Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
‘Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Agụụ Ihe Ime Mmụọ Na-agụ’
JISỌS kwuru, sị: “Ngọzi na-adịrị ndị bụ ogbenye [“maara mkpa na-akpa ha,” NW] n’ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Ndị dị otú ahụ ga-achọ ihe ọmụma na-enye ndụ site n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, ịnarakwa ihe ọmụma nke a nke ga-eduba ha ná ndụ ebighị ebi.—Matiu 4:4; Jọn 17:3.
◻ Otu onye nwere agụụ ihe ime mmụọ n’otu mba dị n’Africa ji ụkwụ gaa ije ruo hour anọ n’ime oyi na n’ime ọchịchịrị iji nweta otu Akwukwọm nke Akukọ Bible. Mgbe o rutere obodo nta ebe Ndịàmà Jehova nọ na-eme nkwusa, o nwere mwute dị ukwuu ịhụ na e tinyewo akwụkwọ nke ikpeazụ. Ọ nọrọ ụbọchị atọ n’obodo nta ahụ mgbe a ga-ebute akwụkwọ ndị ọzọ, mgbe ahụ o nwekwara obi ụtọ n’ikpeazụ inweta ihe ọmụma ime mmụọ nke a mara mma.
N’ọnwa ha nọrọ n’ebe nke a dịpụrụ adịpụ, Ndịàmà ahụ kesara 55 akwụkwọ ukwu, 365 akwụkwọ nta, na 145 magazin, ha natakwara ụtụ magazin 5. A kpaliri ha nke ukwuu ka ha na-ala, mgbe, ma ndị okenye ma ụmụntakịrị na-akpọku ha n’asụsụ Kpelle, sị: “Ka Jehova nọnyere unu!” A na-eme mgbalị iji wulite mmasị ahụ.
Onye ọzọ n’otu mba nke a nwekwara agụụ ihe ime mmụọ. Ọ bụ onye na-edebere chọọchị ọ nọ na ya ego na onye na-ahụ maka ntụrụndụ n’ógbè ya. Mgbe Ndịàmà kpọtụụrụ ya, o ji anya mmiri kweta na chọọchị ya erughị eru n’ihe ndị Bible chọrọ maka Iso Ụzọ Kraịst. Ndịàmà ahụ gosiri ya site na Bible nke ya otú e si amata ezi okpukpe ahụ. O wee bịa nzukọ abụọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, mesịakwa kwuo, sị: “Ihe m hụrụ, nụkwa mere ka o doo m anya n’ezie na nke a bụ eziokwu ahụ.” Nzukọ ndị ahụ na àgwà nke ndị bịara ya masịrị ya nke ukwuu. Ọ hụrụ na ihe Ndịàmà ahụ bịara na nke ya kwuru abụghị ihe a rọrọ nrọ ya, kama ihe dị adị n’ezie. Eri mgbe ahụ, o werewo nzọụkwụ dị iche iche iji gbubipụ mkpakọrịta ya na chọọchị ya, nke a ewetawokwa ịgba àmà dị mma n’ógbè ahụ.
◻ Otu katkist bụ́ onye na-eto eto bụ́ onye Melanesia na New Caledonia nwere agụụ ihe ime mmụọ. Ọ chọtara otu akwụkwọ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-ebi n’elu table n’ime ụlọ nne ya, ọ gụkwara isiakwụkwọ nke 2 na 3. Akụkụ Bible ndị bụ Ọpụpụ 20:4, 5 na Jọn 4:23, 24 bụ́ ndị a tụlere na ha metụtara ya n’obi. N’ihi ihe akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a kwuru, ọ jụrụ ụkọchukwu ya ihe mere Chọọchị Katọlik ji anakwere iji ihe oyiyi eme ihe n’ofufe. Ụkọchukwu ahụ zeere ịza ajụjụ ahụ. Nwoke ahụ gara n’ọtụtụ okpukpe “Kristian” ndị ọzọ ma ha enyeghị ya azịza ndị na-eju afọ maka ajụjụ ndị ọ jụrụ. N’ikpeazụ o kpebiri ịga otu nzukọ Ndịàmà Jehova ya na nne ya, bụ́ onye gosipụtaworo mmasị n’eziokwu ahụ. Ịhụnanya ọ hụtara n’etiti Ndịàmà ahụ na ozizi ha dị iche iche ndị dabeere na Bible masịrị ya nke ukwuu.
N’agbanyeghị ibi n’ebe dị anya, site n’ịrịọ ndị moto ka ha bupụta ya n’ụzọ, ọ na-aga nzukọ nile, ngwa ngwa o weere nguzo ya maka eziokwu ahụ, e meekwa ya baptism. Ugbu a ọ bụ ohu na-eje ozi. Nne ya na ụmụnne ya ndị nwanyị abụọ bụ́ ndị nne ji ha ghọkwara Ndịàmà nke Jehova. Nwa okoro ahụ mere nkwusa nye ndị agbụrụ ya wee malite ọtụtụ ọmụmụ Bible. Ugbu a ụfọdụ na-abịa nzukọ n’ógbè nke a—ha nile n’ihi na ọ dabara na otu nwa okorobịa hụtara otu akwụkwọ nke na-akọwa Bible n’elu table, wee mụọ ya, jirikwa ihe ọ mụtara kpọrọ ihe.
Jehova nwere oké usoro inye nri ime mmụọ nke dị irè taa, ọtụtụ ìgwè mmadụ na-eritekwa uru site na ya. Aịsaịa buru amụma banyere ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị mgbe ọ sịrị: “Lee, ndị ohu m ga-eri ihe, ma agụụ ga-agụ unu onwe unu [ndị nọ n’okpukpe ụgha].” (Aịsaịa 65:13) Obi ụtọ ga-adịrị anyị ma ọ bụrụ na anyị erite uru site ná ndokwa Jehova mere maka imeju agụụ ime mmụọ anyị.