Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 6/1 p. 19-22
  • Gịnị Ka Ọ Na-ewe Iji Mee Gị Obi Ụtọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Ọ Na-ewe Iji Mee Gị Obi Ụtọ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Na-ahụ Ọlaọcha n’Anya Bụ́ Ndị Na-enweghị Afọ Ojuju
  • A Pụrụ Inweta Obi Ụtọ ma Ọ̀ Bụ n’Ụzọ Dị Aṅaa?
  • Ịghọta Mkpa Ime Mmụọ
  • Ịtụkwasị Jehova Obi
  • Ịnakwere Ịba Mba Chineke
  • Ịdị Ọcha na Ịdị Na-ahụ Udo n’Anya
  • Inwe Ntachi Obi
  • Ịchọta Obi Ụtọ Ugbu A na Ruo Ebighị Ebi
  • Ezi Obi Ụtọ n’Ijere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Otú E Si Enweta Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Na-efe “Chineke Bụ́ Onye Obi Ụtọ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Akụ̀ na Ụba Ọ̀ Pụrụ Ime Gị Obi Ụtọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 6/1 p. 19-22

Gịnị Ka Ọ Na-ewe Iji Mee Gị Obi Ụtọ?

NDỊ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị mmadụ họpụtara na-agbalịsi ike ime ndị dị otú ahụ obi ụtọ. E kwuwerị, ọrụ ha dabeere na ya. Ma otu akwụkwọ akụkọ kwuru banyere “ndị nhọpụta a na-emezughị ihe ha tụrụ anya ya nọ n’obi ilu na ndị a kpapụrụ iche” na Poland. Otu onye odeakụkọ kọwara na United States bụ ọha mmadụ “jupụtara n’enweghị ntụkwasị obi n’ebe ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị.” Onye ọzọ na-ede akwụkwọ na-agwa anyị banyere “enweghị mmasị na-arị elu ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị na France.” Enweghị mmasị na afọ ojuju dị otú ahụ n’ebe nile​—⁠nke a na-akparaghị ókè ma ọlị ná mba atọ ndị a⁠—​na-egosi na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ada ada ná mgbalị ha ime ndị mmadụ obi ụtọ.

Ndị ndú okpukpe na-ekwekwa nkwa obi ụtọ, ma ọ bụghị ná ndụ a, ọ bụrụ na nke ọdịnihu ma ọ dịghị ihe ọzọ. Ha gbadoro ụkwụ n’echiche nke na ụmụ mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ ma ọ bụ na-enwogha enwogha kwuo nke a, bụ́ echiche nke ọtụtụ ndị na-ajụ, n’ihi ihe dị iche iche, Bible na-ekwugidekwa ya n’ụzọ doro anya. Chọọchị ndị tọgbọ nkịtị na ọnụ ọgụgụ ndị òtù nke na-ebelata ebelata na-egosi na ọtụtụ nde mmadụ adịkwaghị ele okpukpe anya dị ka ihe dị oké mkpa maka obi ụtọ.​—⁠Tụlee Jenesis 2:​7, 17; Ezikiel 18:​4, 20.

Ndị Na-ahụ Ọlaọcha n’Anya Bụ́ Ndị Na-enweghị Afọ Ojuju

Ma ọ bụghị ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’okpukpe, olee ebe a ga-achọta obi ụtọ? Ma eleghị anya n’ógbè azụmahịa? Ọ na-emekwa nzọrọ inwe ike inye obi ụtọ. Ọ na-eme nzọrọ ya site n’usoro mkpọsa azụmahịa, na-eji ọtụtụ okwu na-ekwu, sị: Obi ụtọ na-abịa site n’inwe ngwongwo nile a na-ahụ anya na usoro ije ozi ndị ego pụrụ ịzụta.

Ọnụ ọgụgụ ndị na-achọ inweta obi ụtọ n’ụzọ dị otú a yiri ka ọ na-arị elu. A kọrọ n’ọtụtụ afọ gara aga na ọkara ezinụlọ nile na Germany nọ n’oké ụgwọ. Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere akwụkwọ akụkọ Germany a ma ama bụ́ Die Zeit ji buo amụma na “ọtụtụ [n’ime ndị a] enweghị olileanya ọ bụla isi n’ụgwọ pụta.” Ọ kọwara, sị: “Ọ dị nnọọ mfe ịdọrọ ego gabiga okere ndị ụlọ akụ na-enyekarị​—⁠o sikwara oké ike isepụta isi gị n’ọnyà ahụ.”

Ọnọdụ dị ná mba ndị ọzọ bara oké ọgaranya dịkwa otú ahụ. Afọ ole na ole gara aga, David Caplovitz, bụ́ ọkà n’ihe banyere mmekọrịta ọha mmadụ na mahadum City University of New York, mere atụmatụ na n’ime United States, bido 20 nde ruo 25 nde ezinụlọ nọ n’oké ụgwọ. “O rikpuwo ndị mmadụ,” ka o kwuru, “ọ na-ebibikwa ndụ ha.”

Nke ahụ adịghị nnọọ ada ka obi ụtọ! Ma ànyị kwesịrị ịtụ anya na ụwa nke azụmahịa ga-enwe ike imezu ihe o doro anya na abụọ ndị nke ọzọ ahụ (ndọrọ ndọrọ ọchịchị na okpukpe) enweghị ike imezu? Eze Solomọn bara ọgaranya dị mgbe o dere, sị: “Onye na-ahụ ego n’anya, ego agaghị eju ya afọ; ọzọ, onye na-ahụ inwe ihe bara ụba n’anya, ihe omume agaghị eju ya afọ: nke a bụkwa ihe efu.”​—⁠Eklisiastis 5:10.

Ịchọ inweta obi ụtọ n’ihe onwunwe ndị a na-ahụ anya yiri mmadụ ikowe akpa ya n’ebe aka ya na-agaghị eru. Ọ pụrụ ịdị na-akpali akpali ikowe ya, ma ị ga-enwe nsogbu ma ị chọọ ịdị na-etinye ya ihe.

A Pụrụ Inweta Obi Ụtọ ma Ọ̀ Bụ n’Ụzọ Dị Aṅaa?

Pọl onyeozi na-akpọ Jehova “Chineke obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11, NW) Site n’ike ụmụ mmadụ n’onyinyo ya, Chineke obi ụtọ ahụ nyekwara ha ikike nke inwe obi ụtọ. (Jenesis 1:26) Ma obi ụtọ ha gaje ịdabere na ha ijere Chineke ozi, dị ka onye ọbụ abụ ahụ gosiri: “Ndị [obi ụtọ, NW] ka ndị ahụ bụ, nke Jehova bụ Chineke ha.” (Abụ Ọma 144:15b) Ihe ozi anyị na-ejere Chineke gụnyere na otú anyị ijere ya ozi si eduga n’ezi obi ụtọ ka a pụrụ ịghọta nke ọma karị ma anyị tụlee ole na ole n’ime 110 ebe dị iche iche na New World Translation ebe okwu ahụ bụ “obi ụtọ” pụtara.

Ịghọta Mkpa Ime Mmụọ

Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke, kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3, NW) Ụwa azụmahịa na-anwa iduhie anyị gaa n’iche na ịzụta ihe okomoko dị iche iche ezuola iji nwee obi ụtọ. Ọ na-agwa anyị na ọbi ụtọ bụ inwe kọmputa nke gị, kamera vidio, telifon, ụgbọ ala, ngwá egwuregwu kasị ọhụrụ, uwe ndị a chọrọ oké mma. Ihe ọ na-adịghị agwa anyị bụ na ọtụtụ iri nde mmadụ n’ụwa enweghị ihe ndị a ma ha abụchaghị ndị na-enweghị obi ụtọ. Ọ bụ ezie na ha na-eme ka e nwekwuo ntụsara ahụ ná ndụ ma mee ka ọ dị mfe, ihe ndị a adịghị oké mkpa maka obi ụtọ.

Dị ka Pọl, ndị maara mkpa ime mmụọ ha na-asị: “Ebe anyị nwere ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ, afọ ga-eju anyị n’ihe ndị a.” (1 Timoti 6:8) N’ihi gịnị? N’ihi na imeju mkpa dị iche iche nke ime mmụọ bụ ihe na-eduba ná ndụ ebighị ebi.​—⁠Jọn 17:3.

Ọ̀ dị ihe dị njọ n’ịnụ ụtọ ihe ọma dị iche iche ma ọ bụrụ na anyị nwere ego ịzụta ha? Ma eleghị anya ọ dịghị. Ma, ọ na-ewusi ọnọdụ ime mmụọ anyị ike ịmụta ịghara imikpu n’ọchịchọ ọ bụla ma ọ bụ ịzụrụ ihe nanị n’ihi na anyị nwere ego ya. Anyị si otú ahụ amụta afọ ojuju ma nọgide na-enwe obi ụtọ, dị ka Jisọs mere, ọ bụ ezie na ọnọdụ akụ na ụba ya abụghị nke kasị mma n’ọ̀tụ̀tụ̀ ihe nke ụwa. (Matiu 8:20) Pọl adịghịkwa egosipụta enweghị obi ụtọ mgbe o dere, sị: “Mụ onwe m mụtara, n’ọnọdụ ọ bụla m nọ, inwezu n’ime ya ihe nile na-akpa m mkpa. Amatara m ụzọ iweda onwe, amatara m ụzọ ịbabiga ókè: n’ihe ọ bụla na n’ihe nile eziwo mụ ihe omimi a, bụ́ ịnọ n’afọ ojuju na ịnọkwa n’agụụ, ịbabiga ókè na ịnọkwa ná mkpa.”​—⁠Ndị Filipaị 4:​11, 12.

Ịtụkwasị Jehova Obi

Mmadụ ịmara mkpa ime mmụọ ya na-egosi ịdị njikere ịtụkwasị Chineke obi. Nke a na-eweta obi ụtọ, dị ka Eze Solomọn kọwara: “Onye na-atụkwasị Jehova obi, onye [obi ụtọ, NW] ka ọ bụ.”​—⁠Ilu 16:20.

Ma, ọ̀ bụ na ọ bụghị eziokwu na ọtụtụ ndị na-etinye ntụkwasị obi ka ukwuu n’ego na ihe ndị ha nwere karịa ka ha na-etinye na Chineke? Site n’ọnọdụ ile ihe anya nke a, ọ ga-esi ike inwe ebe ọzọ okwu ụkpụrụ ahụ bụ “Na Chineke Ka Anyị Tụkwasị Obi” na-ekwesịghị ịdịkwasị karịa n’ego, ọ bụ ezie na okwu ahụ pụtara n’ego mba U.S.

Eze Solomọn, bụ́ onye na-enweghị ụkọ nke ihe ọma nile ego pụrụ ịzụta, ghọtara na ịtụkwasị ihe onwunwe ndị a na-ahụ anya obi adịghị eduba n’obi ụtọ na-adịgide adịgide. (Eklisiastis 5:​12-⁠15) Ego dị n’ụlọ akụ pụrụ ifu site n’ọdịda ụlọ akụ ma ọ bụ oké ịrị elu nke ọnụ ahịa. Ajọ ifufe ma ọ bụ mmiri pụrụ ibibi ụlọ. Ụkpụrụ inshọransi, ọ bụ ezie na ọ pụrụ idochi mfu nke ihe onwunwe ruo ókè ụfọdụ, ọ dịghị mgbe ọ pụrụ ịkwụ ụgwọ mfu nile ná mmetụta uche. Ihe mbe na akụ azụmahịa pụrụ ịghọ ihe na-abakwaghị uru n’otu abalị n’ọdịda mberede nke ahịa ego. Ọbụna ọrụ a na-akwụ ezigbo ụgwọ na ya pụrụ​—⁠n’ihi ọtụtụ ihe⁠—​ịnọ ya taa ma fuo echi.

N’ihi ihe ndị a, onye na-atụkwasị Jehova obi na-ahụ amamihe nke ige ntị n’ịdọ aka ná ntị Jisọs, sị: “Unu akpadola akụ n’ụwa nye onwe unu, ebe nla na nchara na-erichapụ, ebe ndị ohi na-egwupụkwa na-ezukwa ohi: kama kpadoonụ akụ n’eluigwe nye onwe unu, ebe nla ma ọ bụ nchara na-adịghị erichapụ, ebe ndị ohi na-adịghị egwupụkwa, ha adịghị ezukwa ohi.”​—⁠Matiu 6:​19, 20.

Olee echiche kanụ nke ịnọ ná ntụkwasị obi na mmetụta nke obi ụtọ a pụrụ inwe karịa mmadụ ịmara na ya etinyewo ntụkwasị obi ya na Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ onye na-enye ihe mgbe nile?​—⁠Abụ Ọma 94:14; Ndị Hibru 13:​5, 6.

Ịnakwere Ịba Mba Chineke

Ndụmọdụ, ọbụna mba bụ nke a na-anabata mgbe e nyere ya ná mmụọ nke ịhụnanya site n’aka ezi enyi. Otu enyi ọnụ efu nke ohu God bụ́ Job nwere mgbe o sitere n’ezi omume onwe ya gwa ya, sị: “Obi ụtọ na-adịrị nwoke ahụ nke Chineke na-abara mba.” (NW) Ọ bụ eziokwu na okwu ahụ ziri ezi, ihe Elifaz chọrọ ka a ghọta n’okwu ndị ahụ​—⁠na ikpe ngahie dị oké njọ mara Job⁠—​abụghị eziokwu. Lee ka o si bụrụ onye “nkasi obi na-eweta ọnọdụ ọjọọ”! Ma, mgbe Jehova mesịrị baara Job mba n’ụzọ ịhụnanya, Job ji umeala n’obi nakwere mba ahụ wee tinye onwe ya n’ụzọ nke obi ụtọ ka ukwuu.​—⁠Job 5:17; 16:2; 42:6, 10-⁠17.

Taa, Chineke adịghị agwa ndị na-ejere ya ozi okwu kpọmkwem dị ka ọ gwara Job. Kama nke ahụ, ọ na-abara ha mba site n’Okwu ya na nzukọ ya mmụọ nsọ na-eduzi. Otú ọ dị, ndị Kraịst na-achụso ọdịmma ihe onwunwe adịghị enwekebe ma oge, ume, ma ọchịchọ ịmụchi Bible anya na ịga nzukọ nile nzukọ Jehova na-akwadebe.

Onye nke Chineke na-abara mba, n’ikwekọ n’Ilu 3:​11-⁠18, na-aghọta amamihe nke ịnara mba dị otú ahụ: “Onye [obi ụtọ, NW] ka mmadụ nke chọtaworo amamihe bụ, ya na mmadụ nke na-enwepụta nghọta. N’ihi na ọzụzụ ahịa ya dị mma karịa ọzụzụ ahịa ọlaọcha, uru ya dị mma karịa ọlaedo ọma. Ihe dị oké ọnụ ahịa ka ọ bụ karịa ruby: ihe nile kwa nke na-atọ gị ụtọ, ha agaghị aha ka ya. Ụbọchị ndụ dị ogologo dị n’aka nri ya; n’aka ekpe ya ka akụ na nsọpụrụ dị. Ụzọ ya nile bụ ụzọ nke ịdị ụtọ, okporo ụzọ ya nile bụkwa udo. Osisi na-enye ndụ ka ọ bụụrụ ndị na-ejide ya aka: Ee, onye ọ bụla nke na-ejisi ya aka ike bụ onye [obi ụtọ, NW].”

Ịdị Ọcha na Ịdị Na-ahụ Udo n’Anya

Jisọs kọwara ndị obi ụtọ dị ka ndị “dị ọcha n’obi” na ndị “na-eme ka mmadụ na ibe ha dị n’udo.” (Matiu 5:​8, 9) Ma n’ụwa nke na-akwado ụzọ ndụ ịhụ ihe onwunwe n’anya, lee ka o si dị mfe bụ́ ọchịchọ onwe onye nanị, ma eleghị anya ọbụna ndị na-adịghị ọcha, ịgba mkpọrọgwụ n’obi anyị! Ma e jighị amamihe Chineke duzie anyị, lee ka o si dị mfe ka anyị ọbụna bụrụ ndị e duhiere gaa n’ịchọ ọdịmma akụ na ụba site n’ụzọ ndị a na-enyo enyo nke ga-emebi mmekọrịta udo anyị na ndị ọzọ! Ọ bụghị na nkịtị ka Bible na-adọ aká ntị, sị: “Ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche: nke ụfọdụ na-agbasosi ike, e wee duhie ha n’okwukwe anyị, ha werekwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.”​—⁠1 Timoti 6:10.

Ịhụnanya ego na-akwalite echiche mbuli onwe onye elu nke na-akwado enweghị afọ ojuju, enweghị ekele, na anyaukwu. Iji gbochie mmụọ na-ezighị ezi dị otú ahụ ka ọ ghara itolite, ndị Kraịst ụfọdụ, tupu ime mkpebi ụfọdụ siri ike nke ego, na-ajụ onwe ha ajụjụ ndị dị ka: Ọ̀ dị m mkpa n’ezie? Ènwere m mkpa ịzụta ihe a dị oké ọnụ ma ọ bụ ọrụ a na-akwụ ezigbo ụgwọ, nke na-eri oge karịa ọtụtụ nde mmadụ ndị na-aghaghị ibi ndụ n’enweghị ha? M̀ pụrụ ma eleghị anya iji ego m ma ọ bụ oge m mee ihe nke ọma karị n’ịgbasawanye òkè m na-ekere n’ezi ofufe, site n’ịkwado ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ, ma ọ bụ n’inyere ndị ihe na-adabacharaghị dị ka ọ dabaara m aka?

Inwe Ntachi Obi

Otu n’ime ule ndị a manyere Job ịtachiri obi bụ nnapụ nke akụ na ụba. (Job 1:​14-⁠17) Dị ka ihe nlereanya ya na-egosi, a chọrọ ntachi obi n’akụkụ ọ bụla nke ndụ. Ndị Kraịst ụfọdụ aghaghị ịtachi obi ná mkpagbu; ndị ọzọ, ọnwụnwa; ndị ọzọ kwa, ọnọdụ akụ na ụba na-adịchaghị mma. Ma Jehova ga-enyeghachi ụgwọ ọrụ maka ntachi obi nke ụdị ọ bụla, dị ka onye Kraịst na-eso ụzọ bụ́ Jemes dere n’izo aka n’ebe Job nọ, sị: “Anyị na-akpọ ha ndị [obi ụtọ, NW], bụ́ ndị tachiri obi.”​—⁠Jemes 5:11.

Ileghara ọdịmma dị iche iche nke ime mmụọ anya iji meziwanye ọnọdụ akụ na ụba anyị pụrụ iweta ntụsara ahụ na-adịru nwa oge nke akụ na ụba, ma ọ̀ ga-enye aka ime ka ọhụụ anyị nke ntụsara ahụ na-adịgide adịgide nke akụ na ụba n’okpuru Alaeze Chineke nọgide na-egbuke egbuke? Ọ̀ bụ ihe ize ndụ ruru eru itinye aka na ya?​—⁠2 Ndị Kọrint 4:18.

Ịchọta Obi Ụtọ Ugbu A na Ruo Ebighị Ebi

O doro anya na ụfọdụ na-agbagha echiche Jehova nke ihe ọ na-ewe iji mee ụmụ mmadụ obi ụtọ. Site n’ileghara uru ndị na-adịte anya bụ́ ndị ka mkpa anya, ha adịghị ahụ ọnọdụ ọma ọ bụla a pụrụ inweta ugbu a n’ime ihe Chineke dụrụ ọdụ ya. Ha adịghị aghọta na ịtụkwasị ihe onwunwe obi bụ ihe efu, ọ na-edubakwa n’ịda mbà n’obi. Onye so dee Bible jụrụ n’izi ezi, sị: “Mgbe ezi ihe na-aba ụba, ndị na-eri ya abawokwa ụba: olee ngazi ọ na-agaziri onye nwe ya, ma ọ bụghị iji anya ya abụọ hụ ya?” (Eklisiastis 5:11; leekwa Eklisiastis 2:4-⁠11; 7:12.) Lee ka ihe mmasị dị iche iche si apụ n’anya ngwa ngwa, ihe ndị anyị chekwara na anyị aghaghị inwe ewee jedebe n’ọba na-anọchi ụzọ n’ebe ahụ, na-arakwa ntụ.

Ezi onye Kraịst adịghị mgbe ọ ga-enye onwe ya ohere ịbụ onye a kwanyere ‘n’ịchọ ịdị ka ndị ọzọ’ n’ụzọ ihe onwunwe. Ọ maara na a na-atụ ezi abamuru n’ọ̀tụ̀tụ̀, ọ bụghị site n’ihe mmadụ nwere, kama n’ihe ọ bụ. E nweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla n’uche ya banyere ihe ọ na-ewe iji mee mmadụ obi ụtọ​—⁠obi ụtọ n’ezie: iso Jehova nwee mmekọrịta dị mma na iji ọrụ n’aka n’ije ozi Ya.

[Foto dị na peeji nke 20]

Nanị ihe ndị a na-ahụ anya apụghị iweta obi ụtọ na-adịgide adịgide mgbe ọ bụla

[Foto dị na peeji nke 22]

Bible na-asị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya