Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w09 4/1 p. 31
  • Nna nke Ụmụ Na-enweghị Nna

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nna nke Ụmụ Na-enweghị Nna
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Gosi Mmasị Ịhụnanya n’Ebe “Ụmụ Mgbei” Nọ
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Ezinụlọ Ndị Na-enweghị Nna—Ịkwụsị Nsogbu Ahụ
    Teta!—2000
  • Ezinụlọ Ndị Na-enweghị Nna—Ihe E Ji Mara Oge A
    Teta!—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
w09 4/1 p. 31

Bịaruo Chineke Nso

Nna nke Ụmụ Na-enweghị Nna

Ọpụpụ 22:22-24

“NNA nke ụmụ na-enweghị nna . . . ka Chineke bụ n’ebe obibi ya dị nsọ.” (Abụ Ọma 68:5) Okwu ndị a e si n’ike mmụọ nsọ dee na-akụziri anyị ihe na-emetụ n’ahụ́ banyere Jehova Chineke, nke bụ́ na ọ na-echebara mkpa ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha echiche. Iwu o nyere mba Izrel mere ka o doo anya na ọ na-echebara ụmụaka ndị nna ha nwụrụ anwụ echiche. Ka anyị leba anya n’Ọpụpụ 22:22-24, bụ́ ebe mbụ e kwuru banyere “nwa na-enweghị nna” n’ime Baịbụl.

Chineke dọrọ ndị ya aka ná ntị, sị: “Unu emekpala . . . nwa na-enweghị nna ahụ́.” (Amaokwu nke 22) Ebe a anaghị agwa anyị naanị ka anyị na-emepụrụ ndị ụwa na-atụ n’ọnụ; ọ na-agwa anyị ihe bụ́ iwu Chineke. Nwatakịrị nna ya nwụrụ enwekwaghị onye na-echebe ya na onye na-enye ya ihe na-akpa ya, n’ihi ya, o nwere ike ịdịrị ndị ọzọ mfe imegbu ya. Mmadụ ọ bụla ekwesịghị ‘imekpa’ nwata dị otú ahụ ahụ́ n’ụzọ ọ bụla. Ná nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ, ihe a sụgharịrị okwu ahụ bụ́ ‘imekpa ahụ́’ bụ “imegbu” na “irigbu.” Ime nwa na-enweghị nna ihe ọjọọ abụghị obere okwu n’anya Chineke. Olee otú ọ dịruru njọ n’anya ya?

Iwu ahụ kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na e nwee ka i si mekpaa ya ahụ́, ọ bụrụ na o tikuo m, aghaghị m ịnụ mkpu ákwá ya.” (Amaokwu nke 23) E dere amaokwu nke 22 ka ọ̀ bụ ọtụtụ ndị ka a na-agwa okwu, dezie amaokwu nke 23 ka à na-agwa otu onye okwu. Iwu ahụ Chineke nyere ji mmadụ niile n’otu n’otu, jirikwa mba ahụ dum. Jehova na-ahụ ihe na-emenụ; ọ na-ege ụmụ na-enweghị nna ntị, dịrị njikere mgbe ọ bụla ịgbatara ha ọsọ enyemaka ma ha tikuo ya.—Abụ Ọma 10:14; Ilu 23:10, 11.

Gịnịzi ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ emegbuo nwa na-enweghị nna, mee ka nwa ahụ tikuo Chineke? Jehova sịrị: “Iwe m ga-adị ọkụ n’ezie, m ga-ejikwa mma agha gbuo unu.” (Amaokwu nke 24) Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru na “otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ ‘imi m ga-adịkwa ọkụ’ nke bụ́ akpaala okwu na-egosi iwe dị ọkụ.” Ị̀ hụrụ na Chineke ahapụghị ndị ikpe Izrel ka ha jiri aka ha taa onye mebiri iwu a ahụhụ? Chineke ga-eji aka ya gbuo onye ọ bụla megburu nwa na-enweghị nna.—Diuterọnọmi 10:17, 18.

Jehova anaghị agbanwe agbanwe. (Malakaị 3:6) Ọ na-emetara ụmụaka ndị na-enweghị nna ma ọ bụ nne na nna ebere. (Jems 1:27) Chetakwa na imegbu ụmụaka na-enweghị ihe ha mere na-akpasu Nna nke ụmụ na-enweghị nna ezigbo iwe. Ndị na-emegbu nwa na-enweghị nna agaghị agbanahụ “ọnụma Jehova.” (Zefanaya 2:2) Ndị ọjọọ ahụ ga-amata na “ọ bụ ihe dị egwu ịdaba n’aka Chineke dị ndụ.”—Ndị Hibru 10:31.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya