Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
◼Mgbe mmadụ nwụrụ, ọ̀ bụ ihe ziri ezi ka ndị Kraịst nye ezinụlọ ahụ okooko osisi ma ọ bụ zije okooko osisi n’ụlọ akwamozu ahụ?
N’ala ụfọdụ, ọ bụ omenala ime otú ahụ. Ma mgbe ụfọdụ, iji okooko osisi eme ihe n’akwamozu enwewo ihe ndị metụtara okpukpe dị na ya. Ya mere, ka anyị nyochaa okwu ahụ nke ọma, karịsịa ebe ọ bụ na e nwere omenala ndị ọzọ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha nwere njikọ ndị dị otú ahụ n’okpukpe ụgha. Rịba ama okwu ndị sitere n’akwụkwọ bụ The Encyclopedia of Religion (1987):
“E jikọrọ okooko osisi na ógbè ebe dị nsọ site ná njikọ e nwere n’etiti ha na chi na chi nwanyị dị iche iche. Flora, bụ́ chi nwanyị ndị Rom nke oge opupu ihe ubi na okooko osisi, na-eweta ịma mma na ísìsì ọma nye okooko osisi dị iche iche . . . A pụrụ ime ka obi jụrụ chi dị iche iche, feekwa ha ofufe . . . site n’onyinye nke ihe oriri na okooko osisi.
“Njikọ nke okooko osisi na ihe omume ndị metụtara ọnwụ zuru ebe nile gburugburu ụwa. Ndị Grik na ndị Rom na-eji okooko osisi ekpuchi ndị ha nwụrụ anwụ na ili ha. A na-eji okooko osisi lotus ebugo mkpụrụ obi ndị okpukpe Buddha nọ n’ọnụ ọnwụ na Japan, a pụkwara ime ka nkume ndị e ji kpuchie ili dịkwasị n’elu okooko osisi lotus a kpụrụ akpụ . . . Ndị Tahiti na-edebe ùkwù okooko osisi e ji ahịhịa fern kee n’akụkụ ozu ahụ mgbe a nwụsịrị, wee wụsa ihe nwere ísìsì okooko osisi n’elu ozu ahụ iji mee ka ọ dịrị ya mfe ịgafe banye ná ndụ dị nsọ nke a na-adị mgbe a dịsịrị ndụ nke a . . . A pụkwara inwe okooko osisi n’oge dị iche iche dị nsọ n’ụdị nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ma ọ bụ ihe ísì ụtọ nkịtị.”
N’ịmara na e jiwo okooko osisi mee ihe n’ụzọ nwere njikọ n’ebe okpukpe ụgha dị, ụfọdụ ndị Kraịst enwewo mmetụta nke bụ na ha ekwesịghị inye ma ọ bụ izije okooko osisi n’oge akwamozu. Echiche ha pụkwara igosipụta ọchịchọ nke izere omenala ndị ụwa, ebe ọ bụ na ndị na-eso ụzọ Jisọs ‘ekwesịghị ịbụ akụkụ nke ụwa.’ (Jọn 15:19) Otú ọ dị, akụkụ ihe odide Bible ndị dị mkpa na mmetụta a na-enwe n’ógbè dị iche iche metụtara okwu ahụ.
Okooko osisi bụ akụkụ nke onyinye ndị mara mma Chineke nyere ndị dị ndụ ka ha nweta ọṅụ site na ha. (Ọrụ 14:15-17; Jemes 1:17) E jiwo okooko osisi ndị mara mma o kere mee ihe n’ezi ofufe. E ji “ifuru osisi almond . . . na okooko ha” chọọ ihe ịdọba oriọna dị n’ụlọ ikwuu ahụ mma. (Ọpụpụ 25:31-34) Ihe ọpịpị ndị dị n’ụlọ nsọ ahụ gụnyere okooko osisi wara awa na osisi nkwụ. (1 Ndị Eze 6:18, 29, 32) N’ụzọ doro anya, ojiji ndị na-ekpere arụsị ji okooko osisi na-eme ihe apụtaghị na ọ dị mkpa ka ndị na-efe ezi ofufe zere iji ha eme ihe mgbe nile.—Ọrụ 14:13.
