Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 5/1 p. 4-7
  • Bible—Ihe Nduzi Dị Irè Maka Mmadụ Oge A

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Bible—Ihe Nduzi Dị Irè Maka Mmadụ Oge A
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chekwaa Amamihe Dị Irè
  • Akwụkwọ Dị Irè Maka Ibi Ndụ n’Oge A
    Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
  • Ị Pụrụ Ịnagide Nsogbu Nile nke Ndụ
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • A Pụrụ Ịnagide Nrụgide!
    Teta!—1998
  • Ị Pụrụ Ịmụta Ịchịkwa Nchegbu!
    Teta!—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 5/1 p. 4-7

Bible—Ihe Nduzi Dị Irè Maka Mmadụ Oge A

“Ihe nile dị n’akwụkwọ nsọ sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, a pụkwara iji ha mee ihe n’ụzọ dị uru . . . maka iduzi ndụ ndị mmadụ.”​—⁠2 Timoti 3:16, “The Jerusalem Bible.”

AKỤKỤ akwụkwọ nsọ nke a na-akọwa ihe bụ isi mere Bible ji dị irè maka ụbọchị anyị. O sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke. Ebe ọ bụ Chineke kere anyị, ọ dịghị onye maara banyere ahụ anyị, uche anyị, mmetụta anyị, na mkpa anyị nile karịa ka ọ maara. Eze Israel bụ Devid nwere mgbe o kwuru banyere Jehova Chineke, sị: “Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ ka-ezughị okè, ọ bụkwa n’akwụkwọ gị ka e dere ihe nile dị m n’ahụ.” (Abụ Ọma 139:16) Ọ bụrụ na Onye Okike anyị maara ihe a nile banyere anyị, mgbe ahụ ọ ghaghị ịbụ ihe ezi uche dị na ya na ndụmọdụ na okwu ndụmọdụ ya nile banyere otú anyị pụrụ isi nwee obi ụtọ na ihe ịga nke ọma ná ndụ ruru eru ka a tụlee ha.

Ahụmahụ egosiwo na ụkpụrụ nile nke Bible dị irè, bụrụkwa nke a pụrụ iji mee ihe n’oge anyị. Ha na-agakwa n’okwu kpọmkwem. Ihe na-esonụ bụ ihe atụ anọ ndị na-egosi ịdị irè Bible ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị.

Mmekọrịta Ụmụ Mmadụ na Akparamagwa Onwe Onye: Bible na-akwalite ezi usoro ọma nke àgwà onwe onye ndị pụrụ iduga n’ahụ ike, iso ndị ọzọ nwee mmekọrịta na-aga nke ọma. Dị ka ihe atụ, e nyere mba Israel iwu, sị: “Abọla ọ́bọ̀, edebekwala iwe . . . ma hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị.” (Levitikọs 19:18) Ọ bụ ezie na anyị anọghị n’okpuru iwu Israel, ịgbaso ụkpụrụ ya nile nke Bible pụrụ inyere anyị aka iso mmadụ ibe anyị dịrị n’udo. Dị ka ihe atụ, cheedị echiche ọtụtụ nsogbu a pụrụ ịgwọta ma ọ bụrụ na onye ọ bụla na-anwa ịzụlite àgwà ime mmụọ ndị a na-achọta ná Ndị Galetia 5:​22, 23: “Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè: ọ dịghị iwu na-emegide ihe nile dị otú a.”​—⁠Tụlee Ndị Rom 8:​5, 6.

Ọ bụ ihe mwute na mgbe nrụgide nile nke ndụ rịrị elu, ahụ erughị ala na iwe na-ebilite. N’ọnọdụ ndị dị otú a, itinye okwu ịdọ aka ná ntị ndị a na-achọta n’Ilu 29:11 pụrụ ịzọpụta anyị site n’ọtụtụ nsogbu: “Mmụọ nile nke onwe ya ka onye nzuzu na-eme ka ọ pụta ìhè: ma onye maara ihe na-egbochi mmụọ ya, na-emekwa ka ọ dajụọ.”​—⁠Tụlee Ilu 15:1; Matiu 7:12; Ndị Kọlọsi 3:​12-⁠14.

Okwu ndụmọdụ ọma​—⁠ma ọ̀ na-arụ ọrụ ná ndụ n’ezie? Were ọnọdụ nke otu nwoke na France dị ka ihe atụ, bụ́ onye nwere nsogbu siri ike n’ihi mmụọ ya. Ọtụtụ ugbo a na-apụghị ịgụta ọnụ ọ na-adabanye ná nsogbu, ọbụna gaa mkpọrọ, n’ihi itinye aka n’oké ise okwu. Ya ịbụ ọkà n’iti ọkpọ enyeghị aka. N’otu oge esemokwu bilitere n’etiti nwoke a na nna ya. Tupu ọ mara ihe na-eme, o jiwo otu ọkpọ kụtuo nna ya n’ala. Oké nkewa bilitere ná mmekọrịta ha.

Mgbe oge na-aga, nwoke a zutere Ndịàmà Jehova wee malite ịmụta ụkpụrụ dị iche iche nke Bible. Nke a kwaliri ya ileru ụzọ o si eduzi onwe ya n’ebe ndị ọzọ nọ anya. Site n’oké mgbalị akparamagwa onwe onye ya malitere ịgbanwe, ọ ghọwanyere onye udo. Mgbe ahụ, n’otu ụbọchị, nwoke ahụ laghachikwuru nna ya iji kpee udo. Mgbanwe ndị nwa ya nwoke meworo masịrị nna ya nke ukwuu nke na e dozighachiri mmekọrịta ha.

Nke a bụ otu n’ime ọtụtụ ihe atụ ndị na-agba akaebe maka eziokwu nke okwu ndị Pọl onyeozi kwuru: “N’ihi na okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ọ bụla nke nwere ihu abụọ, na-adụkwa ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, ma nkwonkwo ma ụmị, bụrụkwa ihe nwere ike ịtụpụta echiche na izu nile nke obi.”​—⁠Ndị Hibru 4:12.

Ndụ Ezinụlọ: Ezinụlọ gị ọ̀ bụ nke obi ụtọ? Ọtụtụ ezinụlọ abụghị. “Na a na-eyi ndụ ezinụlọ egwu dị ka otu njikọ bụ ihe doro anya ugbu a,” ka The Natal Witness, akwụkwọ akụkọ South Africa, na-ekwu, na-ekwukwa na “a na-amụnye ụmụ nke taa n’ọnọdụ mgbanwe nke ọha mmadụ.”

Otú ọ dị, Bible jubigara ókè n’okwu ndụmọdụ ndị dị irè bụ́ ndị a haziri iji nyere ezinụlọ aka inwe ihe ịga nke ọma ọbụna mgbe nsogbu bilitere. Banyere ọrụ onye bụ di, dị ka ihe atụ, Bible na-asị: “Ndị bụ di jikwa ụgwọ ịhụ nwunye nke aka ha n’anya dị ka ha hụrụ ahụ nke onwe ha n’anya.” Mgbe ndị bụ di na-emezu ihe nke a a chọrọ ha n’aka, ọ na-abụrụ ndị nwunye ha ihe obi ụtọ ịzaghachi nke ọma site n’ịdị “na-atụ egwu di ya.” (Ndị Efesọs 5:​25-29, 33) E kwuru banyere mmekọrịta n’etiti ndị nne na nna na ụmụ ha ná Ndị Efesọs 6:4: “Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” Nke a kwa na-eme ka e nwee ọnọdụ ezinụlọ nke na-eme ka ọ dịrị ụmụaka mfe ịgbaso ihe Bible nyere n’iwu wee na-erubere ndị mụrụ ha isi.​—⁠Ndị Efesọs 6:1.

Ihe dị n’elu bụ nanị ụfọdụ n’ime okwu ndị Bible kwuru banyere ndụ ezinụlọ. Site n’ịnakwere nduzi Chineke, ọtụtụ achọtawo ihe ịga nke ọma ma na-enwe obi ụtọ n’ebe obibi ha. Edward, nna nke ụmụ abụọ, na-akọwa uru ndị o nwetara site n’itinye ụkpụrụ dị iche iche nke Bible n’ọrụ. “Alụmdi na nwunye m na-adakpọ,” ka ọ na-echetaghachi. “Enweghị m oge iso ụmụ m nwee mmekọrịta bara uru. Nanị ihe jikọtara anyị ọnụ bụ anyị itinye n’ọrụ ihe Bible kwuru maka ndụ ezinụlọ.”​—⁠Ilu 13:24; 24:3; Ndị Kọlọsi 3:18-⁠21; 1 Pita 3:​1-⁠7.

Ahụ Ike nke Uche, Anụ Ahụ, na Mmetụta Uche: Nnyocha egosiwo na ruo n’ókè ụfọdụ, e jikọtara ahụ ike anụ ahụ mmadụ na ọnọdụ ahụ ike uche na mmetụta uche ya. “Ihe mgbaàmà ndị a na-ahụkarị nke nrụgide,” ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu, “gụnyere ịrị elu n’ịkụ akụ nke obi, ọ̀tụ̀tụ̀ nrugharị ọbara dị elu karị, uru ahụ ikwetị ekwetị, nkụda mmụọ n’uche, na enweghị ike ịtụkwasị uche n’ihe.” Otú ọ dị, ụfọdụ kwenyere na iṅomi ime ihe ike bụ otu ụzọ isi belata nrụgide. “Iti ọkpọ pụrụ ịbụ oké ihe na-ebelata nrụgide,” ka The Star, akwụkwọ akụkọ South Africa, na-eme nzọrọ ya. O hotara okwu ndị nke Jannie Claasens, ọkachamara maka mmega ahụ, bụ́: “Ọ bụrụ na nwanyị enwewo ụbọchị jupụtara n’ihe nkụda obi, ọ pụrụ ibelata ahụ erughị ala ya site n’iti akpa ọkpọ ihe.”

Otú ọ dị, ọ̀ bụ na ọ gaghị aka mma nke ukwuu ịmụta ịchịkwa isi ihe ndị na-akpata nkụda obi? N’akwụkwọ bụ́ Stress​—⁠The Modern Scourge, Dr. Michael Slutzkin na-ekwu na “ịmata nrụgide . . . dị mkpa, n’ihi na a pụrụ idozi ọtụtụ n’ime ihe ndị na-akpata ya.” O kwukwara na “ịchịkwa nrụgide . . . pụrụ ọbụna ịkwalite usoro ngwọta n’ọtụtụ ọnọdụ dị iche iche.”

Bible na-akọwa otu ụzọ dị nnọọ irè a pụrụ isi chịkwaa nrụgide. “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla . . . meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:​6, 7) Ịchịkwa nrụgide n’ụzọ a nwere ọtụtụ abamuru​—⁠ọbụna n’anụ ahụ. Otu ilu Bible tinyere ya n’ụzọ dị otú a: “Ndụ nke anụ ahụ ka obi a gwọrọ ọrịa ya bụ.” (Ilu 14:30) Ilu ọzọ na-ekwu, sị: “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ dị mma: ma mmụọ mmadụ nke e tigburu etigbu na-amịkọ ọkpụkpụ.”​—⁠Ilu 17:22.

Ná mgbalị ịgbanarị nrụgide, ọtụtụ na-adabere n’ụtaba, ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, ọgwụ ọjọọ. E nwere ezi ihe ndekọ nke mbibi ihe iri ahụ dị otú ahụ na-akpata. Ma Bible anọwo mgbe nile na-akpọsa ịdị ọcha pụọ ná “mmerụ nile nke ahụ.” (2 Ndị Kọrint 7:1; tụlee Ilu 23:​29-⁠35.) N’ezie, izere omume ndị ahụ na-emerụ ahụ bụ ihe nchebe dị irè n’ụwa nke taa.

Ọrụ, Ego, na Ịkwụwa Aka Ọtọ: Umengwu adịghị abara mmadụ uru. “N’ihi na ọ bụ mgbe oyi na-atụ, onye umengwụ agaghị arụ ọrụ ubi; ọ ga-arịọ arịrịọ na mgbe owuwe ihu ubi, ọ dịghịkwa ihe ọ ga-enwe,” ka Ilu 20:4 na-ekwu. Ịrụsi ọrụ ike, n’aka nke ọzọ, na-enyeghachi ụgwọ ọrụ. “Ka onye na-ezu ohi ghara izukwa ohi ọzọ,” ka Ndị Efesọs 4:28 na-ekwu. Akụkụ akwụkwọ nsọ nke a na-agbakwụnye na ọ ka mma nke ukwuu ka mmadụ “dọgbuo onwe ya n’ọrụ, na-eji aka ya abụọ rụọ ezi ihe, ka o wee nwee ihe ya na onye nọ ná mkpa ga-eketa.”​—⁠Tụlee Ilu 13:4.

Ị̀ maara na a pụrụ itinye ụkpụrụ dị iche iche nke Bible n’ọrụ ọbụna ná mmekọrịta ndị e nwere n’ebe a na-arụ ọrụ? Ndị ọrụ, dị ka “ndị ohu” n’oge Bible, ga-eme nke ọma ịdị ‘na-aṅa ndị nwe ha ntị n’ụzọ anụ ahụ n’ihe nile.’ Ndị isi ọrụ, ma ọ bụ “ndị nwe mmadụ,” n’aka nke ọzọ, kwesịrị ịdị ‘na-enyekwa ndị ha were n’ọrụ ihe ziri ezi na nke hà nhata.’​—⁠Kọlọsi 3:22-⁠24; 4:1; tụlee 1 Pita 2:​18-⁠20.

E kwuru ihe dị ukwuu na Bible banyere ịkwụwa aka ọtọ n’ihe a na-eme n’azụmahịa. Ọ bụ ezie na n’ụzọ dị mwute, a dịghị ahụ ya taa, a na-ahụtakarị ịkwụwa aka ọtọ ma na-enwekwa ekele maka ya dị ka àgwà a na-achọsi ike. Nke a bụ ihe Bible na-emesi ike. N’otu oge Jisọs sịrị: “Onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi n’ihe dịkarịsịrị nta kwesịkwara ka a tụkwasị ya obi n’oké ihe; onye bụkwa onye ajọ omume n’ihe dịkarịsịrị nta bụkwa onye ajọ omume n’oké ihe.”​—⁠Luk 16:10; tụlee Ilu 20:10; 22:22, 23; Luk 6:31.

N’otu mba dị n’Africa, ụlọ ọrụ diamond bụ ebe a na-enwekarị oké izu ohi na omume rụrụ arụ. E kpebiri itinye onye ọzọ n’isi. A gwara ndị minista gọọmenti ka ha tinye aha ndị ha chere ga-ekwesị ekwesị maka ọkwá ahụ. Mgbe ndị nhazi ọrụ zukọrọ ime mkpebi, a kagburu aha ndị ahụ otu otu, karịsịa n’ihi omume rụrụ arụ. N’ikpeazụ, ha rutere n’aha ikpeazụ dị ná ndepụta ahụ​—⁠onye isi ala tinyere aha ya.

“Ma o soghị n’òtù ndọrọ ọchịchị ahụ!” ka otu onye minista rụrụ ụka.

Onye isi ala ahụ zaghachiri na nke a abụghị ọkwá ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

“Ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova,” ka onye ọzọ kwuru.

“Ọ bụ ya mere a ga-eji nye ya ọrụ ahụ,” ka onye isi ala kwuru. O kwukwara, sị: “Anyị maara na ha na-akwụwa aka, ọtọ, nke a bụkwa ụdị onye dị anyị mkpa. Anyị maara na anyị pụrụ ịtụkwasị ya obi.”

Ee, ọtụtụ mgbe ndị na-etinye ụkpụrụ nile nke Bible n’ọrụ na-ahụ na nke a na-etinye ha n’ọnọdụ ka mma ọbụna n’ụwa nke taa.

Chekwaa Amamihe Dị Irè

Anyị atụlewo nanị ihe atụ dị nta nke ihe ọ pụtara ‘ịchọta ihe ọmụma Chineke.’ (Ilu 2:​1-⁠9) A na-achọta ụba nke okwu ndụmọdụ dị irè, metụta oge a n’ime Bible. Ụkpụrụ ndị metụtara ịdị ọcha, ịrụsi ọrụ ike, nkwurịta okwu, mmekọahụ, ịgba alụkwaghịm, ịkwụ taks, ịhụ maka ọdịiche n’ụdị mmadụ, na ịnagide ịda ogbenye bụ nanị ụfọdụ nke akụkụ dị iche iche nke ndụ Bible kwuru banyere ha. Ọtụtụ nde mmadụ ga-agba akaebe na ọdịiche dị n’etiti ihe ịga nke ọma na ọdịda ná ndụ ha adaberewo n’ókè ha tinyeworo ụkpụrụ nile nke Bible n’ọrụ.

Ọ bụ ezie na e ji ịdị irè ugbu a nke Bible n’aka, ọ na-esetịpụkwa ọtụtụ uru ndị na-adịte anya. Dị ka ihe atụ, Bible na-ekwe nkwa na a ga-agwọta isi ihe ndị na-akpata ihe mgbu na ahụhụ n’ụwa taa site na Chineke itinye aka.​—⁠Daniel 2:44; 2 Pita 3:​11-⁠13; Mkpughe 21:​1-⁠5.

Ya mere, anyị na-agba gị ume ịmụta ihe dị ukwuu dị ka i nwere ike banyere Bible. Ọ bụrụ na ọ dịghị nke i nwere, hụ na i nwetara otu. Ndị na-ebipụta magazin a ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka. Dị nnọọ ka ọtụtụ ndị ọzọ riteworo uru site n’itinye aro ndị dị irè sitere na Bible n’ọrụ, a pụrụ inyekwara gị onwe gị aka ịghọta uru nke Okwu Chineke, ma ugbu a ma n’ọdịnihu.

[Foto dị na peeji nke 7]

Bible bụ ihe nduzi dị irè n’ime ka e nwee ndụ ezinụlọ obi ụtọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya