Chọọchi Nke Latin America nọ N’oké Ihe Mgbu—N’Ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Nde Ji Apụsị?
SITE n’ókèala ebe ugwu nke Mexico ruo n’ọnụ ọnụ ebe ndịda nke Chile, ọ ga-ara ahụ inwe obodo ma ọ bụ ime ime obodo Latin America nke na-enweghị chọọchị Roman Katọlik n’ámá bụ isi nke obodo. Otú ọ dị, “mgbanwe dị ukwuu na-ewere ọnọdụ na Latin America,” ka Joseph E. Davis, bụ́ onye nduzi usoro ihe omume nke ụlọ ọrụ na-akwalite ọrụ ndị Katọlik kwenyere. O kwenyekwara na Latin America, bụ́ ógbè nke nọworo n’okpuru mmetụta nke Chọọchị Roman Katọlik ihe karịrị narị afọ atọ, nọ nso ugbu a ná nnwogha sara mbara.
Ọ bụghị ihe nzuzo na ọnọdụ ịbụ isi nke Chọọchị Katọlik na-adalata ngwa ngwa. N’oge na-adịbeghị anya, e mere atụmatụ na ọnụ ọgụgụ nke ndị Katọlik na-agachi chọọchị anya bụ nanị 15 pasent nke ngụkọta ọnụ ọgụgụ mmadụ na Latin America. Akwụkwọ bụ́ 1991 Britannica Book of the Year kọrọ, sị: “Ndị Bishọp Roman Katọlik na popu n’onwe ya kwupụtara ụjọ na n’akụkọ ihe mere eme ala Katọlik bụ́ Latin America na-agbakụta okwukwe mgbe ochie ahụ azụ n’ụzọ dị ize ndụ.” N’ihi gịnị ka nke a ji na-eme? Gịnị mere ọtụtụ ji na-ahapụ òtù Katọlik? Gịnị meworo ndị ahụ kpafuworonụ?
Ọchịchọ A Na-achọ Nkọwa
Ndị ndú Katọlik na-ata nnupụtasị nke “ịrọ òtù dị iche iche” ụta maka nsogbu ha. Onye ụkọchukwu bụ́ onye Europe nke na-arụ ọrụ na Bolivia kpesara, sị: “Chọọchị yiri osisi nke ịrọ òtù ndị di ka átá na-amịkọrọ ike ya.”
N’Argentina, a na-akọ akụkọ banyere 140 okpukpe ọhụrụ kwa afọ, nke pụrụ ịbụ ihe so mee e ji nwee ọdịda ná ndị òtù nke Chọọchị Katọlik site na 90 pasent gaa na 60 ma ọ bụ 70 pasent kemgbe ọkara afọ ndị 1970. Na Tijuana, Mexico, 10 pasent nke nde abụọ nke ndị bi na ya agafewo na 327 okpukpe na-abụghị Katọlik n’ebe ahụ. Magazin bụ́ Time kọrọ, sị: “N’ụzọ dị ịtụnanya, e nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na e nwere n’ezie ọnụ ọgụgụ ndị Brazil bụ ndị Protestant na chọọchị n’ụbọchị Sunday karịa ndị Katọlik.” Ọ bụghị ihe ijuanya na dị ka otu akwụkwọ akụkọ si kwuo, mgbe “ndị kadịnal Latin America na popu nwere nzukọ na Vatican City iji kwurịta okwu n’isiokwu abụọ ndị dị oké mkpa maka chọọchị ahụ taa,” otu n’ime ha bụ “nsogbu nke ịrọ òtù dị iche iche.”
Ná nzukọ o sooro ndị bishọp nke Mexico nwee, popu ahụ kwuru na inwe ihe ịga nke ọma nke ọtụtụ okpukpe ọhụrụ ahụ “bụ n’ihi ekpoghị ọkụ ma ọ bụ ajụghị oyi na enweghị mmasị nke ụmụ nke chọọchị ahụ ndị na-adịghị ejezu ozi ọma ha.” N’ihi gịnị ka “ụmụ nke chọọchị ahụ” na-ejighị mmasị n’igbo mkpa ime mmụọ nke ndị Latin America mgbe ọtụtụ n’ime ndị a na-akwanyere Bible ùgwù? Uche akwụkwọ akụkọ Última Hora, nke La Paz, Bolivia, na-akọwa: “Chọọchị ahụ abanyewo n’ụwa ruo n’ókè nke na kwa ụbọchị ọ na-eyi ka ọ na-ahapụkwu ọnọdụ ya kwesịrị ekwesị. Ọ gaghị abụrụ anyị ihe ịtụnanya ịchọpụta, dị ka n’ihe ndị na-eme eme, na ndị ụkọchukwu bụ ndị ọkà n’ihe banyere mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ndị ọkà n’okwu akụ na ụba, ndị nta akụkọ, ma ọ bụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị karịa ka ha bụ ndị ụkọchukwu.”
Hà Bụ Ndị Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Karịa Otú Ha Bụ Ndị Nkwusa?
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na chọọchị ahụ itinye aka n’okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’afọ ndị 1970 na 1980 keere òkè n’ikpọasị nke ọtụtụ ndị Latin America na-enwe ugbu a maka Okpukpe Katọlik. Ihe ọmụmụ e bipụtara na 1985 kwuru ihe ndị a na-esonụ banyere Maryknoll, nke bụ́ òtù Catholic Foreign Mission Society of America, tinyere ọtụtụ chọọchị ya na Latin America, sị: “Maryknoll ewebatawo n’ụzọ gara nke ọma, ozi iweta mgbanwe site n’ime ihe ike bụ́ nke Marx na Lenin kụziri ịbụ nke ọha nabatara kpọmkwem n’ihi na e kwerewo ka ọ na-arụ ọrụ dị ka ngalaba nke Chọọchị Katọlik. Ozi ya erutewo ọ bụghị nanị onye na-eje chọọchị, kamakwa ndị ome iwu America a ma ama.”
Tụleekwa ihe ahụ a kpọrọ agha ruru unyi nke, n’ụzọ dị ịtụnanya, e jidere ma gbuo site na 10,000 ruo 30,000 ndị Argentina na-ekpeghị ha ikpe ná ngwụsị afọ ndị 1970. Otu Uche akwụkwọ akụkọ National Catholic Reporter, n’okpuru isiokwu bụ́ “Ọbara Etetọọ Chọọchị n’Argentina,” kwuru, sị: “Ahụmahụ Argentina ahụ yiri nnọọ n’ụzọ chiri anya omume nke chọọchị Katọlik na Nazi Germany, o welitekwara ajụjụ ọzọ ma ike ọ dị chọọchị ahụ mkpa karịa Oziọma ahụ nke dị mkpa iji bụrụ onye àmà nye eziokwu ahụ.”
Ọchịchọ nke chọọchị ahụ maka ike na gọọmentị ụwa na-aka ya akara n’ụzọ pụtara ìhè di ka onye iro nke Chineke. Bible sịrị: “Ị́ dịghị aghọta na ime ụwa enyi gị bụ ime Chineke onye iro gị? Onye o bụla nke họọrọ ụwa dị ka enyi ya na-eme onwe ya onye iro Chineke.” (Jemes 4:4, Jerusalem Bible nke Katọlik) Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ adịghị elegara Chọọchị Katọlik anya maka nduzi ime mmụọ. Ma gịnị meworo ndị hapụrụ òtù Katọlik?
Atụrụ Na-enweghị Onye Ọzụzụ Atụrụ
Ha dị nnọọ ka ndị ahụ ndị ndú ime mmụọ nke okpukpe ndị Juu narị afọ mbụ na-enweghị ike ilekọta. Bible sịrị na Jisọs “nwere omịiko n’ahụ ha n’ihi na a na-enye ha nsogbu ma na-eleda ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ.” (Matiu 9:36, JB) Ọtụtụ akpafuwo site na Chọọchị Katọlik gaa n’ihe a na-akpọ okpukpe ndị na-ezisa oziọma. Ndị a hà elekọtawo atụrụ ndị a furu efu n’ụzọ ka mma? Ndị Protestant hà nwere mmụọ nke ịdị ka ihe ahụ Jisọs kwuru banyere ezi ndị na-eso ụzọ ya: “Ha esiteghị n’ụwa, dị ka mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa”?—Jọn 17:14.
Ọtụtụ okpukpe na-abụghị Katọlik na-agbalị igosipụta onyinyo nke irubere Bible isi kama ịbụ ndị na-eso omenala okpukpe. Ọtụtụ mgbe nke a na-abụ nanị ihe mkpuchi. Ozizi ndị bụ isi nke nzukọ Protestant yiri nnọọ nke Chọọchị Katọlik nke na ọ dị mfe ndị na-ahụ ihe na-emenụ inwe ike iji okwu ndị Andes mee ihe: “Es la misma cholita con otra pollera” (Ọ ka bụkwa otu nwa agbọghọ India ahụ na-eyi uwe skirt dị iche).
Dị ka ihe atụ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ òtù Protestant nile na-ezi na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu, ma nke a abụghị ozizi Bible. The Encyclopedia of Religion kwetara, sị: “Ndị na-akọwa akụkụ akwụkwọ nsọ na ndị ọkà mmụta okpukpe taa nwere nkwekọrịta na Bible nke Hibru enweghị ozizi nke Atọ n’Ime Otu n’ime ya . . . Agba Ọhụrụ kwa enweghị ozizi nke Atọ n’Ime Otu n’ụzọ pụtara ìhè.”a
E jikọrọ ndị Protestant na ụwa a na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya dịkwa ka Katọlik n’ụzọ doro anya. Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of Latin America na-asị: “Okpukpe Protestant na Latin America etinyewokwa onwe ya na . . . ndọrọ ndọrọ ntụli aka nke ọha mmadụ. Ndị ụkọchukwu ógbè ahụ mgbe mgbe na-abụ ndị ahịa nke ndị na-akwado okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma nweta ndị ga-atụnye vootu n’ịkwụ ụgwọ maka onyinye gọọmentị nyere chọọchị ha.” Latin American Research Review kwuru, sị: “E nyewo okpukpe Protestant dị ka nwunye nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Guatamala kemgbe ọ bịara na mbụ na mba ahụ,” na-agbakwụnye na “ọ bụrụwo ihe a na-eji eme ka a ghọta omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke mmekọrịta ọha na eze dị ka otu ụdị nke okpukpe.”
Ntinye ndị Protestant na-etinye aka n’okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị edugawo mgbe mgbe n’okpukpe Protestant itinye aka n’agha. Harry Emerson Fosdick nwụworonụ, onye e lere anya dị ka otu n’ime ndị ụkọchukwu Protestant a ma ama n’akụkọ ihe mere eme nke America, kwetara, sị: “Akụkọ ihe mere eme nke Ebe Ọdịda Anyanwụ anyị abụwo nke isite n’otu agha gaa n’agha ọzọ. Anyị amụwo ndị mmadụ maka agha, zụọ ndị mmadụ maka agha; anyị etowo agha; anyị emewo ndị dike n’agha ka ha bụrụ ndị ukwuu anyị, ọbụna na anyị tinyere ọkọlọtọ agha n’ime ụlọ chọọchị anyị nile, . . . Anyị ji otu akụkụ ọnụ anyị na-eto Onyeisi Udo, werekwa akụkụ nke ọzọ na-enye agha otuto.”
Olee Ihe I kwesịrị Ime?
Mgbe ọ kọwasịrị okpukpe ụgha dị ka akwụna ihe atụ nke na-eso ndị ọchịchị ụwa akwa iko, akwụkwọ Bible bụ Mkpughe kwuru, sị: “Ndị nke m sịnụ n’ime ya pụta, ka unu ghara iso ya kerịta mpụ ya nile ma nwe otu ụdị ihe otiti ya.”—Mkpughe 18:4, JB.
Ọtụtụ na-aghọta na e nwere oké omume rụrụ arụ n’ime chọọchị, ma n’agbanyeghị nke ahụ ha na-ala azụ n’ịpụ n’ihi na Chọọchị Rom nwere akụkọ ihe mere eme sitere nnọọ na mgbe ochie. Otú ọ dị, cheta na usoro ofufe nke ndị Juu sitere na mgbe ochie, ma n’agbanyeghị nke ahụ Chineke jụrụ ndị Juu dị ka ndị ya ọ họpụtara mgbe ha si n’ezi ofufe dapụ site n’ezi nkụzi ya. Ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi hapụrụ okpukpe ndị Juu mgbe ha ghọtara na Chineke ji ọgbakọ ndị Kraịst eme ihe ugbu a kama ha. Olee otú ị pụrụ isi mata ezi ọgbakọ ndị Kraịst taa?
Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu nde ndị Latin America aghọwo Ndịàmà Jehova n’iri afọ abụọ gara aga. N’ihi gịnị ka ha ji mee mgbanwe dị otú a? Otu akwụkwọ akụkọ na Martínez de la Torre, Veracruz, Mexico, nyochara ajụjụ a. O kwuru, sị: “Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na 100 pasent nke ndị mejupụtara Ndị Mmụta Bible ndị a bụbu ndị nọsiri ike n’okpukpe ndị ọzọ dị iche iche, karịsịa ndị Katọlik, ndị hụtaworo ntinye aka okpukpe na-etinye n’okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nnakwere na nkwado ya n’ebe omume na-adịghị na Bible dị ka mgwakọta okpukpe, omume rụrụ arụ, na ime ihe ike dị. Ọ bụworo ha isi iyi nke afọ ojuju ime ka àgwà ha kwekọọ n’ụkpụrụ omume nke Akwụkwọ Nsọ n’etinyeghị aka n’ikpere arụsị ma ọ bụ omenala nke a na-amaghị mmalite ya. Nke a enyewo ha ịdị n’otu nke okwukwe kwesịrị otuto nke yiri ka o setịpụrụ ha iche n’ebe ọ bụla ha nọ.”
Akwụkwọ Akụkọ Latin America ọzọ tinyere ya otú a: “Ndịàmà Jehova bụ ndị na-arụsị ọrụ ike, na-akwụwa aka ha ọtọ, na-atụkwa egwu Chineke. Ha na-arapagidesị ike n’ụzọ ha na-esi eme ihe ma na-ahụ omenala ha n’anya, okpukpe ha dabekwaara n’ozizi nke Bible.” Anyị na-akpọ gị òkù isoro Ndịàmà Jehova na-amụ Bible n’ebe ọ bụla i bi. Ị ga-amụta na olileanya ha na ụzọ nile ha na-esi ebi ndụ dabeere na Bible. Ee, ị ga-amụta otú e si efe Chineke ofufe “n’ime mmụọ na eziokwu.”—Jọn 4:23, 24.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee akwụkwọ nta Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu? nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc. bipụtara.
[Chaatị dị na peeji nke 21]
NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤFỌDỤ MBA NDỊ LATIN AMERICA
1971 1992
Mba Ndị Nkwusa Ndị Nkwusa
Argentina 20,750 96,780
Bolivia 1,276 8,868
Brazil 72,269 335,039
Chile 8,231 44,067
Colombia 8,275 55,215
Costa Rica 3,271 14,018
Dominican Republic 4,106 15,418
Ecuador 3,323 22,763
El Salvador 2,181 20,374
Guadeloupe 1,705 6,830
Guatemala 2,604 13,479
Honduras 1,432 6,583
Mexico 54,384 354,023
Panama 2,013 7,732
Paraguay 901 4,115
Peru 5,384 43,429
Puerto Rico 8,511 25,315
Uruguay 3,370 8,683
Venezuela 8,170 60,444
NGỤKỌTA 212,156 1,143,175