Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 1/1 p. 28-31
  • Achọtara M Akụ̀ nke Bara Uru Karịsịa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Achọtara M Akụ̀ nke Bara Uru Karịsịa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nzụlite Ezinụlọ M
  • Ịchọta Ezi Akụ̀
  • Njem Ime Nkwusa nke Mụ na Papa
  • Izute Ule Dị Iche Iche
  • Ozi na Adelaide
  • Agụmakwụkwọ Dịruru Ogologo Ndụ M Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Anọ M Nanị M Ma A Hapụghị M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ịgbaso Nzọụkwụ nke Ndị Mụrụ M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Onye Nyere Ọtụtụ Mbe Ìhè
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 1/1 p. 28-31

Achọtara M Akụ̀ nke Bara Uru Karịsịa

DỊ KA FLORENCE WIDDOWSON SI KỌỌ

Ka chi na-eji, anyị kpebiri ịma ụlọikwuu n’akụkụ otu ọdọ mmiri. Ọ bụghị ebe dị mma nye ndị inyom abụọ ịma ụlọikwuu, ma anyị chere na nsogbu agaghị adị maka nanị otu abalị. Ka m ji ọrụ n’aka na-eguzobe ụlọikwuu ahụ, Marjorie kwadebere nri abalị anyị.

MKA kụnyesịrị ntu ụlọikwuu nke ikpeazụ mgbe mmegharị ihe n’akụkụ otu ukwu osisi e gbuturu egbutu nke na-eji oji dọọrọ anya m. “Ị̀ hụrụ ka ukwu osisi ahụ megharịrị?” ka m tiri mkpu jụọ Marjorie.

“Ee e,” ka o ji iti mkpu zaghachi, na-enwetụ ijuanya.

“Ma o megharịrị nnọọ,” ka m tiri mkpu. “Nye m ketụl!”

Ka m weere ya, ya na anyụike n’ubu m, m tinyere isi n’ọdọ mmiri ahụ. Mgbe ọ fọrọ nke nta ka m nọrọ kpọmkwem n’akụkụ ukwu osisi ahụ, otu nwoke si n’azụ ya pụta!

“Mmiri dị n’ọdọ mmiri ahụ ọ̀ dị mma ịṅụ aṅụ?” ka m gbalịrị wee sụọ ná nsụ.

“Ee e, ọ dịghị,” ka ọ zaghachiri n’iwe, “ma ọ bụrụ na ị chọrọ mmiri ọṅụṅụ, aga m ekutere gị ụfọdụ.”

Ajụrụ m enyemaka ya ngwa ngwa, dịkwa ka oké ihe ahụ iru ala nye m, ọ tụgharịrị ozugbo ma si n’ebe ahụ pụọ. N’ahụ ịma jijiji, eji m ọsọ ọsọ laghachi gaa kọọrọ Marjorie ihe meworonụ. Anyị ji ọsọ butuo ụlọikwuu ahụ, kwakọta ibu anyị, wee pụọ. E mesịrị gwa anyị na ọ dịbeghị anya e si n’ụlọ nga tọhapụ nwoke ahụ.

Ọ bụ ezie na ndị na-achọ akụ̀ na-amakarị ụlọikwuu n’ọhịa ebe e nwere ọlaedo n’Australia laa azụ na 1937, anyị bụ ndị na-achọ ụdị akụ̀ nke dị iche. Anyị na-achọ mmadụ ndị dị oké ọnụ ahịa nye Chineke.

Nzụlite Ezinụlọ M

Otu narị afọ gara aga, nna m bụ onye ụzụ n’otu ime obodo nta bụ́ Porepunkah dị na steti Victoria. A mụrụ m n’ebe ahụ na 1895, m wee soro ụmụnne m anọ ndị ọzọ bụ́ ndị ikom tolite n’ebe dị nso n’Osimiri Ovens, n’ala ala Ugwu Buffalo. Ndị mụrụ m bụ ndị na-ejechi Union Church anya, m na-ejekwa Sunday school, ebe nna m bụ onye nlekọta ya.

Na 1909, Mama rịara obi nkuchi mberede mgbe e nwere otu ajọ oké ifufe wee nwụọ n’aka nna m. Mgbe ahụ, ná mmalite 1914, otu n’ime ụmụnne m ndị ikom hapụrụ ụlọ, mgbe hour ole na ole gasịkwara, e bulatara ya​—⁠n’ozu. O gbuwo onwe ya. Iru újú anyị miri emi karị n’ihi nkụzi chọọchị nke na hell na-echere ya, ebe ọ bụ na a sịrị na mmadụ igbu onwe ya bụ mmehie na-enweghị mgbaghara.

E mesịa n’afọ ahụ, Agha Ụwa Mbụ tiwapụrụ, ụmụnne m abụọ ndị ikom banyekwara n’ozi agha n’ofesi. Akụkọ na-atụ ụjọ nke nkwafu ọbara na nhụjuanya mere ka anyị isii bụ ụmụ agbọghọ, tinyere nna m, malite ịmụ akwụkwọ Bible nke Jọn dere.

Ịchọta Ezi Akụ̀

Ellen Hudson nwere otu n’ime akwụkwọ The Time Is at Hand, nke Charles Taze Russell dere. Oké mmasị o nwere maka ya kpaliri onye ọ bụla n’ìgwè ahụ. Mgbe ọ chọpụtara na akwụkwọ ahụ bụ nanị otu n’ime mpịakọta isii a na-akpọ Studies in the Scriptures, o degaara International Bible Students Association dị na Melbourne akwụkwọ na-arịọ ha ka ha zitere ya ndị fọrọ. Ìgwè anyị kwekọrịtara iji mpịakọta nke mbụ, The Divine Plan of the Ages, na-eme ihe n’ọmụmụ ihe anyị kwa izu.

Cheedị echiche ọṅụ mụ na Papa nwere ịchọpụta na e nweghị hell na-ere ọkụ. E wepụrụ egwu ahụ nke bụ na e jibidoro nwanne m nwoke n’ime ọkụ hell. Anyị mụtara eziokwu ahụ bụ na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, dị ka ndị nọ n’ụra, ha ebighịkwa n’ebe ụfọdụ nke ịta ahụhụ. (Eklisiastis 9:​5, 10; Jọn 11:​11-⁠14) Ụfọdụ n’ìgwè ọmụmụ Bible anyị kpebiri ịga na nke ndị agbata obi anyị kwusaara ha eziokwu ndị anyị na-amụta. Anyị ji ụkwụ jee n’ụlọ ndị dị nso, ma anyị ji ịnyịnya ígwè na otu ụgbọ ala nwere ụkwụ abụọ nke ịnyịnya na-adọkpụ gakwuru ndị nọ n’ime ime obodo.

Ire mbụ m detụrụ ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ bụ n’ụbọchị ememe ncheta bụ́ Armistice Day, November 11, 1918. Atọ n’ime anyị site n’ìgwè ọmụmụ ihe anyị mere njem dị 80 kilomita gaa n’obodo Wangaratta ikesa traktị ahụ bụ́ Peoples Pulpit. Ọtụtụ afọ mgbe nke ahụ gasịrị, mgbe anyị na-eme nkwusa n’otu n’ime ógbè ndị dịpụrụ adịpụ, enwere m ahụmahụ ahụ a kọrọ ná mmalite.

Na 1919, ejere m otu mgbakọ ukwu nke Ndị Mmụta Bible na Melbourne. N’ebe ahụ, n’April 22, 1919, e gosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site ná mmikpu n’ime mmiri. Oké oriri ime mmụọ ahụ mere ka ekele m nwere maka akụ̀ ime mmụọ nke Alaeze nke eluigwe na maka nzukọ Jehova n’elu ụwa mie emi karị.​—⁠Matiu 13:44.

Alọtaghị m ụlọ mgbe e mechiri mgbakọ ukwu ahụ kama m naara ọkpụkpọ òkù isonyere Jane Nicholson, onye nkwusa oge nile, maka otu ọnwa nke ịgba àmà. Ọrụ e kenyere anyị bụ ógbè ndị na-akọ ugbo na ndị na-azụ ehi n’akụkụ Osimiri King. Nanị afọ ole na ole gara aga, ebe ugwu a bụ ebe e jiri mee ihe nkiri bụ́ The Man From Snowy River.

Na 1921 anyị natara ọmarịcha ihe enyemaka ọmụmụ Bible ahụ bụ́ The Harp of God. Mgbe Papa malitere iji ya na-eme ihe dị ka akwụkwọ ọmụmụ na klasị Sunday school ya, ọtụtụ ndị nne na nna megidere nke a ma gwa ya ka ọ gbaa arụkwaghịm. O mere nke ahụ n’egbughị oge. E mesịa anyị natara akwụkwọ nta bụ́ Hell, ya na ajụjụ ndị ahụ na-akpali mmasị e nwere n’azụ ya, “Gịnị Ka Ọ Bụ? Olè Ndị Nọ Ebe Ahụ? Hà Pụrụ Ịpụta?” Papa nwere mmasị maka ihe nnwapụta doro anya nke Bible e nyere n’isiokwu ahụ nke na ọ malitere ozugbo ahụ ikesa ụfọdụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ. O tinyere ọtụtụ narị n’ime ya n’ime obodo anyị na n’ime obodo ndị dị nso.

Njem Ime Nkwusa nke Mụ na Papa

E mesịa, Papa zụtara otu ụgbọ ala maka iji jiri ozi Alaeze ahụ rute ndị mmadụ nọ n’ebe ndị ọzọ. Dị ka onye ụzụ, ịnyịnya ibu maara ya ahụ karị, ya mere m ghọrọ ọkwọ ụgbọ ya. Iji malite, anyị na-ehi ụra n’ụlọ oriri dị iche iche. N’oge na-adịghị anya, nke a ghọrọ ihe dị oké ọnụ, anyị wee malite iji ụlọikwuu na-eme ihe.

Papa rụgharịrị oche ihu nke ụgbọ ala ahụ ka o nwee ike ịtọgbọrọ ogologo nke na m pụrụ ihi ụra n’ime ụgbọ ala ahụ. Anyị wuru otu obere ụlọikwuu ebe Papa na-ehi ụra. Mgbe anyị nọworo n’ụlọikwuu ọtụtụ izu, anyị ga-alaghachi na Porepunkah, ebe Papa ga-amaliteghachi ọrụ ụzụ ya ọzọ. Ọ na-eju anyị anya mgbe nile na a na-enwe ọtụtụ ndị ahịa na-akwụta ụgwọ mgbe nile iji kwụọ ụgwọ ihe a ga-emefu ná njem anyị ọzọ nke ime nkwusa.

Ọtụtụ ndị obi ha ziri ezi gosiri mmasị ná nleta anyị ma nakwere ọmụmụ Bible ebe obibi mgbe oge na-aga. E nwere ugbu a ọgbakọ asaa ndị nwekwara Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ha n’ebe ahụ nke ìgwè nta anyị ahụ sitere Porepunkah lekọtaburu. N’ezie, ònye pụrụ ilelị “ụbọchị ihe nta”?​—⁠Zekaraịa 4:10.

Na 1931, mụ na Papa ji ụgbọ ala mee njem fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 300 kilomita n’okporo ụzọ jọgburu onwe ya iji jee nzukọ pụrụ iche, ebe anyị nakweere aha ọhụrụ anyị, “Ndịàmà Jehova.” Aha nke a pụrụ iche nke sitere n’Akwụkwọ Nsọ tọrọ anyị abụọ ụtọ. (Aịsaịa 43:​10-⁠12) O mere ka a mata anyị n’ụzọ pụtara ìhè ọbụna karịa aha ahụ na-adịghị egosipụtacha ịdị iche bụ́ “Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile,” bụ́ nke e ji mara anyị ruo mgbe ahụ.

Otu ụbọchị mgbe m na-agba àmà n’obodo Bethanga, ezutere m otu onye minista nke Church of England. Iwe bịara ya, o wee malite ịga n’ebe ndị anyị nyefere akwụkwọ, na-agwa ha ka ha nyeghachi ya akwụkwọ ha. E mesịa o duziri nnọkọ ihu ọha nke ịkpọ akwụkwọ ọkụ n’etiti obodo ahụ. Ma omume arụrụala ya arụghị ihe o zubere.

Mgbe m gwara alaka ụlọ ọrụ Society ihe merenụ, e bipụtara akwụkwọ ozi a chọrọ ka ọha na eze gụọ nke katọrọ ihe onye ụkọchukwu ahụ mere. Ọzọkwa, e mere ndokwa maka otu ụgbọ ala jupụtara ná Ndịàmà ije kesaa akwụkwọ ozi ahụ n’ógbè ahụ dum. Mgbe mụ na Papa mesịrị letaghachi obodo ahụ, anyị nyefere ọtụtụ akwụkwọ karịa n’oge mbụ. Ndị obodo ahụ nwere oké mmasị ịmata ihe dị n’akwụkwọ ahụ “a na-asọ asọ”!

Onye mbụ natara eziokwu Bible n’ebe ugwu nke akụkụ ọwụwa anyanwụ Victoria n’ihi nkwusa anyị bụ Milton Gibb. N’agbata nleta anyị o jiri nlezianya mụọ mbipụta Society nile anyị hapụụrụ ya. N’otu n’ime nletaghachi anyị, o mere ihe juru anyị anya site n’ịsị: “Abụ m ugbu a otu n’ime ndị na-eso ụzọ unu.”

Ọ bụ ezie na mkpebi ya mere m obi ụtọ, m kọwara, sị: “Ee e, Milton. Ị pụghị ịbụ otu n’ime ndị na-eso ụzọ m.”

“Ọ dị mma, mgbe ahụ, abụ m otu n’ime ndị na-eso ụzọ Rutherford [onye isi oche oge ahụ nke Watch Tower Society].”

Ọzọ ekwupuṭara m sị: “Ee e, ị bụghị otu n’ime ndị na-eso ụzọ Rutherford, kama ma eleghị anya otu n’ime ndị na-eso ụzọ Kraịst.”

Milton Gibb ghọrọ otu n’ime ọtụtụ akụ̀ ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa ndị m nọrọ na-achọ eri ọtụtụ afọ. Ya na ụmụ ya ndị ikom abụọ bụ ndị okenye ndị Kraịst, ndị ọzọkwa nọ n’ezinụlọ ya na-emekwa nke ọma n’ọgbakọ.

Izute Ule Dị Iche Iche

N’agbanyeghị mmachibido iwu n’ọrụ Ndịàmà Jehova n’Australia na January 1941, anyị nọgidere na-eme nkwusa, na-eji nanị Bible eme ihe. Mgbe ahụ ọrụ ọsụ ụzọ m, ma ọ bụ ozi oge nile, kwụsịtụrụ mgbe a sịrị m lọta ụlọ iji lekọta nna m dara oké ọrịa. E mesịa, m dakwara ọrịa nke chọrọ ịwa ahụ siri oké ike. Mụ inwetaghachi ahụ ike were oge ụfọdụ, ma ahụrụ m eziokwu nke nkwa Chineke ahụ bụ́: “M gaghị aha gị aka ma ọlị, m gaghị ahapụkwa gị ma ọlị.” (Ndị Hibru 13:5) Otu nwanna nwanyị bụ́ onye Kraịst mesiri m obi ike, na-asị: “Cheta, Flo, ọ dịghị mgbe ị nọ nanị gị. Gị na Jehova na-akarịkwa mgbe nile.”

Mgbe ahụ, ọrịa ikpeazụ nke ezi nna m nke were izu 13 bịara. Na July 26, 1946, o mechiri anya ya n’ọnwụ. Ọ nụwo ụtọ ndụ nke juru eju, olileanya eluigwe bụkwa nke ya. (Ndị Filipaị 3:14) Ya mere, n’afọ ndụ nke 51, anọ m nanị m, ebe mụ na Papa nọworo ihe kanụ n’afọ m ndị mbụ. Mgbe ahụ, m zutere onye gaje ịbụ di m. Anyị gbara akwụkwọ na 1947 wee malitekọọ ọrụ ọsụ ụzọ. Ma oge obi ụtọ nke a adịteghị anya, ebe ọ rịara ahụ mkpọnwụ na 1953 wee ghọọ onye na-apụghị ime ihe ọ bụla.

O metụtara ikike ikwu okwu nke di m n’ụzọ jọrọ njọ, ọ ghọkwara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe na-ekweghị omume iso ya kwurịta okwu. Nke ahụ bụ akụkụ sikarịrị ike n’ilekọta ya. Nrụgide nke uche nke ịgbalị ịghọta ihe ọ na-agbalịsi ike ikwu dị nnọọ ukwuu. Ọ bụ ezie na anyị bi n’ebe dịpụrụ adịpụ ebe ọ na-adịghị ọgbakọ dị nso, Jehova ahapụghị anyị n’afọ ndị ahụ nke oké ihe isi ike. Anọgidere m na-enweta ihe ọmụma ndị kasị ọhụrụ banyere nzukọ, tinyekwara nri ime mmụọ na-abịa mgbe nile site na magazin Ụlọ Nche na Teta! Na December 29, 1957, di mụ ọma nwụrụ.