Ma, gịnị banyere okwu ahụ sara mbara karị nke metụtara ịgbaso omenala dị iche iche, dị ka omenala ịkwa ozu? Bible zoro aka n’ọtụtụ omenala dị iche iche, nke ụfọdụ n’ime ha bụ ndị na-ezighị ezi nye ndị na-efe ezi ofufe, ndị ọzọ bụkwa ndị ndị Chineke gbasoro. Ndị Eze nke Mbụ 18:28 hotara ‘omenala’ nke ndị na-efe Beal nke ‘iji oké olu na-akpọ, na-ejikwa mma agha na-ebi ahụ onwe ha’—omenala nke ndị na-efe ezi ofufe na-agaghị agbaso. N’aka nke ọzọ, Rut 4:7 adịghị atụ aro na a katọrọ “ihe a na-eme mgbe gara aga n’Israel banyere [ụzọ a na-esi eme] ihe mgbapụta.”
Omenala ndị Chineke na-anara nke ọma pụrụ ọbụna ibilite kpọmkwem n’ihe banyere okpukpe. Mgbe Chineke setịpụrụ ụkpụrụ ememe Ngabiga ahụ, o hotaghị iji mmanya eme ihe, ma ka ọ na-erule narị afọ mbụ ahụ, ọ bụ ihe a na-emekarị, bụ iji iko mmanya dị iche iche eme ihe. Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ajụghị omenala okpukpe nke a. Ha hụrụ ya dị ka ihe na-enweghị ihe ọjọọ dị na ya, ha gbasokwara ya.—Ọpụpụ 12:6-18; Luk 22:15-18; 1 Ndị Kọrint 11:25.
Otú ahụ ka ọ dị n’ihe banyere omenala ịkwa ozu ụfọdụ. Ọ bụ omenala ndị Ijipt ịgbasi ozu agbasi. Nna ochie ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Josef emeghachighị omume n’echeghị echiche, sị, ‘Nke a bụ omenala ndị na-ekpere arụsị, ya mere anyị, bụ́ ndị Hibru aghaghị izere ya.’ Kama nke ahụ, o ‘nyere ndị ohu ya iwu, bụ́ ndị dibia, ịgbasi ozu nna ya,’ nke ihe àmà gosiri na ọ bụ ka e nwee ike ili Jekọb n’Ala Nkwa ahụ. (Jenesis 49:29–50:3) Ndị Juu mesịrị nwee omenala ịkwa ozu ndị dị iche, dị ka ịsa ozu ahụ ahụ na ili ya n’ụbọchị ahụ ọ nwụrụ. Ndị Kraịst oge gboo nakweere omenala ndị Juu dị otú ahụ.—Ọrụ 9:37.
Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na a na-ele otu omenala ịkwa ozu anya dị ka nke nwere ihe ọ pụtara nke dabeere ná njehie okpukpe, dị ka ikwere ná mkpụrụ obi nke na-adịghị anwụ anwụ? Cheta ihe e hotara n’akwụkwọ ọkà ihe ọmụma ahụ, na ụfọdụ ndị “na-edebe ùkwù okooko osisi e ji ahịhịa fern kee n’akụkụ ozu ahụ mgbe a nwụsịrị, wee wụsa ihe nwere ísìsì okooko osisi n’elu ozu ahụ iji mee ka ọ dịrị ya mfe ịgafe banye ná ndụ dị nsọ nke a na-adị mgbe a dịsịrị ndụ nke a.” Eziokwu ahụ nke bụ na e nwere ụdị omenala ahụ apụtaghị na ndị ohu Chineke aghaghị ịjụ ihe ọ bụla yiri ya. Ọ bụ ezie na ndị Juu ekwenyeghị ná ‘mbanye ná ndụ dị nsọ nke a na-adị mgbe a dịsịrị ndụ nke a,’ Bible na-asị: “Ha weere ahụ Jisọs, kee ya n’ezi ákwà ozu, ya na ụda ụtọ ndị a, dị ka ndị Juu na-eme n’ili ozu.”—Jọn 12:2-8; 19:40.
Ndị Kraịst kwesịrị izere omenala ndị megidere eziokwu nke Bible. (2 Ndị Kọrint 6:14-18) Ma, ụdị ihe dị iche iche, ihe osise, na ihe omume dị iche iche, adịwo oge na ebe e nyere ha nkọwa ụgha ma ọ bụ jikọta ha na ozizi ndị akwụkwọ nsọ na-akwadoghị. Ọ dịwo ebe ndị a na-efe osisi dị iche iche ofufe, e lewokwa ihe oyiyi nke obi anya dị ka ihe dị nsọ, e jiwokwa ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ mee ihe n’ihe omume ndị na-ekpere arụsị. Nke a ọ̀ pụtara na onye Kraịst adịghị mgbe ọ bụla ọ ga-eji ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ mee ihe, jiri osisi chọọ ihe mma, ma ọ bụ yiri ọla ndị e mere n’ụdịdị nke obi?a Nke ahụ abụghị nkwubi okwu kwesịrị ekwesị.
Ezi onye Kraịst kwesịrị ịtụle: Ịgbaso otu omenala ọ̀ ga-egosi ndị ọzọ na anabatawo m nkwenkwe ma ọ bụ omenala ndị akwụkwọ nsọ na-akwadoghị? Oge na ebe a nọ eme ihe ahụ pụrụ imetụta azịza ya. Ọ pụrụ ịbụ na otu omenala (ma ọ bụ ihe ịchọ mma) nwere ihe ọ pụtara nke metụtara okpukpe ụgha n’ọtụtụ puku afọ gara aga ma ọ bụ ọ pụrụ inwe ihe dị otú ahụ ọ pụtara n’oge a n’ala dị anya. Ma, n’ejeghị malite ime nchọpụta nke na-ewe oge, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú a na-esikarị ele ya anya n’ebe m bi?’—Tụlee 1 Ndị Kọrint 10:25-29.
Ọ bụrụ na ọ bụ ihe a ma ama na otu omenala (ma ọ bụ ihe ịchọ mma, dị ka obé) nwere ihe ọ pụtara n’okpukpe ụgha, zere ya. Otú a, ndị Kraịst agaghị ezije okooko osisi ndị a haziri n’ụdị nke obé, ma ọ bụ n’ụdị nke mkpụrụ obi na-acha uhie uhie ma ọ bụrụ na a na-ele ha anya dị ka ndị nwere ihe ha pụtara n’ụzọ okpukpe. Ọ pụkwara ịbụ na e nwere ụzọ ụfọdụ a ma ama a na-esi eji okooko osisi eme ihe n’oge akwamozu ma ọ bụ n’akụkụ ili nke nwere ihe ọ pụtara n’ụzọ okpukpe n’ógbè ebe i bi. Onye Kraịst kwesịkwara izere nke ahụ. Ma, nke ahụ abụghị ikwu na iweta ùkwù okooko osisi n’oge akwamozu ma ọ bụ inye onye nọ n’ụlọ ọgwụ okooko osisi bụ ihe a na-aghaghị ile anya dị ka ihe omume okpukpe nke a na-aghaghị izere.b
N’aka nke ọzọ, n’ọtụtụ ala, omenala nke iweta okooko osisi bụ ihe a na-eme ebe nile, a na-elekwa ya anya dị ka ihe omume obi ọma nke kwesịrị ekwesị. Okooko osisi pụrụ inye aka ime ka gburugburu ebe ahụ maa mma, ọ pụkwara ime ka oge mwute dịtụkwuo mma. Ha pụkwara ịbụ ihe omume nke na-egosi ọmịiko na mmetụta. N’ebe ndị ọzọ, omenala pụrụ ịbụ igosipụta mmetụta ndị dị otú ahụ site n’ihe omume afọ ofufo, dị ka isite nri maka onye ọrịa ma ọ bụ ndị na-eru újú. (Cheta mmetụta e nwere maka Dọkas n’ihi na o gosipụtara mmasị na nchegbu o nwere n’ebe ndị ọzọ nọ. [Ọrụ 9:36-39]) Mgbe ọ na-apụtaghị ìhè na ime otú ahụ nwere njikọ ọ bụla n’etiti ya na nkwenkwe ụgha, ụfọdụ Ndịàmà Jehova na-ewetara enyi ha nke nọ n’ụlọ ọgwụ okooko osisi ndị mara mma ma ọ bụkwanụ mgbe mmadụ nwụrụ. N’otu n’otu, ha pụkwara igosipụtakwu mmasị na mmetụta ha site n’ime ihe ndị a hụrụ anya.—Jemes 1:27; 2:14-17.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ dịwo ogologo oge ndị na-ekpere arụsị na-eji ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ e ji okooko osisi mee na-eme ihe n’ememe ha, ma ọ bụghị ihe dị njọ na ndị Chineke jiri ya mee ihe n’ezi ofufe ha. (Ọpụpụ 30:1, 7, 8; 37:29; Mkpughe 5:8) Leekwa isiokwu ahụ bụ “Are They Idolatrous Decorations?” (Hà Bụ Ihe Ịchọ Mma Ndị Na-ekpere Arụsị?) nke dị na Teta! (Bekee) nke December 22, 1976.
b E kwesịrị ịtụle ihe bụ ọchịchọ ezinụlọ ahụ, n’ihi na ụfọdụ ndị na-eme ka a mara na onye ọ bụla nke chọrọ izite okooko osisi, kama ime otú ahụ, kwesịrị ịtụnyere ọgbakọ ego ma ọ bụkwanụ nye ya otu òtù ọrụ ebere.