Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 3/15 p. 3-4
  • Ihe Alaeze Chineke Pụtara nye Ọtụtụ Ndị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Alaeze Chineke Pụtara nye Ọtụtụ Ndị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú E Siworo Lee Alaeze Ahụ Anya
  • Gịnị Mere I Ji Kwesị Ịma Gbasara Alaeze Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ndị Amụma Ụgha Taa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Alaeze Chineke
    Teta!—2013
  • Alaeze Chineke—Ị̀ Na-aghọta Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 3/15 p. 3-4

Ihe Alaeze Chineke Pụtara nye Ọtụtụ Ndị

JISỌS KRAỊST kwuru okwu ọtụtụ mgbe banyere Alaeze Chineke. Banyere nke a onye ọkọ akụkụ ihe mere eme bụ́ H. G. Wells dere, sị: “O kwesịrị ka a rịba ama oké iwu ewu nke Jisọs nyere ozizi nke ihe ọ kpọrọ Alaeze Eluigwe, na ihe a na-ejighị ya kpọrọ ma e jiri ya tụnyere usoro na ozizi nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na chọọchi dị iche iche nke ndị Kraịst. Ozizi nke Alaeze Eluigwe nke a, nke bụ ozizi bụ isi nke Jisọs, nakwa nke keere òkè dị nnọọ nta n’ime usoro ozizi ndị Kraịst, bụ n’ezie otu n’ime ozizi dị iche n’ụzọ bụ isi nke nọgidere na-akpali ma na-agbanwe echiche nke ndị mmadụ.”

Gịnị mere ndị chọọchị nile ji nwee ihe dị nta ha pụrụ ikwu banyere Alaeze Chineke? Otu ihe kpatara nke a pụrụ ịbụ na e jighị Alaeze ahụ n’aka. Olee echiche ndị e nweworo banyere ya?

Otú E Siworo Lee Alaeze Ahụ Anya

Ụfọdụ ahụwo Alaeze Chineke dị ka Chọọchị Katọlik. Mgbe ndị bishọp nabatasịrị Eze Alaeze Ukwu bụ́ Constantine dị ka onye isi ha ná Nzukọ nke Nicaea n’afọ 325 O.A., chọọchị ahụ banyere n’okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, e wee gwa ndị mmadụ na Alaeze ahụ abịaworị. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica kọwara na dị ka ozizi nkà okpukpe nke Augustine si dị (354-430 O.A.), “Alaeze Chineke amaliteworị n’ụwa nke a ná nguzobe nke chọọchị ahụ” na ọ “bụkwa ihe dị adị ugbu a na sakrament dị iche iche nke chọọchị ahụ.”

Ndị ọzọ na-ele Alaeze Chineke anya dị ka ihe mmadụ pụrụ imezu. Otu akwụkwọ ọkà ihe ọmụma ahụ kwukwara, sị: “Ndị chọọchị Protestant . . . n’oge na-adịghị anya ghọrọ ndị chọọchị ógbè, bụ nke bịanyụrụ olileanya nke ọgwụgwụ oge” banyere ọbịbịa nke Alaeze Chineke. H. G. Wells dere, sị: “Ndị mmadụ wepụrụ ihe ka mkpa ná ndụ ha site na alaeze Chineke na òtù ụmụnna nke ihe a kpọrọ mmadụ gaa n’ihe ndị yiri ihe a na-ahụ anya, bụ́ France na England, Russia dị Nsọ, Spain, Prussia . . . Ha bụ chi ndị dị adị n’ezie nọ na-arụ ọrụ nke Europe.”

N’oge a kwa, e mewo ka Alaeze ahụ bụrụ ihe na-emetụtaghị okpukpe. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica kọwara: “Ihe ndị e ji mara mmadụ bụ àgwà bụ isi nke bụ na mmadụ n’onwe ya ga-akwadebe ọha mmadụ zuru òkè nke ọdịnihu n’ụzọ ahaziri ma mee nke ọma nakwa na ‘olileanya’ na ‘nchere’ bụ nke a ga-eji nchepụta mmadụ dochie.” Banyere “òtù Iso Ụzọ Kraịst nke ndị nọ n’America,” otu akwụkwọ ahụ gara n’ihu na-ekwu, sị: “Òtù a lere ozi ndị Kraịst nke Alaeze Chineke anya dị ka nanị ihe na-akpasu nhazigharị nke ọnọdụ ọha mmadụ nke na-emetụta okpukpe n’echiche nke ụkpụrụ omume ọma nke Alaeze Chineke.”

Ọtụtụ ndị Juu lekwara Alaeze ahụ anya dị ka ihe mmadụ pụrụ imezu. Na 1937, nnọkọ nke ndị rabaị nke Mgbanwe Usoro Okpukpe ndị Juu na Columbus, Ohio, U.S.A., kwuru, sị: “Anyị weere ya dị ka ọrụ dị mkpa anyị nwere isonyere mmadụ nile n’iguzobe Alaeze Chineke, òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ, ikpe ziri ezi, eziokwu na udo n’elu ala. Nke a bụ ihe mgbaru ọzọ mesaịa anyị.”

Echiche ọzọ a na-enwe n’ebe nile bụ na Alaeze Chineke bụ ọnọdụ nke obi onwe onye. Dị ka ihe atụ, na United States, okpukpe Southern Baptist Convention nke 1925 kwupụtara, sị: “Alaeze Chineke bụ ọchịchị nke Chineke na-achị n’obi na ná ndụ nke mmadụ ná mmekọrịta nke mmadụ na ibe ya, nakwa n’ụdị ọ bụla na òtù nke ọha mmadụ a haziri ahazi. . . . Alaeze Chineke ga-ezu òkè mgbe a dọtara echiche ọ bụla na uche mmadụ ọ bụla n’agha nye uche nke Kraịst.”

Ya mere, ugbu a, chọọchị ahụ ọ̀ bụ Alaeze Chineke? À ga-esi n’ụzọ n’abụghị nke okpukpe weta Alaeze ahụ? Ọ̀ bụ ọnọdụ nke obi? Gịnịkwa ka Alaeze Chineke pụrụ ịpụta nye gị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya