Lezie Anya Maka Ndị Amụma Ụgha!
OTU di na nwunye bi na Brazil alakpuwo ụra n’abalị mgbe ha nụrụ ka ndị ohi na-awabata n’ebe obibi ha. Di na nwunye ahụ e menyere ụjọ gbalịrị isi na window ọnụ ụlọ ebe ha na-ehi ụra gbapụ gaa kpọọ ndị uwe ojii. Ma mgbe nke ahụ gasịrị, ahụmahụ ahụ kụjara nwunye ahụ uche nke ukwuu nke na ọ pụghị ihi ụra n’ụlọ ahụ, ọ dịkwa mkpa na ọ lara n’ụlọ nne ya.
Onye ọ bụla ndị ohi wabataworo n’ụlọ ya ma ọ bụ onye nke e zuworo ohi n’ụzọ ọ bụla ọzọ ga-aghọta nsogbu ya. Ahụmahụ dị otú ahụ pụrụ itigharị mmadụ uche, ọ bụkwa ihe mwute na ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ n’ụzọ dị otú a. Otú ọ dị, e nwere ụdị izu ohi nke na-enwe mmetụta ndị siri ike nke ukwuu ọbụna karị.
Gịnị bụ ụdị izu ohi nke a siri ike karị, oleekwa ndị bụ ndị ohi ahụ? Ka ọ na-ekwu banyere ụbọchị anyị, Jisọs Kraịst nyere anyị ihe ọmụma ụfọdụ banyere ya mgbe ọ sịrị: “Ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-ebilikwa, duhiekwa ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 24:11) Ndị amụma ụgha bụ ndị ohi. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Gịnị ka ha na-ezuru? E kekọtara izu ohi ha n’amụma ha na-ebu. Ya mere iji ghọta okwu ahụ n’ụzọ zuru ezu, ọ dị anyị mkpa ibu ụzọ mata ihe ibu amụma bụ n’ụzọ Bible si ele ihe anya.
Ihe Ibu Amụma Pụtara
Mgbe i chere echiche banyere ibu amụma, ma eleghị anya ihe mbụ na-abata gị n’uche bụ ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu. Nke a bụ n’ezie otu akụkụ nke ọrụ ndị amụma Chineke n’oge ochie, ma ọ bụghị ọrụ ha bụ isi. Dị ka ihe atụ, n’ọhụụ mgbe a gwara onye amụma bụ́ Ezikiel ka o “buoro ifufe amụma,” nanị ihe ọ ga-eme bụ inye iwu sitere n’ọnụ Chineke. (Ezikiel 37:9, 10) Mgbe a na-ekpe Jisọs ikpe n’ihu ndị nchụàjà, a gbụrụ ya asọ mmiri ma maa ya ụra, ndị na-akpagbu ya jikwa ịkwa emo sị: “Buoro anyị amụma, Kraịst: Ònye bụ onye ahụ nke tiri gị aka?” Ha adịghị agwa Jisọs ka o kwuo ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ha na-ama ya aka iji ike Chineke gosipụta ndị tiworo ya aka.—Matiu 26:67, 68.
N’eziokwu, echiche bụ isi okwu asụsụ ndị mbụ e ji dee Bible na-enye, bụ́ ndị a sụgharịrị ịbụ “buo amụma” ma ọ bụ “amụma” bụ́ n’ụzọ bụ isi ikwupụta uche Chineke banyere otu ihe ma ọ bụ, dị ka akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi si kwuo ya, ikwupụta “oké ọrụ nile nke Chineke.” (Ọrụ 2:11) Ọ bụ n’echiche nke a ka ndị amụma ụgha na-ezu ọtụtụ mmadụ ohi.
Otú ọ dị, olee ndị bụ ndị amụma ụgha, gịnịkwa ka ha na-ezuru? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị leghachi anya azụ n’akụkọ ihe mere eme nke mba Israel gaa n’oge Jeremaịa.