgwọ ọrụ. Okwu ya na-asị: “Ezi ihe ọ bụla onye ọ bụla na-eme, nke a ka ọ ga-anaghachi n’aka Onyenwe anyị [“Jehova,” NW].”—Ndị Efesọs 6:8.
Mgbe Ndị Inyom Gosiri Obi Ọma
15, 16. (a) È si aṅaa cheta obi ọma Dọkas, gịnịkwa mere mgbe ọ nwụrụ? (b) Olee ụzọ ndị inyom bụ ndị Kraịst ndị nwere obi ọma si jupụta n’ezi ọrụ taa?
15 Obi ebere ịhụnanya nke onye ahụ na-eso ụzọ, bụ́ Dọkas (Tabita) onye Jọpa agafereghị n’enwetaghị nkwụghachi ụgwọ. “Nwanyị a jupụtara n’ezi ọrụ na ọrụ ebere nke ọ na-eme,” mgbe ‘ọ dakwara ọrịa wee nwụọ,’ ndị ahụ na-eso ụzọ zipụrụ ka a kpọọ Pita site na Lida. Mgbe ọ bịarutere, “ha duuru ya rịgoo n’ime ụlọ ahụ dị n’elụ ụlọ: ndị inyom nile ndị di ha nwụrụ guzokwara ya nso na-akwa ákwá, na-egosikwa uwe ime na uwe ọzọ, ka ha hà, bụ́ nke Dọkas na-eme mgbe ya na ha nọ.” Jiri anya nke uche gị hụ otú ebe ahụ dị: Ndị inyom di ha nwụrụ, ndị nọ ná mwute, ndị na-akwa ákwá, gwara onyeozi ahụ otú Dọkas siwororịị na-egosi ha obi ọma, gosikwa ya uwe ndị ahụ dị ka ihe àmà nke ịhụnanya na obi ọma ya. Mgbe ọ chụpụsịrị mmadụ nile n’èzí, Pita gbunyere ikpere n’ala wee kpee ekpere ma tụgharịa chee ihu n’ebe ozu ahụ tọgbọ. Gee ntị! Ọ sịrị: “Tabita, bilie.” Ma lee! “Nwanyị ahụ wee saghee anya ya; mgbe ọ hụrụ Pita, o wee nọlie. O wee nye ya aka ya, palie ya elu; mgbe ọ kpọsịrị ndị nsọ na ndị inyom ndị di ha nwụrụ, o chee ya ná ndụ n’ihu ha.” (Ọrụ 9:36-41) Lee nnọọ ngọzi sitere n’aka Chineke nke a bụ!
16 Nke a bụ mbilite n’ọnwụ mbụ e mere ihe ndekọ banyere ya nke onyeozi Jisọs Kraịst mere. Ọnọdụ ndị dujere n’ụdị ọrụ ebube nke a gbanyekwara mkpọrọgwụ n’inwe obi ọma. Ònye pụrụ ikwu na a gaara akpọliteworị Dọkas n’ọnwụ ma a sị na o jupụtaghị n’ezi ọrụ na ọrụ ebere—ma a sị na o jupụtaghị n’obi ebere ịhụnanya? Ọ bụghị nanị na a gọziri Dọkas na ndị inyom ahụ di ha nwụrụ, kama ọrụ ebube nke mbilite n’ọnwụ ya ghọrọ ihe ịgba àmà nke ebube Chineke. Ee, ‘a maara ihe banyere nke a na Jọpa dum, ọtụtụ mmadụ wee kwere n’Onyenwe anyị.’ (Ọrụ 9:42) Taa, ụmụ nwanyị ndị Kraịst nwere obi ọma jupụtakwara n’ezi ọrụ—ma eleghị anya ịdụtara ndị kwere ekwe ibe ha uwe, ịkwadebere ndị meworo agadi n’etiti anyị ihe oriri, ilekwa ndị ọbịa anya nke ọma. (1 Timoti 5:9, 10) Lee nnọọ ka nke a na-esi bụrụ ihe ịgba àmà nye ndị na-ahụ ihe na-emenụ! Karịsịa ihe nile, lee ka anyị na-esi enwe obi ụtọ na nsọpụrụ Chineke na obi ebere ịhụnanya na-akpali ‘usuu nke a bara ụba nke ndị inyom ikpọsa ozi ọma ahụ,’ bụ́ nke na-ewetara Chineke anyị, bụ́ Jehova, nsọpụrụ!—Abụ Ọma 68:11.
Nọgide Na-achụso Obi Ebere Ịhụnanya
17. Gịnị ka e kwuru n’Ilu 21:21, oleekwa ụzọ okwu ndị ahụ si metụta ndị mmadụ na-atụ egwu Chineke?
17 Ndị nile chọrọ inweta ihu ọma Chineke aghaghị ịchụso obi ebere ịhụnanya. “Onye na-agbaso ezi omume na ebere na-achọta ndụ, na ezi omume, na nsọpụrụ,” ka otu ilu amamihe dị na ya kwuru. (Ilu 21:21) Onye na-atụ egwu Chineke na-agbalịsi ike ịchụso ezi omume Chineke, bụrụ onye ụkpụrụ Chineke na-eduzi mgbe nile. (Matiu 6:33) Ọ na-anọgide na-egosi ịhụnanya nke na-eguzosi ike n’ihe ma ọ bụ obi ebere ịhụnanya, n’ebe ndị ọzọ nọ n’ụzọ a na-ahụ anya nakwa karịsịa n’ụzọ ime mmụọ. Otú a, ọ na-achọta ezi omume, n’ihi na mmụọ Jehova na-enyere ya aka ịdị ndụ n’ụzọ ezi omume. N’eziokwu, ọ ‘na-eyikwasị ezi omume dị ka uwe’ dị ka nwoke ahụ na-atụ egwu Chineke bụ Job mere. (Job 29:14) Onye dị otú ahụ adịghị achọ nsọpụrụ nke onwe ya. (Ilu 25:27) Kama nke ahụ, ọ na-enweta nsọpụrụ ọ bụla Jehova kwere ka o nweta, ma eleghị anya n’ụdị nke nsọpụrụ site n’aka ụmụ mmadụ ndị ọzọ ndị Chineke kpaliri imeso ya ihe n’obi ọma n’ihi obi ebere ịhụnanya nke o gosiri ha. Ọzọkwa, ndị ahụ na-eguzosi ike n’ihe n’ime uche Chineke na-achọta ndụ—ọ bụghị nanị ruo afọ ole na ole na-agabiga agabiga, kama ruo mgbe ebighị ebi.
18. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji chụsoo obi ebere ịhụnanya?
18 N’ihi ya, ka ndị nile hụrụ Jehova Chineke n’anya nọgide na-achụso obi ebere ịhụnanya. Àgwà nke a na-eme ka Chineke na ndị ọzọ hụ anyị n’anya. Ọ na-akwalite ile ndị ọbịa anya nke ọma, na-emekwa ka anyị na-echebara ndị ọzọ echiche. Obi ọma na-ewusi ike ihe nkekọ dị n’ime ezinụlọ nakwa n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. Ndị inyom ndị na-egosi obi ebere ịhụnanya bụ ndị a na-enwe mmasị n’ebe ha nọ, ndị a na-asọpụrụkwa nke ukwuu. Ndị nile na-achụso ezi àgwà nke a na-ewetara Chineke nke obi ebere ịhụnanya, bụ́ Jehova, otuto.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ Olee ụzọ Abraham si bụrụ ezi ihe nlereanya n’igosi obi ọma?
◻ Gịnị ka okwu banyere Rehab na-akụziri anyị banyere ịkwụghachi obi ọma?
◻ Olee ụzọ ọgbakọ dị na Filipaị si gosi obi ọma?
◻ Olee ụzọ ndị inyom bụ ndị Kraịst nwere obi ọma si ejupụta n’ezi ọrụ taa?
◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji chụsoo obi ebere ịhụnanya?