Ozi na Adelaide

Anọ m nanị m otu mgbe ọzọ. Gịnị ka m ga-eme? À ga-anabataghachi m dị ka onye ozi oge nile mgbe m kwụsịrị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ ise? A nabatara m, ya mere erere m ụlọ m ma maliteghachi ọhụrụ ịsụ ụzọ n’Adelaide, isi obodo Ndịda Australia. A chọrọ ndị ọsụ ụzọ n’ebe ahụ n’oge ahụ, e zigakwara m n’Ọgbakọ Prospect.

Ebe ọ bụ na egwu na-atụ m ịkwọ ụgbọ n’okporo ụzọ obodo ukwu, erere m ụgbọ ala m ma malite iji ịnyịnya ígwè ọzọ. Ejiri m ya mee ihe ruo mgbe m gbara 86 afọ, bụrụ onye a maara n’ógbè ahụ dị ka “obere nwaada nọ n’elu ịnyịnya ígwè na-acha anụnụ anụnụ.” Mgbe oge na-aga, ụjọ ka ukwuu malitere ịtụ m n’ụzọ; o yiri ka wheel ihu nke ịnyịnya ígwè m ọ̀ na-ama jijiji mgbe nile. Ahụmahụ ọjọọ ikpeazụ m nwere bịara n’otu ehihie mgbe m danyere n’otu ogige a gbara. ‘Nke a bụ nke ikpeazụ ya,’ ka m gwara onwe m, ya mere alaghachikwara m n’iji ụkwụ m abụọ eme ihe.

Afọ ole na ole gara aga, mgbe m na-aga otu mgbakọ distrikti, ike malitere ịgwụ ụkwụ m, e mesịkwara waa m ahụ ugbo abụọ ná nkwonkwo úkwù m. Ana m eme nke ọma mgbe ịwa ahụ ahụ gasịrị ruo mgbe otu nnukwute nkịta kwaturu m. Nke a mere ka ọ dị mkpa inyekwa m ọgwụ, kemgbe ahụ kwa osisi e ji eje ije adịwo m mkpa ka m wee nwee ike ijegharị. Uche m ka na-arụsi ọrụ ike. Ọ bụ dị ka otu enyi m kwuru, sị: “O yiri ka ahụ gị nke na-aka nká apụghị ịnagide uche nke onye na-eto eto i nwere.”

Eri ọtụtụ afọ, ahụwo m ka ọgbakọ ndị dị n’Adelaide toro, mụbaa, ma ọ bụ kewaa. E mesịa, na 1983, mgbe m dị 88 afọ, ahapụrụ m Adelaide gaa binyere otu ezinụlọ na Kyabram na steti nke Victoria, ebe m nọworo afọ iri nke obi ụtọ. M ka na-agbalị ịpụta maka ozi ubi; ndị enyi m n’ọgbakọ na-ebugharị m ije leta ndị na-anata m magazin mgbe nile. Mmadụ ndị a na-eji obi ọma bịa n’ụgbọ ala m nọ na ya ka m wee nwee ike ịgwa ha okwu.

N’ileghachi anya azụ n’ihe karịrị 98 afọ nke ndụ m, m na-eji obi ụtọ echetaghachi ọtụtụ ndị na-anọgidesi ike n’ihe na ndị kwesịrị ntụkwasị obi ndị mụ na ha toworo Jehova, karịsịa ezigbote papa m. O yiri ka ọ bụ nanị m fọrọ ndụ n’ime ndị nile kwesịrị ntụkwasị obi mụ na ha jekọrọ ozi n’ọrụ ọsụ ụzọ. Ma lee oké ọṅụ na-echere m mgbe m ga-esonyere ndị ahụ so na-ekere òkè n’olileanya nke ụgwọ ọrụ nke ndụ n’Alaeze eluigwe nke Chineke, n’ezie akụ̀ nke bara uru karịsịa!

[Foto dị na peeji nke 28]

E mere m baptism n’April 22, 1919

[Foto dị na peeji nke 31]

Na-enwe obi ụtọ n’ihi ị nọgide ka na-ejere Jehova ozi ka m na-eru 100 afọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya