Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Fero ọ̀ lụrụ Sera n’ezie, bụ́ nwunye Abraham, dị ka o yiri site n’otú e si dee Jenesis 12:19 n’ụfọdụ nsụgharị Bible?
Ee e, e gbochiri Fero ịkpọrọ Sera (Seraị) dị ka nwunye ya. Otú a, e wetughị nsọpụrụ na ùgwù Sera n’ala.
A na-enyere anyị aka ịmata nke a site n’inyocha ọnọdụ gbara okwu ahụ gburugburu. Ụkọ nri kpaliri Abraham (Abram) ịchọ ebe mgbaba n’Ijipt ruo nwa oge. Ọ tụrụ egwu na ndụ ya ga-adị n’ihe ize ndụ n’ebe ahụ n’ihi nwunye ya mara mma ile anya, bụ́ Sera. Abraham enwetebeghị nwa nwoke site n’aka Sera, ya mere ọ bụrụ na o zute ọnwụ ya n’Ijipt, a ga-egbubi usoro ọmụmụ nke Mkpụrụ ahụ, bụ́ Mkpụrụ a ga-esite na ya gọzie ezinụlọ nile nke elu ala. (Jenesis 12:1-3) Ya mere Abraham gwara Sera ka ọ kọwaa onwe ya dị ka nwanne ya nwanyị, ebe ọ bụ n’ezie onye ya na ya sitere n’otu nna.—Jenesis 12:10-13; 20:12.
Ịtụ egwu ya abụghị ihe na-enweghị ntọala. Onye ọkà mmụta bụ́ August Knobel kọwara, sị: “Abram rịọrọ Seraị ka o gosi onwe ya dị ka nwanne ya nwanyị n’Ijipt ka e wee ghara igbu ya. Ọ bụrụ na e lere ya anya dị ka nwanyị lụworo di, onye Ijipt pụrụ nanị inweta ya site n’igbu di na onye nwe ya; ọ bụrụ na e lere ya anya dị ka nwanne nwanyị, ọ pụrụ ikwe omume isi n’ebe nwanne ya nwoke nọ nweta ya site n’ụzọ udo.”
Otú ọ dị, ndị eze Ijipt na Abraham abanyeghị ná nkwurịta okwu banyere Fero ịlụ Sera. Nanị ihe ha mere bụ ịkpọta Sera ahụ mara mma ile anya n’ime ụlọ Fero, onye ahụ na-achị Ijipt wee nye onye e chere na ọ bụ nwanne ya nwoke, bụ́ Abraham, onyinye. Ma mgbe nke a gasịrị, Jehova tiri ezinụlọ nke Fero ihe otiti dị iche iche. Mgbe e kpugheere Fero ihe bụ eziokwu n’ụzọ a na-emeghị ka anyị mara, ọ gwara Abraham, sị: “N’ihi gịnị mere i ji sị, ‘Ọ bụ nwanne m nwanyị,’ nke mere m ji chọọ ịkpọrọ ya dị ka nwunye m? Ugbu a lee nwunye gị. Kpọrọ ya laa!”—Jenesis 12:14-19, NW.
Nsụgharị The New English Bible na nsụgharị Bible ndị ọzọ sụgharịrị akụkụ amaokwu ahụ e dere n’ụdị dị iche n’elu “m wee kpọrọ ya dị ka nwunye m” ma ọ bụ jiri okwu ndị yiri nke a mee ihe. Ọ bụ ezie na ọ bụchaghị nsụgharị na-ezighị ezi, ụdị nsụgharị dị otú ahụ pụrụ inye nghọta na-egosi na Fero lụrụ Sera n’ezie, na alụmdi na nwunye ahụ bụ nnọọ ihe e mezuworo. A pụrụ ịrịba ama na na Jenesis 12:19, ngwaa Hibru e dere “ịkpọrọ” nọ n’ụdị ihe ka na-aga n’ihu, nke na-egosi ihe omume a na-emezubeghị. Nsụgharị New World Translation dere ngwaa Hibru a n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ndị gbara okwu ahụ gburugburu nakwa n’ụzọ ga-egosipụta ụdịdị ngwaa ahụ n’ụzọ pụtara ìhè—“nke mere m ji chọọ ịkpọrọ ya dị ka nwunye m.”a Ọ bụ ezie na Fero ‘chọrọ ịkpọrọ’ Sera dị ka nwunye ya, ọ ka emezubeghị ihe nile ma ọ bụ ememe ya na ya so.
A na-akatọkarị Abraham maka ụzọ o si chee okwu a ihu, ma o mere ihe n’ihi ọdịmma nke Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa nakwa nke ihe nile a kpọrọ mmadụ.—Jenesis 3:15; 22:17, 18; Ndị Galetia 3:16.
N’oge dịkwa ihe ize ndụ a pụrụ iji tụnyere nke a, Aịsak gwara nwunye ya bụ Rebeka ka o zere ikpughe na ya alụwo di. N’oge ahụ a mụwo nwa ha bụ Jekọb, onye usoro ọmụmụ nke Mkpụrụ ahụ ga-esite na ya bịa, o dokwara anya na ọ bụ nwa okorobịa. (Jenesis 25:20-27; 26:1-11) N’agbanyeghị nke ahụ, nzube kpaliri ụzọ akọ nke a kwụ ọtọ na nke Abraham pụrụ ịbụ otu ihe. N’oge e nwere ụkọ nri Aịsak na ezinụlọ ya bi n’ókèala nke eze ndị Filistia aha ya bụ Abimelek. Ọ bụrụ na ọ mata na Rebeka bụ nwunye Aịsak, Abimelek pụrụ iji usoro nke igbu ọchụ megide ndị ọzọ nile so n’ezinụlọ Aịsak mee ihe, nke pụrụ iwetara Jekọb ọnwụ. N’akụkụ nke a kwa, Jehova gbatara ọsọ enyemaka iji chebe ndị na-ejere ya ozi na usoro ọmụmụ nke Mkpụrụ ahụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nsụgharị nke si n’aka J. B. Rotherham gụrụ: “N’ihi gịnị mere i ji sị, Nwanne m nwanyị ka ọ bụ; m wee chọọ ịkpọrọ ya dị ka nwunye m?”