“Ị Bọọla Chi! Ị̀ Maara Ihe Aha Chineke Bụ?”
N’ALAKA ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova dị na Brazil, a natara akwụkwọ ozi na-esonu site n’aka ụmụ ejima ndị inyom abụọ dị afọ 12 n’obodo ukwu bụ́ Fortaleza:
“Laa azụ na 1990 mgbe anyị nọ na klasị nke ise, ụlọ akwụkwọ anyị haziri nnọkọ ngosi ihe omume nke ihe ọmụmụ sayensi, nke nkà, na nke ihe ọdịbendi. Anyị kọwaara onye nkụzi ahụ na anyị chọrọ ka ihe anyị ga-egosi dịrị iche site n’ihe ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ na-eme atụmatụ ịkwadebe. Ebe ọ bụ na ọ nụwo ka anyị na-ekwu okwu banyere Jehova na Bible ná mbụ, ọ tụrụ aro, sị: ‘Mgbe ahụ unu pụrụ ide banyere Chineke unu!’
“Anyị hụrụ nke a dị ka ohere nke ịgba àmà, anyị wee kpebie ịhazi ihe ngosi nke akwụkwọ Bible nke lekwasịrị anya n’aha Jehova. Anyị kwadebere ndepụta gbara okpotokpo nke okwu ndị ahụ dị n’Abụ Ọma 83:18 wee nyakodo ya n’ihe osise nke Bible a sapere asape. Ọzọkwa, anyị dokwasịrị n’elu otu table nsụgharị dị iche iche nke Bible ndị nwere aha ahụ bụ́ Jehova. N’elu otu table ahụ, anyị dosachara ụdị dị iche iche nke akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Ná ngwụsị nke table, anyị guzobere otu ígwè VCR na TV iji gosi ndị bịara abịa otu ihe atụ nke ebe e jiri aha Jehova mee ihe n’ihe nkiri a ma ama nke ukwuu.
“N’oge ememe ihe ngosi ahụ, mgbe mmadụ bịara na table anyị, anyị ga-asị: ‘Ị bọọla chị! Ị̀ maara ihe aha Chineke bụ?’ Mgbe anyị nyesịrị onye ọbịa ahụ ohere nke ikwu okwu, anyị gara n’ihu: ‘Lee anya n’ebe a! Ọtụtụ nsụgharị Bible na-egosi na aha ya bụ Jehova,’ na-ezo aka n’aha ahụ na Bible dị iche iche, dị ka nke João Ferreira de Almeida, The Jerusalem Bible, na New World Translation. Mgbe ahụ anyị kpọrọ akụkụ ebe onye bụ isi n’ihe nkiri ahụ na-eme ka Jehova pụta ìhè dị ka aha Chineke. Mgbe ndị mmadụ gosiri mmasị, anyị na-enye ha magazin ma ọ bụ traktị nke nwekwuru ihe ọmụma.
“Otu n’ime ndị ntorobịa bịara na table anyị jụrụ maka akwụkwọ ahụ bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Work. Onye nkụzi anyị nyochara akwụkwọ ahụ bụ́ Ime Ka Ndu Ezi-na-ulọ Gị Nwe Obi-utọ wee tie mkpu, sị: ‘Chei! Lee akwụkwọ na-adọrọ mmasị nke a bụ!’ Ná ngwụsị nke ihe omume ihe ngosi ahụ, anyị etinyewo 7 akwụkwọ dị iche iche, 18 traktị, na 67 magazin. E nyere anyị ọnọdụ nke atọ n’ihe omume ihe ngosi ahụ. Ma karịsịa ihe nile, obi tọrọ anyị ụtọ nke ukwuu maka ihe ùgwù nke ime ka a mara aha Chineke, bụ́ Jehova.”