Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ebe ọ bụ na Bible na-ekwukarị banyere “nwa okoro na-enweghị nna,” nke a ọ̀ na-egosi enwekebeghị nchegbu banyere ụmụ agbọghọ?
Ọ dịghị ma ọlị.
Nsụgharị New World Translation of the Holy Scriptures ji okwu ahụ bụ “nwa okoro na-enweghị nna” mee ihe n’ọtụtụ amaokwu na-egosi nchegbu Chineke na-enwe maka ụmụntakịrị na-enweghị nne ma ọ bụ nna. Chineke mere ka a mara nchegbu nke a n’iwu o nyere ụmụ Israel.
Dị ka ihe atụ, Chineke sịrị: “Unu agaghị emegbu nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ ma ọ bụ nwa okoro na-enweghị nna. Ọ bụrụ na unu emegbuo ya ma ọlị, mgbe ahụ ọ bụrụ na o tikuo m mkpu ma ọlị, m ghaghị ịnụ ákwá ya; iwe m ga-adịkwa ọkụ, m ghaghịkwa iji mmà agha gbuo unu, ndị nwunye unu aghaghịkwa ịghọ ndị inyom di ha nwụrụ, ụmụ unu ndị ikom aghaghịkwa ịghọ ụmụ okoro na-enweghị nna.” (Ọpụpụ 22:22-24, NW) “Jehova bụ́ Chineke unu bụ Chineke kachasị chi nile na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile, Chineke ukwu ahụ, nke bụ dike dịkwa egwu, onye na-adịghị eji ile anya n’ihu emeso onye ọ bụla, nke na-adịghịkwa eri ngo, onye na-eme ihe e kpere n’ikpe maka nwa okoro na-enweghị nna na nwanyị di ya nwụrụ.”—Deuterọnọmi 10:17, 18, NW; 14:29, NW; 24:17, NW; 27:19, NW.
Ọtụtụ nsụgharị Bible dere “nwa na-enweghị nna” ma ọ bụ “nwa mgbei” n’amaokwu ndị a, si otú a na-emetụta ma ụmụ okoro ma ụmụ agbọghọ. Otú ọ dị, ide ya n’ụzọ ndị dị otú a enwetaghị ụtọ okwu nke dị n’okwu Hibru e nwere n’ebe ahụ (ya·thohmʹ), nke nọ n’ụdị e ji ama onye bụ nwoke. Kama nke ahụ, New World Translation of the Holy Scriptures na-eji okwu ziri ezi eme ihe, nke bụ “nwa (ụmụ) okoro na-enweghị nna,” dị ka ọ dị n’Abụ Ọma 68:5 (NW), nke na-agụ, sị: “Nna nke ụmụ okoro na-enweghị nna na onye ikpe nke ndị inyom di ha nwụrụ ka Chineke bụ n’ebe obibi ya dị nsọ.” N’ịdabere n’otu mmetụta ahụ banyere okwu Hibru e ji mee ihe, okwu na-egosi onye bụ nwanyị nke ngwaa dị n’Abụ Ọma 68:11 na-enye ọgụgụ bụ: “Ndị inyom ndị na-ekwusa ozi ọma bụ oké usuu ndị agha.”a
Ọ bụ ezie na “nwa okoro na-enweghị nna” bụ nsụgharị bụ isi nke ya·thohmʹ, e kwesịghị ịghọta nke a dị ka nke na-egosi enweghị nchegbu maka ụmụ agbọghọ na-enweghị nne ma ọ bụ nna. Akụkụ ihe odide ndị ahụ e hotara na ebe ndị ọzọ na-egosi na a gbara ndị Chineke ume ka ha lekọta ndị inyom, ụmụ nwanyị di ha nwụrụ. (Abụ Ọma 146:9; Aịsaịa 1:17; Jeremaịa 22:3; Zekaraịa 7:9, 10; Malakaị 3:5) N’Iwu ahụ, Chineke tinyekwara ihe ndekọ banyere mkpebi ikpe nke e ji jiri n’aka na e nyere ụmụ ndị inyom Zelọfehad na-enweghị nna ihe nketa. Mkpebi ikpe ahụ ghọrọ ụkpụrụ a ga-agbaso maka ọnọdụ ndị yiri ya, si otú ahụ na-ahụ na e debere ihe ndị ruuru ụmụ agbọghọ na-enweghị nna.—Ọnụ Ọgụgụ 27:1-8.
Jisọs akpaghị ókè n’etiti nwoke na nwanyị n’igosi ụmụntakịrị obi ọma. Kama ya, anyị na-agụ: “Ha wee kutara Ya ụmụntakịrị, ka O wee metụ ha aka: ma ndị na-eso ụzọ Ya baara ha mba. Ma mgbe Jisọs hụrụ ya, iwe were Ya nke ukwuu, Ọ sị ha, Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m; unu egbochila ha: n’ihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otú a. N’ezie asị m unu, Onye ọ bụla nke na-agaghị anara alaeze Chineke dị ka nwatakịrị, ọ gaghị aba n’ime ya ma ọlị. O wee kuru ha n’aka Ya, bikwasị ha aka Ya abụọ, wee gọzie ha nke ọma.”—Mak 10:13-16.
Okwu Grik nke a sụgharịrị ebe a ịbụ “ụmụntakịrị” bụ okwu na-adịghị egosi onye bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu Grik a maara nke ọma na-asị na okwu a bụ nke “e ji eme ihe maka ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ.” Jisọs na-egosipụta otu ụdị mmasị ahụ nke Jehova na-egosi n’ebe ụmụntakịrị nile nọ, ma ụmụ okoro ma ụmụ agbọghọ. (Ndị Hibru 1:3; tụlee Deuterọnọmi 16:14; Mak 5:35, 38-42.) Ya mere e kwesịrị ịmata na ndụmọdụ dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru banyere ilekọta “ụmụ okoro ndị na-enweghị nna” bụ ndụmọdụ banyere otú anyị kwesịrị isi nwee nchegbu banyere ụmụntakịrị nile na-enweghị nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ ha abụọ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nsụgharị Tanakh nke ndị Juu na-agụ, sị: “ONYENWE anyị na-enye iwu; ndị inyom na-eweta ozi ahụ bụ usuu ndị bara ụba.”