Bible Ọ̀ Dị Anyị Mkpa?
OXANA, otu nwa agbọghọ bụ onye Russia, nwere obi ụtọ mgbe ọ hụrụ otu Bible onye ahịa mbugharị na-ere na Moscow. Onye ya na ya so bụ́ John, onye si mba ebe onye ọ bụla pụrụ inweta Bible, nwere ijuanya n’ihi oké obi ụtọ Oxana. “Mụ—onye na-ekwenyeghị na Chineke—chọrọ ịzụtara ya ya,” ka o kwetara. Ọ bụ ezie na na mbụ Oxana jụrụ, o mesịrị nakwere onyinye John.
Ọtụtụ, dị ka Oxana, nwere ọchịchọ siri ike inweta Bible. Nke a bụ eziokwu karịsịa ná mba ebe ndị e gbochiworo ya ruo ọtụtụ afọ. Dị ka ihe atụ, ndị na-ebipụta magazin nke a na-arụsi ọrụ ike ịhụ maka ọnụ ọgụgụ Bible a chọrọ ná mba ndị nwerewooro onwe ha nke Soviet oge mbụ, nakwa n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa. Na nke mbụ ya, ọtụtụ mmadụ n’ebe ndị a nwere ohere ime nnyocha Bible kwesịrị ekwesị—ozi ya dị ike na-adọrọkwa ọtụtụ mmadụ.
Ndị Nkatọ na Ndị Na-arụ Ụka
N’aka nke ọzọ, karịsịa n’ebe ugwu Europe, a kpapụwo Bible n’ụsọ hapụ ya n’elu ebe ndebe akwụkwọ ka uzuzu kochie ya. “Akụkọ mgbe ochie!” ka ụfọdụ na-ekwu, na-agbakwụnye, “E dere ya maka ọgbọ ọzọ. Ọ dịghị ihe jikọrọ ya na mmadụ nke oge a.” Ọbụna ndị ụkọchukwu a ma ama ekwuwo n’ihu ọha okwu ndị na-akatọ Bible. The Star, akwụkwọ akụkọ ndị South Africa, kọrọ na achịbishọp ndị Anglikan bụ Desmond Tutu ekwuwo, sị: “E nwere akụkụ ụfọdụ nke Bible ndị uru ha bara na-adịghị adịgide adịgide.” Okwu ndị dị otú a emewo ka ọtụtụ mmadụ jụọ banyere ókè hà aṅaa ha ga-eji Bible kpọrọ ihe.
Mkpa Maka Nduzi
Ma ndị nkatọ ma ndị kwere ekwe aghaghị ikwenye na, karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ụwa nwere mkpa maka ihe ngwọta ndị dị irè. “Ọ gwụla ma mmadụ amụtara ngwa ngwa ịchịkwa ọ̀tụ̀tụ̀ mgbanwe n’ihe omume ndị nke onwe ya na ndị nke ọha mmadụ n’ozuzu ya,” ka Alvin Toffler kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Future Shock, “anyị na-eche ihu n’oké . . . ndakpọ.” E nyere ịdọ aka ná ntị ahụ ihe karịrị 20 afọ gara aga. O yiri ka ndakpọ Toffler kwuru okwu ya a na-eme kpọmkwem ugbu a.
Ka narị afọ a na-eru ọgwụgwụ nso, ọganihu nka na ụzụ na nkà ihe ọmụma mmadụ adawo ada n’ime ka ụwa guzosie ike. Olileanya ndị e nwere n’oge na-adịbeghị anya gara aga maka ndokwa ụwa ọhụrụ emeghewo ụzọ maka ndakpọ olileanya, e mewokwa ka ndụ ọtụtụ ndị bụrụ nanị ịgba mgba kwa ụbọchị maka nlanarị.
Ngụkọ ndị e nwere na-egosi na nkewa ọnọdụ akụ na ụba n’etiti ndị ọgaranya na ndị ogbenye aghọwo oké olulu. Ihe ọmụmụ e mere n’isi nso na-egosi na 82.7 pasent nke akụ e nwere n’ụwa dị n’aka nanị 20 pasent nke ndị bi na ya. Ọ̀ bụ ihe ijuanya na agha, ụkọ nri, ọrịa, ngagharị iwe, na agbasoghị usoro jupụtara n’ọtụtụ mba? Nrụgide iji nagide ọdịdị ndụ nke na-adakpọ adakpọ na-akpata oké ndọlị n’ọnọdụ mmetụta uche ndị mmadụ. N’ihi ya, ọbụna njikọ bụ isi karịsịa nke ọha mmadụ, bụ́ ezinụlọ, na-erekasị.
Ọ bụ ezie na ọtụtụ, dị ka Toffler, na-atụ aro na ọ bụ ibu ọrụ dịịrị mmadụ “ịchọpụta ụzọ ndị dịwaga nnọọ ọhụrụ iji jikwata onwe ya,” ihe àmà na-egosi na ụmụ mmadụ enweghị ike inweta ihe ngwọta ndị nke onwe ha.
Nhọrọ E Nwere Nanị Ya
Bible Nsọ, nke a malitere ide ihe dị ka 3,500 afọ gara aga, agbanwebeghị n’ọtụtụ narị afọ na-agafenụ. Ụkpụrụ ya nile nọgidere na-abụ otu ihe ahụ. Dị ka ihe atụ, egosiwo na okwu ndị dị na Jeremaịa 10:23 bụ eziokwu taa karịa mgbe ọ bụla ọzọ: “Ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ enweghị ike ịgbaziri onwe ha ụzọ, ònye pụrụ? Bible na-arụtụ aka n’Isi Iyi e nwere nanị ya maka ezi nduzi: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.”—Aịsaịa 48:17.
Na peji nile nke Bible, Jehova Chineke na-akụziri anyị inyere onwe anyị aka. O jupụtara n’okwu ndụmọdụ ndị na-egosi anyị ụzọ anyị ga-ejeso. Ndụmọdụ ya metụtara oge a nke ukwuu dị ka ọ dị mgbe e dere ya. Isiokwu nke na-eso ga-atụle ịdị irè nke Bibile nye ọgbọ anyị nke dị ugbu a. N’okwu dị iche iche, malite n’ahụ ike ruo akụ na ụba, ndụ ezinụlọ, na akparamagwa onwe onye, ị ga-enwe ike ịhụ na Bible bụ n’ezie oké nkume nke ịkwụrụsi ike n’ájá na-echigharị echigharị nke ụwa taa.
[Foto dị na peeji nke 4]
Bible bụ arịlịka nke ịkwụrụsi ike n’ụwa nke taa nọ n’ọgba aghara