Ị̀ Na-echeta?
Ì chebarawo mbipụta ndị na-adịbeghị anya nke Ụlọ Nche echiche nke ọma? Ya bụrụ otú ahụ, ma eleghị anya ọ ga-akpali mmasị gị icheta ihe ndị sonị:
◻ Olee ụzọ ihe ndekọ Bible nke agha ndị Jehova buru si enye anyị obi ike n’iche “mkpagbu ukwu” ahụ ihu? (Matiu 24:21)
N’ịbụ onye na-achịkwa mgbe nile ihe na-emenụ, Jehova egosipụtawo na ya pụrụ iche echiche karịa ndị iro ya nile, duziekwa ọnọdụ dịnụ maka nzọpụta nke ndị ya.—8/15, peji 27.
◻ Gịnị ka ndị mụrụ ụmụ na-aghaghị ịdị njikere ime iji nọgide na-enwe mkparịta ụka n’etiti ha na ụmụ ha?
Ndị mụrụ ụmụ aghaghị iwepụta oge ka ha na ụmụ ha nọkọọ. Ọzọkwa, ha aghaghị ịdị njikere iji ihe ụfọdụ chụọ àjà n’ihi ụmụ ha maka ito uto nke echiche, nke anụ ahụ, na nke ime mmụọ ha.—9/1, peji 22.
◻ Gịnị ka nnwogha Jisọs nwoghara pụtara nye anyị taa? (Mak 9:2-4)
Nwogha ahụ pụrụ iwulite okwukwe n’okwu amụma Jehova, wusiekwa nkwenye anyị kwenyere na Jisọs Kraịst dị ka Ọkpara Chineke na Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa ike. Ọ pụkwara iwusi ike nkwenye anyị kwenyere ná mbilite n’ọnwụ Jisọs gaa ná ndụ nke mmụọ, mụbaakwa okwukwe anyị nwere n’ọchịchị Chineke.—9/15, peji 23.
◻ Gịnị ka okwu ahụ bụ “ruo nwa oge” nke dị n’Aịsaịa 11:6 (NW) pụtara?
Nsụgharị e leziri anya mee nke amaokwu nke a na-egosi na anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ agaghị na-anọkọta mgbe nile n’ime ụwa ọhụrụ ahụ. O yiri ka anụmanụ ndị dị otú ahụ ka ga-enwekwa ebe dị iche iche ha ga-ebi, wee si otú ahụ bata n’okpuru òtù dị iche iche dị ka ‘anụ ụlọ na anụ ọhịa dị iche iche’ dị ka e nwere na Paradaịs nke mbụ ahụ. (Jenesis 1:24) Otú ọ dị, ụmụ anụmanụ na ibe ha ga-adịrịta n’udo, nwee ike iso ibe ha nọkọọ n’enweghị ihe ize ndụ ọ bụla.—9/15, peji 31.
◻ Gịnị bụ isi ihe dị n’ezi Iso Ụzọ Kraịst?
Ịhụnanya bụ isi ihe dị n’ezi Iso Ụzọ Kraịst. Okwukwe, ọrụ dị iche iche, na mkpakọrịta dị mma dị oké mkpa, ma ọ bụrụ na e nweghị ịhụnanya, a dịghị ahụta abamuru ha. Nke a dị otú a n’ihi na n’ụzọ bụ isi, Jehova bụ Chineke nke ịhụnanya. (1 Ndị Kọrint 13:1-3; 1 Jọn 4:8)—10/1, peji 20.
◻ Okwu ahụ bụ “mgbe ịmụ nwa na mgbe ịnwụ anwụ” nke dị n’Eklisiastis 3:2 ọ̀ na-akwado echiche ahụ nke bụ na Chineke adịworị mbụ kpebie oge ọnwụ anyị?
Ee e. Ihe Solomọn na-eme bụ nanị ịtụle ọnọdụ na-adịgide adịgide nke ndụ na ọnwụ, bụ́ nke na-emekpa ụmụ mmadụ na-ezughị okè ahụ. Eklisiastis 7:17 kwuru, sị: “Emebibigala iwu ókè, abụkwala onye nzuzu: n’ihi gịnị ka ị ga-anwụchu anwụchu?” Echiche dị aṅaa ga-adị na ndụmọdụ nke a ma ọ bụrụ na e buworị ụzọ kaa mgbe mmadụ ga-anwụ aka?—10/15, peji 5-6.
◻ Gịnị na-arụ ụka megide echiche ahụ nke bụ na Pita onyeozi bụ bishọp mbụ nke Rom?
E nweghị ihe àmà ọ bụla gosiri na ọ dị mgbe ọ bụla Pita jere obodo Rom; ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla Pita zoro aka n’ebe onwe ya nọ dị ka ihe ọ bụla karịrị otu n’ime ndị ozi Kraịst. (2 Pita 1:1)—10/15, peji 8.
◻ Ò kwesịrị ekwesị ka ndị Kraịst zije okooko osisi n’ebe a na-eli ozu?
Ọ bụrụ na ọ bụ ihe a mazuru ebe nile na otu omenala (ma ọ bụ ụzọ idozi ihe, dị ka akara nke obé) nwere ihe ọ pụtara n’ụzọ okpukpe n’oge a n’ógbè mmadụ bi, e kwesịrị izere ya. Ya mere, ndị Kraịst agaghị ezije okooko osisi n’ụdịdị nke obé ma ọ bụ jiri ha mee ihe n’otu ụzọ pụrụ iche nke ọ pụtara ìhè na o nwere ihe ọ pụtara n’ụzọ okpukpe. Otú ọ dị, n’oge a n’ọtụtụ ala, omenala nke iweta okooko osisi n’enweghị ihe ọ bụla jikọrọ ya na okpukpe bụ ihe a na-eme ebe nile. Ụfọdụ ndị Kraịst ezijewo okooko osisi iji mee ka ọnọdụ dị mwute kusapụtụ, ijikwa gosi ọmịiko na mmetụta.—10/15, peji 31.
◻ Gịnị ka nkọwa ndị dị iche iche ọnụ ha na-eru n’okwu nyere Atọ n’Ime Otu na-eme ka ọ pụta ìhè?
Ha na-eme ka ọ pụta ìhè na ozizi Atọ n’Ime Otu abụghị echiche dị mfe. Kama nke ahụ, ọ bụ usoro ngwakọta echiche dị mgbagwoju anya ndị e wekọtaworo site n’ọtụtụ narị afọ, jikọtakwa ha n’ụzọ dị mgbagwoju anya. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta, gụnyere ndị na-ezi ozizi Atọ n’Ime Otu, kwetara na Bible enweghị ozizi Atọ n’Ime Otu n’ezie.—11/1, peji 21, 22.
◻ N’ihi gịnị ka 29 O.A. ji bụrụ afọ dị oké mkpa n’akụkọ ihe mere eme nke Bible nke ọha mmadụ nakweere?
N’ihi na site n’ijikọta ihe ndị e kwuru kpọmkwem n’ime Bible ha na oge e deturu n’akwụkwọ banyere ọchịchị Taịbiriọs, ndị mmụta Bible pụrụ ịgbakọta na ije ozi Jọn malitere n’oge opupu ihe ubi nke 29 O.A., na mgbe ọnwa isii gasịkwara, n’oge mgbụsị akwụkwọ osisi nke 29 O.A., Jọn mere Jisọs baptism.—11/15, peji 31.
◻ Gịnị ka “ofufe” pụtara nye ndị na-asụ asụsụ Hibru, oleekwa ụzọ o si metụta Ndịàmà Jehova n’oge a?
Okwu Hibru dịịrị okwu ahụ bụ “ofufe” bụ nke a pụrụ ịsụgharị ịbụ “ije ozi.” Ya mere, n’echiche ndị Hibru, ofufe pụtara ije ozi. Nke a bụ ihe ọ pụtara nye ndị Jehova taa, ya mere otu akara dị mkpa nke ezi okpukpe bụ ozi nsọpụrụ Chineke nke ikwusa ozi ọma.—12/1, peji 19.